Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Mbara Igwe na Ụwa Na-akụziri Anyị?

Gịnị Ka Mbara Igwe na Ụwa Na-akụziri Anyị?

Ihe ndị dị na mbara igwe ka na-atụ ndị sayensị n’anya. Ha na-emepụtakwa ngwá ọrụ ndị ka mma ha ga-eji na-amụtakwu banyere ihe ndị a. Ma, olee ihe ndị ha chọpụtarala?

A haziri ihe ndị dị na mbara igwe ahazi. Otu magazin a na-akpọ Astronomy kwuru, sị: “A haziri ụyọkọ kpakpando ndị dị na mbara igwe ahazi. Ha adịghị ghaa ghaa ghaa.” Gịnị mere ka ihe a kwe omume? Ndị sayensị kweere na ọ ga-abụ ikike a na-anaghị ahụ anya mere ka ihe ndị a nọrọ n’usoro. Ha kwuru na ikike a yiri ‘ihe a kpara akpa jikọtara kpakpando dị iche iche na ụyọkọ kpakpando dị iche iche, mee ka ha dịrị n’usoro ma jigide ha.’

Gịnị mere ihe ndị a dị na mbara igwe ji dịrị n’usoro dị ka ihe a kpachapụrụ anya hazie? Ì chere na ha ji aka ha hazie onwe ha? E nwere otu nwoke na-enyocha mbara igwe aha ya bụ Allan Sandage. E weere ya ka “otu n’ime ndị a kacha anụ aha ha n’ime ndị na-enyocha mbara igwe n’agbata afọ 1901 na afọ 2000,” o kweekwara na Chineke. Legodị ihe o kwuru mgbe ọ dị ndụ.

Ọ sịrị: “Echeghị m na ihe ndị a niile dị n’usoro otú a ji aka ha hazie onwe ha. A ga-enwerịrị onye haziri ha.”

A haziri ihe ndị dị na mbara igwe ka ha na-akwado ndụ. Chegodị banyere ikike ndị sayensị sịrị na ọ bụ ya na-eme ka anyanwụ nọgide na-acha. Á sị na ikike a dị ntakịrị karịa otú o kwesịrị, anyanwụ agaaraghị adị. Á sịkwanụ na o buru ibu karịa otú o kwesịrị, ọ gaara eme ka anyanwụ gbaa ọkụ kemgbe ọtụtụ afọ gara aga.

Ikike a na ikike ndị ọzọ na-eme ka ihe ndị dị na mbara igwe na-arụ ọrụ nke ọma ka anyị nwee ike ịdị ndụ. Otu onye na-ede banyere sayensị aha ya bụ Anil Ananthaswamy kwuru na á sị na otu n’ime ikike ndị ahụ adịghị otú o kwesịrị ịdị, “kpakpando, planet, na ụyọkọ kpakpando dị iche iche agaaraghị adị. O nweghịkwa ihe ọ bụla gaara adị ndụ.”

Ụwa dị nnọọ otú o kwesịrị ka mmadụ nwee ike ibi na ya. Ụwa nwere ikuku ndụ, nweekwa mmiri ga-ezuru ndị bi na ya. Ụwa nwekwara ọnwa na-enyere ya aka ịnọ ebe o kwesịrị ịnọ. Otu magazin a na-akpọ National Geographic kwuru, sị: “Ihe niile dị n’ụwa anyị a mere ka ọ dị mma obibi. N’ime planet niile e nwere, ọ bụ naanị ụwa ka ndị sayensị chọpụtarala ụmụ mmadụ ga-ebili na ya.” *

Otu onye na-ede akwụkwọ sịrị na ụwa anyị a “dịpụrụ adịpụ n’ebe ihe ndị ọzọ dị na mbara igwe dị.” Ma, ọ bụ otú a ọ dịpụrụ adịpụ mere o ji kwe omume mmadụ ibi na ya. Á sị na anyị nọ kpakpando na ihe ndị ọzọ dị na mbara igwe nso, ụdị ukoro ọkụ si na ha na-apụta ga-akpatara anyị nsogbu. Kama, ebe ụwa anyị a dị bụ ebe ndị sayensị kọwara dị ka “naanị ebe dị mma obibi ma e jiri ya tụnyere ebe ndị ọzọ.”

Mgbe otu onye fiziks aha ya bụ Paul Davies tụlechara ihe ndị ọ ma banyere eluigwe na ụwa, nakwa ikike ndị na-achịkwa ha. O kwuru, sị: “Ekwetaghị m na ọnụnọ anyị nọ n’ụwa a mere ná ndaba, na anyị nọkatara dịwa. . . . A kpachapụrụ anya mee ụwa a ka anyị biri na ya.” Davies anaghị akụzi na ọ bụ Chineke kere eluigwe na ụwa, nakwa ụmụ mmadụ. Ma, gịnị ka i chere? O yichara ka à haziri ihe ndị dị na mbara igwe na ihe ndị dị n’ụwa ka ha mee ka ibi n’ụwa a kwe omume. Ọ̀ ga-abụ na ihe mere ha ji dị otú a bụ n’ihi na e nwere onye haziri ha?

^ Ihe ndị dere ihe a bu n’uche dee ya abụghị iji gosi na ọ bụ Chineke kere ụwa nakwa ụmụ mmadụ. Kama, naanị ihe ha na-ekwu bụ na ụwa dị mma obibi.