Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 32

Mee Ka Okwukwe Gị Sie Ike na E Nwere Onye Kere Ihe Niile

Mee Ka Okwukwe Gị Sie Ike na E Nwere Onye Kere Ihe Niile

“Okwukwe bụ . . . ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-anaghị ahụ anya dị adị n’eziokwu.”​—HIB. 11:1.

ABỤ NKE 11 Ihe Chineke Kere Na-eto Ya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe a kụziiri gị gbasara Onye Okike?

Ọ BỤRỤ na nne gị na nna gị bụ Ndịàmà Jehova, o nwere ike ịbụ na ị mụtara gbasara Jehova mgbe ị ka dị obere. Ha kụziiri gị na ọ bụ ya kere ihe niile, na o nwere àgwà ndị magburu onwe ha, nakwa na ọ chọrọ ime ka ụwa a ghọọ paradaịs.​—Jen. 1:1; Ọrụ 17:​24-27.

2. Olee otú ụfọdụ ndị si ele ndị kweere na Chineke anya?

2 Ma, ọtụtụ ndị ekwetaghị na Chineke dị, ma ya fọdụzie na ọ bụ ya kere ihe niile. Kama, ha kwetara na obere ihe ndị dị ndụ nọkatara dịrị, jirizie nwayọọ nwayọọ ghọọ nnukwu ihe ndị ọzọ dị ndụ. Ụfọdụ ndị kweere ihe a gụkwara ezigbo akwụkwọ. Ha nwere ike ịna-ekwu na ihe sayensị kwuru na-egosi na ihe Baịbụl na-akụzi abụghị eziokwu, nakwa na ndị kweere na e nwere Onye kere ihe niile bụ ndị na-agụghị akwụkwọ, ndị na-amaghị ihe, ma ọ bụ ndị e nwere ike ịghọgbu ngwa ngwa.

3. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mee ka okwukwe anyị sikwuo ike?

3 Ihe a ndị gụrụ oké akwụkwọ na-ekwu ọ̀ ga-eme ka anyị nwewe obi abụọ ma ọ̀ bụ Jehova kere ihe niile? Ihe ga-ekpebi ihe a bụ ihe mere anyị ji kwere na Chineke. Ihe mere anyị ji kwere ọ̀ bụ na ọ bụ ihe a gwara anyị ka ọ̀ bụ na anyị wepụtara oge mụọ gbasara ihe ndị gosiri na ọ bụ ya kere ihe niile? (1 Kọr. 3:​12-15) N’agbanyeghị afọ ole anyị bụrụla Ndịàmà Jehova, anyị kwesịrị ịna-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, anyị agaghị ekwe ka e jiri “amamihe ụwa na ihe ndị na-abụghị eziokwu” gbasara Baịbụl ghọgbuo anyị. (Kọl. 2:8; Hib. 11:6) Iji nyere anyị aka, n’isiokwu a, anyị ga-eleba anya na (1) ihe mere ọtụtụ ndị ekwetaghị na e nwere Onye kere ihe niile, (2) otú anyị ga-esi nwee okwukwe na Jehova Onye kere anyị, nakwa (3) otú anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike.

IHE MERE ỌTỤTỤ NDỊ EKWEGHỊ NA E NWERE ONYE KERE IHE NIILE

4. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 11:​1, gịnị na-eme ka mmadụ nwee ezigbo okwukwe?

4 Ụfọdụ ndị chere na inwe okwukwe bụ ikwere n’ihe n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya. Ma, ihe Baịbụl kwuru gosiri na nke ahụ abụghị ezigbo okwukwe. (Gụọ Ndị Hibru 11:1.) Baịbụl gosiri na ihe na-eme ka mmadụ nwee okwukwe bụ ihe àmà doro anya. N’ihi ya, n’agbanyeghị na anyị anaghị ahụ Jehova, Jizọs, ma ọ bụkwanụ Alaeze, e nwere ezigbo ihe na-egosi na ha dị. (Hib. 11:3) Otu ọkà mmụta bụ́ Onyeàmà Jehova kwuru, sị: “Ndịàmà Jehova nwere ezigbo ihe mere ha ji kwere ihe ndị ha kweere. Ha anaghị eleghara ihe sayensị kwuru anya.”

5. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji kweta na e nweghị Onye kere ihe niile?

5 Anyị nwere ike ịna-ajụ, sị, ‘Ọ bụrụ na e nwere ezigbo ihe gosiri na e nwere Onye Okike, gịnị mere ọtụtụ ndị ekwetaghị na ọ bụ Chineke kere ihe ndị dị ndụ?’ Ụfọdụ n’ime ha agbalịbeghị ịmụ banyere ihe ndị a n’onwe ha. Otu nwoke aha ya bụ Robert bụ́ Onyeàmà Jehova ugbu a kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na a kụzirighị anyị na e nwere Onye kere ihe niile n’ụlọ akwụkwọ, m weere ya na e nweghị Onye kere ihe niile. Mgbe m matara na e nwere Onye kere ihe niile bụ mgbe m gaferela afọ iri abụọ, mgbe Ndịàmà Jehova si na Baịbụl kụziere m ihe ndị gosiri na e nwere Onye kere ihe niile.” *​—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ozi Dị Mkpa Maka Ndị Nne na Nna.”

6. Gịnị mere na ụfọdụ ndị ekwetaghị na e nwere Onye Okike?

6 Ụfọdụ ndị ekwetaghị na e nwere Onye Okike n’ihi na ha na-ekwu na naanị ihe ha na-ekweta na ya bụ ihe ha na-ahụ anya. Ma, e nwere ihe ndị ha na-anaghị ahụ anya ha kwetara na ya, dị ka ikuku. Ihe ga-eme ka anyị nwee ụdị okwukwe e kwuru okwu ya na Baịbụl bụ ihe àmà doro anya na “ihe ndị a na-anaghị ahụ anya dị adị n’eziokwu.” (Hib. 11:1) Ịmụ gbasara ihe àmà ndị a ga-ewe anyị oge, chọọkwa ka anyị gbasie mbọ ike. Ma, ọtụtụ ndị achọghị ịgba ụdị mbọ a. Onye na-amụghị banyere ihe àmà ndị a n’onwe ya nwere ike ikwere na Chineke adịghị.

7. Ọ̀ bụ mmadụ niile gụrụ oké akwụkwọ kwetara na e nweghị Onye kere ihe niile? Kọwaa.

7 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị kwetara na Chineke kere ihe niile mgbe ha mụrụ ihe ndị gosiri na Chineke dị. * Ụfọdụ nwere ike iche na e nweghị Onye kere ihe niile n’ihi na a naghị akụziri ha ya na mahadum, otú ahụ ọ dị Robert anyị kwuburu okwu ya. Ma, ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị amụtala gbasara Jehova, hụkwa ya n’anya. Anyị niile kwesịrị ime ka okwukwe anyị sie ike na Chineke otú ahụ ndị ọkà mmụta sayensị ndị a mere, n’agbanyeghị ma ànyị gụrụ oké akwụkwọ ma ọ bụ na anyị agụghị. E nweghị onye ọzọ ga-emere anyị ya.

OTÚ ANYỊ GA-ESI MEE KA OKWUKWE ANYỊ SIKWUO IKE NA E NWERE ONYE KERE IHE NIILE

8-9. (a) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle ugbu a? (b) Olee otú ịmụ gbasara ihe ndị e kere eke ga-esi baara gị uru?

8 Olee otú i nwere ike isi mee ka okwukwe gị sikwuo ike na e nwere Onye Okike. Ka anyị lee ụzọ anọ anyị ga-esi eme ya.

9 Mụọ gbasara ihe ndị e kere eke. Ọ bụrụ na ị na-ele ụmụ anụmanụ, osisi, na kpakpando, o nwere ike ime ka okwukwe gị sikwuo ike na e nwere Onye kere ha. (Ọma 19:1; Aịza. 40:26) Ka ị na-amụkwu gbasara ihe ndị a ka obi na-esikwu gị ike na ọ bụ Jehova kere ha. Ọtụtụ mgbe, a na-enwe isiokwu ndị na-akọwakwuru anyị gbasara ihe ndị Chineke kere. Ahapụla ịgụ ha ọ bụrụgodị na ọ na-esiri gị ike nghọta. Mụọ gbasara ha otú ọ bụla i nwere ike. Gaakwa na jw.org ka ị hụ ọmarịcha vidio dị iche iche gbasara ihe ndị e kere eke anyị lere ná mgbakọ ukwu ndị anyị nwere n’oge ndị na-adịbeghị anya.

10. Mee ihe atụ gosiri na e nwere Onye kere ihe niile. (Ndị Rom 1:20)

10 Ị na-amụ gbasara ihe ndị Chineke kere, chọpụta ihe ndị ha nwere ike ịkụziri gị gbasara Onye kere anyị. (Gụọ Ndị Rom 1:20.) Dị ka ihe atụ, anyanwụ na-eme ka okpomọkụ dịrị, anyị ana-ahụkwa ụzọ. Ma, ihe ụfọdụ na-esi n’anyanwụ apụta nwere ike imerụ anyị ahụ́. E kwesịrị ichebe anyị ka ihe ndị ahụ ghara imerụ anyị ahụ́. E nwekwara ihe na-echebe anyị. Olee ihe ọ bụ? E nwere ihe dị n’ụwa anyị a na-egbochi ihe ndị ahụ na-esi n’anyanwụ apụta imerụ anyị ahụ́. Ọ bụrụ na ihe ndị ahụ nwere ike imerụ anyị ahụ́ akarịa, ihe ahụ na-egbochi ya na-ebukwu ibu. Ọ̀ bụ na ihe a emeghị ka i kweta na e nwere Onye kere ihe ndị a hụrụ anyị n’anya, nweekwa amamihe?

11. Olee ebe i nwere ike isi hụ ihe ndị ga-eme ka obi sie gị ike na e nwere Onye kere ihe niile? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ́ “ Ihe Ụfọdụ Ga-eme Ka Okwukwe Gị Sie Ike.”)

11 I nwere ike ịhụ ọtụtụ ihe ga-eme ka obi sie gị ike na e nwere Onye kere ihe niile ma i jiri Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ mee nchọnchọ nakwa ma i mee nchọnchọ na jw.org. I nwere ike iji vidio ma ọ bụ isiokwu ndị na-agba n’isiokwu bụ́ “È Kere Ya Eke?” malite. Ihe ndị e dere ebe ahụ dị nkenke, na-egosikwa ihe ụfọdụ dị ịtụnanya gbasara ụmụ anụmanụ na ihe ndị ọzọ e kere eke. Ha kwukwara gbasara otú ndị ọkà mmụta sayensị si agbalị isi n’ihe ndị e kere eke emepụta ihe ụfọdụ.

12. Ị na-amụ Baịbụl, olee ihe ụfọdụ i kwesịrị iche gbasara ha?

12 Na-amụ Baịbụl. Onye ọkà mmụta sayensị ahụ anyị kwuburu okwu ya ekwebughị na e nwere Onye kere ihe niile. Ma, ka oge na-aga, obi siri ya ike na e nwere Onye kere ihe niile. Ọ sịrị: “Ihe mere m ji kweta na e nwere Onye kere ihe niile abụghị naanị ihe m mụtara na sayensị. Ịmụ Baịbụl nke ọma nyekwaara m aka.” O nwere ike ịbụ na ị ma Baịbụl nke ọma ugbu a, ma i kwesịrị ịnọgide na-amụ Baịbụl ka okwukwe gị sie ike na e nwere Onye kere ihe niile. (Josh. 1:8; Ọma 119:97) Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara otú Baịbụl si kọọ ihe bụ́ eziokwu gbasara ihe mere ọtụtụ afọ gara aga. Cheekwa gbasara otú amụma ndị e buru na Baịbụl sirila mezuo na otú ihe ndị dere ya kwuru si daba n’ihe ibe ha kwuru. Ịmụ gbasara ihe ndị a niile ga-eme ka i kwetasie ike na e nwere Onye kere anyị ma ihe ma hụ anyị n’anya, nakwa na ọ bụ uche ya ka e dere na Baịbụl. *​—2 Tim. 3:14; 2 Pita 1:21.

13. Olee otu ihe atụ gosiri na ihe Baịbụl kwuru bara uru?

13 Ị na-amụ Okwu Chineke, chọpụta uru ihe ndị e dere na ya na-abara anyị. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ afọ gara aga, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị na ịhụ ego n’anya nwere ike ịkpatara anyị ọtụtụ nsogbu, meekwa ka ‘ahụ́ niile na-afụ mmadụ ụfụ.’ (1 Tim. 6:​9, 10; Ilu 28:20; Mat. 6:24) Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ ka bara uru taa? Akwụkwọ aha ya bụ The Narcissism Epidemic sịrị: “Ọtụtụ mgbe, ndị kweere na ego bụ ihe kacha mkpa ná ndụ anaghị enwe obi ụtọ, ha na-adakarịkwa mbà. Ndị nke chọkwara inwetakwu ego anaghị enwe obi ụtọ, ha na-arịakarịkwa ọrịa.” N’ihi ya, ndụmọdụ a Baịbụl nyere anyị ka anyị ghara ịhụ ego n’anya dị ezigbo mkpa. N’ihi ya, zere ịhụ ego n’anya. È nwere ndụmọdụ Baịbụl ọzọ baara gị uru? Ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara ezigbo ndụmọdụ juru na Baịbụl, anyị ga-ahụ na Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ihe ga-akacha abara anyị uru. Ihe ndị a ga-eme ka anyị na-atụkwasị ya obi mgbe niile. (Jems 1:5) Ọ ga-emekwa ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ.​—Aịza. 48:​17, 18.

14. Gịnị ka ịmụ Baịbụl ga-akụziri anyị banyere Jehova?

14 Ihe i kwesịrị ibu n’obi na-amụ Baịbụl bụ ka ị matakwuo Jehova nke ọma. (Jọn 17:3) Ka ị na-amụ Baịbụl, ị ga-amata ụdị onye Jehova bụ nakwa àgwà ndị o nwere. Àgwà ndị a bụ àgwà ndị ahụ ị mụtara mgbe ị na-amụ gbasara ihe ndị e kere eke. Àgwà ndị a ga-eme ka ị mata n’eziokwu na Jehova dị. (Ọpụ. 34:​6, 7; Ọma 145:​8, 9) Ka ị na-amụtakwu banyere Jehova nke ọma, okwukwe gị ga na-esikwu ike, gị ana-ahụkwu ya n’anya, gị na ya ana-adịkwukwa ná mma.

15. Olee uru ịgwa ndị ọzọ banyere Chineke ga-abara gị?

15 Na-agwa ndị ọzọ ihe ị mụtara banyere Chineke. Ka ị na-eme otú ahụ, okwukwe gị ga na-esikwu ike. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ị na-ezi ozi ọma ekwuo na o cheghị na Chineke dị, ya abụrụkwa na ị maghị ihe ị ga-aza ya? Gbalịa jiri akwụkwọ anyị chọpụta ihe Baịbụl zara gbasara ajụjụ ahụ. Gị na onye ahụ kwurịta ya. (1 Pita 3:15) I nwekwara ike ịgwa nwanna ọzọ ka o nyere gị aka. Ma onye ahụ ò kwetara ihe Baịbụl kwuru ma ọ bụ na o kwetaghị, nchọnchọ ndị ahụ i mere ga-abara gị uru, okwukwe gị ga-esikwukwa ike. Ọ ga-emekwa ka ị ghara ikweta na Chineke adịghị, otú ahụ ndị gụrụ oké akwụkwọ chọrọ ka i kweta.

NA-EME KA OKWUKWE GỊ NA-ESIKWU IKE

16. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị anaghị eme ka okwukwe anyị sie ike?

16 N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-eme ka okwukwe anyị na-esi ezigbo ike n’ebe ọ nọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, okwukwe anyị nwere ike ịnyụ ka ọkụ. Cheta na ihe mere ka anyị nwee okwukwe bụ ihe àmà ndị a na-anaghị ahụ anya. Ọ naghị ara ahụ́ mmadụ ichefu ihe ọ na-anaghị ahụ anya. Ọ bụ ya mere Pọl ji sị na enweghị okwukwe bụ “mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị.” (Hib. 12:1) Olee otú anyị nwere ike isi zere ọnyà a?​—2 Tesa. 1:3.

17. Olee ihe ga-enyere anyị aka ka okwukwe anyị nọgide na-esi ike?

17 Nke mbụ, rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya, na-emekwa otú ahụ mgbe niile. N’ihi gịnị? N’ihi na okwukwe so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:​22, 23) Okwukwe anyị nwere n’Onye kere ihe niile agaghị esi ike ma ọ bụrụ na mmụọ nsọ enyereghị anyị aka. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-arịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, ọ ga-enye anyị ya. (Luk 11:13) Anyị nwedịrị ike ịrịọ ya, sị: “Mee ka anyị nwekwuo okwukwe.”​—Luk 17:5.

18. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 1:​2, 3, olee onyinye dị oké ọnụ ahịa anyị nwere ugbu a?

18 Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịna-amụchi Okwu Chineke anya. (Gụọ Abụ Ọma 1:​2, 3.) Mgbe e dere abụ ọma a, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ụmụ Izrel nwere akwụkwọ e depụtara Iwu niile Chineke nyere ha. Ma, ndị eze na ndị nchụàjà nwere ike inweta ya. Afọ asaa ọ bụlakwa, a na-eme ndokwa ka “ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, ụmụntakịrị,” nakwa ndị mbịarambịa bi n’Izrel nụrụ Iwu Chineke. (Diut. 31:​10-12) N’oge Jizọs, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nwere Akwụkwọ Nsọ, a na-edosakwa ọtụtụ n’ime ha n’ụlọ nzukọ. Ma taa, ọtụtụ ndị nwere Baịbụl. Ihe a bụ nnọọ ezigbo onyinye Chineke nyere anyị. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ya?

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ka okwukwe anyị sie ike?

19 Anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka Okwu Chineke ma anyị na-agụchi ya anya. Anyị kwesịrị ịhazi oge anyị ga-eji na-agụ Baịbụl, ọ bụghị ịgụ ya mgbe ohere dapụtara. Ọ bụrụ na anyị agbalịa na-agụchi Baịbụl anya, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sie ike.

20. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

20 Anyị adịghị ka “ndị ma ihe na ndị ọkachamara” nọ n’ụwa a. Ihe mere anyị ji nwee okwukwe bụ ihe àmà ndị e dere n’Okwu Chineke. (Mat. 11:​25, 26) Baịbụl kọwaara anyị ihe mere ụwa ji jọọ njọ otú a nakwa ihe Jehova ga-eme maka ya. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịna-eme ka okwukwe anyị sie ike nakwa inyere ọtụtụ ndị aka inwe okwukwe n’Onye kere ihe niile. (1 Tim. 2:​3, 4) Ka anyị nọgidekwa na-atụ anya oge mmadụ niile nọ n’ụwa ga na-eto Jehova ma na-ekwu ihe e dere ná Mkpughe 4:11. Ọ sịrị: “Jehova Chineke anyị, . . . i ruru eru ka ndị niile too gị . . . n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile.”

ABỤ NKE 2 Jehova Bụ Aha Gị

^ par. 5 Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na ọ bụ Jehova Chineke kere ihe niile. Ma, ọtụtụ ndị ekwetaghị. Ha na-ekwu na ihe niile nọkatara dịrị. Ihe ha na-ekwu agaghị eme ka okwukwe anyị gharazie isi ike ma ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike mee ka okwukwe anyị sie ike na Chineke nakwa na Baịbụl. Isiokwu a ga-akọwara anyị otú anyị ga-esi eme ka okwukwe anyị sie ike.

^ par. 5 N’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ, a naghị akụzi na ọ bụ Chineke kere ihe niile. Ụfọdụ ndị nkụzi na-ekwu na ịkụziri ya ụmụaka bụ ịmanye ha ka ha kwere na Chineke.

^ par. 7 N’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ e dere ihe ụfọdụ ndị ọkà mmụta kweere na e nwere Onye kere ihe niile kwuru. Gaa n’isiokwu bụ́ “Sayensị na Nkà na Ụzụ,” chọọ n’isiokwu nta bụ́ “‘Ajụjụ Ọnụ’ (Isiokwu na-agbakarị na Teta!).”

^ par. 12 Dị ka ihe atụ, gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Jehova Buru n’Amụma Na-emezu.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche January 1, 2008.