Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ihe Pọl onyeozi kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:29 ọ̀ pụtara na e mere ụfọdụ Ndị Kraịst n’oge ya baptizim n’ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ?

Mba. Baịbụl na akụkọ ihe mere eme ekwughị ihe dị otú ahu.

Otú e si sụgharịa amaokwu a na Baịbụl ụfọdụ emeela ka ụfọdụ ndị chee na e mere ndị mmadụ baptizim maka ndị nwụrụ anwụ n’oge Pọl. Dị ka ihe atụ, otú e si dee ya na Baịbụl Union Version bụ: “N’ihi na a sị na ọ dịghị otú a, gịnị ka ha ga-eme bụ ndi a na-eme baptizim n’ọnọdụ ndi nwụrụ anwụ.”

Ma, lee ihe ndị ọkà mmụta Baịbụl abụọ kwuru. Dr Gregory Lockwood kwuru na e nweghị akụkọ ihe mere eme ma ọ bụ akụkọ Baịbụl gosiri na e mere ndị mmadụ baptizim “n’ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ.” Prọfesọ Gordon D. Fee kwukwara, sị: “E nweghị ebe e kwuru n’akụkọ ihe mere eme ma ọ bụ na Baịbụl na e mere ụdị baptizim ahụ. Ọ dịghịkwa n’Agba Ọhụrụ. E nwekwanụghị ihe gosiri na chọọchị ndị e nwere n’oge ochie mere ụdị ihe a.”

Baịbụl kwuru na ndị na-eso ụzọ Jizọs ‘ga-eme ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, na-eme ha baptizim, na-ezikwa ha ka ha debe ihe niile’ o nyere ha n’iwu. (Mat. 28:19, 20) Tupu mmadu abụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs e mere baptizim, ọ ga-amụta gbasara Jehova na Ọkpara ya, kwere na ha ma na-erubere ha isi. Onye nwụrụ anwụ nọ n’ili enweghị ike ime ụdị ihe a. Onye Kraịst dị ndụ enweghịkwa ike imere onye nwụrụ anwụ ụdị ihe a.—Ekli. 9:5, 10; Jọn 4:1; 1 Kọr. 1:14-16.

Gịnịzi ka ihe ahụ Pọl dere pụtara?

Ụfọdụ ndị Kọrịnt ekwetaghị na a ga-akpọlite ndị nwụru anwụ n’ọnwụ. (1 Kọr. 15:12) Pọl kwuru na ihe ahụ ha kwuru abụghị eziokwu. O kwuru na ya ‘na-eche ọnwụ ihu kwa ụbọchị.’ N’agbanyeghị nke ahụ, obi siri ya ike na ọ nwụgodị, na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ, ya agaa eluigwe, bụrụ mmụọ ka Jizọs.—1 Kọr. 15:30-32, 42-44.

Ụmụnna nọ na Kọrịnt kwesịrị ịghọta na ebe ọ bụ na ha bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ọtụtụ ọnwụnwa ga-abịara ha, ha anwụọkwa tupu a kpọlite ha n’ọnwụ. Mgbe e mere ha ‘baptizim ka ha na Kraịst dị n’otu,’ ọ pụtakwara na e mere ha baptizim ka ha “nwụọ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ.” (Rom 6:3) Baptizim e mere ha pụtara na ha ga-ata ahụhụ, mechaakwa nwụọ tupu a kpọlite ha n’ọnwụ ịga eluigwe.

Mgbe e mechara Jizọs baptizim, ihe karịrị afọ abụọ agaa, ọ gwara ndịozi ya abụọ, sị: ‘A ga-emekwa unu baptizim ahụ a na-eme m.’ (Mak 10:38, 39) Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na a na-eme ya baptizim mgbe ahụ. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na a ga-emecha gbuo ya n’ihi ozi o ji obi ya niile na-ejere Chineke. Pọl kwuru na Ndị Kraịst e tere mmanụ na Kraịst ‘ga-atakọ ahụhụ ka e nwee ike ime ka ha na ya nwekọọ ebube.’ (Rom 8:16, 17; 2 Kọr. 4:17) Ọ pụtara na hanwa ga-anwụkwa tupu e nwee ike ịkpọlite ha n’ọnwụ ịga eluigwe.

N’ihi ihe ndị a, ụzọ ziri ezi e nwere ike isi kwuo ihe ahụ Pọl kwuru bụ: “Ma ọ́ bụghị ya, gịnị ka ha ga-eme bụ́ ndị a na-eme baptizim ka ha wee ghọọ ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ ma ọlị, gịnị mere e ji na-emekwa ha baptizim ka ha wee ghọọ ndị dị otú ahụ?”