Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 49

ABỤ NKE 147 Jehova Kwere Anyị Nkwa Ndụ Ebighị Ebi

Olee Otú Ị Ga-esi Enweta Ndụ Ebighị Ebi?

Olee Otú Ị Ga-esi Enweta Ndụ Ebighị Ebi?

“Onye ọ bụla nke nabatara Ọkpara ahụ ma nwee okwukwe na ya [ga-enwe] ndụ ebighị ebi.”​—JỌN 6:40.

IHE A GA-AMỤ

Otú àjà Jizọs Kraịst si abara ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ uru.

1. Gịnị ka ụfọdụ ndị chere gbasara ụmụ mmadụ ịdị ndụ ebighị ebi?

 ỌTỤTỤ ndị na-eri nri na-edozi ahụ́ ma na-emega ahụ́ mgbe niile ka ahụ́ gbasie ha ike. Ma, ha anaghị eme ya ka ha dịrị ndụ ebighị ebi. O nwere ike ịbụ na ha chere na ịdị ndụ ebighị ebi agaghị ekwe omume. Ma, ihe Jizọs kwuru na Jọn 3:16 na 5:24 gosiri na ụmụ mmadụ ga-adịli “ndụ ebighị ebi.”

2. Gịnị ka Jọn isi 6 kwuru gbasara ndụ ebighị ebi? (Jọn 6:39, 40)

2 Otu ụbọchị, Jizọs rụrụ ọrụ ebube nye ọtụtụ puku mmadụ azụ̀ na achịcha. a Ihe ahụ dị ịtụnanya. Mana, ihe o kwuru n’ụbọchị na-eso ya kadị dị ịtụnanya. Ìgwè mmadụ ahụ chọ ya gaa Kapaniọm nke dị nso n’akụkụ Oké Osimiri Galili. Ọ nọkwa ebe ahụ gwa ha na e nwere ike ịkpọlite ha n’ọnwụ, ha adịrị ndụ ebighị ebi. (Gụọ Jọn 6:39, 40.) Chegodị gbasara ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị nwụrụ anwụ. Ihe Jizọs kwuru gosiri na a ga-akpọliteli ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ nakwa na gị na ndị ị hụrụ n’anya ga-adịli ndụ ebighị ebi. Ma, ihe ọzọ Jizọs kwuru na Jọn isi 6 siiri ọtụtụ n’ime ndị ahụ ike ịghọta, ọ ka na-esikwara ọtụtụ ndị ike taa. Ka anyị lebakwuoro ihe ahụ o kwuru anya.

3. Dị ka e kwuru na Jọn 6:51, gịnị ka Jizọs gwara anyị gbasara onwe ya?

3 Mgbe Jizọs rụchara ọrụ ebube nye ìgwè mmadụ ahụ achịcha, ha chewere gbasara mana ahụ Jehova nyere ndị Izrel mgbe ha nọ n’ala ịkpa. Baịbụl kpọdịrị mana ahụ “achịcha si n’eluigwe.” (Ọma 105:40; Jọn 6:31) Jizọs ji ihe o kwuru gbasara mana kụziere ìgwè mmadụ ahụ ihe dị ezigbo mkpa. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Chineke rụrụ ọrụ ebube nye ha mana ahụ, ma ndị riri ya mechara nwụọ. (Jọn 6:49) Ma, Jizọs kpọrọ onwe ya “ezigbo achịcha si n’eluigwe,” “achịcha nke Chineke,” na “achịcha na-enye ndụ.” (Jọn 6:32, 33, 35) Jizọs kwuru ihe dị mkpa mere yanwa ji dị iche na mana. Ọ sịrị: “Abụ m achịcha na-enye ndụ nke si n’eluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọ bụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ebighị ebi.” (Gụọ Jọn 6:51.) Ihe a o kwuru juru ndị Juu ahụ anya. Olee otú Jizọs ga-esi ekwu na ya bụ “achịcha” si n’eluigwe nke ka mana Chineke nyere ndị nna nna ha? Jizọs gwaziri ha, sị: “Achịcha m ga-enye bụ anụ ahụ́ m.” Gịnị ka ihe ahụ o kwuru pụtara? Ọ dị mkpa ka anyị mata azịza ya n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mere o ji bụrụ na anyị na ndị anyị hụrụ n’anya ga-adịli ndụ ebighị ebi. Ka anyị chọpụta ihe Jizọs bu n’obi.

ACHỊCHA NA-ENYE NDỤ NA ANỤ AHỤ́ JIZỌS

4. Gịnị mere ihe Jizọs kwuru ji gbaa ụfọdụ ndị agba ná ntị?

4 Mgbe Jizọs kwuru gbasara inye “anụ ahụ́ [ya] ka ụwa wee nweta ndụ,” o juru ụfọdụ n’ime ndị nụrụ ya anya. Hà chere na Jizọs ga-enye ha anụ ahụ́ ya ka ha rie? (Jọn 6:52) Ma Jizọs gwaziri ha ihe ọzọ ga-agba ha agba ná ntị. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu erighị anụ ahụ́ Nwa nke mmadụ ma ṅụọ ọbara ya, unu enweghị ndụ n’ime onwe unu.”​—Jọn 6:53.

5. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na ihe Jizọs na-agwa ìgwè mmadụ ahụ abụghị ka ha ṅụọ ọbara ya?

5 N’oge Noa, Jehova gwara ụmụ mmadụ ka ha ghara iri ọbara. (Jen. 9:3, 4) Jehova kwughachikwara ya n’Iwu o nyere ndị Izrel. O kwuru na onye ọ bụla riri ọbara, “a ga-egbu ya.” (Lev. 7:27) Jizọs kụzikwaara ndị Juu ka ha rubere Iwu ahụ Chineke nyere ha isi. (Mat. 5:17-19) N’ihi ya, ihe ọ na-agwa ndị Juu abụghị ka ha rie anụ ahụ́ ya ma ọ bụ ṅụọ ọbara ya. Jizọs kwuru ihe a ka o jiri ya kụziere ha ihe ha ga-eme ka ha nweta “ndụ ebighị ebi.”​—Jọn 6:54.

6. Olee otú anyị kwesịrị isi aghọta ihe Jizọs kwuru gbasara iri anụ ahụ́ ya na ịṅụ ọbara ya?

6 Gịnị ka Jizọs nọ na-ekwu? O doro anya na Jizọs nọ na-emere ha ihe atụ. O mekwaara nwaanyị Sameria ihe atụ mgbe ọ gwara ya, sị: “Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri m ga-enye ya, mmiri agakwaghị agụ ya ọzọ, kama mmiri m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi nke na-asọpụta mmiri na-enye ndụ ebighị ebi.” (Jọn 4:7, 14) b Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na e nwere mmiri nkịtị nwaanyị Sameria ahụ ga-aṅụ, ya enweta ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, ihe Jizọs na-agwa ìgwè mmadụ ahụ nọ na Kapaniọm abụghị na ihe ha ga-eme iji nweta ndụ ebighị ebi bụ iri anụ ahụ́ ya nkịtị ma ọ bụkwanụ ịṅụ ọbara ya.

OGE ỌZỌ JIZỌS KWURU ỤDỊ OKWU AHỤ

7. Gịnị ka ụfọdụ ndị na-ekwu gbasara ihe Jizọs kwuru na Jọn 6:53?

7 Ụfọdụ ndị okpukpe na-ekwu na Jizọs ji ihe o kwuru na Jọn 6:53 na-akọwa ihe ndị mmadụ kwesịrị ime ná Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ihi na mgbe ọ malitere ya, o kwuru ihe yiri ya. (Mat. 26:26-28) Ha na-ekwu na onye ọ bụla bịara Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị kwesịrị ịta achịcha ma ṅụọ mmanya a na-ebugharị n’ihu ndị bịara nnọkọ ahụ. Ihe ahụ ha kwuru ọ̀ dabara adaba? Ọ dị mkpa ka anyị mata ma ihe a ha kwuru ọ̀ bụ eziokwu n’ihi na n’afọ ọ bụla, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile na-eso anyị abịa nnọkọ ahụ. Anyị ga-achọpụta ụfọdụ ihe dị iche n’ihe Jizọs kwuru na Jọn 6:53 na ihe o kwuru n’oge Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.

8. Olee ihe ndị dị iche n’oge abụọ Jizọs kwuru gbasara anụ ahụ́ ya na ọbara ya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

8 Ka anyị lee ihe abụọ dị iche n’ihe ndị mere n’oge Jizọs kwuru ihe ahụ. Nke mbụ, olee mgbe Jizọs kwuru ihe e dere na Jọn 6:53-56? Oleekwa ebe ọ nọ kwuo ya? Ndị ọ gwara okwu ahụ bụ ìgwè ndị Juu nọ na Galili n’afọ 32 Oge Ndị Kraịst. Ihe a bụ otu afọ tupu ya amalite Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na Jeruselem. Nke abụọ, olee ndị ọ gwara okwu ahụ? Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ahụ Jizọs gwara okwu ahụ na Galili mkpa bụ iri nri, rijuo afọ, ọ bụghị ihe gbasara adịm ná mma ha na Chineke. (Jọn 6:26) Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe Jizọs kwuru ihe siiri ha ike nghọta, ha kwụsịrị inwe okwukwe na ya. Ụfọdụ n’ime ndị bụ́ ndị na-eso ụzọ ya kwụsịdịrị iso ya. (Jọn 6:14, 36, 42, 60, 64, 66) Ma, ọ bụghị ụdị ndị a ka Jizọs gwara okwu mgbe ya na ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi nọ, mgbe ọ malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị mgbe ihe dị ka otu afọ gachara n’afọ 33 Oge Ndị Kraịst. N’oge ahụ, ya na ndịozi ya ndị ahụ nọ n’agbanyeghị na ha aghọtachaghị ihe niile ọ kụziri. Ha emeghị ka ọtụtụ ndị ahụ nọ na Galili. Kama, obi siri ha ike na Jizọs bụ Ọkpara Chineke, onye si n’eluigwe bịa. (Mat. 16:16) Ọ jara ha mma, sị: “Unu ahapụghị m n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara m.” (Luk 22:28) Naanị ihe abụọ a dị iche n’ihe mere mgbe Jizọs kwuru gbasara anụ ahụ́ ya na ọbara ya gosiri na ihe ọ na-ekwu na Jọn 6:53 abụghị iji kọwaa otú a ga-esi na-eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. A ka nwekwara ihe ndị ọzọ.

Jọn isi 6 kọrọ ihe Jizọs gwara ìgwè ndị Juu nọ na Galili (n’aka ekpe). Mgbe otu afọ gachara, ọ gwara mmadụ ole na ole bụ́ ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi okwu na Jeruselem (n’aka nri) (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)


OTÚ IHE JIZỌS KWURU SI GBASA GỊ

9. Olee ndị ihe Jizọs kwuru mgbe ọ na-eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị gbasara?

9 N’oge Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, Jizọs nyere ndịozi ya achịcha na-ekoghị eko ma gwa ha na ọ nọchiri anya ahụ́ ya. O nyekwara ha mmanya ma kwuo na ọ nọchiri anya “ọbara ọgbụgba ndụ.” (Mak 14:22-25; Luk 22:20; 1 Kọr. 11:24) Ihe a o kwuru gbasara ọgbụgba ndụ dị ezigbo mkpa. Ndị ya na ha gbara ọgbụgba ndụ ahụ bụ “Izrel [nke Chineke]” ndị ga-anọ “n’Alaeze Chineke,” ọ bụghị mmadụ niile. (Hib. 8:6, 10; 9:15) Ndịozi ya aghọtaghị ọgbụgba ndụ ahụ n’oge ahụ. Mana, n’oge na-adịghị anya, a ga-eji mmụọ nsọ tee ha mmanụ, ha esoro n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, sorokwa Jizọs nọrọ n’eluigwe.​—Jọn 14:2, 3.

10. Olee ihe ọzọ dị iche n’ihe Jizọs kwuru mgbe ọ na-eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na ihe ọ gwara ìgwè mmadụ na Galili? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

10 Ihe Jizọs kwuru mgbe ọ na-eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị gbasara “ìgwè atụrụ nta.” Ndị mbụ so na ha bụ ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, ndị ya na ha nọ n’oge ahụ. (Luk 12:32) Ọ bụ hanwa ka Jizọs gwara ka ha taa achịcha ma ṅụọ mmanya ahụ ná mgbede ahụ. Ndị ọzọ ga-emecha sonyere ha kwesịrị ịta achịcha ma ṅụọ mmanya mgbe ọ bụla a na-eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ọ bụ ha ga-eso Jizọs keta eluigwe. N’ihi ya, ihe a bụ ihe ọzọ dị iche n’ihe ọ gwara ndịozi ya na ihe ọ gwara ìgwè mmadụ na Galili. Ihe ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ gbasara ọtụtụ mmadụ.

Ndị na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs dị mmadụ ole na ole, mana onye ọ bụla nwere ike inwe okwukwe na Jizọs ma nweta ndụ ebighị ebi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)


11. Gịnị ka Jizọs kwuru mgbe ọ nọ na Galili nke gosiri na ọ bụghị mmadụ ole na ole ka ọ na-agwa okwu?

11 Mgbe Jizọs nọ na Galili n’afọ 32 Oge Ndị Kraịst, ndị ọ na-agwa okwu bụ ndị Juu chọrọ ka o nye ha achịcha. Mana, ọ gwara ha banyere ihe dị mkpa karịa achịcha. Ọ gwara ha ihe ga-eme ka ha nwee ndụ ebighị ebi. Jizọs kwudịrị na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’oge ikpeazụ, ha adịrị ndụ ebighị ebi. Ndị ọ na-ekwu maka ha abụghị mmadụ ole na ole a kapịrị ọnụ otú ahụ o kwuru mgbe a na-eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Kama, mgbe ọ nọ na Galili, o lekwasịrị anya n’ihe Chineke ga-emere mmadụ niile. Ọ sịdịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ebighị ebi. . . . Achịcha m ga-enye bụ anụ ahụ́ m ka ụwa wee nweta ndụ.”​—Jọn 6:51. c

12. Gịnị ka ọ dị mkpa ka mmadụ mee ka o nweta ndụ ebighị ebi?

12 Ihe Jizọs na-ekwu ọ̀ bụ na mmadụ niile dịrịla ndụ n’ụwa ga-enweta ndụ ebighị ebi? Mba. Ọ bụ naanị ndị ‘riri achịcha a’ ga-adị ndụ ebighị ebi, ya bụ, ndị nwere okwukwe na ya. Ọtụtụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst chere na naanị ‘ikwere na Jizọs’ na iwere ya ka onye nzọpụta ha ga-eme ka ha dịrị ndụ ebighị ebi. (Jọn 6:29, Bible Nsọ nke Union Version) Mana, ụfọdụ ndị so n’ìgwè mmadụ ahụ kweburu na Jizọs mechara hapụ ya. Maka gịnị?

13. Olee ihe ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ime?

13 Ọtụtụ ndị so n’ìgwè mmadụ ahụ nọ na-eso Jizọs naanị n’ihi na ọ na-enye ha ihe ha chọrọ. Ihe dị ha mkpa bụ ka Jizọs gwọọ ha ọrịa ha, nye ha nri n’efu, ma ọ bụ kụziere ha ihe ha chọrọ ka ọ kụziere ha. Ma, Jizọs gosiri na e nwere ihe ndị chọrọ ịbụ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ime. Ihe mere o ji bịa n’ụwa abụghị ka o meere ndị mmadụ ihe ha chọrọ. Ha kwesịrị ịza òkù ọ na-akpọ ha ka ha ‘bịakwute’ ya. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịnabata ihe niile ọ kụziri ma na-eme ha eme.​—Jọn 5:40; 6:44.

14. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka ọbara Jizọs na anụ ahụ́ ya baara anyị uru?

14 Jizọs gwara ìgwè mmadụ ahụ na ọ dị mkpa ka ha nwee okwukwe. Inwe okwukwe na gịnị? Inwe okwukwe n’anụ ahụ́ ya na ọbara ya ọ ga-eji achụ àjà ga-eme ka ha dịrị ndụ ebighị ebi. Ọ dị ndị Juu ahụ mkpa inwe ụdị okwukwe ahụ. Ọ dịkwa anyịnwa mkpa taa. (Jọn 6:40) N’ihi ya, ihe Jizọs kwuru na Jọn 6:53 pụtara na anyị kwesịrị inwe okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. Ọtụtụ ndị ga-eriteli uru ahụ.​—Efe. 1:7.

15-16. Olee uru Jọn isi 6 na-abara anyị?

15 Ihe e dere na Jọn isi 6 ga-abara anyị na ndị anyị hụrụ n’anya ezigbo uru. O mere ka anyị ghọta na Jizọs hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu. Mgbe ọ nọ na Galili, ọ gwọrọ ndị ọrịa, kụziere ha gbasara Alaeze Chineke, nyekwa ha nri. (Luk 9:11; Jọn 6:2, 11, 12) Nke kadị mkpa bụ na ọ kụziiri ha na ọ bụ ya bụ “achịcha na-enye ndụ.”​—Jọn 6:35, 48.

16 Ndị ọ kpọrọ “atụrụ ọzọ” anaghị ata achịcha ma ọ bụ na-aṅụ mmanya e ji eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị kwa afọ. (Jọn 10:16) Mana, anụ ahụ́ na ọbara Jizọs Kraịst ga-abara ha uru. Ihe ha ga-eme ka ọ baara ha uru bụ inwe okwukwe n’àjà mgbapụta ọ chụrụ nakwa n’ihe ọma ọ ga-emere ụmụ mmadụ. (Jọn 6:53) Mana, ndị kwesịrị ịta achịcha ma ṅụọ mmanya ahụ na-egosi na ha esorola n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nakwa na ha nwere olileanya iso Jizọs Kraịst chịa n’eluigwe. N’ihi ya, ma ànyị so ná ndị e tere mmanụ ma ọ bụ n’atụrụ ọzọ, ịmụ banyere akụkọ a kọrọ na Jọn isi 6 dị anyị ezigbo mkpa. O kwuru na ọ dị mkpa ka anyị nwee okwukwe ka anyị nwee ike inweta ndụ ebighị ebi.

ABỤ NKE 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị

a E kwuru gbasara Jọn 6:5-35 n’isiokwu bu nke a ụzọ.

b Mmiri Jizọs na-ekwu okwu ya nọchiri anya ihe niile Chineke merela na ndị nke ọ ka na-eme ka ụmụ mmadụ nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi.

c Na Jọn isi 6, e kwuru okwu nwere ike ịpụta “onye” na “onye ọ bụla” mgbe a na-ekwu banyere ndị ga-adị ndụ ebighị ebi.​—Jọn 6:35, 40, 47, 54, 56-58.