Ì Chetara?
Ị̀ gụọla Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’afọ a nke ọma? Ngwa, lee ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:
Olee uru ọ ga-abara anyị ma ọ bụrụ na anyị ewepụta oge na-agwa Jehova okwu, na-ege ya ntị, ma na-atụgharị uche gbasara ya?
Anyị ga na-eme ihe dị mma, na-akụzikwu ihe nke ọma, okwukwe anyị ga-esikwu ike, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ga-esikwukwa ike.—w22.01, peeji nke 30 na nke 31.
Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị mụta ịtụkwasị Jehova na ndị ọ họpụtara obi?
Anyị kwesịrị ịmụta ịtụkwasị otú Jehova si eme ihe obi ugbu a. Ihe ndị okenye kpebiri ma ọ bụ ihe ha sịrị anyị mee ekwesịghị ịna-eme anyị obi abụọ. N’oge oké mkpagbu, anyị ga-adị njikere ige ha ntị, ọ bụrụgodị na ha enye anyị ntụziaka ndị nwere ike isiri anyị ike ịghọta ma ọ bụ ime.—w22.02, peeji nke 4 ruo na nke 6.
Gịnị mere otu mmụọ ozi ji gwa Zekaraya gbasara ‘eriri e ji atụ̀ ihe dị n’aka Gọvanọ Zerubabel’? (Zek. 4:8-10)
Ọhụụ a mere ka obi sie ndị Chineke ike na a ga-arụcha ụlọ nsọ ahụ e nwere ike ịsị na o bughị ibu, nakwa na ọ ga-eme Jehova obi ụtọ.—w22.03, peeji nke 16 na nke 17.
Olee otú anyị ga-esi mee ka ‘otú anyị si ekwu okwu bụrụ ihe e ji ama atụ’? (1 Tim. 4:12)
Anyị ga-eji obiọma na-agwa ndị mmadu okwu ma na-akwanyere ha ùgwù ma anyị nọrọ n’ozi ọma, jiri obi anyị niile na-abụ abụ, na-aza ajụjụ mgbe niile n’ọmụmụ ihe, na-ekwukwa eziokwu na ihe ndị ga-eme ka okwukwe ndị ọzọ sikwuo ike, ma zere ịkparị mmadụ.—w22.04, peeji nke 6 ruo na nke 9.
Gịnị mere otu anụ ọhịa e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:1, 2 ji nwee ihe ndị e ji mara anụ ọhịa anọ (ya bụ, ọchịchị anọ) e kwuru okwu ha na Daniel isi 7?
Anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 13 anọchighị anya naanị otu ọchịchị, dị ka Rom. Kama, ọ nọchiri anya ọchịchị niile chịrịla ụmụ mmadụ kemgbe ụwa.—w22.05, peeji nke 9.
Olee otú anyị ga-esi gosi na obi siri anyị ike na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi?
Mmadụ kparịa anyị, mee ihe wutere anyị, ma ọ bụ mejọọ anyị, anyị na-agbalị gbaghara onye ahụ, ghara iburu ya iwe n’obi ma hapụrụ Jehova ihe ahụ e mere anyị. Jehova ga-ewepụ ihe ọjọọ niile mmehie kpatara.—w22.06, peeji nke 10 na nke 11.
Gịnị ka nwanna nwoke a gwara ka o kpee ekpere n’ọmụmụ ihe ọgbakọ kwesịrị iburu n’uche?
O kwesịghị iji ekpere nyewe ọgbakọ ndụmọdụ ma ọ bụ jiri ya na-amara ọgbakọ ọkwa. O kwesịghịkwa ikwu “ọtụtụ okwu,” karịchaa, mgbe a chọrọ ịmalite ọmụmụ ihe. (Mat. 6:7)—w22.07, peeji nke 24 na nke 25.
Olee otú o si bụrụ na “ndị mere ajọ omume ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe”? (Jọn 5:29, Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ)
A gaghị ama ha ikpe maka ihe ha mere tupu ha anwụọ. A ga-eji àgwà ndị ha kpara mgbe a kpọlitechara ha n’ọnwụ lee ha ule.—w22.09, peeji nke 18.
Olee ihe na-eme obi ụtọ Nwanna J. F. Rutherford kwuru ná mgbakọ e mere n’ọnwa Septemba afọ 1922?
Ná mgbakọ e mere na Sida Pọịnt Ohayo dị n’Amerịka, ọ sịrị: “Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị na-ekwusa ozi ya. N’ihi ya, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na Alaeze ya.”—w22.10, peeji nke 3 ruo na nke 5.
Olee ụzọ atọ Aịzaya isi 30 kwuru Chineke si enyere anyị aka ịtachi obi?
Isi nke 30 mere ka anyị mata na Chineke (1) na-ege ntị n’ekpere anyị ma na-aza ya, (2) na-eduzi anyị, (3) na-agọzikwa anyị ugbu a, ọ ga-agọzikwa anyị n’ọdịnihu.—w22.11, peeji nke 9.
Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ihe e kwuru n’Abụ Ọma 37:10, 11, 29 mezuru n’oge ochie nakwa na ọ ga-emezu n’ọdịnihu?
Ọ dabara adaba na Devid ji ihe o kwuru kọwaa ihe ọma ndị mere n’Izrel, dị ka n’oge Solomọn chịrị. Jizọs kwuru banyere paradaịs a ga-enwe n’ọdịnihu, kwughachikwa ihe e kwuru n’amaokwu nke 11. (Mat. 5:5; Luk 23:43)—w22.12, peeji nke 8 ruo na nke 10, na nke 14.