Ì Chetara?
Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:
Olee ụdị mmehie Jizọs na-ekwu banyere ya na ndụmọdụ e dere na Matiu 18:15-17?
Jizọs na-ekwu banyere ụdị mmehie mmadụ abụọ nwere ike ikwurịta ma dozie. Ma, ọ bụ mmehie dị́ oké njọ nke na o nwere ike ime ka a chụọ mmadụ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na e dozilighị ya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ nkwutọ, ma ọ bụ igwu wayo.—w16.05, peeji nke 7.
Gịnị ka ị ga-eme ka ịgụ Baịbụl bakwuoro gị uru?
I nwere ike ime ihe ndị a: Buru n’obi na e nwere ihe ị ga-amụta, gbaakwa mbọ ka ị mụta ihe n’ebe ị na-agụ; jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú m ga-esi jiri ya nyere ndị ọzọ aka?’; jirikwa akwụkwọ ndị e ji eme nchọnchọ mee nchọnchọ n’ihe ị na-agụ.—w16.05, peeji nke 24-26.
Ọ̀ dị njọ ma Onye Kraịst ruwe uju n’agbanyeghị na o kweere ná mbilite n’ọnwụ?
Ikwere ná mbilite n’ọnwụ apụtaghị na Onye Kraịst agaghị eru uju ma mmadụ nwụnahụ ya. Ebreham ruru uju mgbe nwunye ya Sera nwụrụ. (Jen. 23:2) Onye Kraịst na-eru uju ga-eji nwayọọ nwayọọ nwetawa onwe ya.—wp16.3, peeji nke 4.
N’ọhụụ Ezikiel, ole ndị ka nwoke ahụ jí mpi ink odeakwụkwọ na ndị ikom isii ahụ jí ngwá ọgụ e ji akụgbu mmadụ nọchiri anya ha?
Anyị ghọtara na ha nọchiri anya ndị mmụọ ozi duziri mbibi e bibiri Jeruselem, ndị ga-ebibikwa ụwa Setan a n’Amagedọn. N’oge anyị a, nwoke ahụ jí mpi ink odeakwụkwọ nọchiri anya Jizọs Kraịst, bụ́ onye na-aka ndị a ga-echebe akara.—w16.06, peeji nke 16-17.
Olee nsogbu ndị na-emelighị ka Baịbụl ghara ịdịgide?
Baịbụl dịgidere n’agbanyeghị (1) na ihe ndị mbụ e ji dee ya bụ ihe ndị nwere ike irekasị erekasị, dị ka papaịrọs na akpụkpọ anụ; (2) mbọ ndị ọchịchị na ndị isi okpukpe gbara ịla ya n’iyi; (3) mbọ ụfọdụ ndị gbara ịgbanwe ihe e dere na ya.—wp16.4, peeji nke 4-7.
Olee otú ị ga-esi selata aka n’ihe ndị na-eri gị oge?
Mata ihe ndị dị́ gị mkpa, kwụsị imefusị ego n’ihe ndị na-adịghị gị mkpa. Depụta otú ị ga-esi na-emefu ego. Wepụsịa ihe ndị a na-enweghị ihe i ji ha eme. Kwụchaa ụgwọ niile i ji. Belata oge i ji arụ ọrụ ego, haziekwa otú ị ga-esi jekwuoro Jehova ozi.—w16.07, peeji nke 10.
Gịnị ka Baịbụl kwuru na ọ bara uru karịa ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha?
Ihe Job 28:12, 15 kwuru gosiri na amamihe Chineke bara uru karịa ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha. Ka ị na-achọ ya, gbalịsie ike ka ị dịrị umeala n’obi, ka okwukwe gị siekwa ike.—w16.08, peeji nke 18-19.
Ụmụnna nwoke hà kwesịrị ịna-eruwe afụ ọnụ taa?
N’obodo ụfọdụ, mmadụ nwere ike ịhapụ afụ ọnụ ya, mezie ya ka ọ dị mma n’anya. Ọ gaghịkwa eme ka ndị mmadụ ghara ige ntị n’ozi ọma. Ma, ụfọdụ ụmụnna nwere ike ikpebi na ha ga na-akpụ nke ha. (1 Kọr. 8:9) N’obodo ụfọdụ, a naghị ewere ya na ndị ozi Chineke kwesịrị ịhapụ afụ ọnụ ha ka o rujuo erujuo.—w16.09, peeji nke 21.
Gịnị mere anyị ga-eji kwere na akụkọ Baịbụl kọrọ gbasara Devid na Golayat mere eme?
Golayat ji ihe dị ka sentimita iri na ise ka nwoke a na-ahụbeghị onye ka ya ogologo n’oge anyị a. Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie hụrụ ebe e dere ụlọ Devid n’otu ihe e dere n’oge ochie. Ihe a ha chọpụtara na ihe Jizọs kwuru gosiri na e nwere onye bụ́ Devid. Ebe ndị Baịbụl kwuru Devid na Golayat nọ lụọ agha ahụ ka dị ugbu a.—wp16.5, peeji nke 13.
Olee otú inwe amamihe si dị iche n’ịmụta ihe na inwe nghọta?
Mmadụ nwere ike ịmụta ihe a kụziiri ya ma buru ya n’isi. Onye nwere nghọta na-amata otú otu ihe si gbasa ihe ọzọ. Ma onye nwere amamihe na-eji ihe ọ mụtara na ihe ọ ghọtara mee ihe ga-abara ya uru.—w16.10, peeji nke 18.