Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 34

Olee Otú Ị Ga-esi ‘Detụ Jehova Ire ma Hụ na Ọ Dị Mma’?

Olee Otú Ị Ga-esi ‘Detụ Jehova Ire ma Hụ na Ọ Dị Mma’?

“Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma. Onye gbabara n’ime ya na-enwe obi ụtọ.”​—ỌMA 34:8.

ABỤ NKE 117 Ịdị Mma

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 34:​8, olee otú anyị ga-esi mụtakwuo gbasara ịdị mma Jehova?

KA E were ya na mmadụ nyere gị nri ị na-eritụbeghị mbụ ka i rie. I nwere ike ịmatatụ gbasara nri ahụ ma i lee ya anya, ị nụ ísì ya, ị mata ihe ndị e ji sie ya, ma ọ bụkwanụ ma ị jụọ ndị ọzọ ritụrụla ya otú ọ dị. Ma, otú ị ga-esi amata ma nri ahụ ọ ga-amasị gị bụ ma i rie ya n’onwe gị.

2 Anyị nwere ike ịmụta na Jehova dị mma ma anyị na-agụ Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, nakwa ma anyị na-anụ ka ndị ọzọ na-ekwu maka ihe ọma ndị Jehova meerela ha. Ma, otú anyị ga-esi aghọta otú Jehova dịruru ná mma bụ ma anyị ‘detụ’ ya ire n’onwe anyị. (Gụọ Abụ Ọma 34:8.) Ka anyị maa atụ otu ụzọ anyị ga-esi eme ya. Ka e were ya na anyị chọrọ ịbanye ozi oge niile, ma iji nwee ike ime ya, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị gbanwee ihe ụfọdụ ná ndụ anyị. O nwere ike ịbụ na anyị na-agụ nkwa Jizọs kwere anyị na ọ bụrụ na anyị ebute Alaeze Chineke ụzọ, Jehova ga-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa. Ma, ụdị ihe ahụ emebereghị anyị. (Mat. 6:33) N’agbanyeghị nke ahụ, ebe ọ bụ na anyị nwere okwukwe ná nkwa Jizọs kwere anyị, anyị na-agbalị na-ebelata aka n’ego anyị na-emefu, na-eselata aka n’oge anyị ji arụ ọrụ, na-ewepụtakwa oge buru ibu maka ozi ọma. Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị ga-ahụ na Jehova na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa n’eziokwu. Anyị ‘na-edetụ’ ịdị mma Jehova ire.

3. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 16:​1, 2, olee ndị Jehova na-emere ihe ọma?

3 Jehova na-emere “ihe niile o kere eke ihe ọma,” ma ndị na-anaghịdị efe ya. (Ọma 145:9; Mat. 5:45) Ma, ndị Jehova na-aka emere ihe ọma bụ ndị hụrụ ya n’anya nakwa ndị na-eme ike ha niile ife ya. (Gụọ Abụ Ọma 16:​1, 2.) Ka anyị kwuo gbasara ihe ọma ụfọdụ Jehova meerela anyị.

4. Olee otú Jehova si emere ndị ka na-amalite ịbịaru ya nso ihe ọma?

4 Mgbe ọ bụla anyị mere ihe anyị mụtara n’aka Jehova, anyị na-ahụ uru ọ na-abara anyị ná ndụ anyị. Mgbe anyị mụtara gbasara ya, o nyeere anyị aka anyị akwụsị ịkpa àgwà na iche echiche otú na-adịghị ya mma. (Kọl. 1:21) Mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị ma mee baptizim, o meere anyị ọtụtụ ihe ọma, dị ka ime ka anyị nwee akọnuche dị ọcha na anyị na ya ịdị n’ezigbo mma.​—1 Pita 3:21.

5. Olee otú anyị si ahụ ịdị mma Jehova n’ozi ọma anyị?

5 Anyị na-ahụ na Jehova dị mma ma anyị na-aga ozi ọma. Ị̀ bụ onye ihere? Ọtụtụ ndị Jehova taa bụ ndị ihere. O nwere ike ịbụ na tupu gị aghọọ Onyeàmà Jehova, i chetụghị n’echiche na ị ga-agali n’ụlọ onye ị na-amaghị, kụọ aka ma zie ya ozi ọma. Ma taa, ị na-eme otú ahụ mgbe niile. Ihe ọzọkwa bụ na Jehova enyerela gị aka mee ka ozi ọma na-atọ gị ụtọ. E nweela ọtụtụ ụzọ ị hụrụ Jehova si nyere gị aka. O meela ka obi na-eru gị ala ma mgbe a na-akpagbu gị n’ozi ọma. O nyerela gị aka icheta amaokwu Baịbụl dabara adaba ị ga-agụrụ onye nwere mmasị. O nyekwala gị ike ị ga-eji nọgide na-ezi ozi ọma n’agbanyeghị na e nwere ndị na-achọghị ige gị ntị.​—Jere. 20:​7-9.

6. Olee otú ọzụzụ ndị Jehova na-enye anyị si egosi ịdị mma ya?

6 Otú ọzọ Jehova si gosi anyị ịdị mma ya bụ ịzụ anyị maka ozi ọma. (Jọn 6:45) N’ọmụmụ ihe etiti izu anyị, anyị na-ele vidio ndị na-enyere anyị aka ịmụta otú e si ezi ozi ọma. A gbakwara anyị ume ka anyị na-esi otú ahụ na-ezi ozi ọma. Na mbụ, ụjọ nwere ike ịna-atụ anyị isi ụzọ ọhụrụ zie ozi ọma. Ma, ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị nwere ike ịchọpụta na ọ na-amasị ndị anyị na-ezi ozi ọma. N’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ ndị anyị na-aga, a na-agba anyị ume isi ụzọ ndị nwere ike ịdị iche n’ụzọ ndị anyị sibu ezi ozi ọma na-ezi ozi ọma. Ime ihe a nwere ike ghara ịdịchara anyị mfe. Ma ọ bụrụ na anyị emee ha, Jehova ga-agọzi anyị. Ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ Jehova ga-esi gọzie anyị ma anyị siri n’ụzọ ndị ọhụrụ na-eme ike anyị niile n’ozi ya n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị. Anyị ga-atụlekwa otú anyị nwere ike isi mezuo ihe ndị anyị chọrọ ime n’ozi ọma.

JEHOVA NA-AGỌZI NDỊ TỤKWASỊRỊ YA OBI

7. Olee ngọzi ndị na-abịara anyị ma anyị gbaa mbọ wepụtakwuo oge kwusaa ozi ọma?

7 Anyị na Jehova na-adịkwu ná mma. Legodị ihe mere otu okenye aha ya bụ Samuel * onye ya na nwunye ya na-eje ozi na Kolombia. Ha bụbu ọsụ ụzọ oge niile n’ọgbakọ ha. Ma iji jekwuoro Jehova ozi, ha kpebiri ịga nye aka n’ọgbakọ ọzọ. Iji nwee ike ime ya, ha kwesịrị ịhapụ ihe ụfọdụ. Samuel sịrị: “Anyị mere ihe e kwuru na Matiu 6:33 ma kwụsị ịzụ ihe ndị na-adịghị anyị mkpa. Ma ihe kacha siere anyị ike bụ ịkwapụ n’ụlọ anyị. A rụrụ ya nnọọ otú anyị si chọọ. O nweghịkwa ụgwọ anyị ji maka ya.” Mgbe ha gafere n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ, ha chọpụtara na ego ha na-emefuzi ugbu a dị ezigbo obere ma e jiri ya tụnyere nke ha na-emefubu. Samuel kwukwara, sị: “Anyị ahụla otú Jehova si na-edu anyị ma na-aza ekpere anyị. Anyị chọpụtara na obi dị Jehova ụtọ n’ebe anyị nọ. Anyị esikwala ụzọ ndị ọzọ hụ ihe ndị gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya otú anyị na-ahụtụbeghị.” Ị̀ ga-ewepụtali oge iji kwusakwuo ozi ọma? Ọ bụrụ otú ahụ, obi sie gị ike na ọ ga-eme ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. Jehova ga-egbokwara gị mkpa gị.​—Ọma 18:25.

8. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Ivan na nwunye ya Viktoria kwuru?

8 Anyị na-enwe obi ụtọ n’ozi anyị. Legodị ihe otu nwanna aha ya bụ Ivan na nwunye ya Viktoria bụ́ ọsụ ụzọ oge niile na Kegịstan kwuru. Ha gbanwere ihe ụfọdụ ná ndụ ha ka ha nwee ike iwepụta onwe ha jee ụdị ozi ọ bụla, ma iso arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. Ivan sịrị: “Anyị na-eji ọrụ nke ọ bụla akpọrọ ihe. N’agbanyeghị na ike na-agwụ anyị ná mgbede ụbọchị ọ bụla, obi na-eru anyị ala, anyị ana-enwekwa obi ụtọ n’ihi na anyị ma na anyị ji ike anyị mee ihe gbasara Alaeze Chineke. Obi na-adịkwa anyị ezigbo ụtọ na anyị na ụmụnna anyị dị ná mma nakwa maka ihe ọma ndị meere anyị n’ozi anyị.”​—Mak 10:​29, 30.

9. Olee ihe otu nwanna nwaanyị merela iji jekwuoro Jehova ozi n’agbanyeghị nsogbu? Oleekwa uru ọ baara ya?

9 Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị na-eje ozi Jehova ọ bụrụgodị na e nwere ihe ndị mere ka ọ na-esiri anyị ike. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Mirreh bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka di ya nwụrụ. Ọ bụ dọkịta. Mgbe ọ lara ezumike nká, ọ malitere ịsụ ụzọ. Mirreh na-arịa ezigbo ọrịa na-eme ka ahụ́ na-afụ ya ezigbo ụfụ, ịga ije ana-esikwara ya ike. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ọ pụtara ozi ọma, ọ bụ naanị otu awa ka ọ na-eji aga ozi ụlọ n’ụlọ. Ma, ọ na-aka anọ ogologo oge n’ozi ọma ma ọ nọrọ n’ebe e dosara akwụkwọ anyị n’ihe nkwagharị na-ezi ozi ọma. O nwere ọtụtụ ndị nletaghachi na ndị ọ na-amụrụ Baịbụl. Ọ na-eji ekwentị akpọtụrụ ụfọdụ n’ime ha. Gịnị mere Nwanna Nwaanyị Mirreh ji chọọ ijekwuru Chineke ozi? Ọ sịrị: “M hụrụ Jehova na Jizọs n’anya nke ukwuu. M na-ekpe ekpere mgbe niile ka Jehova nyere m aka ka m na-emere ya ike m niile n’ozi ya.”​—Mat. 22:​36, 37.

10. Dị ka e kwuru na 1 Pita 5:​10, olee ihe ndị chọrọ ijekwuru Jehova ozi na-enweta n’aka Jehova?

10 Jehova na-enyekwu anyị ọzụzụ. Otu ọsụ ụzọ aha ya bụ Kenny na-eje ozi na Mọrishọs chọpụtara na nke a bụ eziokwu. Mgbe ọ batara n’ọgbakọ, ọ hapụrụ ụlọ akwụkwọ mahadum, mee baptizim ma banye ozi oge niile. Ọ sịrị: “M na-agbalị ime ka Aịzaya onye amụma, onye sịrị: ‘Lee m, ziga m.’” (Aịza. 6:8) Kenny esorola rụọ ụfọdụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. O nyekwala aka sụgharịa akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ ya. Ọ sịrị: “Enwetara m ọzụzụ ndị nyeere m aka n’ọrụ m.” Ma, ihe ọ mụtara abụghị naanị otú e si arụ ọrụ ahụ. Ọ sịkwara: “M matakwara ihe ndị m na-enweghị ike imeli nakwa àgwà ndị m kwesịrị inwe ka m nwee ike ịna-efekwu Jehova nke ọma.” (Gụọ 1 Pita 5:10.) Ì nwere ike ịgbalị gbanwee ihe ụfọdụ ná ndụ gị ka i nwee ike iwepụta onwe gị ka Jehova nyekwuo gị ọzụzụ?

Ebe otu di na nwunye na-ezi ozi ọma n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa Alaeze. Ebe otu nwanna nwaanyị na-arụ ọrụ n’ebe a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ebe otu di na nwunye katarala ahụ́ ji ekwentị na-ezi ozi ọma. Obi dị ha niile ụtọ n’ozi ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Olee ihe ụmụnna nwaanyị atọ na Saụt Koria mere ka ha na-ekwusakwu ozi ọma, oleekwa uru ọ baara ha? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

11 A ka kwesịkwara inye ma ụmụnna ndị nọrọla ọdụ n’ọgbakọ ọzụzụ ma ha chọọ isi ụzọ ọhụrụ zie ozi ọma. N’oge koronavaịrọs, ndị okenye nọ n’otu ọgbakọ nọ na Saụt Koria kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị cheburu na ha agaghị ekwusali ozi ọma n’ihi ọrịa a na-ejizi kọmputa na-ezi ozi ọma ugbu a. Ụmụnna nwaanyị atọ gaferela afọ iri asatọ mụtara otú e si eji kọmputa ezi ozi ọma. Ha na-eji ya ezi ozi ọma ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ kwa ụbọchị.” (Ọma 92:​14, 15) Ị̀ ga-achọ iji oge bukwuru ibu na-ekwusa ozi ọma ka ị hụkwuo ịdị mma Jehova? Lee ihe ụfọdụ i nwere ike ime ga-enyere gị aka ime ya.

OTÚ Ị GA-ESI NA-EKWUSAKWU OZI ỌMA

12. Olee ihe Jehova kwere nkwa imere ndị tụkwasịrị ya obi?

12 Mụta ịtụkwasị Jehova obi. O kwere nkwa imere anyị ọtụtụ ihe ọma ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi ma na-eme ike anyị niile n’ozi ya. (Mal. 3:10) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Fabiola bi na Kolombia hụrụ na Jehova mezuru ihe a ná ndụ ya. Ọ chọrọ ịbụ ọsụ ụzọ oge niile ozugbo o mechara baptizim. Ma, ọ bụ ya na-akpa afọ di ya na ụmụ ya atọ. N’ihi ya, mgbe o ruru ịla ezumike nká, o kpesiri ekpere ike ka Jehova nyere ya aka. Ọ sịrị: “Ọ na-ewekarị ogologo oge tupu a kwụwa mmadụ ụgwọ ezumike nká. Ma nke m were naanị otu ọnwa. Ihe a dị m nnọọ ka ọrụ ebube.” Mgbe ọnwa abụọ gachara, ọ malitere ịsụ ụzọ. Nwanna nwaanyị a akarịala afọ iri asaa ugbu a, ọ sụọkwala ụzọ ihe karịrị afọ iri abụọ. N’oge ahụ niile, o nyerela mmadụ asatọ aka ime baptizim. Ọ sịrị: “N’agbanyeghị na ike na-agwụ m mgbe ụfọdụ, Jehova na-enyere m aka ịna-asụ ụzọ.”

Olee otú Ebreham na Sera, Jekọb, na ndị nchụàjà gafere Osimiri Jọdan si gosi na ha tụkwasịrị Jehova obi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13-14. Olee ihe atụ ndị nwere ike inyere gị aka ịtụkwasị Jehova obi ma ị chọọ iji oge buru ibu jeere Jehova ozi?

13 Mụta ihe n’aka ndị tụkwasịrị Jehova obi. Baịbụl kwuru gbasara ọtụtụ ndị gbasiri mbọ ike n’ozi Jehova. Ọtụtụ mgbe, Jehova gọziri ha mgbe ha mere ihe gosiri na ha tụkwasịrị ya obi. Dị ka ihe atụ, ọ bụ mgbe Ebreham hapụrụ ụlọ ya, “n’agbanyeghị na ọ maghị ebe ọ na-aga,” ka Jehova gọziri ya. (Hib. 11:8) Ọ bụkwa naanị mgbe Jekọb na mmụọ ozi gbara mgba ka a gọziri ya ngọzi pụrụ iche. (Jen. 32:​24-30) Mgbe ndị Izrel chọrọ ịba n’Ala Nkwa ahụ, ọ bụ naanị mgbe ndị nchụàjà zọnyere ụkwụ n’Osimiri Jọdan ka ndị Izrel nwere ike isi na ya gafere.​—Josh. 3:​14-16.

14 I nwekwara ike isi n’aka ndị fere Jehova taa mụta ịtụkwasị Jehova obi na ịgbasikwu mbọ ike n’ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ọ na-amasịkarị otu di na nwunye aha ha bụ Payton na Diana ịgụ gbasara ụmụnna ndị wepụtakwuru oge ha jekwuoro Jehova ozi, dị ka ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu bụ́ “Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha.” * Payton sịrị: “Ọ bụrụ na anyị ana-agụ akụkọ ha, ọ na-adị anyị ka ànyị na-ele onye na-eri nri na-atọ ya ezigbo ụtọ. Anyị na-amụ gbasara ha, ọ na-agụkwu anyị agụụ ‘idetụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’” Payton na nwunye ya mechara kwaga n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Ị̀ gụọla isiokwu ndị ahụ? Ì leela vidio aha ya bụ Ikwusa Ozi Ọma n’Ime Ime Obodo Ndị Dị n’Ọstrelia na Ikwusa Ozi Ọma n’Ime Ime Obodo Dị n’Ayaland nke dị na jw.org? Ha nwere ike inyere gị aka ịchọ ụzọ ị ga-esi wepụtakwuo oge na-ejere Jehova ozi.

15. Olee otú ezigbo ndị enyi nwere ike isi nyere anyị aka?

15 Meta ndị ezigbo mmadụ enyi. Ọ ga-adịrị anyị mfe iri nri anyị na-eritụbeghị ma ọ bụrụ na anyị na ndị nri ahụ na-amasị ana-anọrị. Ọ bụrụkwa na anyị na ndị ji ofufe Jehova kpọrọ ihe mbụ ná ndụ ha ana-anọ, anyị ga na-achọkwu ụzọ ndị anyị ga-esi na-ejekwuru Jehova ozi. Otu nwanna aha ya bụ Kent na Veronica nwunye ya chọpụtara na nke a bụ eziokwu. Nwanna Kent sịrị: “Ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị gbara anyị ume ka anyị si n’ụzọ ndị ọzọ jeere Jehova ozi. Anyị chọpụtara na anyị na ndị na-ebute Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ ha ịna-akpakọrịta mere ka obi sie anyị ike na anyị ga-emeli ihe anyị na-emetụbeghị.” Ugbu a, Nwanna Kent na Veronica nwunye ya bụzi ọsụ ụzọ pụrụ iche na Sebia.

16. Dị ka e kwuru n’ihe atụ ahụ Jizọs mere na Luk 12:​16-21, gịnị mere anyị ji kwesị ịdị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ?

16 Hapụ ihe ụfọdụ maka ozi Jehova. Ọ dịghị mkpa ka anyị hapụ ihe niile na-amasị anyị iji mee Jehova obi ụtọ. (Ekli. 5:​19, 20) Ma, ọ bụrụ na anyị ahapụ ijekwuru Jehova ozi n’ihi na anyị achọghị ịhapụ ihe ụfọdụ na-amasị anyị, anyị nwere ike ime ka nwa okorobịa ahụ Jizọs ji mee ihe atụ, bụ́ onye gbasiri mbọ ike ka o nweta ọtụtụ ihe kama ibute ihe gbasara ofufe Jehova ụzọ. (Gụọ Luk 12:​16-21.) Otu nwanna aha ya bụ Christian bi na Frans sịrị: “Ejibughị m ike m niile na oge m niile na-ejere Jehova ozi. Anaghịkwa m ewepụtara ezinụlọ m oge kwesịrị ekwesị.” Ma, ya na nwunye ya mechara kpebie ịsụ ụzọ. Iji nwee ike ime ya, ha kwụsịrị ọrụ ha. Ha maliteziri na-ehichara ndị mmadụ ụlọ iji nweta ihe ndị dị ha mkpa. Ha mụtakwara ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ha enwechaghịzi nnukwu ihe. Obi ọ̀ dị ha ụtọ na ha hapụrụ ihe ụfọdụ iji sụwa ụzọ? Christian sịrị: “Ugbu a, ozi ọma na-atọkwu anyị ụtọ. Ọ na-amasịkwa anyị ịhụ ka ndị anyị na-amụrụ ihe na ndị anyị na-agara nletaghachi na-amụtakwụ banyere Jehova.”

17. Gịnị nwere ike ime ka o siere anyị ike isi n’ụzọ ndị ọzọ na-ezi ozi ọma?

17 Dị njikere isi n’ụzọ ndị ọzọ na-ezi ozi ọma. (Ọrụ 17:​16, 17; 20:​20, 21) Otu nwanna nwaanyị na-asụ ụzọ aha ya bụ Shirley bi n’Amerịka gbanwere otú o si ezi ozi ọma n’oge koronavaịrọs. Na mbụ, o siiri ya ike iji ekwentị na-ezi ozi ọma. Ma, mgbe onye nlekọta sekit bịara ileta ha, ọ mụtara otú ọ ga-esi na-eme ya. Ọ maliteziri isi otú a na-ekwusa ozi ọma. Ọ sịrị: “Ná mmalite, ọ tụrụ m ụjọ. Ma ugbu a, ọ na-amasịzi m. Anyị na-enwetakwu ndị anyị na-ezi ozi ọma ugbu a karịa mgbe anyị na-aga ozi ụlọ n’ụlọ.”

18. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ma ọ bụrụ na e nwere ihe chọrọ ime ka o siere anyị ike iwepụtakwu oge n’ozi anyị?

18 Kpebie ihe ị chọrọ ime, gbalịakwa mee ya. Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, anyị na-ekpe ekpere ka Chineke nyere anyị aka, cheekwa echiche nke ọma gbasara ihe anyị chọrọ ime. (Ilu 3:21) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sonia bụ́ ọsụ ụzọ oge niile n’otu ìgwè na-eji asụsụ Romani amụ ihe na Yurop sịrị: “M na-edepụta ihe m bu n’obi ime edepụta, dosakwa ya ebe m ga na-ahụ ya anya. M sere ụzọ abụọ chere ihu ebe dị iche iche n’elu tebụl m. E nwee ihe m chọrọ ikpebi ime, m na-ele ihe ahụ m sere anya ma chee echiche ma ọ̀ ga-enyere m aka imezu ihe ahụ m bu n’obi ime ka ọ̀ bụ na ọ gaghị enyere m aka.” Nwanna Nwaanyị Sonia gbalịrị ịna-ele nsogbu ya anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ sịrị: “M ga-ekpebi ma m̀ ga-ewere nsogbu ọ bụla bịaara m ka mgbidi ga-egbochi m ime ihe m chọrọ ime ka ọ̀ bụ àkwà mmiri ga-enyere m aka ịgaru ebe m chọrọ ịga.”

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

19 Jehova na-esi n’ọtụtụ ụzọ agọzi anyị. Anyị ga-egosi na obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ya ma ọ bụrụ na anyị emee ike anyị niile iji too ya. (Hib. 13:15) Anyị nwere ike ime ọtụtụ ihe n’ozi Jehova. Ọ ga-emekwa ka Jehova gọzikwuo anyị. Kwa ụbọchị, ka anyị na-achọ ụzọ ndị anyị ga-esi ‘detụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’ Anyị mee otú ahụ, anyị ga-adị ka Jizọs bụ́ onye sịrị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaakwa ọrụ ya.”​—Jọn 4:34.

ABỤ NKE 80 ‘Detụ Jehova Ire, Hụ na Ọ Dị Mma’

^ par. 5 Ihe niile dị mma na-esi n’aka Jehova. Ọ na-emere onye ọ bụla ihe ọma, ma ndị ajọ omume. Ma, ọ na-akacha emere ndị ji obi ha niile na-efe ya ihe ọma. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú Jehova si emere ndị ohu ya ihe ọma. Anyị ga-atụlekwa otú o si emere ndị wepụtakwuru oge ha ijere ya ozi ihe ọma.

^ par. 7 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 14 Isiokwu ndị a na-agbabu n’Ụlọ Nche. Mana ugbu a, ha na-agbazi na jw.org. Gaa n’ebe e dere GBASARA ANYỊ, pịa AKỤKỌ GBASARA NDỊÀMÀ JEHOVA, pịzie IME IHE NDỊ ANYỊ CHỌRỌ IME N’OZI JEHOVA.