Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịma Ihe Ị Ga-ekpebi?

Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịma Ihe Ị Ga-ekpebi?

“Eluigwe na ụwa ga-ejili aka ha kee onwe ha.”​—Ihe Stephen Hawking na Leonard Mlodinow bụ́ ndị fiziks kwuru n’afọ 2010.

“Chineke kere eluigwe na ụwa.”​—Ihe Baịbụl kwuru na Jenesis 1:1.

Ọ̀ bụ Chineke kere eluigwe na ụwa na ihe ndị dị ndụ dị na ha, ka hà nọkatara dịrị? Ihe ndị fiziks abụọ ahụ zara ná mmalite isiokwu a dị nnọọ iche n’ihe Baịbụl zara. Azịza nke ọ bụla nwekwara ndị na-akwadosi ya ike. Ma, ọtụtụ ndị amaghị nke ha ga-ekwere ekwere. Ọtụtụ arụọkwala ụka banyere ya n’akwụkwọ ndị a ma ama nakwa na tiivi.

O nwere ike ịbụ na ndị nkụzi unu gwara unu na eluigwe na ụwa ji aka ha dịrị, na o nweghị onye kere ha. Ma, hà gwara unu ihe gosiri na o nweghị onye kere ha? O nwekwara ike ịbụ na ị nụla ebe ndị isi chọọchị na-akụzi na e nwere onye kere ihe ndị a. Ma, hà gwara gị ihe gosiri na e nwere onye kere ha? Ka hà gwara gị jiri okwukwe nabata ihe ha kwuru?

O doro anya na i chebarala ajụjụ a echiche. Ma o nwere ike ịdị gị ka o nweghị onye ma ma è nwere onye kere ihe niile n’eziokwu. I nwekwara ike ịna-ajụ onwe gị ma ịmata azịza ajụjụ a ọ̀ dịkwanụ mkpa.

N’akwụkwọ a, anyị ga-ebu ụzọ kwuo ihe ụfọdụ mere ka ọtụtụ ndị kweta na e nwere onye kere ihe niile. Anyị kwuchaa nke ahụ, anyị ekwuzie ihe mere o ji dị mkpa ka anyị mata otú ihe ndị dị ndụ si malite n’ụwa.