Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Devid kwuru n’Abụ Ọma 61:8 na ya ga-eto aha Jehova “ruo mgbe ebighị ebi.” Ihe a o kwuru ọ̀ bụ ihe na-agaghị ekwe omume?

Mba. Ihe Devid dere ebe ahụ bụ eziokwu, bụrụkwa ihe ga-ekwe omume.

Chegodị ihe o kwuru n’amaokwu ahụ nakwa n’amaokwu ndị yiri ya. Ọ sịrị: “M ga-abụ abụ iji too aha gị ruo mgbe ebighị ebi. M ga-emezukwa nkwa m kwa ụbọchị.” “Jehova Chineke m, m ji obi m niile na-eto gị. M ga-etokwa aha gị ruo mgbe ebighị ebi.” “M ga-eto aha gị ruo mgbe niile ebighị ebi.”—Ọma 61:8; 86:12; 145:1, 2.

Mgbe Devid dere okwu ndị a, ọ naghị eche na ya enweghị ike ịnwụ anwụ. Ọ ma na Jehova ekwuola na ụmụ mmadụ ga-anwụ n’ihi na ha bụ ndị mmehie. Devid makwa na yanwa bụ onye mmehie. (Jen. 3:3, 17-19; Ọma 51:4, 5) Ọ ma na ndị mere ihe dị Chineke mma, dị ka Ebreham, Aịzik, na Jekọb, anwụọla. Ọ makwa na yanwa ga-emecha nwụọ. (Ọma 37:25; 39:4) Ma, ihe o dere n’Abụ Ọma 61:8 na-egosi na ọ chọsiri ike, kpebisiekwa ike ịna-eto Jehova ruo mgbe ebighị ebi, ya bụ, ná ndụ ya niile.—2 Sam. 7:12.

Ihe ụfọdụ Devid dere bụ ihe ndị mere ná ndụ ya, dị ka anyị hụrụ n’okwu mmeghe Abụ Ọma nke 18, 51, na nke 52. N’Abụ Ọma nke 23, Devid kwuru na Jehova bụ onye na-azụ ya dị ka atụrụ. Ọ na-eduzi ya, na-enye ya nri, na-echebekwa ya. Devid bụ ụdị onye ọzụzụ atụrụ ahụ. Ọ chọkwara ife Jehova ‘ná ndụ ya niile.’—Ọma 23:6.

Chetakwa na ọ bụ Jehova gwara Devid ka o dee ihe ndị ahụ o dere. Devid dekwara amụma banyere ihe ndị ga-emecha mee. Dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma nke 110, Devid kwuru gbasara mgbe Onyenwe ya ‘ga-anọdụ ala n’aka nri Chineke’ n’eluigwe, e nyekwa ya nnukwu ikike. Iji mee gịnị? Iji bibie ndị iro Chineke, ‘kpeekwa mba dị iche iche ikpe ma taa ha ahụhụ.’ Devid bụ nna nna Jizọs, onye bụ́ Mezaya. Mezaya ga-esi n’eluigwe na-achị ma bụrụ “onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọma 110:1-6) Jizọs kwuru na amụma ahụ dị n’Abụ Ọma nke 110 bụ gbasara yanwa, nakwa na ọ ga-emezu n’ọdịnihu.—Mat. 22:41-45.

N’eziokwu, Jehova gwara Devid ka o dee gbasara ihe ndị ga-eme n’oge ya nakwa n’ọdịnihu mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ, ya enwee ike ịna-eto Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Ihe a na-enyere anyị aka ịghọta na e nwere ike ikwu na Abụ Ọma 37:10, 11, 29 na-akọwa ihe ndị mere n’Izrel oge ochie nakwa ihe ndị ga-eme n’ụwa niile n’ọdịnihu mgbe Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere.—Gụọ paragraf nke 8 n’isiokwu bụ́ “Mụ na Gị Ga-anọ na Paradaịs,” nke gbara n’Ụlọ Nche a.

N’ihi ya, Abụ Ọma 61:8 na amaokwu ndị yiri ya na-egosi na Devid chọrọ ịna-eto Jehova n’Izrel oge ochie ruo mgbe ọ ga-anwụ. Amaokwu ndị a na-egosikwa ihe Devid ga-eme n’ọdịnihu ma Jehova kpọlite ya n’ọnwụ.