Ị̀ Chetara?
Ị̀ gụọla Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’afọ a nke ọma? Ngwa lee ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:
Olee ihe Jems 5:11 mere ka obi sie anyị ike na ya mgbe o kwuru na “ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ Jehova n’obi, nakwa na ọ na-eme ebere”?
Anyị ma na Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị n’ihi na ọ na-eme ebere. Jems 5:11 mere ka obi sie anyị ike na ọ chọrọ inyere anyị aka. Anyị kwesịkwara ịna-eme ka ya.—w21.01, peeji nke 21.
Gịnị mere Jehova ji hazie ka e nwee ndị isi?
Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Nhazi ya a mere ka ezinụlọ ya dịrị n’udo, ihe a na-agakwa nke ọma. Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ya na-erubere ya isi maara ndị o nyere ọrụ ime mkpebi na ịhụ na e mere ihe ha kpebiri n’ezinụlọ ya.—w21.02, peeji nke 3.
Gịnị mere Ndị Kraịst kwesịrị iji kpachara anya n’otú ha si eji ihe ndị a na-eji ezirịta ozi n’Ịntanet ezirịta ozi?
Ọ bụrụ na mmadụ ekpebie iji ihe ndị ahụ na-ezirịta ozi, o kwesịrị ịhọ ndị ya na ha ji ya na-akparịta ahọ. Ọ na-akacha esi ike n’ebe mmadụ na ọtụtụ ndị nwere ike ịna-ezirịta ozi otu mgbe. (1 Tim. 5:13) E nwekwara ike ịnọ ebe ahụ na-agbasa akụkọ ndị a na-ejighị n’aka ma ọ bụkwanụ jiri ụmụnna na-akpa ego.—w21.03, peeji nke 31.
Olee ihe ụfọdụ mere Chineke ji kwe ka Jizọs taa ahụhụ ma nwụọ?
Otu ihe mere ya bụ na mkpọgide a kpọgidere Jizọs n’elu osisi mere ka a tọhapụ ndị Juu n’ọnụ a bụrụ ha. (Gal. 3:10, 13) Ihe nke abụọ bụ na Jehova ji ya zụọ Jizọs ịbụ nnukwu onye nchụàjà. Ihe nke atọ bụ na otú Jizọs si rubere Chineke isi ruo ọnwụ gosiri na mmadụ nwere ike irubere Jehova isi n’agbanyeghị ọnwụnwa tara akpụ bịaara ya. (Job 1:9-11)—w21.04, peeji nke 16 na nke 17.
Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ na-esiri gị ike inweta ndị mmadụ n’ozi ọma?
I nwere ike ịgbalị gaa n’oge ọzọ, mgbe e nwere ike inweta ha n’ụlọ. I nwekwara ike ịga kwusaa ozi ọma n’ebe ọzọ. I nwekwara ike isi n’ụzọ ndị ọzọ na-ekwusa ozi ọma, dị ka ide akwụkwọ ozi.—w21.05, peeji nke 15 na nke 16.
Gịnị ka Pọl onyeozi bu n’obi mgbe ọ sịrị: “M nwụrụ anwụ ma a bịa n’idebe iwu”? (Gal. 2:19)
Iwu Mosis mere ka ezughị okè ụmụ mmadụ pụta ìhè, dugakwa ndị Izrel n’ebe Kraịst nọ. (Gal. 3:19, 24) Nnabata a Pọl nabatara Kraịst mere ka ọ bụrụ onye “nwụrụ anwụ ma a bịa n’idebe iwu,” nke mere ka iwu ahụ gharazie ịchị ya.—w21.06, peeji nke 31.
Olee otú Jehova si kụziere anyị ịna-atachi obi?
Jehova na-edi nkatọ a na-akatọ aha ya, mmegide a na-emegide ọchịchị ya, nnupụisi ụfọdụ ụmụ ya, ụgha Ekwensu na-agha mgbe niile, ahụhụ ndị ohu ya ọ hụrụ n’anya na-ata, ọnwụ ndị enyi ya, mmegbu ndị obi tara mmiri na-emegbu ndị ya, na mmebi a na-emebi ihe ndị o kere.—w21.07, peeji nke 9 ruo na nke 12.
Olee otú Josef si kụziere anyị inwe ndidi?
O diri mmegbu ụmụnne ya megburu ya. Nke ahụ mere ka e bo ya ebubo ụgha ma tụọ ya mkpọrọ ọtụtụ afọ n’Ijipt.—w21.08, peeji nke 12.
Olee ịma jijiji nke Hagaị 2:6-9, 20-22 buru amụma ya?
Mba dị iche iche anaghị anabata ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa. Ma, ọtụtụ ndị anabatala eziokwu ahụ. N’oge na-adịghị anya, mba ndị ahụ ga-ama jijiji ikpeazụ mgbe a ga-ebibi ha.—w21.09, peeji nke 15 ruo na nke 19.
Gịnị mere ike ekwesịghị ịgwụ anyị ikwusa ozi ọma?
Jehova na-ahụ mbọ anyị na-agba. Obi dịkwa ya ụtọ maka ya. Ọ bụrụ na anyị adaghị mbà, anyị ga-enweta ndụ ebighị ebi.—w21.10, peeji nke 25 na nke 26.
Olee otú ihe e kwuru na Levitikọs isi nke iri na itoolu ga-esi nyere anyị aka ime ihe a Baịbụl kwuru: “Dịrịnụ nsọ n’ihe niile unu na-eme”? (1 Pita 1:15)
O nwere ike ịbụ na ihe e kwuru n’amaokwu ahụ si na Levitikọs 19:2. Levitikọs isi nke iri na itoolu gosiri anyị ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi na-eme ihe e kwuru na 1 Pita 1:15 kwa ụbọchị.—w21.12, peeji nke 3 na nke 4.