Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Sayensị Na-agaghị Akọwali

Ihe Ndị Sayensị Na-agaghị Akọwali

Ndị sayensị amụọla banyere ọtụtụ ihe dị na mbara igwe nakwa n’ụwa. Ma, a ka nwere ọtụtụ ajụjụ ndị dị mkpa ha na-agaghị azali.

Ndị sayensị hà akọwaala otú eluigwe na ụwa, nakwa ndụ si malite? Azịza ya bụ mba. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ndị sayensị mụrụ banyere mbara igwe ga-akọwali otú eluigwe na ụwa si malite. Ma, Marcelo Gleiser bụ́ prọfesọ na-akụzi gbasara ihe ndị dị na mbara igwe na mahadum Dartmouth, onye na-ekwetachaghị na Chineke dị, kwuru, sị: “Anyị akọwabeghị ihe ọ bụla gbasara otú eluigwe na ụwa si malite.”

Otu isiokwu gbara na magazin a na-akpọ Science News kwukwara ihe yiri ya mgbe ọ na-ekwu gbasara otú ndụ si malite. Ọ sịrị: “O yiri ka ọ gaghị ekwe omume ịmata kpọmkwem otú ndụ si malite n’ụwa. Ọtụtụ n’ime nkume na ihe ndị ọzọ e nwere ike iji mata ihe ndị mere mgbe ụwa bidoro adịghịzi.” Ihe ndị a na-egosi na ndị sayensị enwebeghị ike ịza ajụjụ ahụ bụ́, Olee otú eluigwe na ụwa, nakwa ndụ si malite?

Ma, i nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Ọ bụrụ na e nwere onye kere ihe ndị dị ndụ n’ụwa a, ònye ka ọ bụ?’ O nwekwara ike ịbụ na ị jụọla ajụjụ ndị dị ka, ‘Ọ bụrụ na onye kere anyị ma ihe ma hụ anyị n’anya, gịnị mere o ji kwe ka ụmụ mmadụ o kere eke na-ata ahụhụ? Gịnị mere o ji kwe ka e nwee okpukpe dị iche iche na-akụzi ihe na-emegide ibe ha? Gịnịkwa mere o ji kwe ka ndị sị na ha na-efe ya na-eme ọtụtụ ihe ọjọọ?’

Ndị sayensị agaghị azali ajụjụ ndị a. Ma, ọ pụtaghị na ị gaghị amatali azịza ha. Ọtụtụ ndị amatala azịza ha na Baịbụl.

Ị chọọ ịmata ihe mere ụfọdụ ndị sayensị wepụtara oge mụọ Baịbụl ji kweta na e nwere Onye kere ihe niile, gaa na jw.org. Denye “ihe ndị mmadụ kwuru mere ha ji kwere na Chineke dị” n’ebe a na-achọ ihe.