ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Disemba 2016

Ihe dị́ n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Jenụwarị 30 ruo Febụwarị 26, 2017.

AKỤKỌ NDỤ

Aghọrọ M “Ihe Niile n’Ebe Ụdị Mmadụ Niile Nọ”

Ọtụtụ ọrụ Nwanna Denton Hopkinson rụrụla kemgbe ọtụtụ afọ emeela ka ọ ghọta na Jehova na-ahụ ndị si ná mba dị iche iche n’anya.

Chineke Mere Ka Unu Si ná Mmehie Pụọ n’Ihi Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ

Ị ga-erite ezigbo uru ma i chee otú Jehova si mee ka i si ná mmehie pụọ.

“Ịtụkwasị Uche na Mmụọ Nsọ Pụtara Ndụ na Udo”

Ndụmọdụ dị́ ná Ndị Rom isi asatọ ga-enyere gị aka inweta ụgwọ ọrụ Jehova chọrọ inye mmadụ niile.

Ì Chetara?

Ị̀ gụọla Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’oge na-adịbeghị anya? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a.

Na-atụkwasị Jehova Nchegbu Gị Niile

Ndị ohu Chineke na-echegbu onwe ha mgbe ụfọdụ. E nwere ihe anọ ga-enyere gị aka irite uru ‘n’udo nke Chineke.’

Jehova Na-akwụ Ndị Na-achọsi Ya Ike Ụgwọ Ọrụ

Olee otú olileanya maka ụgwọ Jehova ga-akwụ anyị si abara anyị uru? Olee otú o si kwụọ ndị fere ya ụgwọ n’oge ochie? Oleekwa otú o si eme ya n’oge anyị a?

Ịdị Nwayọọ n’Obi Ga-egosi na Ị Ma Ihe

Mmadụ ijide onwe ya ma e mee ya ihe ọjọọ anaghị adị mfe. Ma, Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha dị nwayọọ n’obi. Gịnị ga-enyere gị aka ịkpa àgwà ọma a?

Isiokwu Ndị E Bipụtara n’Ụlọ Nche n’Afọ 2016

Ebe e depụtara isiokwu ndị e biri n’Ụlọ Nche a na-amụ amụ na nke ọhaneze.