Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 51

ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

Anya Mmiri Gị Na-ewute Jehova

Anya Mmiri Gị Na-ewute Jehova

“Biko, gbanye anya mmiri m n’ime karama akpụkpọ gị. Ọ̀ bụ na i deghị ha n’akwụkwọ gị?”​—ỌMA 56:8.

IHE A GA-AMỤ

Otú Jehova si aghọta ihe ndị na-ewute anyị n’obi nakwa otú o si akasi anyị obi.

1-2. Olee ihe ndị nwere ike ime ka anya mmiri gbaa anyị?

 ANYỊ niile ebetụla ákwá. E nwee ihe mere anyị ezigbo obi ụtọ, anya mmiri nwere ike ịgba anyị. O nwere ike ịbụ na i bere ákwá mgbe ihe dị ezigbo mkpa mere ná ndụ gị, dị ka ihe atụ, mgbe ị mụrụ nwa, mgbe i chetara ihe ọma meere gị n’oge gara aga, ma ọ bụkwanụ mgbe ị hụrụ enyi gị ị na-ahụbeghị kemgbe ọtụtụ afọ.

2 Ma, ọtụtụ mgbe, ihe na-eme ka anya mmiri gbaa anyị bụ ihe na-ewute anyị n’obi. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ibe ákwá mgbe mmadụ mewara anyị obi. Anya mmiri nwekwara ike ịgba anyị ma ọ bụrụ na ọrịa anyị na-arịa na-ekweghị ala ala na-egbu anyị ezigbo mgbu ma ọ bụkwanụ mgbe anyị na-eru uju onye nwụnahụrụ anyị. N’oge ndị ahụ, o nwere ike ịdị anyị otú ọ dị Jeremaya onye amụma mgbe ndị Babịlọn bibiri Jeruselem. Jeremaya sịrị: “Anya mmiri si m n’anya na-asọpụta ka iyi . . . M na-ebe ákwá n’akwụsịghị akwụsị.”​—Ákwá 3:48, 49.

3. Olee otú obi na-adị Jehova ma ọ hụ ka ndị ohu ya na-ata ahụhụ? (Aịzaya 63:9)

3 Jehova ma ugboro ole anya mmiri gbarala anyị n’ihi ihe ndị gbawara anyị obi. Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ma mgbe ohu ya nke ọ bụla na-ata ahụhụ. Ọ na-anụkwa ákwá anyị na-ebe ka o nyere anyị aka. (Ọma 34:15) Ma, ihe Jehova na-eme abụghị naanị ịhụ anya mmiri na-agba anyị ma ọ bụkwanụ ịnụ arịrịọ anyị na-arịọ ya. Dịkwa ka nne ma ọ bụ nna hụrụ ụmụ ya n’anya, ọ na-ewute Jehova ma ọ hụ ka ụmụ ya na-ebe ákwá. Ọ chọkwara inyere ha aka.​—Gụọ Aịzaya 63:9.

4. Olee ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl anyị ga-eleba anya, gịnịkwa ka anyị ga-amụta gbasara Jehova?

4 Na Baịbụl, Jehova gosiri ihe o mere mgbe ndị ohu ya bere ákwá ka o nyere ha aka. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe mere Hana, Devid, na Eze Hezekaya. Gịnị mere anya mmiri ji gbaa ha? Gịnị ka Jehova mere mgbe ha bere ákwá ka o nyere ha aka? Oleekwa otú akụkọ ha ga-esi enyere anyị aka ma anyị bee ákwá n’ihi ihe na-ewute anyị, mgbe mmadụ gharịpụrụ anyị, ma ọ bụkwanụ mgbe ọ dị anyị ka olileanya adịghị?

MGBE ANYA MMIRI NA-AGBA GỊ N’IHI IHE NA-EWUTE GỊ

5. Olee otú obi dị Hana maka nsogbu ya?

5 E nwere ọtụtụ nsogbu mere ka Hana bee ákwá. Otu n’ime ha bụ na di ya nwere nwaanyị ọzọ bụ́ Penina. Nwunye di ya a kpọkwara ya asị. Ihe ọzọ bụ na Hana amụtaghị nwa. Mana, Penina mụtara ọtụtụ ụmụ. (1 Sam. 1:1, 2) Ọ nọkwa na-akwa Hana emo maka na ọ mụtaghị nwa. Olee otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ gị bụ Hana? Ihe ahụ wutere Hana nke na “ọ na-ebe ákwá, gharakwa iri nri.” ‘Obi jọkwara ya ezigbo njọ.’​—1 Sam. 1:6, 7, 10.

6. Gịnị kasiri Hana obi?

6 Gịnị kasiri Hana obi? Otu ihe nyeere ya aka bụ na ọ gara n’ụlọikwuu a na-anọ efe Chineke. N’ebe ahụ, o nwere ike ịbụ na ọ gara nọrọ nso n’ebe e si abanye n’ogige ụlọikwuu ahụ, ‘malite ịrịọ Jehova arịrịọ, na-ebekwa ezigbo ákwá.’ Ọ rịọrọ Jehova, sị: “Hụ ahụ́ a na-emekpa mụnwa bụ́ ohu gị ma cheta m.” (1 Sam. 1:10b, 11) Hana kpere ekpere gwa Jehova otú obi dị ya. Mgbe Jehova hụrụ otú nwa ya nwaanyị a ọ hụrụ n’anya si na-ebesi ákwá ike, o wutere ya.

7. Olee otú obi dị Hana mgbe ọ kọchaara Jehova nsogbu ya?

7 Mgbe Hana kpechara ekpere kọọrọ Jehova ihe niile dị ya n’obi, nnukwu onye nchụàjà bụ́ Ịlaị mere ka obi sie ya ike na Jehova ga-aza ekpere ya. Oleezi otú obi dị Hana mgbe ahụ? Baịbụl sịrị: “Nwaanyị ahụ wee laa ma riwe ihe. Ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ.” (1 Sam. 1:17, 18) Ọ bụ eziokwu na nsogbu Hana akwụsịbeghị, ma ahụ́ bịara ruo ya ala. O bunyela Jehova ibu ahụ na-anyịgbu ya. Jehova hụrụ nsogbu ọ nọ na ya, nụ ákwá ya, mechaakwa gọzie ya, ya amụta ụmụ.​—1 Sam. 1:19, 20; 2:21.

8-9. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 10:24, 25, gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eme ike anyị niile ịna-aga ọmụmụ ihe? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

8 Ihe anyị na-amụta. È nwere nsogbu siri ike bịaara gị, nke na-eme ka anya mmiri na-agba gị? O nwere ike ịbụ na ị na-eru uju onye ezinụlọ gị ma ọ bụ enyi gị nwụnahụrụ gị. N’ụdị oge ahụ, o nwere ike ịdị gị ka ị nọrọ naanị gị. E nweghị onye ọ na-anaghị adị otú ahụ. Mana, ihe kasiri Hana obi bụ na ọ gara n’ụlọikwuu Jehova. Ọ bụrụkwa na gịnwa agaa ọmụmụ ihe, ma mgbe ike na-adịghị gị ma mgbe obi gbawara gị, o nwere ike ịkasi gị ezigbo obi. (Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.) N’ọmụmụ ihe, anyị na-anụ ka a na-agụ amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi. Ọ bụ otú Jehova na-esi enyere anyị aka ịkwụsị iche banyere ihe na-agbawa anyị obi. Ihe a nwere ike ime ka obi dị anyị mma ọ bụrụgodị na nsogbu anyị akwụsịghị ozugbo.

9 Anyị nọrọ n’ọmụmụ ihe, obi na-atọkwa anyị ụtọ ma anyị na ụmụnna anyị nọrịa, ha ana-agba anyị ume ma na-egosi anyị na ha hụrụ anyị n’anya. (1 Tesa. 5:11, 14) E nwere otu nwanna bụ́ ọsụ ụzọ pụrụ iche nwunye ya nwụrụ. Ọ sịrị: “M ka na-ebe ákwá. Mgbe ụfọdụ, m na-aga nọrọ otu ebe na-ebe naanị ákwá. Ma, ịga ọmụmụ ihe na-agba m ezigbo ume. Okwu ọma ụmụnna m na-agwa m nakwa azịza ndị ha na-aza n’ọmụmụ ihe na-akasi m obi. N’agbanyeghị otú m si na-echegbu onwe m tupu mụ agaa ọmụmụ ihe, mgbe ọ bụla m ruru ebe ahụ, obi na-adị m mma.” Anyị gaa ọmụmụ ihe, Jehova nwere ike iji ụmụnna anyị nyere anyị aka.

Ụmụnna anyị nwere ike ịkasi anyị obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)


10. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Hana ma e nwee ihe gbawara anyị obi?

10 Ihe ọzọ kasiri Hana obi bụ na o kpere ekpere gwa Jehova otú obi dị ya. Gịnwa nwekwara ike ‘ịkọrọ ya ihe niile na-echegbu gị,’ obi esie gị ike na ọ ga-ege gị ntị. (1 Pita 5:7) Otu nwanna nwaanyị ndị ohi gbagburu di ya sịrị: “Obi jọrọ m ezigbo njọ nke na m chere na e nweghị ihe ọ bụla ga-emeli ka obi dịwakwa m ụtọ. Ihe kasiri m obi bụ na m kpere ekpere kọọrọ Jehova, bụ́ Nna m nke eluigwe hụrụ m n’anya, otú ọ dị m n’obi. Mgbe ụfọdụ, anaghị m ama ihe m ga-ekwu. Ma, ọ na-aghọta otú obi dị m. Ọ bụrụ na obi agbawaa m ma ọ bụkwanụ mụ ana-echegbu onwe m, m na-ekpe ekpere ka Jehova mee ka obi ruo m ala. M kpechaa ekpere, obi na-eru m ala, mụ emeekwa ihe ndị m kwesịrị ime n’ụbọchị.” Ọ bụrụ na i bee ákwá kọọrọ Jehova ihe na-ewute gị, ọ na-ewutekwa ya. Ọ na-aghọtakwa otú obi dị gị. Ọ bụrụgodị na ihe ahụ mere ka obi na-ajọ gị njọ akwụsịghị, Jehova nwere ike ime ka obi ruo gị ala. (Ọma 94:19; Fil. 4:6, 7) Ọ na-ahụ mbọ ị na-agba irubere ya isi. Ọ ga-akwụkwa gị ụgwọ maka ya.​—Hib. 11:6.

MGBE ANYA MMIRI NA-AGBA GỊ N’IHI NA A GHARỊPỤRỤ GỊ

11. Olee otú nsogbu ndị bịaara Devid mere ka obi dị ya?

11 E nwere ọtụtụ ihe mere ka anya mmiri gbaa Devid. E nwere ndị kpọrọ ya asị. Ụfọdụ ndị enyi ya na ndị ezinụlọ ya gharịpụrụ ya. (1 Sam. 19:10, 11; 2 Sam. 15:10-14, 30) E nwere otu oge ihe siiri ya ike, ya edee, sị: “Ude m na-asụ emeela ka ike gwụ m. Anya mmiri m na-ede àkwà m abalị niile. Ákwá m na-ebe na-eme ka anya mmiri m dee ihe m ji edina ala.” Gịnị mere obi ji dị Devid otú ahụ? O kwuru na ọ bụ ‘n’ihi ndị niile na-achọ ya okwu.’ (Ọma 6:6, 7) Ihe ọjọọ ndị mmadụ mere Devid mere ka anya mmiri na-agba ya.

12. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 56:8, gịnị ka obi siri Devid ike na ya?

12 N’agbanyeghị ọtụtụ ihe ọjọọ mere Devid, obi siri ya ike na Jehova hụrụ ya n’anya. O dere, sị: “Jehova ga-anụ ákwá m na-ebe.” (Ọma 6:8) N’oge ọzọ, o kwuru ihe ọzọ magburu onwe ya n’Abụ Ọma 56:8. (Gụọ ya.) Ihe o kwuru ebe a na-egosi otú Jehova si hụ anyị n’anya nke ukwuu, ihe na-ewute anyị ana-ewutekwa ya. Ọ dị Devid ka Jehova ọ̀ na-agbanye anya mmiri ya na karama ma ọ bụkwanụ na-edeba ya n’akwụkwọ. Obi siri Devid ike na Jehova na-ahụ ihe mgbu ya ma na-echeta ya. Obi sikwara ya ike na Nna ya nke eluigwe hụrụ ya n’anya na-ahụ nsogbu ndị bịaara ya, na-ahụkwa otú o mere ka obi dịrị ya.

13. Ọ bụrụ na mmadụ agharịpụ anyị, olee ihe ga-akasi anyị obi? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

13 Ihe anyị na-amụta. Obi ọ̀ gbawara gị n’ihi na onye ị tụkwasịrị obi mere ihe wutere gị ma ọ bụ gharịpụ gị? O nwere ike ịbụ na obi gbawara gị n’ihi na di gị, nwunye gị, ma ọ bụ onye ị chọrọ ịlụ hapụrụ gị ma ọ bụkwanụ na onye ị hụrụ n’anya kwụsịrị ife Jehova. Otu nwanna nwunye ya kwara iko ma hapụ ya sịrị: “Ihe mere m riri m ọnụ. Ọ dị m ka mụ abaghị uru, iwe ana-ewe m, ọsụkọsụ ana-asụkwa m.” Ọ bụrụ na e nwere onye gharịpụrụ gị ma ọ bụ mewaa gị obi, ka obi sie gị ike na Jehova agaghị agbakụta gị azụ. Nwanna ahụ sịrị: “Aghọtala m na mmadụ nwere ike ịgharịpụ anyị. Mana, Jehova bụ Oké Nkume anyị. N’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, ọ ga na-enyere anyị aka. Ọ gaghị ahapụ ndị na-erubere ya isi.” (Ọma 37:28) Chetakwa na Jehova hụrụ gị n’anya karịa otú mmadụ ọ bụla nwere ike ịhụ gị. N’agbanyeghị otú obi si gbawaa gị n’ihi na onye ị tụkwasịrị obi gharịpụrụ gị, ka obi sie gị ike na Jehova ka hụrụ gị n’anya. (Rom 8:38, 39) Ihe anyị na-ekwu bụ: N’agbanyeghị otú mmadụ si meso gị omume, Nna gị nke eluigwe hụrụ gị n’anya.

Akwụkwọ Abụ Ọma na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova nọ ndị obi gbawara nso (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)


14. Gịnị ka Abụ Ọma 34:18 na-eme ka obi sie anyị ike na ya?

14 Ọ bụrụ na onye anyị tụkwasịrị obi gharịpụrụ anyị, ihe ọzọ Devid kwuru n’Abụ Ọma 34:18 nwere ike ịkasi anyị obi. (Gụọ ya.) Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru na “ndị obi gbawara” nwere ike ịbụ “ndị chere na e nweghị ihe ọma ọ bụla ha ga-atụwa anya ya.” Gịnị ka Jehova na-emere ndị ọ dị otú ahụ n’ihi na a gharịpụrụ ha? Jehova ‘nọ anyị nso.’ Ọ na-eme ka nne ma ọ bụ nna ku nwa ya na-ebe ákwá ma na-akasi ya obi. Ọ bụrụ na anyị na-ata ahụhụ n’ihi na mmadụ gharịpụrụ anyị ma ọ bụkwanụ hapụ anyị, ọ na-ewute Jehova. Ọ ga-enyekwara anyị aka ozugbo. Ọ na-agụ ya agụụ ịkasi anyị obi ma ọ bụrụ na obi gbawara anyị ma ọ bụkwanụ ma anyị chee na anyị abaghị uru. E nwekwara ọtụtụ nkwa o kwere anyị na-eme ka anyị nwee olileanya. Ha ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị bịaara anyị.​—Aịza. 65:17.

MGBE ANYA MMIRI NA-AGBA GỊ N’IHI NA I CHERE NA OLILEANYA ADỊGHỊZI

15. Olee nsogbu bịaara Hezekaya nke mere ka o bee ákwá?

15 Mgbe Eze Hezekaya nke chịrị Juda dị afọ iri atọ na itoolu, ọ chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa ga-egbu ya. Aịzaya onye amụma gwara ya na Jehova kwuru na ọrịa ahụ ga-egbu ya. (2 Eze 20:1) O yiri ka Hezekaya enweghịzi olileanya. Ozi ahụ gbawara ya obi, ya ebee ezigbo ákwá. Ọ rịọsikwara Jehova arịrịọ ike ka o nyere ya aka.​—2 Eze 20:2, 3.

16. Gịnị ka Jehova meere Hezekaya?

16 Mgbe Jehova nụrụ ekpere Hezekaya, hụkwa anya mmiri ya, o metaara ya ebere ma gwa ya, sị: “Anụla m ekpere gị. Ahụla m anya mmiri gị. M ga-agwọ gị.” Jehova si n’ọnụ Aịzaya kwe ya nkwa na ọ ga-agbatịkwu ndụ ya, napụtakwa Jeruselem n’aka ndị Asiria.​—2 Eze 20:4-6.

17. Olee otú Jehova si akasi anyị obi ma ezigbo ọrịa bịa anyị? (Abụ Ọma 41:3) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

17 Ihe anyị na-amụta. È nwere ọrịa ị na-arịa nke mere ka ọ dị gị ka olileanya adịghịzi? Kpee ekpere ọ bụrụgodị na ị ga-ebe ákwá na-ekpe ya. Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na Jehova ga-akasi anyị obi n’ọnwụnwa niile bịaara anyị. Ọ bụ ‘Nna nke na-emetere ndị mmadụ ebere na Chineke nke na-akasi ndị mmadụ obi n’ụdị ọnọdụ niile ha nọ.’ (2 Kọr. 1:3, 4) Taa, anyị anaghị atụ anya ka Jehova wepụrụ anyị nsogbu niile. Mana, anyị ga-atụkwasịli ya obi ka o nyere anyị aka. (Gụọ Abụ Ọma 41:3.) Jehova na-eji mmụọ nsọ ya enye anyị ike na amamihe, na-emekwa ka obi ruo anyị ala ka anyị nwee ike idi nsogbu anyị. (Ilu 18:14; Fil. 4:13) Ihe ọzọ ọ na-eji akasi anyị obi bụ nkwa o kwere na Baịbụl na ọ ga-ewepụ ụdị ọrịa niile.​—Aịza. 33:24.

Jehova ga-aza ekpere anyị, nye anyị ike na amamihe, meekwa ka obi ruo anyị ala (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)


18. Olee amaokwu Baịbụl na-akasi gị obi ma ezigbo nsogbu bịara gị? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Okwu Ndị Ga-akasi Anyị Obi Mgbe Anyị Na-ebe Ákwá.”)

18 Ihe Jehova gwara Hezekaya kasiri ya obi. Anyị geekwa ihe Jehova si n’Okwu ya bụ́ Baịbụl na-agwa anyị, ọ ga-akasi anyị obi. Jehova mere ka e dee okwu na-akasi obi na Baịbụl ka o mee ka obi ruo anyị ala ma nsogbu bịara anyị. (Rom 15:4) Mgbe a chọpụtara na otu nwanna nwaanyị bi n’Ọdịda Anyanwụ Afrịka na-arịa kansa, o bere ákwá ọtụtụ ugboro. Ọ sịrị: “Otu amaokwu Baịbụl nke na-akasi m ezigbo obi bụ Aịzaya 26:3. Ọ bụ eziokwu na anyị enweghị ike ịhọrọ ụdị nsogbu ga-abịara anyị, ma amaokwu ahụ na-eme ka obi sie m ike na Jehova ga-eme ka obi ruo m ala, nyekwara m aka idi nsogbu ọ bụla bịaara m.” È nwere amaokwu Baịbụl na-akacha akasi gị obi mgbe ezigbo nsogbu bịaara gị ma ọ bụdị mgbe i chere na olileanya adịghịzi?

19. Gịnị ka anyị na-atụ anya ga-eme n’ọdịnihu?

19 Oge ikpeazụ a anyị bi na-akụzi kwarapụ kwarapụ. Anyị na-atụkwa anya na a ga-enwekwu nsogbu ndị nwere ike ịkpatara anyị ihe mgbu, meekwa ka anyị na-ebe ákwá. Ma, dị ka anyị hụrụ n’akụkọ Hana, Devid, na Eze Hezekaya, Jehova na-ahụ anya mmiri na-agba anyị, na-echetakwa ya. Anya mmiri na-agba anyị na-ewute ya n’eziokwu. N’ihi ya, ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, anyị kwesịrị ikpe ekpere kọọrọ Jehova otú ọ dị anyị n’obi. Anyị ekwesịghị ịhapụ ụmụnna anyị hụrụ anyị n’anya gaa nọrọ naanị anyị. Anyị kwesịrị ịna-agụ okwu na-akasi obi dị na Baịbụl ka o mee ka obi ruo anyị ala. Ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị atachie obi ma nọsie ike n’ofufe Jehova, ọ ga-akwụ anyị ụgwọ. Ihe so n’ihe ọ ga-eji kwụọ anyị ụgwọ bụ imezuru anyị nkwa bụ́ ihichapụ anyị anya mmiri niile na-agba anyị n’ihi nsogbu bịaara anyị. (Mkpu. 21:4) N’oge ahụ, ọ bụrụ na anya mmiri agbaa anyị, ọ ga-abụ naanị n’ihi na obi na-atọ anyị ụtọ.

ABỤ NKE 4 “Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”