Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 50

ABỤ NKE 135 Jehova Ji Obiọma Na-arịọ: “Mara Ihe, Nwa M”

Ndị Nne na Nna, Na-enyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Nwee Okwukwe Siri Ike

Ndị Nne na Nna, Na-enyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Nwee Okwukwe Siri Ike

‘Chọpụtanụ ihe bụ́ uche Chineke, nke dị mma, nke zuru okè, nke na-emekwa ya obi ụtọ.’​—ROM 12:2.

IHE A GA-AMỤ

Ihe ndị ga-enyere ndị nne na nna aka ka ha na ụmụ ha na-ekwurịta okwu nke ọma, nyekwara ha aka inwe okwukwe siri ike na Chineke nakwa na Baịbụl.

1-2. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ime ma nwa ha jụọ ha ajụjụ gbasara ihe anyị kweere?

 ỌTỤTỤ ndị ga-ekweta na ịzụ ụmụ abụghị obere ọrụ. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, anyị na-aja gị mma n’otú i si agbasi mbọ ike ka ụmụ gị nwee okwukwe siri ike. (Diut. 6:6, 7) Ka nwa gị na-eto, o nwere ike ịjụwa ajụjụ ndị dị mkpa gbasara ihe ndị anyị kweere nakwa ihe Baịbụl kwuru bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.

2 Na mbụ, i nwere ike ịna-echegbu onwe gị maka ajụjụ ndị a nwa gị na-ajụ. I nwere ike ịna-eche na ajụjụ ọ na-ajụ na-egosi na okwukwe ya esichaghị ike. Mana nke bụ́ eziokwu bụ na nwatakịrị kwesịrị ịna-ajụ ajụjụ ka okwukwe ya sie ike. (1 Kọr. 13:11) N’ihi ya, ụjọ ekwesịghị ijide gị. Ọ bụrụ na ọ jụọ ajụjụ, i nwere ike iji ya nyere ya aka ka ọ mụta iche echiche nke ọma. Ọ ga-eme ka okwukwe o nwere na Chineke nakwa na Baịbụl sikwuo ike.

3. Gịnị ka anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu a?

3 N’isiokwu a, anyị ga-ekwu otú ndị nne na nna ga-esi enyere ụmụ ha aka (1) inwe okwukwe siri ike, (2) ịghọta uru irubere ihe Baịbụl kwuru bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ isi na-aba, na (3) ịmata otú ha ga-esi akọwara ndị ọzọ ihe ha kweere. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe mere o ji dị mma ka ụmụaka na-ajụ ajụjụ, nakwa ihe ụfọdụ gị na ụmụ gị nwere ike ime ka o nyere unu aka ikwurịta gbasara ihe ndị anyị kweere.

NYERE NWA GỊ AKA KA O NWEE OKWUKWE SIRI IKE

4. Olee ajụjụ ụfọdụ nwatakịrị nwere ike ịjụ? Maka gịnị?

4 Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ma na inwe okwukwe na Chineke abụghị ihe nwata na-ebu apụta ụwa. Gịnwa enweghị okwukwe na Jehova mgbe a mụrụ gị. Otú ahụ ka ọ dịkwa nwa gị. Ka oge na-aga, nwa gị nwere ike ịjụwa ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee otú m si mara na Chineke dị? Obi ọ̀ ga-esili m ike na ihe Baịbụl na-ekwu bụ eziokwu?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị na-echebara ihe “echiche” ma ‘na-achọpụta nke bụ́ eziokwu n’ihe niile.’ (Rom 12:1; 1 Tesa. 5:21) Gịnịzi ka ị ga-eme iji nyere nwa gị aka ka okwukwe ya sikwuo ike?

5. Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ime ka okwukwe nwa ha nwere na Baịbụl sikwuo ike? (Ndị Rom 12:2)

5 Nyere nwa gị aka ịchọpụta na ihe Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu. (Gụọ Ndị Rom 12:2.) Nwa gị jụọ gị ajụjụ, jiri ohere ahụ gosi ya otú ọ ga-esi eji ihe ndị anyị ji eme nchọnchọ achọta azịza ya, dị ka Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ. N’isiokwu bụ́ “Baịbụl,” o nwere ike ịchọ isiokwu bụ́ “Mmụọ Nsọ Duru Ndị Dere Ya” ka ọ chọpụta ihe ndị gosiri na Baịbụl bụ “okwu Chineke,” ọ bụghị naanị ezigbo akwụkwọ ndị mmadụ dere. (1 Tesa. 2:13) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime nchọnchọ gbasara obodo Ninive dị n’Asiria oge ochie. N’oge gara aga, ndị na-akatọ Baịbụl kwuru na e nwetụbeghị obodo a kpọrọ Ninive. Mana, n’ihe dị ka n’afọ 1850, ndị na-eme nchọnchọ gwupụtara ihe ụfọdụ gbasara obodo Ninive oge ochie n’ala, nke gosiri na ihe Baịbụl kwuru gbasara ya bụ eziokwu. (Zef. 2:13-15) Iji matakwuo banyere otú mbibi Ninive si mezuo amụma Baịbụl, i nwere ike ịgụ isiokwu bụ́ “Ị̀ Maara?” nke dị n’Ụlọ Nche Nọvemba 2021. Ka nwa gị na-atụle ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ anyị na ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ ndị ọzọ e ji eme nchọnchọ a tụkwasịrị obi, obi ga-esi ya ike na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu.

6. Olee otú ndị nne na nna ga-esi enyere nwa ha aka ịhụ ihe ndị na-egosi na Baịbụl na-ekwu eziokwu? Nye ihe atụ. (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

6 Na-enyere nwa gị aka iche echiche nke ọma. Ndị nne na nna nwere ohere dị iche iche ha na nwa ha ga-eji kwurịta banyere Baịbụl ma ọ bụ inwe okwukwe na Chineke. Ha nwere ike ime otú a ma ha gaa ilegharị anya n’ebe a na-edowe ihe ndị mgbe ochie, n’ogige a kụrụ osisi dị iche iche, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na unu agaa ilegharị anya n’ebe a na-edowe ihe ndị mgbe ochie ma ọ bụkwanụ na unu na-ele ya na vidio, i nwere ike ịgwa nwa gị banyere ihe ndị mere n’oge ochie ma ọ bụ akụkọ a kọrọ n’oge gara aga gbasara ihe dị na Baịbụl. Ihe a nwere ike inyere ya aka ịchọpụta na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. I nwere ike ịgwa nwa gị banyere otu nkume ndị Moab oge ochie. Nkume ahụ agbaala puku afọ atọ. E dekwara aha Jehova na ya. Nkume a dị n’otu ebe a na-edowe ihe ndị mgbe ochie na Paris dị na Frans. A kpụkwara ya n’ebe a na-elegharị anya n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Wọwik dị na Niu Yọk. Ị ga-ahụ ya n’ebe a na-egosi banyere Baịbụl na aha Chineke. Nkume ahụ na-egosi na eze Moab aha ya bụ Misha nupụụrụ Izrel isi. Ihe a dabara n’ihe Baịbụl kwuru. (2 Eze 3:4, 5) Ọ bụrụ na nwa gị ejiri anya ya hụ ihe ndị gosiri na Baịbụl na-ekwu eziokwu, nakwa na ihe ndị ọ kọrọ akụkọ ha ziri ezi, okwukwe ya ga-esikwu ike.​—I nwere ike ịtụle 2 Ihe E Mere 9:6.

I nwere ike inyere nwa gị aka ka okwukwe ya sikwuo ike na Chineke nakwa na Baịbụl ma gị na ya na-ekwurịta ihe ndị mgbe ochie gosiri na Baịbụl bụ eziokwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)


7-8. (a) Gịnị ka anyị nwere ike isi n’ihe ndị magburu onwe ha Chineke kere mụta? Nye ihe atụ. (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.) (b) Olee ajụjụ ndị nwere ike inyere nwa gị aka ka obi sie ya ike na e nwere Onye kere ihe niile?

7 Gbaa nwa gị ume ka o chee gbasara ihe ndị Jehova kere. Mgbe gị na nwa gị na-aga n’ubi ma ọ bụ n’ebe e nwere osisi, nyere ya aka ka ọ hụ otú dị ịtụnanya ihe ụfọdụ e kere eke na-adịkarị. Maka gịnị? Ọ bụ maka na otú dị ịtụnanya Chineke si kee ha gosiri na e nwere onye ma ihe kere ha. Dị ka ihe atụ, e nwere ihe ụfọdụ e kere eke na-adị ka eriri a gbakụrụ agbakụ. Ndị sayensị amụọla gbasara ha ruo ọtụtụ afọ. Otu onye sayensị aha ya bụ Nicola Fameli kọwara na ị mụọ gbasara otú e si hazie ihe ndị ahụ e kere eke, ị ga-ahụ na ha nwere ọnụ ọgụgụ dị n’usoro. Ọ bụ otu nwoke a na-akpọ Fibonacci chọpụtara ọnụ ọgụgụ ahụ. Ihe ụfọdụ dị otú ahụ bụ ụfọdụ ụyọkọ kpakpando, ihe ndị dị ná mmiri yiri eju, akwụkwọ osisi, na okooko osisi a na-akpọ sọnflawa. a

8 Ka nwa gị na-amụkwu gbasara sayensị n’ụlọ akwụkwọ, ọ ga-amụtakwa na a haziri ihe ndị ọzọ e kere eke ahazi nke ọma. Were osisi dị ka ihe atụ. I lee osisi anya, ị ga-ahụ na a haziri ya nke ọma. Osisi na-enwe úkwù, nwee alaka ma ndị obere ma ndị nnukwu, nweekwa akwụkwọ. A na-ahụkwa ụdị ihe a n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ e kere eke. Ma, ònye kere ihe ndị a mara ezigbo mma? Ònye haziri ha ha amaa mma otú ahụ? Nwa gị chebakwuoro ajụjụ ndị a echiche, o nwere ike ime ka okwukwe ya sie ike na ọ bụ Chineke kere ihe niile. (Hib. 3:4) Ka nwa gị na-etokwu, i nwere ike ịjụ ya, sị: “Ebe ọ bụ Chineke kere anyị, ì chere na ọ ma otú kacha mma anyị ga-esi na-akpa àgwà ka obi na-adị anyị ụtọ?” I nweziri ike ịgwa ya na Chineke nyere anyị Baịbụl iji gosi anyị ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-enwe obi ụtọ.

NASA, ESA, and the Hubble Heritage (STScl/AURA)-ESA/Hubble Collaboration

Ònye haziri ihe ndị magburu onwe ha anyị na-ahụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8)


NYERE NWA GỊ AKA ỊGHỌTA URU IME IHE BAỊBỤL KWURU GA-ABARA YA

9. Gịnị nwere ike ime ka nwa gị jụọ gị ajụjụ gbasara ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ?

9 Nwa gị jụọ gị gbasara ihe Baịbụl kwuru bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, gbalịa ka ị chọpụta ihe mere o ji na-ajụ gị ajụjụ ahụ. Ihe mere o ji jụọ ya ọ̀ bụ na o kwetaghị na ihe Baịbụl kwuru dabara adaba, ka ọ̀ bụ na ọ maghị otú ọ ga-esi akọwara ya ndị ọzọ? Nke ọ bụla ọ bụ, i nwere ike iji akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi nyere ya aka ka ọ ghọta ihe mere ime ihe Baịbụl kwuru ji aba uru. b

10. Olee otú i nwere ike isi enyere nwa gị aka ka o jiri adịm ná mma ya na Jehova kpọrọ ihe?

10 Nyere nwa gị aka ka o jiri adịm ná mma ya na Jehova kpọrọ ihe. Ka gị na nwa gị na-amụ Baịbụl, gbalịa ka i jiri ajụjụ nakwa ihe atụ ndị dị n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi mata ihe dị ya n’obi. (Ilu 20:5) Dị ka ihe atụ, isi nke 8 ji Jehova tụnyere ezigbo enyi mmadụ na-echetara ya ihe ndị ga-abara ya uru ma chebe ya. Gị na ya gụchaa 1 Jọn 5:3, i nwere ike ịjụ ya, sị: “Ebe ọ bụ na ị matala na Jehova bụ ezigbo enyi gị, olee otú i kwesịrị isi ewere ihe ndị ọ na-agwa anyị mee?” Ajụjụ ahụ nwere ike iyi ajụjụ dị mfe. Ma, ọ ga-enyere ya aka ịghọta na ihe mere Jehova ji enye anyị iwu bụ na ọ hụrụ anyị n’anya.​—Aịza. 48:17, 18.

11. Olee otú i nwere ike isi nyere nwa gị aka iji ihe Baịbụl kwuru kpọrọ ihe? (Ilu 2:10, 11)

11 Gị na ya kwurịta uru ime ihe Baịbụl kwuru ga-abara ya. Unu gụwa Baịbụl ma ọ bụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị, kwurịtanụ ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru baarala ezinụlọ unu uru. Dị ka ihe atụ, nwa gị ọ̀ chọpụtala uru ịrụsi ọrụ ike na ikwu eziokwu na-aba? (Hib. 13:18) I nwekwara ike inyere ya aka ka ọ ghọta otú ime ihe Baịbụl kwuru si eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ, ahụ́ ana-agbasikwa ya ike. (Ilu 14:29, 30) Gị na nwa gị ikwurịta ihe ndị a nwere ike inyere ya aka iji ndụmọdụ dị na Baịbụl kpọrọkwuo ihe.​—Gụọ Ilu 2:10, 11.

12. Olee otú otu nwanna si enyere nwa ya aka ịghọta uru ime ihe Baịbụl kwuru na-aba?

12 E nwere otu nwanna aha ya bụ Steve bi na Frans. Ọ kọwara otú ya na nwunye ya si nyere nwa ha nwoke dị afọ iri na isii aha ya bụ Ethan aka ka ọ ghọta na ihe mere Jehova ji enye anyị iwu bụ na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ sịrị: “Anyị na-ajụ ya ajụjụ ndị dị ka, ‘Gịnị mere Jehova ji chọọ ka anyị mee ihe a? Olee otú ihe a si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya? Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị emeghị ihe a o kwuru?’” Ihe a Ethan na ndị mụrụ ya na-ekwurịta emeela ka obi sie ya ike na iwu Jehova dị mma. Steve sịrị: “Ihe bụ́ mkpa anyị bụ inyere Ethan aka ịghọta na amamihe ndị dị na Baịbụl bara uru karịa amamihe mmadụ.”

13. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ịna-eme ihe Baịbụl kwuru? Nye ihe atụ.

13 Zụọ nwa gị ka ọ na-eme ihe Baịbụl kwuru. E nwere ike ịgwa nwa gị ka ọ gụọ otu akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ. Ndị a kọrọ akụkọ ha n’akwụkwọ ahụ nwere ike ịna-eme ihe Jehova kwuru na ọ dị njọ. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịna-eme omume rụrụ arụ ma ọ bụ na-eme tigbuo zọgbuo. A na-edekwa ụdị akwụkwọ ndị ahụ otú ọ ga-eyi ka ihe ndị ahụ adịghị njọ. I nwere ike ịgwa nwa gị ka o chee gbasara otú obi na-adị Jehova ma ndị mmadụ na-eme ụdị omume ndị ahụ. (Ilu 22:24, 25; 1 Kọr. 15:33; Fil. 4:8) Ihe ahụ nwere ike inyere ya aka ka o jikere ejikere izi onye nkụzi ya na ụmụ akwụkwọ ibe ya ozi ọma ma ha kwurịtawa gbasara akwụkwọ ahụ.

KỤZIERE NWA GỊ OTÚ Ọ GA-ESI AKỌWARA NDỊ ỌZỌ IHE O KWEERE

14. Olee ihe e nwere ike ikwulite, ụjọ abịa Onye Kraịst na-eto eto? Maka gịnị?

14 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike obi agaghị esi ụfọdụ Ndị Kraịst na-eto eto ike ịkọwa ihe ha kweere. E kwuwe na e keghị ihe ndị dị ndụ eke na klas ha, ụjọ nwere ike ịbịa ha. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị nkụzi ha nwere ike ịna-ekwu na ọ bụ eziokwu. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, olee otú ị ga-esi enyere nwa gị aka ka obi sie ya ike na ihe o kweere bụ eziokwu?

15. Gịnị nwere ike inyere Onye Kraịst na-eto eto aka ka obi sikwuo ya ike n’ihe o kweere?

15 Nyere nwa gị aka ka obi sikwuo ya ike n’ihe o kweere. Ihere ekwesịghị ime nwa gị n’ihi na o kwetara na e nwere Onye kere ihe niile. (2 Tim. 1:8) Maka gịnị? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị sayensị ghọtara na ihe ndị dị ndụ anọkataghị dịrị. Ha achọpụtala na e nwere onye ma ihe kere ihe ndị dị ndụ dị ịtụnanya. Ihe a emeela ka ha ghara ikwere na ihe niile nọkatara dịrị otú a na-akụzi n’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ n’ụwa niile. Otu ihe nwere ike inyere nwa gị aka ka o kwetasie ike n’ihe o kweere ma nwekwuo obi ike bụ ịchọpụta ihe nyeere ụmụnna anyị aka ikweta na e kere ihe ndị dị ndụ eke. c

16. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere nwa ha aka ịkọwara ndị ọzọ ihe mere o ji kwere na e nwere Onye kere ihe niile? (1 Pita 3:15) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

16 Nyere nwa gị aka ka o nwee ike ịkọwara ndị ọzọ ihe mere o ji kwere na e nwere Onye kere ihe niile. (Gụọ 1 Pita 3:15.) O nwere ike ịbara gị uru ma gị na nwa gị gụọ isiokwu ndị gbara na jw.org ndị dị n’ebe e dere “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị​—È Nwere Onye Kere Ihe Niile Ka Ọ̀ Bụ na E Nweghị?” Kwurịtanụ ihe dị ebe ahụ nwa gị chere na ọ ga-akacha enyere ya aka ịkọwara ndị ọzọ eziokwu o kweere gbasara Onye kere ihe niile. Chetara ya na o kwesịghị ịga ka ya na ụmụ akwụkwọ ibe ya rụwa ụka. Gbaa ya ume ka o jiri okwu ndị dị mfe nghọta, ndị ga-emekwa ka mmadụ chee echiche, nyere ndị chọrọ ige ya ntị aka ịghọta ihe ọ chọrọ ikwu. Dị ka ihe atụ, nwa akwụkwọ ibe ya nwere ike ịsị: “M na-ekwere naanị ihe m ga-ahụli anya. Ahụbeghịkwanụ m Chineke anya.” Nwa gị nwere ike ịsị ya: “Weregodị ya na ị na-aga n’oké ọhịa dị ezigbo anya n’ebe ndị mmadụ bi, gị ahụ otu ụlọ mara mma. Gịnị ka ị ga-eche? Ọ bụrụ na ụlọ ahụ na-egosi na e nwere onye ma ihe rụrụ ya, ọ̀ bụ na ụwa anyị na ihe ndị dị ndụ dị na ya anaghị egosi na e nwere onye kere ya?”

Jiri ihe ndị dị mfe nghọta, ndị ga-emekwa ka mmadụ chee echiche, kọwaa ihe i kweere mgbe gị na ụmụ akwụkwọ ibe gị na-ekwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17) d


17. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi gbaa nwa ha ume ka ọ na-achọpụta ohere ọ ga-eji na-agwa ndị ọzọ ihe o kweere gbasara Baịbụl? Nye ihe atụ.

17 Gbaa nwa gị ume ka ọ chọta ohere ọ ga-eji na-agwa ndị ọzọ eziokwu dị na Baịbụl. (Rom 10:10) I nwere ike iji ịkụziri ndị ọzọ gbasara Baịbụl tụnyere mmadụ ịmụ otú e si akpọ ụbọ. Ná mmalite, onye ahụ nwere ike ịmụta otú e si akpọ ụda egwú ndị dị mfe. Ma, ka oge na-aga, ịkpọ ụbọ ga-adịkwuru ya mfe. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị mgbe mbụ onye na-eto eto bụ́ Onye Kraịst na-agwa ndị ọzọ gbasara ihe o kweere. O nwere ike iji ihe dị mfe mee ya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịjụ nwa akwụkwọ ibe ya, sị: “Ị̀ ma na ndị sayensị na-elerekarị anya n’ihe ndị e kere eke emepụta ihe? Ka m gosi gị otu vidio ga-atọ gị ụtọ.” O gosichaa ya otu vidio si n’isiokwu bụ́ È Kere Ya Eke? o nwere ike ịsị ya: “Ọ bụrụ na a na-eto onye sayensị maka ilere anya n’ihe ndị e kere eke rụpụta ihe, ònyekwanụ ka anyị kwesịrị ito maka ihe ahụ o leere anya rụpụta nke ya?” Ụdị ihe a nwere ike ime ka nwa akwụkwọ ibe ya ahụ chọọ ịmụtakwu gbasara Jehova.

AKWỤSỊLA INYERE NWA GỊ AKA KA OKWUKWE YA NA-ESI IKE

18. Olee otú ndị nne na nna ga-esi na-enyere ụmụ ha aka inwe okwukwe na Jehova?

18 Anyị bi n’ụwa ndị juru na ya bụ ndị na-enweghị okwukwe na Jehova. (2 Pita 3:3) N’ihi ya, ndị nne na nna, unu na nwa unu mụwa Baịbụl, gbaanụ ya ume ka ọ chọpụta isiokwu ndị ga-enyere ya aka ijikwu Baịbụl na ihe Chineke kwuru bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ akpọrọ ihe. Jirinụ ihe dị iche iche Jehova kere mee ka ọ na-eche echiche nke ọma, na-enwekwukwa okwukwe na Jehova. Nyerenụ ya aka ịghọta amụma ndị dị na Baịbụl ndị mezurulanụ. Nke ka nke, na-ekperenụ ya ekpere, ma mgbe unu na ya nọ ma mgbe unu na-ekpe nke onwe unu. Unu mee otú ahụ, obi sie unu ike na Jehova ga-agọzi mbọ ọ bụla unu na-agba ime ka ụmụ unu nwee okwukwe na ya.​—2 Ihe 15:7.

ABỤ NKE 133 Fee Jehova n’Oge Ị Na-eto Eto

a Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, lee vidio dị na jw.org aha ya bụ The Wonders of Creation Reveal God’s Glory—Patterns.

b Ọ bụrụ na nwa gị amụchaala akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, gị na ya nwere ike ilebagharị anya n’ihe ndị e kwuru ná nkebi nke 3 na nke 4 ebe kwuru gbasara ihe Baịbụl kwuru bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.

c Gụọ isiokwu bụ́ “Why We Believe in a Creator” nke gbara na Teta! Bekee nke September 2006, na broshọ bụ́ The Origin of Life​—Five Questions Worth Asking. I nwekwara ike ịchọta ihe atụ ndị ọzọ na vidio ndị na-agba na jw.org n’isiokwu bụ́ Ihe Ndị Mmadụ Kwuru Mere Ha Ji Kwere na Chineke Dị.

d NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-eto eto na-egosi nwa akwụkwọ ibe ya otu vidio dị n’isiokwu bụ́ È Kere Ya Eke?