Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Ahapụrụ M Ihe Niile Soro Kraịst

Ahapụrụ M Ihe Niile Soro Kraịst

“Ị nwaa anwaa gaa ozi ọma, alọtakwala. Ị lọtakwanụ, m ga-akụji gị ụkwụ.” Egwu ahụ papa m yiri m mere ka m kpebie ịhapụ ụlọ. Nke a bụ nke mbụ m hapụrụ ihe niile soro Kraịst. M dị naanị afọ iri na isii.

OLEE otú ihe a si mee? Ka m kọwaa. A mụrụ m n’abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Julaị, afọ 1929. M toro n’otu ime obodo dị n’obodo Bulakan nke dị na Filipinz. Ndị mmadụ anaghị ebi ndụ okomoko n’obodo a n’ihi na ihe siri ike n’oge ahụ. Agha dara na Filipinz mgbe m na-eto eto. Ndị agha Japan batara na Filipinz n’ike ma chịwazie ha. Ma, obodo anyị dị n’ime ime. N’ihi ya, agha ahụ eruteghị n’obodo anyị. Anyị enweghị redio, tivii, na akwụkwọ akụkọ. Anyị na-anụ ihe na-emenụ n’akụkọ.

Abụ m nwa nke abụọ n’ime ụmụ asatọ papa m na mama m mụrụ. Nne na nna mama m kpọọrọ m ka mụ na ha biri mgbe m dị afọ asatọ. Ọ bụ eziokwu na anyị bụ ndị Katọlik, nna mama m na-ege ndị chọọchị ndị ọzọ ntị, ndị enyi ya nyekwara ya akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, ya anata. M chetara na o gosiri m akwụkwọ atọ aha ha bụ Protection, Safety, na Uncovered e dere n’asụsụ Tagalog, * gosikwa m Baịbụl. Ọ na-atọ m ụtọ ịgụ Baịbụl, nke ka nke, Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Ịgụ ha mere ka m chọọ ime ka Jizọs.—Jọn 10:27.

ỊMỤTA OTÚ M GA-ESI SORO KRAỊST

Ndị Japan kwụsịrị ịchị Filipinz n’afọ 1945. N’oge ahụ, papa m na mama m gwara m ka m lọta ụlọ. Nna mama m gbara m ume ka m lawa, n’ihi ya, m lawara.

Ọ dịghị anya m lọtara, n’ọnwa Disemba afọ 1945, Ndịàmà Jehova si n’obodo Angat bịa izi anyị ozi ọma. Otu n’ime ha katarala ahụ́ bịara n’ụlọ anyị ma kọwaara anyị ihe Baịbụl kwuru banyere ‘oge ikpeazụ.’ (2 Tim. 3:1-5) Ọ gwara anyị ka anyị bịa ọmụmụ ihe n’otu obodo dị nso n’obodo anyị. M gara, ma papa m na mama m agaghị. Ihe dị ka mmadụ iri abụọ bịara. Ụfọdụ jụkwara ajụjụ banyere ihe Baịbụl na-ekwu.

Aghọtachaghị m ihe a na-amụ, n’ihi ya, m kpebiri ịpụ. Mgbe m chọrọ ịpụ, ha malitere ịbụ abụ Alaeze. Abụ ahụ tọgburu m atọgbu, ọ bụ ya mere apụghịzi m. Mgbe a bụchara abụ, kpee ekpere, a gwara mmadụ niile ka ha bịa ọmụmụ ihe n’Angat na Sọnde ọzọ.

Ụfọdụ n’ime anyị ji ụkwụ gaa ihe dị ka kilomita asatọ iji ruo n’ụlọ Nwanna Cruz, bụ́ ebe a ga-anọ enwe ọmụmụ ihe. Ndị bịara ọmụmụ ihe ahụ dị mmadụ iri ise. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ na obere ụmụaka sodị zaa ajụjụ n’isiokwu ndị tara akpụ na Baịbụl. Mgbe m gara ọmụmụ ihe ihe dị ka ugboro atọ, Nwanna Damian Santos, bụ́ ọsụ ụzọ katarala ahụ́ gwara m ka m hie n’ụlọ ya ruo echi. Nwanna a bụbu onyeisi obodo anyị. Anyị ji oge buru ibu n’abalị ahụ kwurịta gbasara Baịbụl.

N’oge ahụ, ọtụtụ n’ime anyị egbughị oge bata n’ọgbakọ mgbe anyị mụtara ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi. Mgbe anyị gara ọmụmụ ihe ugboro ole na ole, ụmụnna jụrụ mụ na ndị ọzọ, sị: “Ùnu chọrọ ka e mee unu baptizim?” M zara, “Ee, na m chọrọ.” Ama m na m chọrọ ịbụ “ohu nke Nna Ukwu ahụ, bụ́ Kraịst.” (Kọl. 3:24) Anyị gara n’otu mmiri dị nso, e mee mụ na otu nwoke ọzọ baptizim n’abalị iri na ise n’ọnwa Febụwarị, afọ 1946.

Anyị ghọtara na anyị kwesịrị ịna-ezi ozi ọma mgbe niile ka Jizọs ebe ọ bụ na anyị bụ Ndị Kraịst e mere baptizim. Ozi ọma a m chọrọ izi adịghị papa m obi mma. Ọ sịrị: “Ị dị obere izi ozi ọma. Ihe ọzọ bụ na imikpu gị na mmiri emeghị ka ị bụrụ onye ozi ọma.” M gwara ya na ọ bụ uche Chineke ka anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Mat. 24:14) M gwakwara ya, sị: “M kwesịrị imezu nkwa m kwere Chineke.” Ọ bụ mgbe m kwuru ihe a ka papa m yiri m egwu ahụ m kwuru ná mmalite. N’eziokwu, ọ chọsiri ike ime ka m kwụsị izi ozi ọma. Ọ bụ ya mere m ji hapụ ihe niile ná nke mbụ ya ma jiri oge m niile na-ejere Jehova ozi.

Nwanna Cruz na ndị ezinụlọ ya gwara m ka mụ na ha biri n’Angat. Ha gbakwara mụ na nwa ha nwaanyị nke ikpeazụ aha ya bụ Nora ume ka anyị bido ịsụ ụzọ. Mụ na ya malitere ịsụ ụzọ n’abalị mbụ n’ọnwa Nọvemba, afọ 1947. Nora nọ n’obodo ọzọ na-eje ozi, ebe m nọgidere n’Angat na-eje ozi.

IHE ỌZỌ MERENỤ M JI HAPỤ IHE NIILE SORO KRAỊST

Mgbe m sụrụ ụzọ afọ atọ, otu Nwanna aha ya bụ Earl Stewart si n’alaka ụlọ ọrụ anyị bịara kwuo okwu ihu ọha n’ụlọ ezumeezu dị n’Angat. Ihe karịrị narị mmadụ ise bịara ya. O ji Bekee kwuo okwu, e mechaa mụ achịkọta ihe o kwuru n’asụsụ Tagalọg. Ọ bụ naanị afọ asaa ka m gara akwụkwọ, ma ndị nkụzi anyị na-eji asụsụ Bekee akụziri anyị ihe. Ihe ọzọ nyeere m aka ịmatakwu asụsụ Bekee bụ na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl anyị nwere n’asụsụ Tagalọg dị naanị ole na ole. N’ihi ya, m na-eji ọtụtụ akwụkwọ anyị e dere n’asụsụ Bekee amụ ihe. Ọ bụ ya mere m ji matatụ Bekee m ji tapịa okwu ahụ n’asụsụ Bekee, tapịakwa okwu ndị ọzọ n’oge ndị ọzọ.

N’ụbọchị ahụ m tapịaara Nwanna Stewart okwu ahụ o kwuru, ọ gwara ụmụnna na alaka ụlọ ọrụ chọrọ ka otu nwanna bụ́ ọsụ ụzọ ma ọ bụ abụọ bịa rụọrọ ha ọrụ. Ha ga-enye aka ma ndị ozi ala ọzọ gawa Mgbakọ Ịba Ụba Ọchịchị Chineke e nwere na Niu Yọk dị n’Amerịka n’afọ 1950. Eso m n’ime ụmụnna abụọ ahụ a kpọrọ. Ahapụkwara m ihe ụfọdụ, ebe maara m ahụ́, nakwa ụmụnna anyị. Ma na nke ugbu a bụ ka m nwee ike jee ozi na Betel.

M rutere na Betel n’abalị iri na itoolu n’ọnwa Jun, afọ 1950 ma malite ọrụ e nyere m. Betel dị n’otu nnukwu ụlọ ochie. Ọ dị ibé ala iri na ise nnukwu osisi gbara gburugburu. Ihe dị ka ụmụnna iri na abụọ na-alụbeghị nwaanyị na-eje ozi na ya. N’isi ụtụtụ, m na-arụ ọrụ n’usekwu. O ruzie ihe dị ka elekere anya itoolu, mụ edewe ákwà n’ebe a na-asa ákwà. Ihe ndị ahụ m na-arụ n’ụtụtụ ka m na-arụkwa n’ehihie. M nọgidere na-eje ozi na Betel ma mgbe ndị ozi ala ọzọ lọtara mgbakọ. M na-afụ magazin anyị akwụkwọ tupu e zipụ ya, na-ahụ maka ọda ndị a tụrụ, ma na-arụ ọrụ n’ebe a na-anabata ndị ọbịa. M rụrụ ọrụ ọ bụla a sị m rụọ.

M HAPỤRỤ FILIPINZ GAA ỤLỌ AKWỤKWỌ GILIED

N’afọ 1952, a kpọrọ mụ na ụmụnna isii si Filipinz ka anyị bịa gụọ akwụkwọ na klas nke iri abụọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ihe a tọgburu m atọgbu. Ọtụtụ ihe ndị anyị hụrụ na ihe ndị anyị mere n’Amerịka bụcha ihe ọhụrụ na ihe anyị na-emetụbeghị mbụ. N’eziokwu, ihe ndị ahụ dị iche n’ihe ndị m maara n’obere obodo m si bịa.

Ebe mụ na ụmụ akwụkwọ ibe m nọ na Gilied

Dị ka ihe atụ, anyị mụrụ otú e si eji ngwa ụlọ ndị a na-akwụnye n’ọkụ eletrik eme ihe. Oyi na-atụ n’Amerịka karịa n’obodo anyị. Otu ụtụtụ m pụtara èzí ebe niile chara ụcha n’ihi snoo. Nke a bụ nke mbụ m na-ahụ snoo. M chọpụtaziri na ọ jụrụ ezigbo oyi.

Ma, mgbanwe ndị ahụ anyị mere n’Amerịka adịghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ihe ndị magburu onwe ha a kụziiri anyị na Gilied. Ụmụnna na-akụziri anyị ihe kụziiri anyị otú e si ezi ihe nke ọma. Anyị mụtakwara otú e si eme ezigbo nchọnchọ na otú e si amụ ihe nke ọma. O doro anya na ihe ndị a kụziiri anyị nyeere m aka imekwu nke ọma n’ọgbakọ.

Mgbe m gụchara akwụkwọ na Gilied, e zigara m na Bronz dị na Niu Yọk ka m bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche nke nwa oge. N’ihi ya, n’ọnwa Julaị afọ 1953, m gara Mgbakọ Òtù Ụwa Ọhụrụ nke e nwere n’otu obodo dị na Niu Yọk. Mgbe e mechiri mgbakọ ahụ, m laghachiri na Filipinz, jewekwa ozi na Betel.

AHAPỤRỤ M OBODO AHỤ́ RURU M ALA

Ụmụnna anyị n’alaka ụlọ ọrụ sịrị: “Ugbu a, ị ga-abụ onye nlekọta sekit.” Nke a ga-eme ka m soro nzọụkwụ Kraịst, bụ́ onye gara obodo ndị dị anya kụziere atụrụ Jehova ihe. (1 Pita 2:21) E zigara m na sekit dị n’ebe a na-akpọ Sentral Luzọn. Ọ bụ agwaetiti kachanụ e nwere n’obodo Filipinz. Obodo ndị dị n’agwaetiti a bụ Bulakan, Nueva Ekija, Talak, na Zambales. Anyị gawa obodo ụfọdụ, anyị na-arị Ugwu Sierra Madre. O nweghị ụgbọala ọhaneze na-eru n’ebe ndị ahụ. N’ihi ya, m na-agwa ndị na-akwọ nnukwu ụgbọala na-ebu osisi ka m nọrọ n’elu osisi ndị ha bu n’ụgbọala. Ọtụtụ mgbe, ha na-ekwe, ma ahụ́ anaghị erucha mmadụ ala iso ha.

Ọ dịbeghị anya e hiwere ọtụtụ ọgbakọ ndị dị ebe ahụ, ndị nkwusa nọ na ha ehighịkwa nne. N’ihi ya, obi na-atọ ụmụnna ụtọ ma m nyere ha aka hazie ọmụmụ ihe na ozi ọma nke ọma.

E mechara ziga m na sekit ọzọ, mụ aga na-eleta ọgbakọ niile dị na Bikọl. Ọtụtụ n’ime ha bụ ìgwè na-abụbeghị ọgbakọ e zigara ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ihi na e nweghị ndị na-ezi ozi ọma n’ebe ndị ahụ. N’otu ụlọ m nọ leta ọgbakọ, naanị ebe anyị na-aga mposi bụ n’ala e gwuru egwu e ji osisi abụọ tụbichie. M zọkwasịrị ha ụkwụ, ha agbajie, mụ adaba n’ime ya. O were m oge ịsachasị ahụ́ tupu mụ erie nri ụtụtụ.

Ọ bụ n’oge a m na-eje ozi n’ebe a ka m malitere iche banyere Nora. Ọ malitere ịsụ ụzọ na Bulakan. Ma ugbu a, ọ bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo Dumagete. M gara leta ya n’ebe ahụ. Anyị malitere idetara ibe anyị akwụkwọ ozi. N’afọ 1956, anyị alụọ. Anyị ji izu mbụ anyị lụrụ gaa leta otu ọgbakọ dị n’agwaetiti Rapụ Rapụ. Anyị rịrị ugwu ma jiri ụkwụ gaa ọtụtụ ebe. Ma, obi dị m ụtọ na mụ na nwunye m so jeere ụmụnna ndị nọ n’ime ime obodo ndị ahụ ozi.

A KPỌRỌ M ỌZỌ KA M BỊA JEWE OZI NA BETEL

Mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo afọ anọ anyị nọ n’ọrụ sekit, a kpọrọ anyị ka anyị bịa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ. N’ihi ya, n’afọ 1960 ka anyị malitere ozi Betel a anyị nọ na ya kemgbe. Kemgbe ọtụtụ afọ, amụtala m ọtụtụ ihe n’aka ụmụnna ndị nwere nnukwu ọrụ ha na-arụ. Nora arụọkwala ọrụ ọtụtụ ebe na Betel.

Mgbe m na-ekwu okwu ná mgbakọ, otu nwanna ana-atapịa ya n’asụsụ Sebụano

Kemgbe m malitere ije ozi na Betel, Jehova agọziela m, mụ ahụ otú ọtụtụ ndị si na-abata n’ọgbakọ n’ike n’ike na Filipinz. Mgbe m bịara Betel ọhụrụ n’oge m bụ okokporo, e nwere ihe dị ka puku ndị nkwusa iri na Filipinz niile. Ugbu a, e nweela ihe karịrị narị puku ndị nkwusa abụọ na Filipinz. Narị mmadụ anọ na iri atọ na ise n’ime ha na-eje ozi na Betel iji kwado ozi ọma dị mkpa a na-ezi.

Ka ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ kemgbe ọtụtụ afọ, alaka ụlọ ọrụ anyị anaghịzi aba ndị na-eje ozi na ya. Òtù Na-achị Isi gwaziri anyị ka anyị chọọ ala a ga-arụkwu ụlọ. Mụ na nwanna na-elekọta ebe a na-ebi akwụkwọ gawara n’ụlọ ndị dị nso n’alaka ụlọ ọrụ anyị, bụ́ ebe ndị Chaịna bi. Anyị nọ na-ajụ ha ma ò nwere onye chọrọ ire ala ya. O nweghị onye chọrọ ire ala ya, ma otu n’ime ndị nwe ala ebe ahụ gwadịrị anyị, sị: “Ndị Chaịna anaghị ere ala. Ihe anyị na-eme bụ ịzụ ala.”

Ebe m na-atapịara Nwanna Albert Schroeder okwu

Ma, otu ụbọchị, otu onye n’ime ndị nwe ala ebe ahụ, bụ́ onye chọrọ ịkwaga Amerịka, jụrụ anyị ma ànyị ga-achọ ịzụ ala ya. Anyị atụghị anya ihe a o kwuru. Nke a bụ otú ọtụtụ ihe ndị ga-esiri anyị ike ikweta na ha ga-eme si malite ime. Onye ọzọ bi nso n’alaka ụlọ ọrụ kpebiri ire ala ya, ma gwakwa ndị ọzọ bi ya nso ka ha meekwa otú ahụ. Anyị zụdịrị ala nwoke ahụ gwara anyị na “Ndị Chaịna anaghị ere ala.” Obere oge, ala alaka ụlọ ọrụ nwe bịara jiri okpukpu atọ karịa nke mbụ. Obi siri m ike na Jehova Chineke chọrọ ka ihe a mee.

N’afọ 1950 ahụ a kpọrọ m bịa jee ozi na Betel ná nke mbụ ya, ndị niile nọ na Betel tọchara m. Ugbu a, ọ bụ mụ na nwunye m tọchara mmadụ niile na-eje ozi na Betel. Anaghị m akwa mmakwaara n’ihi na m na-eso Kraịst na-aga ebe ọ bụla ọ gwara m gaa. Ọ bụ eziokwu na papa m na mama m chụpụrụ m n’ụlọ, ma Jehova enyela m otu nnukwu ezinụlọ mụ na ha na-efekọ Chineke. Anatụdịghị m enwe obi abụọ na Jehova na-egboro anyị mkpa anyị niile, n’agbanyeghị ọrụ ọ bụla e nyere anyị. Obi na-atọgbu mụ na nwunye m atọgbu maka ihe ọma niile Jehova na-emere anyị. Anyị na-agbakwa ndị ọzọ ume ka ha nwalee Jehova.—Mal. 3:10.

E nwere mgbe Jizọs gwara onye ọnaụtụ aha ya bụ Matiu Livaị, sị: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” Olee ihe onye ọnaụtụ a mere? Baịbụl kwuru, sị: ‘Ọ gbahapụrụ ihe niile, bilie soro Jizọs.’ (Luk 5:27, 28) Emeela m ihe a onye ọnaụtụ ahụ mere. Eji m obi m niile na-agwa ndị ọzọ ka ha meekwa otú ahụ, Jehova ga-agọzikwa ha mmaji kwuru mmaji.

Obi dị m ụtọ na m ka so na-enye aka eme ka ọtụtụ mmadụ na-abata n’ọgbakọ na Filipinz

^ para. 6 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha. Ma a naghịzi ebipụta ha.