È KERE YA EKE?
Mkpokoro Eju Mmiri na Ihe Ndị Ọzọ Yiri Eju Bi ná Mmiri
MKPOKORO eju mmiri na ihe ndị ọzọ yiri eju na-ebi ná mmiri na-enyere ha aka ibi n’ebe siri ike obibi, dị ka, n’ala ala osimiri. Otú mkpokoro ha si na-ekpuchi ahụ́ ha nke ọma ka ihe ọ bụla ghara ime ya, dọọrọ mmasị ndị njinia, ha achọwa ka ha matakwuo gbasara ya. Ndị njinia ndị a bidoro ime nchọnchọ iji matakwuo gbasara ọdịdị ha. Ha chọrọ ilere anya n’otú ha dị rụọ ụgbọala na ụlọ ndị ga na-echebe ndị nọ ha n’ime nke ọma.
Ihe Ị Ga-echebara Echiche: Ndị njinia ndị a mere nchọnchọ n’ụdị mkpokoro abụọ: (1) ndị nke dị mbadamba na-adị abụo abụọ na (2) ndị nke pịrị ọnụ ka nke eju.
Nchọpụta ndị e mere gosiri na mkpokoro ndị nke dị mbadamba na-eme ka ihe ọ bụla chọrọ ịdụpu ya chipụ gaa n’akụkụ ya na n’ebe jikọtara mkpokoro abụọ ahụ. Ná mkpokoro ndị nke pịrị ọnụ ka nke eju, ihe ọ bụla chọrọ ịdụpu ya na-achipụkwa gaa sụọ n’etiti ya, bụkwanụ ebe kacha sie ike ná mkpokoro ahụ. Ọ pụtara na o nwee ka ihe si kụọ na mkpokoro ndị a, ihe ahụ na-achịpụ gaa sụọ n’ebe kacha sie ike na mkpokoro ahụ. Ihe a na-eme ka ihe ọ bụla ghara imetụta ihe nọ n’ime mkpokoro ahụ.
Mgbe ndị na-eme nchọpụta ji mkpokoro ndị nke ezigbo ya tụnyere ihe yiri mkpokoro ha ji kọmputa mepụta, iji mata nke ga-akacha esi ike, ha chọpụtara na mkpokoro nke ezigbo ya ahụ ji okpukpu abụọ sie ike karịa nke ahụ ha rụpụtara.
Otu akwụkwọ aha ya bụ Scientific American, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e mepụta ụgbọala ga-adị ka mkpokoro eju ndị a n’ọdịnihu, ọ ga-ama ezigbo mma, siekwa ike otú ga-eme ka o chebe ndị nọ ya n’ime.”
Gịnị Ka I Chere? Otú mkpokoro eju mmiri na ihe ndị ọzọ yiri eju na-ebi ná mmiri dị, ọ̀ nọkatara dịrị? Ka è kere ya eke?