Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 33

Ka Obi Na-atọ Gị Ụtọ n’Ihe Ndị I Nwere Ike Imere Jehova

Ka Obi Na-atọ Gị Ụtọ n’Ihe Ndị I Nwere Ike Imere Jehova

“Ọ ka mma na mmadụ ji ihe ndị ọ na-ahụ anya na-eme onwe ya obi ụtọ kama ịchọgharịwa ihe na-agụ ya agụụ ọ na-enweghị ike inweta.”​—EKLI. 6:9.

ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe ụfọdụ ndị na-eme n’ihi na ha chọrọ ijekwuru Jehova ozi?

 E NWERE ọtụtụ ọrụ ndị anyị ga-arụ ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso. (Mat. 24:14; Luk 10:2; 1 Pita 5:2) Anyị niile chọrọ iji ike anyị niile jeere Jehova ozi. Ọtụtụ n’ime anyị na-ewepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma. Ụfọdụ ndị chọrọ ịbụ ndị ọsụ ụzọ, ndị ọzọ chọkwara ije ozi na Betel ma ọ bụ na-eso arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. Ọtụtụ ụmụnna nwoke na-agbalịkwa ka ha ruo eru ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye. (1 Tim. 3:​1, 8) Obi na-atọgbu Jehova atọgbu ma ọ hụ ka ndị ya na-achọ iwepụta onwe ha ijere ya ozi.​—Ọma 110:3; Aịza. 6:8.

2. Olee otú obi nwere ike ịdị anyị ma ọ bụrụ na anyị enwelighị ike ime ihe ụfọdụ anyị chọrọ ime n’ozi Jehova?

2 Ọ bụrụ na oge ụfọdụ agafee ma anyị emelighị ihe anyị chọrọ ime n’ozi Jehova ma ọ bụkwanụ nká ma ọ bụ ihe ndị ọzọ emee ka anyị ghara ime ihe ndị anyị chọrọ ime n’ozi Jehova, o nwere ike ime ka anyị daa mbà. (Ilu 13:12) Ọ bụ ihe a mere Melissa. * Ọ chọrọ ije ozi na Betel ma ọ bụ gaa Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ma ọ sịrị: “Agafeela m afọ ole a na-adị aga ya. Mgbe ụfọdụ, obi na-ada m mbà.”

3. Olee ihe ụfọdụ ndị nwere ike ime ka ha nwee ike iru eru ịrụ ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ?

3 O nwere ike ịdị mkpa ka ụfọdụ ndị na-eto eto ahụ́ gbasiri ike mụta ịkpa àgwà ụfọdụ tupu a họpụta ha ịrụ ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ. Ụbụrụ nwere ike ịna-aghọ ha nkọ, ha amara ihe ha kwesịrị ime, chọọkwa ime ya. Ma, o nwere ike ịdị mkpa ka ha mụta ịna-enwe ndidi, ịna-elerukwu anya ala, na ịna-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ọ bụrụ na i lekwasị anya n’àgwà ndị i kwesịrị ịmụta, e nwere ike ịhọpụta gị mgbe ị na-atụghị anya ya. Chegodị ihe mere Nick. Mgbe ọ dị afọ iri abụọ, ọ dara mbà n’obi n’ihi na a họpụtaghị ya ịbụ ohu na-eje ozi. Ọ sịrị: “M chere na o nwere ihe m na-anaghị emeta.” Ma, Nick adaghị mbà. O ji ike ya niile na-arụ ọrụ n’ọgbakọ, na-ekwusakwa ozi ọma. Taa, o sozi na Kọmitii Alaka.

4. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

4 Obi ọ̀ na-ada gị mbà na i nweghị ike imeli ihe ụfọdụ ị chọrọ ime n’ozi Jehova? Ọ bụrụ otú ahụ, kọsara ya Jehova. (Ọma 37:​5-7) Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ ịgwa nwanna ma nke a na-akọ n’ọgbakọ ka ọ tụọrọ gị aro ihe i nwere ike ime iji na-emekwu nke ọma n’ozi Jehova. Gbaakwa mbọ ka i mee ihe ọ gwara gị. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, i nwere ike inweta ihe ahụ ị na-atụ anya ya. O nwere ike ị gaghị emeli ihe ị chọrọ ime n’ozi Jehova ugbu a otú ahụ ọ dị Melissa anyị kwuburu gbasara ya. Gịnị ka ị ga-eme ma ihe dị otú a? Gịnị ka ị ga-eme ka ị na-enwe ọṅụ? Iji zaa ajụjụ a, n’isiokwu a, anyị ga-eleba anya na (1) ihe nwere ike ime ka ị na-enwe ọṅụ, (2) otú ị ga-esi na-enwekwu ọṅụ, nakwa (3) ihe ndị i nwere ike ikpebi ime ga-eme ka ị na-enwekwu ọṅụ.

IHE NWERE IKE IME KA Ị NA-ENWE ỌṄỤ

5. Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ọṅụ, olee ihe anyị kwesịrị ilekwasị anya na ya? (Ekliziastis 6:9)

5 Ekliziastis 6:9 kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịna-enwe ọnụ. (Gụọ ya.) Onye obi na-adị ụtọ n’ihe “ọ na-ahụ anya” na-enwe obi ụtọ n’ihe ndị o nwere, dị ka otú ihe si dịrị ya ugbu a. Ma, onye na-achọgharị ihe na-agụ ya agụụ ọ na-agaghị enwetali agaghị enwe obi ụtọ. Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ọṅụ, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ihe ndị anyị nwere ugbu a nakwa n’ịchọ ime ihe ndị anyị nwere ike ime.

6. Olee ihe atụ anyị ga-atụle, oleekwa ihe anyị ga-elekwasị anya na ya?

6 Ò kwere omume mmadụ inwe obi ụtọ n’ihe ndị o nwere ike imeli ugbu a? Ọtụtụ ndị chere na ọ gaghị ekwe omume n’ihi na kwa ụbọchị ndị mmadụ na-achọ ime ihe ndị ha na-emetụbeghị. Ma, ọ ga-ekweli omume. Anyị ga-enweli obi ụtọ n’ihe anyị nwere ugbu a. Ma, olee otú anyị ga-esi eme ya? Iji chọpụta, ka anyị tụlee ihe atụ Jizọs mere gbasara talent na Matiu 25:​14-30. Anyị ga-elekwasị anya n’ihe ọ ga-akụziri anyị gbasara otú anyị ga-esi enweta ọṅụ ma na-enwekwu ọṅụ n’ihe ndị anyị nwere ike ime ugbu a.

IHE Ị GA-EME KA Ị NA-ENWEKWU ỌṄỤ

7. Kọwaa ná nkenke ihe atụ ahụ Jizọs mere gbasara talent.

7 N’ihe atụ ahụ, otu nwoke chọrọ ime njem. Tupu ya agawa, ọ kpọrọ ndị ohu ya ma nye onye nke ọ bụla talent ọ ga-eji zụọ ahịa. * Nwoke ahụ ma ihe ohu ya nke ọ bụla ga-emeli. N’ihi ya, o nyere onye nke mbụ talent ise, nye onye nke ọzọ talent abụọ, nyekwa onye nke atọ otu talent. Ohu ya nke mbụ na nke abụọ rụsiri ọrụ ike inwetara nna ha ukwu uru. Ma, ohu nke atọ ejighị ego nna ya ukwu nyere ya mee ihe ọ bụla. N’ihi ya, nna ya ukwu chụrụ ya n’ọrụ.

8. Gịnị mere obi ji tọọ ohu nke mbụ ahụ ụtọ?

8 Obi tọgburu ohu nke mbụ ahụ atọgbu na nna ya ukwu nyere ya talent ise. Ihe a abụghị obere ego. O gosikwara na nna ya ukwu tụkwasịrị ya obi. Oleekwanụ maka ohu nke abụọ? Obi gaara ada ya mbà n’ihi na ego e nyere ya erughị ka nke ohu nke mbụ. Ma, gịnị ka o mere?

Olee ihe ndị ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’aka ohu nke abụọ e kwuru okwu ya n’ihe atụ Jizọs? (1) Nna ya ukwu nyere ya talent abụọ. (2) Ọ rụsiri ọrụ ike nwetakwuoro nna ya ukwu uru. (3) O nwetara talent abụọ ọzọ n’uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 ruo na nke 11)

9. Gịnị ka Jizọs na-ekwughị gbasara ohu nke abụọ ahụ? (Mat. 25:​22, 23)

9 Gụọ Matiu 25:​22, 23. Jizọs ekwughị na ohu nke abụọ ahụ were iwe n’ihi na ihe e nyere ya bụ naanị talent abụọ. Jizọs ekwukwaghị na ọ nọ na-ajụ, sị, ‘Ọ̀ bụ naanị ihe a ka e nyere m? M ga-emeli ihe ohu ahụ e nyere talent ise ga-emeli. Ọ bụrụ na nna m ukwu ejighị ọrụ m na-arụrụ ya kpọrọ ihe, m ga-aga lie talent abụọ a n’ala mewe ihe masịrị m.’

10. Gịnị ka ohu nke abụọ ahụ ji talent e nyere ya mee?

10 Ohu nke abụọ mekwara ka ohu nke mbụ. Ọ ma na ọrụ ahụ nna ya ukwu nyere ya dị mkpa. O jikwa ya kpọrọ ihe. O ritekwuru talent abụọ ọzọ n’uru. Nna ya ukwu kwụrụ ya ụgwọ maka ịrụsi ọrụ ike. Ọ bụghị naanị na obi dị nna ya ukwu ụtọ maka ihe o mere, kama, ọ jara ya mma ma nyekwuo ya ọrụ.

11. Gịnị ka ị ga-eme ka ị na-enwekwu ọṅụ?

11 Anyịnwa nwekwara ike inwekwu ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị ana-arụsi ọrụ ike n’ọrụ ọ bụla e nyere anyị n’ọgbakọ Jehova. Jiri ‘oge gị niile’ na-ekwusa ozi ọma, na-arụsikwa ọrụ ike n’ọgbakọ. (Ọrụ 18:5; Hib. 10:​24, 25) Kwadebe nke ọma tupu gị agawa ọmụmụ ihe ka i nwee ike ịza ajụjụ ga-agba ụmụnna ume. E nye gị ihe omume nwa akwụkwọ, jiri ya kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na a gwa gị ka i nye aka rụọ ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ, bịa n’oge, gbaakwa mbọ hụ na ị rụrụ ya. Elekwala ọrụ ọ bụla e nyere gị anya ka ihe ị na-ekwesịghị iwepụtara oge rụọ. Na-agbalị ịmụtakwu ọrụ ị na-arụ nke ọma. (Ilu 22:29) Ọ bụrụ na ị na-agbalị na-arụsi ọrụ ọ bụla e nyere gị n’ọgbakọ ike, ọ ga-eme ka i nwee ọganihu ma nwee ezigbo ọṅụ. (Gal. 6:4) Ọ ga-adịkwara gị mfe inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na e nye ndị ọzọ ọrụ ị gaara achọ ịrụ.​—Rom 12:15; Gal. 5:26.

12. Gịnị ka ụmụnna abụọ mere iji hụ na ha na-enwekwu ọṅụ n’ozi ha?

12 Ì chetara Melissa, nwanna nwaanyị ahụ chọrọ ịga Betel ma ọ bụ Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze? N’agbanyeghị na ọ galighị nke ọ bụla n’ime ha, ọ sịrị: “M na-eme ike m niile n’ọrụ ọsụ ụzọ m na-arụ, na-esikwa n’ụzọ dị iche iche ekwusa ozi ọma. Ihe a emeela ka m nwee ezigbo ọṅụ.” Gịnịkwanụ ka Nick mere mgbe a na-ahọpụtaghị ya ịbụ ohu na-eje ozi mgbe ọ tụrụ anya ya? Ọ sịrị: “M lekwasịrị anya n’ihe ndị m nwere ike imeli, ya bụ, ịga ozi ọma na ịza ajụjụ ndị na-agba ume n’ọmụmụ ihe. M tinyekwara akwụkwọ ịga Betel. A kpọkwara m ka m bịa n’afọ na-esonụ.”

13. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị etinyekwuo uche anyị n’ihe anyị nwere ike ime ugbu a? (Ekliziastis 2:24)

13 Ọ bụrụ na i tinyekwuo uche gị n’ọrụ ị na-arụ ugbu a, ị̀ ga-enweta ihe ndị ị na-atụ anya ha n’ọdịnihu? O nwere ike, otú ahụ o meere Nick. Ma, ọ bụrụkwanụ na i nwetaghị ya, otú ahụ Melissa na-enwetaghị? Ị ka ga na-enwekwu ọṅụ. Obi ga-adịkwa gị ụtọ na ị na-eme ihe niile i nwere ike ime n’ozi Jehova. (Gụọ Ekliziastis 2:24.) Ihe ọzọkwa bụ na ị ga-enwe ezigbo ọṅụ n’ihi na ị ma na mbọ ị na-agba na-eme Nna anyị ukwu bụ́ Jizọs obi ụtọ.

IHE NDỊ GA-EME KA ANYỊ NWEKWUO ỌṄỤ

14. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe ọ bụla anyị chọrọ ime ihe iji jekwuoro Jehova ozi?

14 Ilekwasị anya n’ihe ndị anyị nwere ike ime ugbu a, ọ̀ pụtara na anyị ekwesịghị ịchọ ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi jekwuoro Jehova ozi? Azịza ya bụ mba. Anyị nwere ike ime ya. Anyị kwesịkwara ịna-achọ ihe ndị anyị ga-eme n’ozi Jehova n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma n’ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe nakwa inyere ụmụnna anyị aka. Ihe ga-eme ka ihe gaziere anyị bụ ịmara ebe ike anyị ruru na ilekwasị anya n’ijere ụmụnna anyị ozi kama ịchọ ihe ga-abara naanị onwe anyị uru.​—Ilu 11:2; Ọrụ 20:35.

15. Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ime ka ị na-enwekwu ọṅụ?

15 Olee ihe ndị anyị nwere ike ịgba mbọ ka anyị mee? Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịmata ihe ndị ị ga-emeli. (Ilu 16:3; Jems 1:5) Ì nwere ike ịgba mbọ mee ihe ndị e kwuru na  paragraf nke mbụ n’isiokwu a, ya bụ, ịsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ nke inyeaka, ije ozi na Betel ma ọ bụkwanụ iso na-arụ ụlọ ná nzukọ Jehova? Ma ọ bụkwanụ, otú ihe si dịrị gị ọ̀ ga-ekwe gị mụọ asụsụ ọzọ ka i nwee ike gaa obodo ọzọ zie ozi ọma? I nwere ike ịmata ihe ndị ọ dị mkpa ka i mee ma ị gụọ isi nke iri n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova nakwa ma ị gaa ka gị na ndị okenye ọgbakọ unu kwurịta ya. * Ka ị na-agba mbọ ime ihe ndị a, ọganihu gị ga-apụta ìhè, ị ga na-enwekwu ọṅụ.

16. Gịnị ka ị ga-eme ma e nwee ihe ị chọrọ ime ị na-agaghị emeli?

16 Ọ bụrụkwanụ na ị gaghị emeli nke ọ bụla n’ime ihe ndị anyị kwuru okwu ha na paragraf bu nke a ụzọ, ihe ị ga-eme bụ ịchọ ihe ọzọ ị ga-emeli. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ime n’ozi Jehova? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17) *

17. Dị ka e kwuru na 1 Timoti 4:​13, 15, olee otú nwanna nwoke nwere ike isi gbaa mbọ ka ọ bụrụ ezigbo onye nkụzi?

17 Gụọ 1 Timoti 4:​13, 15. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke mere baptizim, i nwere ike ịgba mbọ ka otú i si ekwu okwu na otú i si akụzi ihe kakwuo mma. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na ‘obi gị niile’ adịrị n’ịgụ ihe, n’ikwu okwu, na n’ịkụzi ihe, ọ ga-abara ndị na-ege gị ntị uru. Gbaa mbọ ka ị gụọ ma mee ihe ndị e kwuru na broshọ bụ́ Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe. Mụọ otu n’ime ha n’otu oge. Gbaa mbọ ka i mee ya n’onwe gị n’ụlọ. Gbaakwa mbọ ka i mee ihe e kwuru ebe ahụ n’oge ọzọ ị ga-ekwu okwu n’ọmụmụ ihe. Gakwuru onye na-enye ndụmọdụ ma ọ bụkwanụ okenye ọzọ “na-agbasi mbọ ike n’ikwu okwu na n’ịkụzi ihe.” * (1 Tim. 5:17) Ihe ị ga-eme abụghị naanị ịmata otú e si akụzi ihe, kama, otú e si enyere ndị na-ege ntị aka ka okwukwe ha sikwuo ike, nakwa otú ị ga-esi eme ka ndị na-ege gị ntị mee ihe ị na-ekwu. I mee otú ahụ, ma gị ma hanwa ga-enwekwu ọṅụ.

Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ime n’ozi Jehova? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18) *

18. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ime ihe ndị anyị chọrọ ime n’ozi ọma?

18 E nyere anyị niile ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:​19, 20; Rom 10:14) Ị̀ ga-achọ ịna-emekwu nke ọma n’ọrụ a kacha mkpa? Ị gụọ broshọ Izi Ihe, gbalịa ka e nwee ihe ndị ị mụtara na ya ị ga-achọ ime. Gbaakwa mbọ na-eme ha. I nwere ike ịhụ ihe ndị ọzọ ga-enyere gị aka n’akwụkwọ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ nakwa na vidio mkparịta ụka a na-egosi n’ọmụmụ ihe etiti izu. Gbalịa si n’ụzọ dị iche iche mee ya ka ị mata nke ga-akara gị mma. Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, ị ga-enwe ọṅụ na-enweghị atụ n’ihi na ị ghọọla aka ochie n’ozi ọma.​—2 Tim. 4:5.

Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ime n’ozi Jehova? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19) *

19. Olee otú i nwere ike isi mụta àgwà ndị ga-eme Chineke obi ụtọ?

19 I kwesịghị ichefu na otu n’ime ihe ndị kacha mma ị ga-agba mbọ mee bụ ịmụta àgwà ndị ga-eme Jehova obi ụtọ. (Gal. 5:​22, 23; Kọl. 3:12; 2 Pita 1:​5-8) Olee otú ị ga-esi eme ha? Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị chọrọ ka okwukwe gị sikwuo ike, ihe i nwere ike ime bụ ịgụ isiokwu dị iche iche dị n’akwụkwọ anyị kwuru ihe ụfọdụ mmadụ nwere ike ime ka okwukwe ya sikwuo ike. Ile Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova ndị kwuru otú ụmụnna anyị si gosi na ha nwere okwukwe n’oge ọnwụnwa bịaara ha ga-enyekwara gị aka. Gbalịakwa ka ị chọpụta ụzọ ndị i nwere ike isi mee ka ha ná ndụ gị.

20. Olee otú anyị nwere ike isi nwetakwuo ọṅụ ma belata ịda mbà?

20 O doro anya na onye ọ bụla n’ime anyị ga-achọ ime karịa otú ọ na-eme n’ofufe Jehova ugbu a. N’ụwa ọhụrụ, anyị ga-enwe ohere ife Jehova otú ọ bụla anyị si chọọ. Ma ka ọ dịgodị, anyị nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị emee ike anyị niile n’ihe ndị anyị nwere ike ime ugbu a. Anyị agaghịkwa na-adakarị mbà. Nke ka mkpa bụ na anyị ga-eme ka e too Jehova bụ́ “Chineke, onye obi ụtọ.” (1 Tim. 1:11) N’ihi ya, ka anyị na-enweta ọṅụ n’ọrụ ọ bụla anyị nwere ike ịrụ ugbu a.

ABỤ NKE 82 “Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu”

^ par. 5 Anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu, chọọkwa ime ihe niile anyị nwere ike ime n’ozi ya. Ihe a nwere ike ime ka anyị chọọ ijekwuru Jehova ozi ma ọ bụkwanụ ruo eru ịrụ ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ. Ọ bụrụkwanụ na anyị agbalịa ike anyị niile ma anyị emelighị ihe ụfọdụ anyị chọrọ ime? Olee otú anyị ga-esi nọgide na-arụ ọrụ Jehova ma ka na-enwe obi ụtọ? Ihe atụ Jizọs mere gbasara talent ga-enyere anyị aka ịmata azịza ya.

^ par. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 7 NKỌWAKWU: Otu talent bụ ego ole a na-akwụ mmadụ ma ọ rụọ ọrụ afọ iri abụọ.

^ par. 15 A na-agba ụmụnna nwoke ume ka ha gbaa mbọ ruo eru ịbụ ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma ihe mmadụ ga-eme ka o ruo eru, gụọ isi nke ise na isi nke isii n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova.

^ par. 17 NKỌWAKWU: Onye na-enye ndụmọdụ bụ okenye a họpụtara ka ọ na-enye ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ndụmọdụ ma ha mechaa ihe omume n’ọmụmụ ihe.

^ par. 64 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-eme nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ka o nwee ike ịbụ ezigbo onye nkụzi ọ chọrọ ịbụ.

^ par. 66 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-enye onye na-ere ahịa kaadị jw.org mgbe o kpebichara ịna-ezi ozi ọma mgbe ọ na-anọghị n’ozi.

^ par. 68 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị nyere nwanna ọzọ onyinye n’ihi na ọ chọrọ ịna-akpakwu àgwà na-eme Jehova obi ụtọ.