Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Akwụsịbeghị M Ịmụta Ihe

Akwụsịbeghị M Ịmụta Ihe

M NA-EKELE Jehova maka na ọ bụ ‘Onye Ozizi m kachanụ.’ (Aịza. 30:20) Ihe ọ na-eji akụziri ndị na-efe ya ihe bụ Okwu ya bụ́ Baịbụl, ihe ndị dị ịtụnanya o kere, nakwa nzukọ ya. Ọ na-ejikwa ụmụnna anyị akụziri anyị ihe. Ọ bụ eziokwu na ọ fọrọ obere ka m gbaa otu narị (100) afọ, ihe ndị Jehova ji ihe ndị a niile na-akụziri anyị ka na-abara m uru. Ka m kọwaa otú o si bụrụ eziokwu.

Mụ na ndị ezinụlọ anyị n’afọ 1948

A mụrụ m n’afọ 1927 n’obere obodo dị nso na Chikago, Ilinọị, dị n’Amerịka. Papa m na mama m mụrụ ụmụ ise. Ha bụ Jetha, Don, mụnwa, Karl, na Joy. Anyị niile kpebisiri ike iji obi anyị niile na-efe Jehova. Nwanne m nwaanyị bụ́ Jetha gara klas nke abụọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’afọ 1943. Don gara Betel dị na Bruklin, Niu Yọk, n’afọ 1944, Karl agaa n’afọ 1947, Joy agaa n’afọ 1951. Àgwà ọma ha na nke nne na nna m gbara m ume ijekwuru Jehova ozi.

OTÚ EZINỤLỌ ANYỊ SI MATA GBASARA JEHOVA

Papa m na mama m na-agụ Baịbụl. Ha hụrụ Chineke n’anya, kụziekwara anyị ịhụ ya n’anya. Ma, papa m kwụsịrị inwe mmasị n’okpukpe mgbe o so lụọ Agha Ụwa Mbụ na Yurop. Mgbe ọ lọtara, obi tọgburu mama m atọgbu na ọ lọtara ná ndụ. N’ihi ya, ọ sịrị papa m: “Ka anyị gaanụ chọọchị otú anyị na-agabu.” Papa m zara ya, sị: “M ga-eso gị garuo ebe ahụ, mana agaghị m abanye n’ime chọọchị.” Mama m ajụọ ya, sị: “Maka gịnị?” Papa m asị ya: “N’oge a nọ na-alụ agha, ndị ụkọchukwu ndị na-ekpe otu okpukpe nọ na-ekpere ndị agha ha ekpere ma na-agọzi ngwá agha ha ka ha lụso ndị okpukpe ha nọ ná mba ọzọ agha. Olee ndị Chineke na-akwado?”

Ka oge na-aga, mgbe mama m nọ na chọọchị, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ anyị. Ha nyere papa m akwụkwọ abụọ e ji amụ Baịbụl a kpọrọ Light, ndị kọwara akwụkwọ Mkpughe. Akwụkwọ ndị ahụ masịrị papa m, ya anara ha. Ozugbo mama m hụrụ akwụkwọ ndị ahụ, ọ malitere ịgụ ha. Otu ụbọchị, ọ hụrụ ihe e dere n’otu akwụkwọ akụkọ nke na-ekwu na a na-akpọ ndị nwere mmasị òkù ka ha bịa jiri akwụkwọ abụọ ahụ mụọ Baịbụl. O kpebiri na ọ ga-aga. Mgbe o ruru ebe ahụ, otu nwaanyị katarala ahụ́ mepeere ya ụzọ. Mama m weliri otu n’ime akwụkwọ ahụ elu, jụọ ya, sị: “Ùnu na-amụ akwụkwọ a ebe a?” Ọ zara ya, sị: “Ee, nwa m nwaanyị. Batawa.” N’izu ọzọ, mama m kpọọrọ anyị bụ́ ụmụ ya gaa ebe ahụ. Mgbe anyị gachara nke ụbọchị ahụ, anyị malitere ịna-aga kwa izu.

N’otu oge anyị nọ n’ọmụmụ ihe, onye na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ gwara m ka m gụọ Abụ Ọma 144:15, ebe kwuru na ndị na-efe Jehova na-enwe obi ụtọ. Ihe e kwuru ebe ahụ nakwa n’amaokwu abụọ ọzọ masịrị m. Otu bụ 1 Timoti 1:11, ebe kwuru na Jehova bụ “Chineke, onye obi ụtọ,” nke ọzọ abụrụ Ndị Efesọs 5:1, ebe gbara anyị ume ka anyị ‘na-eme ka Chineke.’ M ghọtara na m kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ ka m nwee ike ịna-efe Onye kere m nakwa na m kwesịrị ịna-ekele ya maka na o kwere ka m na-efe ya. M na-agbalị na-eme ihe abụọ a ná ndụ m niile.

Ọgbakọ kacha dịrị anyị nso dị na Chikago, ihe dị ka kilomita iri atọ na abụọ ma e si n’ụlọ anyị gawa ya. N’agbanyeghị ya, anyị na-aga ya, mụ ana-amụtakwa ihe na Baịbụl. M chetara na otu ụbọchị, onye na-eduzi ọmụmụ ihe kpọrọ nwanne m nwaanyị Jetha ka ọ zaa ajụjụ. Mgbe ọ nọ na-aza ajụjụ, m kwuru n’ime obi m, sị: ‘Ama m azịza ya. M gaara eweli aka ka m zaa ya.’ M maliteziri na-akwado ihe m ga-aza ma na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ihe kadị mkpa bụ na mụ na Jehova bịara dịkwuo ná mma otú ahụ ya na ụmụnne m dịkwa ná mma. E mere m baptizim n’afọ 1941.

ỊMỤTA BANYERE JEHOVA NÁ MGBAKỌ UKWU

M na-echetakarị mgbakọ ukwu e nwere n’afọ 1942 na Klivland dị n’Ohayo. Ndị ezinụlọ anyị biri n’ụlọikwuu n’ebe dị nso n’ebe e mere mgbakọ ahụ, anyị na ezinụlọ ndị ọzọ. Ụmụnna ndị nọkwa n’ihe karịrị obodo iri ise ndị ọzọ dị n’Amerịka si na telefon gere ihe e mere ná mgbakọ ahụ. A ka na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ n’oge ahụ, a na-akpagbukwukwa Ndịàmà Jehova. Ná mgbede, ahụrụ m ka ụmụnna bịara dọwa ụgbọala ha n’ebe a rụrụ ụlọikwuu ndị ahụ, chee ọkụ ha ihu gburugburu ya. Ha niile kwekọrịtara na a ga-enwe onye nọ n’ụgbọala nke ọ bụla na-eche nche abalị niile. A hụ ihe na-egosi na nsogbu dị, ndị nọ n’ụgbọala ndị ahụ ga-agbanye ọkụ ha ka ọ chachie ndị bịara ịwakpo anyị anya. Ha ga na-egbukwa opi ụgbọala ahụ. Ihe a ga-emezi ka ndị ọzọ nwee ike ịgbata ma nye aka. M kwuru n’obi m, sị: ‘Ndị Jehova na-ejikere ejikere n’ihe niile.’ Ebe ọ bụ na obi siri m ike na e nwere ndị na-eche anyị, ehiri m ụra nke ọma n’abalị ahụ. E nweghịkwa ihe merenụ.

N’afọ ndị na-eso ya, mgbe m chetara ihe ndị mere ná mgbakọ ahụ, m ghọtara na e nweghị ihe ọ bụla gosiri na ụjọ nọ na-atụ mama m. Ọ tụkwasịrị Jehova na nzukọ ya obi ya niile. Agaghị m echefu ihe m mụtara n’aka ya.

Obere oge tupu mgbakọ ahụ, mama m ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile. Ọ na-ege ntị nke ọma ma e kwuwe okwu gbasara ndị nọ n’ozi oge niile. Mgbe anyị nọ na-ala, ọ sịrị: “M ka chọrọ ịna-asụ ụzọ. Ma, agaghị m emeli ya ma na-elekọta ụlọ anyị nke ọma.” Ọ jụrụ anyị ma ànyị ga-enyere ya aka. Anyị sịrị ya ee. N’ihi ya, o kenyere onye ọ bụla n’ime anyị otu ọnụ ụlọ ma ọ bụ abụọ anyị ga na-ehicha tupu anyị erie nri ụtụtụ. Anyị gaa ụlọ akwụkwọ, ọ na-aga leruo ụlọ anyị anya, jide n’aka na ọ dị ọcha, ya agawazie ozi ọma. Mama m na-ejikarị ọrụ n’aka. Mana, ọ naghị elefuru anyị bụ́ ụmụ ya anya. Anyị lọta iri nri ehihie nakwa ma a gbasaa akwụkwọ, ọ na-anọ n’ụlọ na-eche anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị lọta, anyị na-eso ya aga ozi ọma. Ihe a nyeere anyị aka ịghọta ihe ịbụ ọsụ ụzọ pụtara.

M MALITERE ỊSỤ ỤZỌ

M malitere ịsụ ụzọ mgbe m dị afọ iri na isii. Ọ bụ eziokwu na papa m aghọbeghị Onyeàmà Jehova mgbe ahụ, mana, ihe m na-eme nọ na-amasị ya. Otu mgbede, m gwara ya na m na-agbalịsi ike ka m malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl, mana, ahụbeghị m onye chọrọ ịmụ Baịbụl. M gbatụrụ nkịtị ma jụọ ya, sị, “Ị̀ ga-achọnụ ka mụ na gị na-amụ Baịbụl?” O chebaara ya echiche ma zaa m, sị, “E nweghị ihe ọ bụla m ma ga-egbochi m ikweta ka ị mụwara m Baịbụl.” N’ihi ya, onye mbụ m malitere ịmụrụ Baịbụl bụ papa m. Ihe a bụ ihe pụrụ ezigbo iche.

Mụ na ya mụrụ akwụkwọ bụ́ “The Truth Shall Make You Free.” Ka ọmụmụ ihe anyị na-aga n’ihu, m chọpụtara na papa m na-enyere m aka ịbụ ma ezigbo nwa akwụkwọ ma ezigbo onye nkụzi. Dị ka ihe atụ, otu mgbede anyị gụchara otu paragraf, ọ sịrị m: “Ahụrụ m ihe akwụkwọ a kwuru. Mana, olee otú i si mara na ọ bụ eziokwu?” Ejikereghị m ejike ịza ya ajụjụ ahụ. N’ihi ya, m sịrị ya, “Agaghị m egosili gị ya ugbu a. Mana, n’ụbọchị ọzọ anyị ga-amụ ihe, m ga-egosi gị azịza ya.” M mekwara otú ahụ. M chọtara amaokwu Baịbụl ndị gosiri na ihe ahụ anyị na-amụ bụ eziokwu. Mgbe nke ahụ gachara, m na-akwadozi nke ọma tupu anyị amụọ ihe. M malitere na-eme nchọnchọ. Ihe a mere ka m na-amụkwu Baịbụl nke ọma. O nyekwaara papa m aka. O mere ihe ọ na-amụta ma mee baptizim n’afọ 1952.

M MỤTAKWARA IHE NA BETEL

M pụrụ n’ụlọ anyị mgbe m dị afọ iri na asaa. Nwanne m nwaanyị Jetha a ghọrọ onye ozi ala ọzọ, Don ana-eje ozi na Betel. Ha abụọ ji ozi ha kpọrọ ihe. Ihe a gbakwara m ezigbo ume. N’ihi ya, m tinyere akwụkwọ ịga ma Betel ma Ụlọ Akwụkwọ Gilied, hapụzie ka Jehova kpebie nke m ga-aga. Gịnị mechara mee? A kpọrọ m ka m gaa Betel n’afọ 1946.

Kemgbe m nọ na Betel, arụọla m ọrụ dị iche iche. N’ihi ya, amụtakwala m ọtụtụ ihe ọhụrụ. Ejeela m ozi na Betel ruo afọ iri asaa na ise. N’oge ndị ahụ, amụtakwala m otú e si ebi akwụkwọ na otú e si edekọ ego. M mụtakwara otú e si azụta ihe ndị dị mkpa a chọrọ na Betel nakwa otú e si eziga ihe ndị dị mkpa n’ebe dị iche iche. Ma ihe kacha tọọ m ụtọ bụ otú e si amụ Baịbụl na Betel ma e mewe ihe mmụta dịịrị ụbọchị nakwa ma e kwuwe okwu ndị ọzọ.

Mgbe m na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ ndị okenye ọgbakọ

Amụtakwara m ihe n’aka nwanne m m tọrọ bụ́ Karl. Ọ bịara Betel n’afọ 1947. Ọ na-amụ Baịbụl nke ọma, na-akụzikwa ya nke ọma. E nwere otu oge m gwara ya ka o nyere m aka n’okwu e kenyere m ikwu. M kọwaara ya na e nweela ọtụtụ ihe m chọtarala, mana, amaghị m otú m ga-esi etinye ha n’okwu m. Ọ jụrụ m otu ajụjụ nyeere m aka ịma ihe m ga-eme. Ọ sịrị m: “Joel, gịnị bụ isiokwu gị?” M ghọtara ihe ọ na-ekwu ozugbo. Ihe m kwesịrị ime bụ iwere ihe ndị gbasara isiokwu m ma hapụzie ihe ndị ọzọ. Echefughị m ihe a.

Anyị chọọ inwe obi ụtọ na Betel, anyị kwesịrị ịna-ejechi ozi ọma anya. O nwekwara ike ime ka anyị hụ ihe ndị ga-agba anyị ume. Otu m na-echeta bụ ihe mere n’otu mgbede na Brọnks dị na Niu Yọk Siti. Mụ na otu nwanna gara na nke otu nwaanyị anyị nyeburu Ụlọ Nche na Teta! Anyị sịrị ya, “Ná mgbede a, anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta ihe ndị na-agba ume dị na Baịbụl.” Ọ zara anyị, sị: “Ọ bụrụ maka Baịbụl, batawanụ.” Anyị na ya gụrụ ma kwurịta amaokwu ụfọdụ kwuru banyere Alaeze Chineke na ụwa ọhụrụ. O doro anya na ihe ahụ masịrị ya n’ihi na ọ kpọrọ ụfọdụ ndị enyi ya ka ha soro ya n’izu na-eso ya. Ya na di ya mechara ghọọ Ndịàmà Jehova.

M MỤTARA IHE N’AKA NWUNYE M

M kpebiri na m ga-alụ nwaanyị. Afọ iri gara tupu mụ ahụ nwanna nwaanyị m ga-alụ. Gịnị nyeere m aka ịchọta ezigbo nwaanyị? M kpere ekpere ma chee gbasara ihe mụ na nwunye m ga-achọ ime ma anyị lụchaa.

Mụ na nwunye m, mgbe anyị na-eleta sekit

Mgbe e mechara mgbakọ n’Ámá Egwuregwu Yanki n’afọ 1953, m hụrụ otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Mary Aniol. Ya na Jetha nwanne m nwaanyị so gaa klas nke abụọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ọ bụkwa ha abụọ ka e zigara ka ha na-eje ozi ala ọzọ n’otu ebe. Mary na-eji ịnụ ọkụ n’obi akọrọ m otú ozi ala ọzọ ya si na-aga n’àgwàetiti Karịbian nakwa gbasara ndị ọ na-amụrụ Baịbụl kemgbe ọtụtụ afọ. Ka anyị na-amatakwu ibe anyị, anyị ghọtara na anyị abụọ bu n’obi ime otu ihe n’ofufe Jehova. Anyị hụkwuru ibe anyị n’anya, lụọ n’ọnwa Eprel afọ 1955. Nwunye m Mary si n’ọtụtụ ụzọ gosi na ọ bụ onyinye si n’aka Jehova nakwa onye m ga-amụta ihe n’aka ya. Ọ na-eji obi ụtọ arụ ọrụ ọ bụla e nyere ya. Ọ na-arụsi ọrụ ike. Ọ na-eche gbasara ndị ọzọ, ọ na-ebutekwa ihe gbasara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ ya. (Mat. 6:33) Anyị rụrụ ọrụ sekit ruo afọ atọ. N’afọ 1958, a kpọrọ anyị abụọ ka anyị bịa jewe ozi na Betel.

Amụtara m ọtụtụ ihe n’aka nwunye m Mary. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị ka lụrụ ọhụrụ, anyị kpebiri na anyị ga na-agụkọ Baịbụl ọnụ. Anyị ga na-agụ ihe dị ka amaokwu iri na ise n’otu oge. Otu onye n’ime anyị gụchaa otu ebe, anyị na-ekwu gbasara amaokwu Baịbụl ahụ ma kwurịta otú anyị ga-esi eme ya ná ndụ anyị. Nwunye m Mary na-agwakarị m gbasara ihe ọ mụtara n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied ma ọ bụ n’ozi ala ọzọ o jere. Ihe a mụ na ya na-ekwurịta nyeere m aka ịghọtakwu ihe nke ọma, nyekwara m aka ịna-emekwu nke ọma n’okwu m na-ekwu nakwa ma m gbawa ụmụnna nwaanyị ume.​—Ilu 25:11.

Nwunye ọma m bụ́ Mary nwụrụ n’afọ 2013. Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ ya n’ụwa ọhụrụ. Ma, ka ọ dịgodị, m kpebisiela ike na m ga na-amụtakwu ihe ma na-atụkwasị Jehova obi m niile. (Ilu 3:5, 6) Iche gbasara ihe ndị na-efe Jehova ga-eme n’ụwa ọhụrụ na-akasi m obi, na-emekwa m obi ụtọ. Ihe so na ya bụ ịmụta ihe ọhụrụ n’aka Onye Ozizi anyị kachanụ nakwa ịmụta gbasara ya. N’eziokwu, agaghị m ekelechali Jehova maka ihe niile ọ kụziiri m ruo ugbu a nakwa maka otú o si si n’ụzọ dị iche iche meere m amara.

a Gụọ akụkọ ndụ Nwanna Nwaanyị Jetha Sunal n’Ụlọ Nche March 1, 2003, peeji nke 23 ruo na nke 29.