IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO
Egwuregwu Ndị Nwere Ike Ịta Isi Mmadụ Ọ̀ Dị Mma?
IHE MERE ỤFỌDỤ JI EME YA
Otu nwa okorobịa aha ya bụ Leon kwuru, sị: “M gara kwụrụ n’akụkụ ụgbọ okporo ígwè na-agba oké ọsọ n’okpuru ala. Ụdị akpata oyi wụrụ m n’ahụ́ mere ka ọ dị m ka mụ enweghịzi nsogbu ọ bụla.” *
Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Larissa, kwuru sị: “Mgbe ọ bụla m si n’ọnụ ọnụ ugwu maba n’ime mmiri, ahụ́ na-ada m jii. Ime ihe a na-atọ m ụtọ, ma, ọ na-atụkwa m ụjọ mgbe ụfọdụ.”
Dị ka Leon na Larissa, ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwetakarị obi ụtọ pụrụ iche ma ha mee ihe ndị nwere ike ịta isi ha. Ọ̀ na-agụ gị agụụ iso mee ụdị ihe ndị a? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe ndị e kwuru n’isiokwu a ga-abara gị uru.
IHE I KWESỊRỊ ỊMA
Igwu ụdị egwuregwu a nwere ike ịmara mmadụ ahụ́. Otú o si na-atọ gị ụtọ nwere ike ime ka ịchọwa imekwu ya. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Marco, onye gara nọrọ n’akụkụ ụgbọ okporo ígwè, otú ahụ Leon mere, kwuru, sị: “O siiri m ike ịkwụsị ime ya. Obi ụtọ m na-enweta na ya na-eme ka m chọwa nke ka ya m ga-eme.”
Otu nwa okorobịa aha ya bụ Justin na-eyiri akpụkpọ ụkwụ nwere taya, jide ụgbọala na-agba ọsọ aka, soro ya na-aga. O kwuru, sị: “Otú ime ihe a si atọ m ụtọ na-eme ka m na-achọkwu ime ya. M chọrọ ka ndị mmadụ na-eto m. Ma, m mechara nweta onwe m n’ụlọ ọgwụ.”
Ịchọ ime ka ndị ọgbọ gị nabata gị nwere ike ime ka i chefuo onwe gị. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Marvin kwuru, sị: “Ndị enyi m nyere m nsogbu ka m jiri aka rịa ahụ́ ụlọ otu ụlọ elu toro ogologo. Ha nọ na-asị m: ‘Rịwa, rịwa, ị ga-emeli ya.’ Ọ kachaghị m obi. M nọkwa na-ama jijiji mgbe m bidoro ịrị ya.” Larissa anyị kwuburu gbasara ya ná mmalite kwuru, sị: “M na-eso ndị ọzọ eme ihe ọ bụla ha na-eme.”
Ụfọdụ ndị chọrọ ito ndị na-eme ụdị ihe a ma kpalie ndị ọzọ ime ya, na-etinye vidio na ihe ndị ọzọ ga-eme ka ọ yie ihe na-adịghị ize ndụ n’Ịntanet. N’ihi otú ọtụtụ ndị si ele vidio ndị ahụ, ndị na-eme ya ghọziri ndị ama ama.
Di ka ihe atụ, e nwere ụfọdụ vidio na-egosi ebe ndị mmadụ na-amagharị n’elu mgbidi, ụlọ, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ nwere ike ịta isi mmadụ. Ha na-enwe ike isi n’elu otu ihe mafere n’ọzọ n’ejideghị ihe ọ bụla aka. Ile vidio ndị a nwere ike ime
ka mmadụ chewe na: (1) Ọghọm adịchaghị na ya, na (2) Onye ọ bụla na-eme ya. Ihe ga-esizi n’ime ya pụta bụ na: O nwere ike gụwa gị agụụ ka i mee ihe ndị ahụ nwere ike ịta isi mmadụ.E nwere otú kacha mma mmadụ nwere ike isi mata ebe ike ya ruru. Baịbụl kwuru, sị: “Ọzụzụ nke ahụ́ bara ntakịrị uru.” (1 Timoti 4:8) Ma, ọ gwakwara gị ka ị “na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè.” (Taịtọs 2:12) Olee otú i nwere ike isi mee ya?
IHE I NWERE IKE IME
Leba anya ná nsogbu ndị dị na ya. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke maara ihe ga-eji ihe ọmụma mee ihe, ma onye nzuzu ga-agbasa nzuzu ya ebe niile.” (Ilu 13:16) Tupu gị emee ihe ọ bụla, buru ụzọ chọpụta ọghọm dị n’ihe ahụ. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ihe a m chọrọ ime ò nwere ike ịkpatara m ọnwụ ma ọ bụ mmerụ ahụ́?’—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 14:15.
Meta ndị ji ndụ kpọrọ ihe enyi. Ezigbo ndị enyi agaghị agba gị ume ka i mee ihe nwere ike igbu gị ma ọ bụ ihe ị na-achọghị ime. Larissa kwuru, sị: “Ezigbo ndị enyi nyeere m aka ịhọrọ egwuregwu ndị na-adịghị ize ndụ. Ndị enyi m nwere ugbu a mere ka ndụ m ka mma.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 13:20.
Jụọ onwe gị, sị, ‘Ihe a m chọrọ ime ò nwere ike ịkpatara m ọnwụ ma ọ bụ mee ka m merụọ ahụ́?’
Otú ị ga-esi mee ihe ndị na-amasị gị n’emerụghị ahụ́. Otu akwụkwọ aha ya bụ Adolescent Risk Behaviors kwuru na mmadụ na-eto, ọ “na-amụtakwu ihe ndị o kwesịrị ime na ebe ike ya ruru.” Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ebe ike gị ruru, jiri ihe ndị ga-egbochi mmerụ ahụ́ mee ya.
Ka obi na-atọ gị ụtọ n’ihe ndị ị ga-emeli. Ihe ga-eme ka ndị mmadụ na-akwanyere gị ùgwù abụghị ihe i mere ka ndị ọzọ hụ gị, kama, otú i si emeri nsogbu ndị i nwere. Larissa kwuru, sị: “Isi n’ọnụ ọnụ ugwu maba n’ime mmiri bụ ihe mbụ nwere ike ịta isi mmadụ m mere. Ọ gaara akacha mma ma a sị na m jụrụ ime ihe ndị ahụ.”
Ihe ị ga-eburu n’obi: Kama itinye aka n’egwuregwu ndị nwere ike ịta isi gị, i nwere ike ịhọrọ egwuregwu ndị na-agaghị akpatara gị nsogbu.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 15:24.
^ para. 4 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.