Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 30

Jiri Ọrụ Gị n’Ezinụlọ Jehova Kpọrọ Ihe

Jiri Ọrụ Gị n’Ezinụlọ Jehova Kpọrọ Ihe

“I mere ka ndị mmụọ ozi katụ ya. I ji ebube na ùgwù chọọ ya mma.”​—ỌMA 8:5.

ABỤ NKE 123 Ka Anyị Na-erubere Chineke Isi

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ ma ọ bụrụ na anyị echebara ihe niile Jehova kere echiche?

Ọ BỤRỤ na anyị echebara ihe niile Chineke kere echiche, o nwere ike ịdị anyị otú ahụ ọ dị ọbụ abụ bụ́ Devid. Ọ gwara Jehova, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ọrụ aka gị, ọnwa na kpakpando ndị i kere, gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere i ji na-echeta ya? Gịnịkwa ka nwa nke mmadụ bụ nke mere i ji na-elekọta ya?” (Ọma 8:​3, 4) Dị ka Devid, ọ bụrụ na anyị elee otú anyị si dịrị ntakịrị ma e jiri anyị tụnyere ihe niile Chineke kere eke, o nwere ike iju anyị anya na Jehova na-echeta anyị. Ma, dị ka anyị ga-ahụ, ọ bụghị naanị na Jehova lekọtara Adam na Iv, o mekwara ka ha soro n’ezinụlọ ya.

2. Gịnị ka Jehova chọrọ ka Adam na Iv mee?

2 Adam na Iv bụ ndị mbụ Jehova kere n’ụwa. Jehova bụkwa Nna ha nke eluigwe hụrụ ha n’anya. O nyere ha ọrụ ndị ha ga-arụ. Ọ gwara ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, junụ n’ụwa, na-elekọtakwanụ ya.” (Jen. 1:28) Jehova chọrọ ka ha mụọ ụmụ, chọọkwa ka ha na-elekọta ụwa a nke ọma. Ọ bụrụ na ha rubeere ya isi ma mee ihe ọ chọrọ ka ha mee, ha na ụmụ ha gaara abụ ndị ezinụlọ ya ruo mgbe ebighị ebi.

3. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na Adam na Iv bara uru n’ezinụlọ Jehova?

3 Adam na Iv bara uru n’ezinụlọ Jehova. N’Abụ Ọma 8:​5, Devid kwuru gbasara mmadụ, sị: “I mere ka ndị mmụọ ozi katụ ya. I ji ebube na ùgwù chọọ ya mma.” Nke bụ́ eziokwu bụ na e nyeghị ụmụ mmadụ ụdị ikike na amamihe e nyere ndị mmụọ ozi. (Ọma 103:20) Ma, ihe Baịbụl kwuru gosiri na ndị mmụọ ozi ji obere ihe ka ụmụ mmadụ. Chegodịnụ ihe ọ dị ka ya. Mgbe Jehova kere nne na nna anyị mbụ, o mere ka ihe dịrị ha ná mma.

4. Adam na Iv hà nọgidere n’ezinụlọ Jehova? Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

 4 Ma, ọ dị mwute na Adam na Iv anọgideghị n’ezinụlọ Jehova. Ihe a kpara ụmụ ha aka ọjọọ dị ka anyị ga-emecha hụ n’isiokwu a. Ma, nzube Jehova agbanwebeghị. Ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ na-erubere ya isi bụrụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi. Ka anyị buru ụzọ tụlee otú Jehova si gosi na o ji anyị kpọrọ ihe. Anyị ga-atụlekwa ihe anyị nwere ike ime iji gosi na anyị chọrọ ịbụ ndị ezinụlọ Chineke. N’ikpeazụ, anyị ga-eleba anya ná ngọzi ụmụ Chineke nọ n’ụwa ga-enweta ruo mgbe ebighị ebi.

OTÚ JEHOVA SI GOSI NA O JI ANYỊ KPỌRỌ IHE

Olee ụzọ ndị Jehova si gosi na o ji anyị kpọrọ ihe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 ruo na nke 11) *

5. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ na Jehova kere anyị n’oyiyi ya?

5 Jehova kere anyị n’oyiyi ya iji gosi na o ji anyị kpọrọ ihe. (Jen. 1:​26, 27) Ebe ọ bụ na e kere anyị n’oyiyi Chineke, anyị nwere ike ịna-akpa àgwà ya ndị magburu onwe ha, dị ka, ịhụnanya, ọmịiko, ikwesị ntụkwasị obi, na ezi omume. (Ọma 86:15; 145:17) Ọ bụrụ na anyị na-agbalị ịkpa àgwà ndị ahụ, anyị na-akwanyere Jehova ùgwù ma na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị. (1 Pita 1:​14-16) Ọ bụrụ na anyị akpaa àgwà otú mere Nna anyị nke eluigwe obi ụtọ, anyị ga-enwe obi ụtọ. Ebe Jehova kere anyị n’oyiyi ya, o mere ka anyị nwee ike ịbụ ụdị ndị ọ chọrọ ka ha nọrọ n’ezinụlọ ya.

6. Olee otú Jehova si gosi na o ji ụmụ mmadụ kpọrọ ihe mgbe ọ na-eke ụwa?

6 Jehova kwadebeere anyị ebe obibi pụrụ iche. Ogologo oge tupu Chineke ekee Adam, ọ kwadebere ụwa maka ụmụ mmadụ. (Job 38:​4-6; Jere. 10:12) Jehova nyere ụmụ mmadụ ọtụtụ ihe ga-eme ha obi ụtọ n’ihi na ọ dị obiọma, na-emesapụkwa aka. (Ọma 104:​14, 15, 24) E nwere oge ndị o lere ihe ndị o kere ma “hụ na ha dị mma.” (Jen. 1:​10, 12, 31) O gosiri na o ji ụmụ mmadụ kpọrọ ihe n’ihi na o ‘mere ka ha lekọtawa’ ihe ndị ọzọ magburu onwe ha o kere n’ụwa. (Ọma 8:6) Jehova kwere nkwa na ụmụ mmadụ zuru okè ga-enwe obi ụtọ n’ilekọta ọrụ aka ya dị ebube ruo mgbe ebighị ebi. Ị̀ na-ekele Jehova mgbe niile maka nkwa a magburu onwe ya o kwere anyị?

7. Olee otú Joshụa 24:15 si gosi na mmadụ nwere ikike ikpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme?

7 Jehova mere ka anyị nwere onwe anyị ikpebiri onwe anyị ihe. Anyị nwere ike ikpebi ihe anyị ga-eji ndụ anyị eme. (Gụọ Joshụa 24:15.) Obi na-atọ Jehova ezigbo ụtọ ma anyị kpebie ife ya. (Ọma 84:11; Ilu 27:11) Anyị nwere ike iji onyinye a Chineke nyere anyị ikpebiri onwe anyị ihe mee ezigbo mkpebi n’ọtụtụ ihe. Ka anyị lee otú Jizọs Kraịst si mee ihe a. 

8. Olee otu ụzọ Jizọs si jiri ikike o nwere ikpebiri onwe ya ihe mee mkpebi?

8 Anyị na-eṅomi Jizọs ma ọ bụrụ na anyị ana-ebute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ. E nwere mgbe ike gwụrụ Jizọs na ndịozi ya, ha agawa ebe dị jụụ ka ha zurutụ ike. Ma, ha ezughị ike ahụ n’ihi na ìgwè mmadụ hụrụ ha, chọsiekwa ike ka Jizọs kụziere ha ihe. Ma, iwe eweghị ya, kama, o metaara ha ebere. Gịnị ka Jizọs mere? Ọ ‘malitere izi ha ọtụtụ ihe.’ (Mak 6:​30-34) Ọ bụrụ na anyị emee ka Jizọs ma na-eji ike anyị na oge anyị na-enyere ndị ọzọ aka, ọ ga-eme ka e too Nna anyị nke eluigwe. (Mat. 5:​14-16) Anyị na-egosikwa Jehova na anyị chọrọ ịnọ n’ezinụlọ ya.

9. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị iburu n’obi?

9 Jehova kere ụmụ mmadụ ka ha nwee ike ịmụ ụmụ na ịkụziri ụmụ ha ịhụ ya n’anya ma na-efe ya. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ì ji onyinye a Chineke nyere gị kpọrọ ihe? Ọ bụ eziokwu na Jehova gọziri ndị mmụọ ozi nke ukwuu, ma, o nyeghị ha ikike ịmụ ụmụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, jiri onyinye a Chineke nyere gị kpọrọ ihe. Chineke nyere ndị nne na nna ọrụ dị ezigbo mkpa, ya bụ, ‘ịna-agbazi ụmụ ha otú Jehova chọrọ.’ (Efe. 6:4; Diut. 6:​5-7; Ọma 127:3) Iji nyere ndị nne na nna aka, nzukọ Jehova ewepụtala ọtụtụ ihe ndị e ji amụ Baịbụl, dị ka akwụkwọ, vidio, egwú, na ihe ndị ọzọ na-adị n’Ịntanet. O doro anya na Nna anyị nke eluigwe na Ọkpara ya ji ndị na-eto eto kpọrọ ihe. (Luk 18:​15-17) Ọ bụrụ na ndị nne na nna atụkwasị Jehova obi ma mee ike ha niile ilekọta ụmụ ha, obi na-atọ Jehova ụtọ. Ndị nne na nna dị otú ahụ na-eme ka ụmụ ha nwee olileanya ịbụ ndị ezinụlọ Jehova ruo mgbe ebighị ebi.

10-11. Gịnị ka Jehova ji àjà Jizọs Kraịst chụrụ mee ka o kwe omume?

10 Jehova nyere Ọkpara ya ọ kacha hụ n’anya ka anyị nwee ike ịbụ ndị ezinụlọ ya ọzọ. Dị ka anyị kwuru na  paragraf nke anọ, nnupụisi Adam na Iv mere ka ha na ụmụ ha ghara ịnọ n’ezinụlọ Jehova. (Rom 5:12) Adam na Iv kpachaara anya nupụrụ Jehova isi. N’ihi ya, otú ahụ Jehova mere ka ha ghara iso n’ezinụlọ ya kwesịịrị ha. Ma, oleekwanụ maka ụmụ ha? Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, n’ihi ya, o mere ka ndị na-erubere ya isi nwee ike ịbụ ndị ezinụlọ ya. Otú o si mee ya bụ iji Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst chụọ àjà n’ihi ha. (Jọn 3:16; Rom 5:19) Àjà ahụ Jizọs chụrụ mere ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi dị otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ bụrụ ụmụ Chineke.​—Rom 8:​15-17; Mkpu. 14:1.

11 Ihe ọzọ bụkwa na ọtụtụ nde mmadụ na-erubere Chineke isi. Ha nwere olileanya ịbụ ụmụ Chineke ma ule ikpeazụ gachaa ná ngwụcha otu puku afọ ahụ. (Ọma 25:14; Rom 8:​20, 21) Olileanya ahụ ha nwere mere ka ha na-akpọ Jehova bụ́ onye kere ha “Nna” ugbu a. (Mat. 6:9) A ga-enyekwa ndị a kpọlitere n’ọnwụ ohere ịmụ banyere ihe Chineke chọrọ n’aka ha. Ndị rubere isi ga-emecha soro n’ezinụlọ Chineke.

12. Olee ajụjụ anyị ga-atụle ugbu a?

12 Dị ka anyị hụrụ, e nweela ọtụtụ ihe Jehova merela iji gosi na o ji ụmụ mmadụ kpọrọ ihe. O meela ka ndị e tere mmanụ bụrụ ụmụ ya, meekwa ka oké ìgwè mmadụ ahụ nwee olileanya ịbụ ụmụ ya n’ime ụwa ọhụrụ. (Mkpu. 7:9) Gịnị ka anyị nwere ike ime iji gosi Jehova na anyị chọrọ ịbụ ndị ezinụlọ ya ruo mgbe ebighị ebi?

GOSI JEHOVA NA Ị CHỌRỌ ISO N’EZINỤLỌ YA

13. Olee ihe anyị nwere ike ime ka anyị soro n’ezinụlọ Chineke? (Mak 12:30)

13 Jiri obi gị niile na-efe Jehova iji gosi ya na ị hụrụ ya n’anya. (Gụọ Mak 12:30.) N’ime ihe niile Chineke meere anyị, o nwere ike ịbụ na otu n’ime ihe ndị kachanụ bụ onyinye o nyere anyị ife ya ofufe. Anyị na-egosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya ma anyị ‘na-eme ihe ndị o nyere n’iwu.’ (1 Jọn 5:3) Jizọs kwuru uche Nna ya mgbe o nyere anyị iwu ka anyị na-eme ndị na-eso ụzọ, na-emekwa ha baptizim. (Mat. 28:19) O nyekwara anyị iwu ka anyị hụ ibe anyị n’anya. (Jọn 13:35) Jehova ga-anabata ndị niile na-erube isi n’iwu ya n’ezinụlọ nke ndị na-efe ya zuru ụwa ọnụ.​—Ọma 15:​1, 2.

14. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya? (Mat. 9:​36-38; Rom 12:10)

14 Na-ahụ ndị ọzọ n’anya. Ịhụnanya bụ àgwà Jehova kachanụ. (1 Jọn 4:8) Jehova hụrụ anyị n’anya tupu anyị amata onye ọ bụ. (1 Jọn 4:​9, 10) Anyị na-eṅomi ya ma ọ bụrụ na anyị ana-ahụ ndị ọzọ n’anya. (Efe. 5:1) Otu n’ime ụzọ kacha mma anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya bụ inyere ha aka ịmata Jehova ugbu a oge ka dị. (Gụọ Matiu 9:​36-38.) Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị na-eme ka ha nwee olileanya ịbụ ndị ezinụlọ Chineke. Mmadụ mechaa baptizim, anyị kwesịkwara ịnọgide na-ahụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. (1 Jọn 4:​20, 21) Olee otú anyị ga-esi eme ya? Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịtụkwasị ya obi. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ihe o mere, anyị ekwesịghị iche na ihe mere o ji mee ihe ahụ bụ na ọ na-achọ ọdịmma nke onwe ya naanị ma ọ bụkwanụ na o bu ihe ọjọọ n’obi mee ya. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịkwanyere ya ùgwù ma were ya na ọ ka anyị.​—Gụọ Ndị Rom 12:10; Fil. 2:3.

15. Olee ndị anyị kwesịrị ịna-emere ebere na obiọma?

15 Na-emere mmadụ niile ebere na obiọma. Ọ bụrụ na anyị chọrọ iso n’ezinụlọ Jehova ruo mgbe ebighị ebi, anyị kwesịrị ịna-eme ihe Okwu Chineke kwuru. Dị ka ihe atụ, Jizọs kụziri na anyị kwesịrị ịna-emere mmadụ niile ebere na obiọma, ma ndị iro anyị. (Luk 6:​32-36) Anyị nwere ike ịchọpụta na ihe a na-esiri anyị ike ime mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ otú ahụ, anyị kwesịrị ịmụta iche echiche na ịna-akpa àgwà ka Jizọs. Ọ bụrụ na anyị emee ike anyị niile irubere Jehova isi na iṅomi Jizọs, anyị na-egosi Nna anyị nke eluigwe na anyị chọrọ ịbụ ndị ezinụlọ ya ruo mgbe ebighị ebi.

16. Olee otú anyị ga-esi mee ka a ghara ịna-akpọ ezinụlọ Jehova aha ọjọọ?

16 Emela ihe ga-eme ka a na-akatọ aha Jehova. N’ezinụlọ, nwata nwoke ọ bụla na-achọkarị ịna-eme ka nwanne ya nwoke tọrọ ya. Ọ bụrụ na nwanne ya ahụ na-eme ihe Baịbụl kwuru, ọ ga na-emekwa otú ahụ. Ma, ọ bụrụ na nwanne ya ahụ ana-eme ihe ọjọọ, o nwekwara ike ịna-eme ka ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ezinụlọ Jehova. Ọ bụrụ na Onye Kraịst kwesịburu ntụkwasị obi aghọọ onye si n’ezi ofufe dapụ, mewe omume rụrụ arụ ma ọ bụ biwe ndụ na-adịghị mma, ndị ọzọ nwere ike iso ya mewe ihe ọjọọ. Ndị na-eme otú ahụ na-eme ka a kpọwa ndị na-efe Chineke aha ọjọọ. (1 Tesa. 4:​3-8) Anyị kwesịrị izere ndị na-akpa àgwà ọjọọ ma ghara ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị na Nna anyị nke eluigwe ghara ịdị ná mma.

17. Olee ụdị echiche anyị kwesịrị izere? N’ihi gịnịkwa?

17 Tụkwasị Jehova obi kama ịtụkwasị akụnụba obi. Jehova kwere nkwa inye anyị nri, uwe, na ebe obibi ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze ya ma na-eme ezi omume. (Ọma 55:22; Mat. 6:33) Ọ bụrụ na anyị eburu nke a n’uche, anyị agaghị na-eche na ego na akụnụba ga-echebe anyị ma mee ka anyị na-enwe obi ụtọ. Anyị ma na naanị ihe ga-eme ka obi ruo anyị ala bụ ime uche Jehova. (Fil. 4:​6, 7) Ọ bụrụgodị na anyị nwere ego anyị ga-eji azụ ọtụtụ ihe, anyị kwesịrị iche echiche nke ọma mara ma ànyị nwere ike ma ọ bụ oge anyị ga-eji na-elekọta ihe ndị ahụ. Ihe ka anyị mkpa ọ̀ bụ akụnụba anyị nwere? Anyị kwesịrị icheta na Jehova nyere anyị ọrụ anyị ga na-arụ n’ezinụlọ ya. Ihe ọ pụtara bụ na anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla megharịa anyị anya. Anyị achọghị ịdị ka nwoke ahụ kwere ka ohere ọma o nwere ijere Jehova ozi nakwa ịbụ onye Chineke weere ka nwa ya kwaa ya n’ihi na ihe ka ya mkpa bụ akụnụba.​—Mak 10:​17-22.

NGỌZI ỤMỤ CHINEKE GA-ENWETA RUO MGBE EBIGHỊ EBI

18. Olee ihe ọma na ngọzi kachanụ ụmụ mmadụ rubeere Chineke isi ga-enweta ruo mgbe ebighị ebi?

18 Ụmụ mmadụ rubeere Chineke isi ga-enweta ihe ọma kacha ihe ọma niile, ya bụ, ohere magburu onwe ya ife Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ga-enweta obi ụtọ n’ilekọta ụwa anyị a mara ezigbo mma Jehova kere ka ọ bụrụ ebe obibi ha. N’oge na-adịghị anya, a ga-eme ka ụwa a na ihe niile dị ndụ na ya dị ọhụrụ mgbe Alaeze Chineke ga-achị ụwa. Jizọs ga-ewepụ ihe ọjọọ niile nnupụisi Adam na Iv kpatara. Jehova ga-akpọlite ọtụtụ nde mmadụ n’ọnwụ ma nye ha ohere ịdị ndụ ebighị ebi, ahụ́ agbasiekwa ha ike n’ụwa e mere ka ọ ghọọ paradaịs. (Luk 23:​42, 43) Ka a na-eme ka ezinụlọ Chineke dị n’ụwa zuo oké, onye ọ bụla n’ime ha ga-enweta “ebube na ùgwù” ahụ Devid dere banyere ya.​—Ọma 8:5.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi?

19 Ọ bụrụ na i so “n’oké ìgwè mmadụ,” i nwere olileanya magburu onwe ya. Chineke hụrụ gị n’anya. Ọ chọrọ ka i soro n’ezinụlọ ya. N’ihi ya, mee ihe niile i nwere ike ime iji mee ya obi ụtọ. Ka nkwa Chineke kwere gị dịgide n’obi gị nakwa n’uche gị ụbọchị niile. Jiri ihe ọma Nna anyị nke eluigwe meere gị kpọrọ ihe. Jirikwa olileanya i nwere ito ya ruo mgbe ebighị ebi kpọrọ ihe.

ABỤ NKE 107 Ṅomie Ịhụnanya Chineke

^ par. 5 Ka ihe nwee ike ịna-aga nke ọma n’ezinụlọ, onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ kwesịrị ịma ọrụ ya, na-enyekwara ibe ya aka. Nna kwesịrị iji ịhụnanya na-edu ezinụlọ ya, nwunye ya ana-enyere ya aka, ụmụ ha ana-erubekwara ha isi. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ezinụlọ Jehova. O nwere ihe ndị Jehova chọrọ ka anyị na-eme. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị ahụ, anyị ga-abụ ndị ezinụlọ ya ruo mgbe ebighị ebi.

^ par. 55 NKỌWA FOTO: Chineke kere anyị otú anyị nwere ike ịna-akpa àgwà ka ya. Ihe a mere ka otu di na nwunye hụ ibe ha n’anya ma na-enwere ibe ha ọmịiko, na-emekwara ụmụ ha otu ihe ahụ. Di na nwunye a hụrụ Jehova n’anya. Ha gosiri na ha ji onyinye Chineke nyere ha ịmụ ụmụ kpọrọ ihe. O mere ka ha na-azụ ụmụ ha ka ha hụ Jehova n’anya ma na-efe ya. Ha jikwa vidio na-akọwara ụmụ ha ihe mere Jehova ji jiri Jizọs gbapụta anyị. Ha na-akụzikwara ha na n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ, anyị ga na-elekọta ụwa na ụmụ anụmanụ ruo mgbe ebighị ebi.