Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ị̀ gụọla Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’afọ a nke ọma? Ngwa, lee ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Olee ihe anyị na-amụta n’aka Jehova gbasara otú anyị ga-esi na-emeso ụmụ nwaanyị?

Ọ naghị akpapụ ha iche. Ọ naghịkwanụ ewere ya na ụmụ nwoke ka ụmụ nwaanyị mma. Ọ na-ege ụmụ nwaanyị ntị. Nsogbu ha na-enwe na otú obi na-adị ha na-emetụ ya n’obi. Ọ tụkwasịrị ha obi, na-enyekwa ha ọrụ.​—w24.01, peeji nke 15 na nke 16.

Olee otú anyị ga-esi eme ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 5:7, ebe sịrị: “Ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-ejikọ unu na ha”?

Pọl onyeozi na-agwa anyị ka anyị na ndị ga-eme ka o siere anyị ike idebe iwu Chineke ghara ịna-akpa. Ụdị ndị ahụ bụ ma ndị anyị na ha na-anọ ihu na ihu ma ndị anyị na ha na-ekwurịta okwu n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet.​—w24.03, peeji nke 22 na nke 23.

Olee akụkọ ndị na-abụghị eziokwu anyị kwesịrị ịkpachara anya maka ha?

Anyị kwesịrị ịkpachara anya maka akụkọ ndị a na-ejighị n’aka si n’aka ndị enyi anyị, ozi iimel ndị anyị na-amaghị nọkatara zite, kpachakwara anya maka ndị si n’ọgbakọ pụọ, ndị na-eme ka hà chọrọ ịmụtakwu eziokwu Baịbụl.​—w24.04, peeji nke 12.

Gịnị ka anyị ma, gịnịkwa ka anyị na-amaghị gbasara otú Jehova ga-esi ekpe Eze Solomọn, ndị e bibiri na Sọdọm na Gọmọra nakwa n’Iju Mmiri ikpe?

Anyị amaghị ma Jehova ọ̀ mara ha ikpe mbibi ebighị ebi. Ma, anyị ma na ọ ma ihe niile gbasara ha nakwa na ọ bụ onye obi ebere.​—w24.05, peeji nke 3 na nke 4.

Gịnị ka obi siri anyị ike na ya ebe ọ bụ na Chineke bụ “Oké Nkume” anyị? (Diut. 32:4)

Anyị nwere ike ime Jehova ebe mgbaba anyị. Anyị ga-atụkwasịli ya obi, ọ na-emezukwa nkwa ya. Ọ naghị agbanwe agbanwe. Ọ naghịkwa agbanwe ụdị onye ọ bụ nakwa nzube ya.​—w24.06, peeji nke 26 ruo na nke 28.

Gịnị nwere ike inyere gị aka ka ọgbakọ ọhụrụ ị gafere mara gị ahụ́?

Tụkwasị Jehova obi. Ọ ga-enyere gị aka otú o nyeere ndị ohu ya n’oge gara aga. Ejila ọgbakọ ị nọbu atụnyere nke ugbu a. Na-eso eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ ọhụrụ gị, gbalịakwa meta ndị enyi ọhụrụ.​—w24.07, peeji nke 26 ruo na nke 28.

Olee ihe ndị anyị ga-amụta n’ihe atụ atọ e dere na Matiu isi nke 25?

Ihe atụ gbasara atụrụ na ewu na-egosi anyị uru irubere Chineke isi bara. Ihe atụ gbasara ụmụ agbọghọ ndị nwere uche na ndị nke dị nzuzu na-akụziri anyị uru ịdị njikere ma nọrọ na nche bara. Ihe atụ gbasara talent na-akụziri anyị uru ịrụsi ọrụ ike bara.​—w24.09, peeji nke 20 ruo na nke 24.

Olee otú ogo ihe a rụnyere n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọ nsọ Solomọn hà?

N’Ihe E Mere nke Abụọ 3:4, ụfọdụ akwụkwọ Baịbụl ochie ndị e ji aka dee kwuru ‘otu narị kubit na iri abụọ (120),’ nke pụtara na ogo ya hà ka ihe dị ka poolu eletrik ise. Mana ụfọdụ akwụkwọ Baịbụl ndị a tụkwasịrị obi kwuru ‘kubit iri abụọ,’ ya bụ, ihe fọrọ obere ka ọ hara ka otu poolu eletrik. Kubit iri abụọ yikwaranụ ihe ahụ́ ụlọ nsọ ahụ ga-ebuli.​—w24.10, peeji nke 31.

Gịnị ka ohu na-eje ozi ịbụ ‘di otu nwaanyị’ pụtara? (1 Tim. 3:12)

Ọ pụtara na ọ lụrụ naanị otu nwaanyị, ọ gaghịkwa na-akwa iko. Ihe ọzọkwa bụ na obi ya ekwesịghị ịdịwa n’ebe ụmụ nwaanyị ndị ọzọ nọ.​—w24.11, peeji nke 19.

Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ihe e dere na Jọn 6:53 abụghị iji kọwaa otú a ga-esi na-eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?

Jọn 6:53 kwuru na e kwesịrị iri anụ ahụ́ Jizọs, ṅụọkwa ọbara ya. Jizọs kwuru ihe ahụ na Galili n’afọ 32 Oge Ndị Kraịst. Ndị ọ gwara ya bụ ndị Juu kwesịrị inwe okwukwe na ya. Ma, Jizọs mechara hiwe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị mgbe otu afọ gachara na Jeruselem. Ndị ọ gwara okwu n’oge ahụ bụ ndị ga-eso ya chịa n’eluigwe.​—w24.12, peeji nke 10-11.