Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 48

ABỤ NKE 97 Okwu Chineke Na-enye Ndụ

Ihe Anyị Na-amụta n’Ọrụ Ebube Jizọs Rụrụ Nye Ndị Mmadụ Achịcha

Ihe Anyị Na-amụta n’Ọrụ Ebube Jizọs Rụrụ Nye Ndị Mmadụ Achịcha

“Abụ m achịcha na-enye ndụ. Agụụ agaghị agụ onye na-abịakwute m.​—JỌN 6:35.

IHE A GA-AMỤ

Ihe anyị ga-amụta na Jọn isi 6, ebe kọrọ otú Jizọs si rụọ ọrụ ebube jiri achịcha na azụ̀ nyejuo ìgwè mmadụ afọ.

1. Olee uru achịcha bara n’oge e dere Baịbụl?

 IHE ndị mmadụ kacha eri n’oge e dere Baịbụl bụ achịcha. (Jen. 14:18; Luk 4:4) N’eziokwu, ọ dị ezigbo mkpa nke na mgbe ụfọdụ, Baịbụl na-eji “achịcha” anọchi anya nri. (1 Eze 17:11, 12) Jizọs jikwa achịcha rụọ ọrụ ebube abụọ ndị mmadụ ma nke ọma. (Mat. 16:9, 10) Akụkọ otu n’ime ha dị na Jọn isi 6. Ka anyị na-eleba anya n’akụkọ a, anyị ga-achọpụta ihe ndị anyị ga-amụta na ya ga-abara anyị uru taa.

2. Olee mgbe ọtụtụ puku mmadụ chọrọ nri?

2 Mgbe ndịozi Jizọs kwusachara ozi ọma, Jizọs kpọọrọ ha banye n’ụgbọ mmiri gafee Oké Osimiri Galili ka ha zurutụ ike. (Mak 6:7, 30-32; Luk 9:10) Ha rutere n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị na Betsaịda. Ma n’oge na-adịghị anya, ọtụtụ puku mmadụ bịara n’ebe ahụ ka ha hụ Jizọs. Jizọs agbachighị ha nkịtị. O wepụtara oge kụziere ha gbasara Alaeze Chineke, gwọọkwa ndị ọrịa. Mgbe chi chọwara iji, ndị na-eso ụzọ ya nọ na-echegbu onwe ha otú ìgwè mmadụ ahụ ga-esi nweta ihe ha ga-eri. Ọ ga-abụ na ụfọdụ n’ime ha nwere obere nri ha ga-eri. Ma, ọtụtụ n’ime ha ga-aga n’obodo ndị dị nso zụrụ ihe ha ga-eri. (Mat. 14:15; Jọn 6:4, 5) Gịnị ka Jizọs ga-eme?

JIZỌS RỤRỤ ỌRỤ EBUBE MEE KA E NWEE ACHỊCHA

3. Gịnị ka Jizọs gwara ndịozi ya ka ha meere ìgwè mmadụ ahụ? (Kọwaakwa foto.)

3 Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Ha ekwesịghị ịla. Nyenụ ha nri ka ha rie.” (Mat. 14:16) Ihe a yiri ihe na-agaghị ekwe omume n’ihi na e nwere ihe dị ka puku ụmụ nwoke ise (5,000). Ebe ọ bụkwa na e nwere ụmụ nwaanyị na ụmụaka, ha nwere ike iru puku mmadụ iri na ise (15,000) a ga-enye nri. (Mat. 14:21) Andru sịrị: “Lee nwata nwoke bu ogbe achịcha ọka bali ise na obere azụ̀ abụọ. Ma olee otú ha ga-esi zuoro ọtụtụ mmadụ a?” (Jọn 6:9) Ọtụtụ ndị na-erikarị achịcha e ji ọka bali mee. O nwekwara ike ịbụ na e fesara obere azụ̀ ahụ nnu ma mịkpọọ ya. Mana, ole nwata nwoke ahụ bu agaghị eju ìgwè mmadụ há otú ahụ.

Jizọs nyere ndị mmadụ ihe na-akpa ha, kụziekwara ha banyere Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)


4. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta na Jọn 6:11-13? (Kọwaakwa ihe ndị e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

4 Jizọs chọrọ igosi ìgwè mmadụ ahụ obiọma. N’ihi ya, ọ gwara ha ka ha nọrọ n’ìgwè n’ìgwè n’elu ahịhịa. (Mak 6:39, 40; gụọ Jọn 6:11-13.) Baịbụl kwuru na Jizọs kelere Nna ya maka achịcha na azụ̀ ahụ. Ọ dabara adaba ikele Chineke, onye mere ka ha nweta nri ahụ. Ihe ahụ Jizọs mere na-echetara anyị na anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere tupu anyị erie nri, ma mgbe naanị anyị nọ ma mgbe anyị na ndị ọzọ nọ. Jizọs gwaziri ndịozi ya ka ha kesaara ndị mmadụ achịcha na azụ̀ ahụ. Ndị mmadụ rikwara ya, rijuo afọ. Ha rifọdịrị. Ma, Jizọs achọghị ka nke ahụ fọrọ afọ laa n’iyi. N’ihi ya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha tụtụkọta ndị nke ahụ fọrọ afọ ka e nwee ike iri ha n’oge ọzọ. Jizọs ji ihe ahụ kụziere anyị na anyị ekwesịghị ịna-emefusị ihe. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ọ ga-adị mma ka gị na ụmụ gị gụọ akụkọ a ma kwurịta ihe ọ na-akụzi banyere ekpere, ile ọbịa, na imesapụ aka.

Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ekpe ekpere tupu mụ erie nri otú ahụ Jizọs mere?’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)


5. Gịnị ka ndị mmadụ mere n’ihi ihe Jizọs mere n’ụbọchị ahụ? Gịnịkwa ka Jizọs mere?

5 Otú Jizọs si akụzi ihe na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ juru ndị mmadụ anya. Ha ma na Mosis kwuru na Chineke ga-ezite onye amụma pụrụ iche. N’ihi ya, ha nwere ike iche na ọ bụ Jizọs bụ onye amụma ahụ. (Diut. 18:15-18) Ọ bụrụ otú ahụ, o yiri ka hà weere ya na Jizọs ga-abụ ezigbo eze, onye ga na-enye mmadụ niile nọ n’Izrel nri. N’ihi ya, ìgwè mmadụ ahụ chọrọ “ịbịa jide ya ka ha mee ya eze.” (Jọn 6:14, 15) Jizọs kwe ka ha mee ya eze, ọ pụtara na ọ na-etinye aka n’ọchịchị ndị Juu, ndị ndị Rom na-achị. Mana, o meghị otú ahụ. Baịbụl kwuru na Jizọs “gaghachiri n’ugwu naanị ya.” N’ihi ya, n’agbanyeghị na ndị ọzọ chọrọ ịmanye ya ka o tinye aka n’ọchịchị, o kweghị. Ihe a na-akụzikwara anyị ezigbo ihe.

6. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị chọrọ ime ka Jizọs? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

6 O doro anya na ndị mmadụ agaghị agwa anyị ka anyị rụọ ọrụ ebube nye ha achịcha ma ọ bụ gwọọ ha ọrịa ma ọ bụkwanụ ka anyị bụrụ eze ha. Ma, ha nwere ike ịna-agba anyị ume ka anyị tụọ vootu ma ọ bụ ka anyị kwado onye ha chere na ọ ga-eme ka ihe ka mma. Mana, ihe Jizọs mere doro anya. O kweghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. O mechadịrị sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 17:14; 18:36) Ndị Kraịst taa kwesịrị ịgbalị na-eche echiche ka Jizọs, na-emekwa ka ya. Anyị na-akwado Alaeze Chineke, na-ekwusa gbasara ya, na-ekpekwa ekpere ka ọ bịa. (Mat. 6:10) Ka anyị gaghachi n’akụkọ gbasara ọrụ ebube Jizọs rụrụ nye ndị mmadụ achịcha ka anyị hụ ihe ọzọ anyị ga-amụta na ya.

Jizọs ekweghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị Juu ma ọ bụ nke ndị Rom. Anyị kwesịkwara ime ka ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)


“IHE HA KWESỊRỊ ỊGHỌTA N’ỌRỤ EBUBE AHỤ O JI ACHỊCHA RỤỌ”

7. Gịnị ka Jizọs mere, oleekwa ihe ndịozi ya kwuru maka ya? (Jọn 6:16-20)

7 Mgbe Jizọs nyechara ìgwè mmadụ ahụ nri, ọ gwara ndịozi ya ka ha hapụ ebe ahụ banye ụgbọ mmiri laghachi Kapaniọm, yanwa agawazie n’ugwu. O si otú ahụ gbaara ìgwè mmadụ ahụ na-achọ ime ya eze ọsọ. (Gụọ Jọn 6:16-20.) Mgbe ndịozi Jizọs nọ n’ụgbọ mmiri, oké ifufe malitere ife, nke mere ka e nwee oké ebili mmiri. Jizọs jeere ije n’elu mmiri ahụ bịakwute ha. Ọ gwakwara Pita onyeozi ka o jee ije n’elu mmiri ahụ. (Mat. 14:22-31) Mgbe Jizọs batara n’ụgbọ ahụ, oké ifufe ahụ kwụsịrị. O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, ha asị: “Ị bụ Ọkpara Chineke n’eziokwu.” a (Mat. 14:33) Mana, ọ dị ịtụnanya na ọ bụ ugbu a Jizọs jere ije n’elu mmiri ka ha kwuru ihe a, ọ bụghị mgbe ọ rụrụ ọrụ ebube nye ndị mmadụ achịcha. Mak sịrị: “O juru ha ezigbo anya n’ihi na ha aghọtabeghị ihe ha kwesịrị ịghọta n’ọrụ ebube ahụ o ji achịcha rụọ. Kama, ọ ka na-esiri obi ha ike ịghọta ihe.” (Mak 6:50-52) N’eziokwu, ha aghọtaghị na Jehova nyere Jizọs ikike ịrụ ọrụ ebube karịrị inye ndị mmadụ achịcha. Ma, n’oge na-adịghị anya, Jizọs kwuru banyere ọrụ ebube ahụ ọ rụrụ nye ndị mmadụ achịcha, kwuokwa ihe anyị ga-amụta na ya.

8-9. Gịnị mere ìgwè mmadụ ahụ ji chọwa Jizọs? (Jọn 6:26, 27)

8 Ihe ka ìgwè mmadụ ahụ Jizọs nyere nri mkpa bụ igbo mkpa ha na inweta ihe na-agụ ha agụụ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? N’ụbọchị na-eso ya, ha chọpụtara na Jizọs na ndịozi ya esila ebe ahụ pụọ. N’ihi ya, ha banyere n’ụgbọ mmiri ndị si Taịbirias, gawazie Kapaniọm ka ha chọta Jizọs. (Jọn 6:22-24) Ihe mere ha ji mee ya ọ̀ bụ ka Jizọs kụzikwuoro ha banyere Alaeze Chineke? Mba. Ihe kacha ha mkpa bụ ka Jizọs nye ha achịcha ha ga-ata. Olee otú anyị si mara?

9 Lee ihe mere mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ Jizọs n’ebe dị nso na Kapaniọm. Jizọs kwuru hoo haa na ihe mere ha ji chọọ ịhụ ya bụ na ha chọrọ nri. O kwuru na ha ‘tara achịcha, afọ eju ha.’ Ọ kpọrọ ya “nri nke na-ala n’iyi.” Ọ gwara ha ka ha rụọ ọrụ inweta “nri nke ga-adịru ebighị ebi.” (Gụọ Jọn 6:26, 27.) Jizọs kwuru na ọ bụ Nna ya na-enye ụdị nri ahụ. Ọ ga-abụ na o juru ìgwè mmadụ ahụ anya mgbe ha nụrụ na e nwere nri ha ga-eri nweta ndụ ebighị ebi. Olee ụdị nri ọ bụ? Oleekwa otú ha ga-esi enweta ya?

10. Gịnị bụ “ọrụ dị Chineke mma” ndị Juu ahụ kwesịrị ịmụta gbasara ya?

10 Ndị Juu ahụ chọrọ ịma ihe ha ga-eme ma ọ bụ ọrụ ha ga-arụ ka ha nweta ụdị nri ahụ. O nwere ike ịbụ na ha chere na “ọrụ” ahụ bụ ime ihe Iwu Mosis kwuru. Ma, Jizọs gwara ha, sị: “Ọrụ dị Chineke mma unu ga-arụ bụ inwe okwukwe n’onye o zitere.” (Jọn 6:28, 29) Inwe okwukwe n’onye na-anọchite anya Chineke dị mkpa iji ‘nweta ndụ ebighị ebi.’ Jizọs ebula ụzọ kwuo gbasara ihe a. (Jọn 3:16-18, 36) E nwekwara ihe ndị ọzọ ọ ga-emecha kwuo gbasara otú anyị ga-esi nweta ndụ ebighị ebi.​—Jọn 17:3.

11. Olee otú ndị Juu ahụ si gosi na ihe bụ́ mkpa ha bụ ịta achịcha tajuo afọ? (Abụ Ọma 78:24, 25)

11 Ndị Juu ahụ ekwetaghị ihe ọhụrụ ahụ Jizọs kụziri gbasara “ọrụ dị Chineke mma.” Ha jụrụ ya, sị: “Olee ọrụ ebube ị ga-arụ, ka anyị hụ ya ma kwere na gị?” (Jọn 6:30) Ha kwuru na Chineke nyere ndị nna nna ha mana n’oge Mosis, nke e nwere ike iji tụnyere achịcha. (Nehe. 9:15; gụọ Abụ Ọma 78:24, 25.) O doro anya na obi ha niile dị n’inweta achịcha nkịtị. Ha agwadịghị Jizọs ka ọ kọwaara ha ihe ọzọ o kwuru banyere “ezigbo achịcha si n’eluigwe,” nke yiri mana si n’eluigwe nke na-enye ndụ. (Jọn 6:32) Ihe bụ́ mkpa ha bụ ihe ga-egboro ha mkpa ha. O mere ka ha ghara ịchọ ịmụta eziokwu Jizọs chọrọ ịkụziri ha. Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ a?

IHE KWESỊRỊ ỊKACHA ANYỊ MKPA

12. Olee otú Jizọs si gosi ihe kwesịrị ịkacha anyị mkpa?

12 E nwere ihe dị ezigbo mkpa anyị kwesịrị ịmụta n’ihe a kọrọ na Jọn isi 6. Ihe kwesịrị ịkacha anyị mkpa bụ irubere Jehova isi na anyị na ya ịdị ná mma. Cheta na Jizọs mere ka ihe a doo anya mgbe ọ na-ajụ ọnwụnwa Setan. (Mat. 4:3, 4) Mgbe ọ nọkwa na-akụzi ihe n’elu ugwu, o kwuru na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na Chineke dịrị ná mma. (Mat. 5:3) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Otú m si ebi ndụ ọ̀ na-egosi na mụ na Chineke ịdị ná mma dị mụ mkpa karịa ime ihe na-agụ m agụụ?’

13. (a) Gịnị mere iri nri adịghị njọ? (b) Gịnị ka Pọl dọrọ anyị aka ná ntị banyere ya? (1 Ndị Kọrịnt 10:6, 7, 11)

13 Ikpe ekpere maka ihe ndị bụ́ mkpa anyị na iji ha eme onwe anyị obi ụtọ adịghị njọ. (Luk 11:3) Baịbụl kwuru na ọ dị mma mmadụ “iri ihe na ịṅụ mmanya na ikpori ndụ n’ihi ọrụ ọ na-arụsi ike,” nakwa na o ‘si n’aka ezi Chineke.’ (Ekli. 2:24; 8:15; Jems 1:17) Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ihe ndị na-akpa anyị ghara ịbụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. Pọl onyeozi mere ka o doo anya mgbe ọ na-edegara Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu akwụkwọ ozi obere oge tupu e bibie Jeruselem. O kwuru banyere ihe ndị Izrel mere n’oge gara aga, ma nke ha mere n’ebe dị nso n’Ugwu Saịnaị. Ọ dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị ‘ka ihe ọjọọ ghara ịna-agụ ha agụụ otú ọ gụrụ’ ndị Izrel. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:6, 7, 11.) Jehova rụrụ ọrụ ebube nye ndị Izrel ahụ nri. Ma, akpịrị ogologo ha mere ka ọ ghọọrọ ha “ihe ọjọọ.” (Ọnụ Ọgụ. 11:4-6, 31-34) Mgbe ha fere chi nwa ehi, ha gosiri na ihe ka ha mkpa bụ iri ihe, ịṅụ mmanya, na ikpori ndụ, ọ bụghị irubere Jehova isi. (Ọpụ. 32:4-6) Pọl ji ihe ndị Izrel mere dọọ Ndị Kraịst aka ná ntị mgbe ọ fọrọ obere ka e bibie Jeruselem na ụlọ nsọ ya n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst. N’oge a anyị bi, ọ fọla obere ka e bibie ụwa ochie a. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ndụmọdụ Pọl ahụ kpọrọ ihe.

14. N’ụwa ọhụrụ, gịnị ka anyị na-atụ anya ya n’ihe gbasara nri?

14 Mgbe Jizọs gwara anyị ka anyị rịọ Chineke ka o “nye anyị nri taa,” o kwukwara ka anyị na-ekpe ekpere ka uche Chineke mee “n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Mat. 6:9-11) Gịnị ka ihe a na-echetara gị? Baịbụl kwuru na inwe ezigbo nri so n’ihe bụ́ uche Chineke maka ụwa a. Dịkwa ka e kwuru n’Aịzaya 25:6-8, nri na-atọ ụtọ ga-eju eju bara abara n’ụwa mgbe Alaeze Chineke ga na-achị. Abụ Ọma 72:16 sịrị: “Nri ga-eju n’ụwa. Ọ ga-eju eju n’elu ugwu dị iche iche.” Ị̀ na-atụsi anya ike mgbe ị ga-esi nri kacha amasị gị ma ọ bụkwanụ nke ị na-esitụbeghị? Ihe ọzọ bụ na ị ga-akọ ubi vaịn, ṅụọkwa mmanya si na ya. (Aịza. 65:21, 22) Mmadụ niile nọ n’ụwa ga na-ekporikwa ndụ.

15. Gịnị ka a ga-akụziri ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ? (Jọn 6:35)

15 Gụọ Jọn 6:35. Chegodị gbasara ndị ahụ tara achịcha na azụ̀ Jizọs nyere ha. N’oge a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ, i nwere ike ịhụ ụfọdụ n’ime ha. Ọ bụrụgodị na ha enweghị okwukwe na Jizọs n’oge gara aga, a ka nwere ike ịkpọlite ha. (Jọn 5:28, 29) Ma, ọ ga-adị mkpa ka ha mụta ihe mere Jizọs ji sị: “Abụ m achịcha na-enye ndụ. Agụụ agaghị agụ onye na-abịakwute m.” Ọ ga-adị mkpa ka ha nwee okwukwe n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ maka ha. N’oge ahụ, a ga-enwe otú a haziri a ga-esi akụziri ndị a kpọlitere n’ọnwụ nakwa ụmụ ndị a ga-amụ mgbe ahụ ihe. Obi ga-atọ anyị ezigbo ụtọ iso kụziere ndị a ihe. Ịkụziri ndị mmadụ ihe ga-atọ gị ụtọ karịa ịta achịcha. N’eziokwu, ihe ga-aka anyị mkpa bụ ihe gbasara Jehova.

16. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-eso nke a?

16 Anyị elebala anya n’ihe ụfọdụ e kwuru na Jọn isi 6. Ma, a ka nwere ihe ndị ọzọ Jizọs ga-akụzi banyere “ndụ ebighị ebi.” Ndị Juu ndị ahụ Jizọs gwara okwu kwesịrị ige ntị nke ọma ka ha nụ ihe ọ ga-akụziri ha. Anyị kwesịkwara ime otú ahụ. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị ọzọ e kwuru na Jọn isi 6.

ABỤ NKE 20 I Nyere Anyị Ọkpara Ị Hụrụ n’Anya

a Ị chọọ ịmatakwu gbasara akụkọ a, gụọ akwụkwọ bụ́ Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ, peeji nke 131, nakwa Ṅomie Okwukwe Ha, peeji nke 185.