Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọnwụnwa

Ọnwụnwa

Ịgba alụkwaghịm, nsogbu ahụ́ ike, na akọnuche ịpịa mmadụ ụtarị so ná nsogbu ụfọdụ ịdaba n’ọnwụnwa na-akpata taa. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ịdaba n’ọnwụnwa?

Gịnị bụ ọnwụnwa?

A na-anwa gị ọnwụnwa ma ọ bụrụ na i nwere mmasị n’ihe, karịchaa ma ọ bụrụ na ihe ahụ bụ ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ka ị nọ n’ime ahịa na-azụrụ ihe, otu ihe adọrọ masịrị gị. Ozugbo ahụ, obi gị agwa gị na i nwere ike izuru ihe ahụ n’enweghị onye ga-ahụ gị. Ma, akọnuche gị asị gị mba. Gị ewepụ uche gị n’ihe ahụ, gawa ebe ị na-aga. Ozugbo ahụ i wepụrụ uche gị n’ihe ahụ, ka ọnwụnwa ahụ bịaara gị kwụsịrị. I meriela ya.

IHE BAỊBỤL KWURU

 

Na a nwara mmadụ ọnwụnwa apụtaghị na onye ahụ bụ ajọ mmadụ. Baịbụl kwuru na ọnwụnwa na-abịara mmadụ niile. (1 Ndị Kọrịnt 10:13) Ihe kacha mkpa bụ otú anyị si kpaa àgwà mgbe ọ bịara. Ụfọdụ ndị na-anọgide na-eche gbasara ihe ọjọọ n’obi ha ruo mgbe ha mehiere, ebe ndị ọzọ na-ewepụ ihe ọjọọ ahụ n’obi ha ozugbo.

“A na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya.”​—⁠Jems 1:⁠14.

Gịnị mere o ji dị mma ịlụso ọnwụnwa ọgụ ozugbo?

Baịbụl gwara anyị ihe atọ na-eduba mmadụ n’ime ihe ọjọọ. Jems 1:15 kwuru, sị: “Mgbe ọchịchọ [na-ezighị ezi] ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie.” Ka anyị na-atụgharị ihe na-adịghị mma n’obi anyị, oge ga-eru mgbe ịlụso ya ọgụ ga-esiri anyị ezigbo ike, dị ka otú ahụ nwaanyị dị ime na-aghaghị ịmụ nwa. Ma, anyị nwere ike igbochi onwe anyị ịbụ ohu nke ọchịchọ ọjọọ. Anyị nwere ike imeri ọchịchọ ime ihe ọjọọ.

IHE BAỊBỤL KWURU GA-ENYERE GỊ AKA

 

Otú ahụ obi anyị nwere ike isi na-eme ka ọchịchọ ime ihe ọjọọ na-eto, ka o nwekwara ike isi wepụ ya. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ma, ọ bụrụ na anyị etinye uche n’ihe ọzọ, dị ka ịga chọrọ otu ihe mewe, anyị na enyi ịkparịta ụka ma ọ bụkwanụ ichebara ihe ndị bara uru echiche. (Ndị Filipaị 4:⁠8) Ihe ọzọ ga-enyekwa aka bụ iburu ụzọ chee banyere nsogbu anyị ga-abanye na ya ma ọ bụrụ na anyị ekwere ka a nwata anyị. Nsogbu ndị a nwere ike ibutere anyị mkpaghasị uche, mmerụ ahụ́ ma ọ bụ mee ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. (Diuterọnọmi 32:29) Ihe ọzọ ga-enyekwara anyị aka bụ ikpe ekpere. Jizọs, sịrị: “Na-ekpe ekpere mgbe niile, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa.”​—⁠Matiu 26:⁠41.

“Unu ekwela ka e duhie unu: Chineke abụghị onye a ga-akwa emo. N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.”​—⁠Ndị Galeshia 6:⁠7.

Olee otú ị ga-esi jikere onwe gị maka ọnwụnwa?

NKE BỤ́ EZIOKWU

 

Ghọta na ọnwụnwa dị ka ihe ụrà nwere ike ịrata onye na-amaghị ihe, ma ọ bụ onye nzuzu ka ọ ma n’ọnyà. (Jems 1:14) Ọ dị ka ọnwụnwa ndị ahụ na-eme ka mmadụ kwaa iko, ha nwere ike iduba onye ahụ ná nsogbu ndị nwere ike ịta isi ya.​—⁠Ilu 7:​22, 23.

IHE BAỊBỤL KWURU GA-ENYERE GỊ AKA

 

Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na anya aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya tụfuo.” (Matiu 5:29) N’ebe a, Jizọs anaghị ekwu gbasara anya nkịtị. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na iji mee ihe ga-adị Chineke mma, anyị ga-eme ka akụkụ ahụ́ anyị ụfọdụ nwụọ n’ebe ihe ọjọọ dị. (Ndị Kọlọsi 3:⁠5) Ọ pụtara na anyị ga-ekpebisi ike ịgbakụta ihe ọ bụla ga-eme ka anyị daba n’ọnwụnwa azụ. Otu nwoke nwere okwukwe na Chineke kwuru, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.”​—⁠Abụ Ọma 119:⁠37.

Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike isitụrụ mmadụ ike ijide onwe ya. A sịdị kwuwe, “anụ ahụ́ adịghị ike.” (Matiu 26:41) N’ihi ya, anyị ga na-emehie ihe. Ma, ọ bụrụ na ihe anyị mejọrọ e wute anyị, anyị a na-agbalịsikwa ike ka àgwà ọjọọ ghara ịmara anyị ahụ́, Jehova Chineke anyị, ga-enyere anyị aka n’ihi na ọ “dị ebere, na-emekwa amara.” (Abụ Ọma 103:⁠8) Ihe a bụ ihe na-emesi obi ike.

“A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele, Jaa, Jehova, ònye pụrụ iguzo?”​—⁠Abụ Ọma 130:⁠3.