Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-erubere Jehova Isi Na-emezu Nkwa Ha Kwere Ya

Ndị Na-erubere Jehova Isi Na-emezu Nkwa Ha Kwere Ya

IHE I NWERE IKE ỊMỤ

Ndị Na-erubere Jehova Isi Na-emezu Nkwa Ha Kwere Ya

Gụọ Ndị Ikpe 11:30-40 ka ị hụ ihe anyị ga-amụta n’aka Jefta na ada ya banyere imezu nkwa.

Chebara akụkọ ahụ echiche. Olee otú ndị Izrel ji obi ha niile fee Jehova si lee nkwa ha kwere ya anya? (Ọnụ Ọgụ. 30:2) Olee otú Jefta na ada ya si gosi na ha nwere okwukwe na Jehova?​—Ikpe 11:9-11, 19-24, 36.

Matakwuo ihe mere. Olee nkwa Jefta kwere Jehova, gịnịkwa ka o bu n’obi kwe ya? (w16.04 7 ¶12) Gịnị ka Jefta na ada ya hapụrụ ka ha nwee ike imezu nkwa ahụ? (w16.04 7-8 ¶14-16) Olee nkwa ụfọdụ dị ezigbo mkpa Ndị Kraịst na-ekwe Jehova?​—w17.04 5-8 ¶10-19.

Chebara ihe ndị ị mụtara echiche. Jụọ onwe gị, sị:

• ‘Gịnị ga-enyere m aka imezu nkwa m kwere Jehova mgbe m nyefere ya onwe m?’ (w20.03 13 ¶20)

• ‘Olee ihe ndị m nwere ike ịhapụ ka m nwee ike ijekwuru Jehova ozi?’

• ‘Gịnị ka m ga-eme ka m nwee ike imezu nkwa m kwere di m ma ọ bụ nwunye m n’ụbọchị anyị gbara akwụkwọ?’ (Mat. 19:5, 6; Efe. 5:28-33)