Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 50

“Mụ na Gị Ga-anọ na Paradaịs”

“Mụ na Gị Ga-anọ na Paradaịs”

“N’eziokwu, ana m asị gị taa, mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—LUK 23:43.

ABỤ NKE 145 Chineke Kwere Anyị Nkwa Paradaịs

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Obere oge tupu Jizọs anwụọ, gịnị ka ọ gwara onye omekome nọ ya n’akụkụ? (Luk 23:39-43)

 JIZỌS na ndị omekome abụọ nọ ya n’akụkụ nọ na-ata ahụhụ ka ha ji nwayọọ nwayọọ na-anwụ. (Luk 23:32, 33) Ndị omekome abụọ ahụ ebula ụzọ na-akparị Jizọs. N’ihi ya, o doro anya na ha abụghị ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 27:44; Mak 15:32) Ma, otu n’ime ha gbanwere obi ya. Ọ sịrị: “Jizọs, cheta m ma ị banye n’Alaeze gị.” Jizọs asị ya: “N’eziokwu, ana m asị gị taa, mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Gụọ Luk 23:39-43.) E nweghị ihe gosiri na onye omekome ahụ nabatara ozi ọma gbasara “Alaeze eluigwe” Jizọs kwusara mgbe ọ nọ n’ụwa. Jizọs ekwughịkwanụ na nwoke ahụ ga-abanye n’Alaeze ahụ n’eluigwe. (Mat. 4:17) Jizọs na-ekwu banyere Paradaịs ga-adị n’ụwa. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Gịnị ka anyị nwere ike ikwu banyere onye omekome ahụ ya na Jizọs kwurịtara okwu nakwa banyere ihe onye omekome ahụ ma n’oge ahụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2 na nke 3)

2. Olee ihe gosiri na onye omekome ahụ chegharịrịnụ bụ onye Juu?

2 Ọ dị ka onye omekome ahụ chegharịrịnụ ọ̀ bụ onye Juu. Ọ gwara onye omekome ibe ya, sị: “Ọ̀ bụ na ị naghị atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na ahụhụ a tara gị ka a tara nwoke a?” (Luk 23:40) Ndị Juu fere naanị otu Chineke, ma ndị mba ọzọ fere ọtụtụ chi. (Ọpụ. 20:2, 3; 1 Kọr. 8:5, 6) A sị na ndị omekome ahụ bụ ndị mba ọzọ, ihe otu onye gaara ajụ ibe ya bụ, “Ọ̀ bụ na ị naghị atụ egwu chi ndị anyị na-efe?” Ihe ọzọ bụ na e zitere Jizọs “maka atụrụ furu efu, bụ́ mba Izrel,” ọ bụghị maka ndị mba ọzọ. (Mat. 15:24) Chineke mere ka ndị Izrel mata na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. O nwere ike ịbụ na onye omekome ahụ chegharịrịnụ ma ihe a. Ihe o kwuru gosikwara na o bu n’obi na Jehova ga-akpọlite Jizọs n’ọnwụ ka ọ chịa n’Alaeze Chineke. Ọ ga-abụ na nwoke ahụ bu n’obi na Chineke ga-akpọlitekwa yanwa n’ọnwụ.

3. Olee ihe nwere ike ịbata onye omekome ahụ n’obi mgbe Jizọs kwuru banyere Paradaịs? Kọwaa. (Jenesis 2:15)

3 Ebe ọ bụ na onye omekome ahụ chegharịrịnụ bụ onye Juu, ọ ga-abụrịrị na ọ ma gbasara Adam na Iv na Paradaịs ahụ Jehova mere ka ha biri na ya. N’ihi ya, ọ ga-abụ na onye omekome ahụ ghọtara na Paradaịs ahụ Jizọs kwuru okwu ya ga-abụ ebe mara mma ga-adị n’ụwa a.—Gụọ Jenesis 2:15.

4. Gịnị ka ihe Jizọs gwara otu n’ime ndị omekome ahụ kwesịrị ime ka anyị chebara echiche?

4 Ihe Jizọs gwara onye omekome ahụ kwesịrị ime ka anyị chee otú ibi na Paradaịs ga-adị. N’eziokwu, e nwere ihe anyị ga-amụtali gbasara Paradaịs n’ọchịchị ọma Eze Solomọn. Baịbụl kwuru na Jizọs ka Solomọn. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jizọs na ndị ga-eso ya chịa ga-eme ka ụwa bụrụ Paradaịs magburu onwe ya. (Mat. 12:42) O doro anya na ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ kwesịrị ịchọ ịma ihe ha ga-eme ka ha nwee ike iru eru ibi na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi.—Jọn 10:16.

OLEE OTÚ IBI NA PARADAỊS GA-ADỊ?

5. Olee ihe ị na-atụ anya ya na Paradaịs?

5 Olee otú i chere ihe ga-adị na Paradaịs? I nwere ike ịna-eche gbasara ogige mara mma ka ogige Iden. (Jen. 2:7-9) I nwere ike icheta amụma ahụ Maịka buru banyere ndị Chineke, na onye ọ bụla “ga-anọdụ ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya.” (Maị. 4:3, 4) I nwekwara ike icheta amaokwu Baịbụl ndị kwuru na nri ga-abụ atụrụ tawa. (Ọma 72:16; Aịza. 65:21, 22) N’ihi ya, i nwere ike iji uche gị na-ahụ ka ị nọ n’ebe magburu onwe ya, ihe juru na tebụl abụrụ ụdị nri dị iche iche bụ́ e rie a mịchaa aka. I nwekwara ike ichewe otú ọ ga-adị mgbe ebe niile ga na-esi ísì ọma si n’okooko osisi. I nwere ike ịna-anụ ọchị ndị ezinụlọ na ndị enyi na-achị mgbe ha na-anọrị. Ụfọdụ n’ime ha bụdị ndị a kpọlitere n’ọnwụ. Ihe ndị a abụghị nrọ. O doro anya na ihe ndị a niile ga-eme mgbe ụwa ga-abụ Paradaịs. Ma, anyị ga-arụkwa ọrụ na-eme obi ụtọ n’oge ahụ.

Anyị ga-arụ ọrụ dị mkpa, nke bụ́ ịkụziri ndị a kpọlitere n’ọnwụ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Gịnị ka anyị ga na-arụ na Paradaịs? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

6 Jehova kere anyị ka ọrụ na-atọ anyị ụtọ. (Ekli. 2:24) Anyị ga-arụ ọtụtụ ọrụ n’otu puku (1,000) afọ ahụ Jizọs ga-achị. Ma ndị gafere oké mkpagbu ma ọtụtụ nde ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-achọ uwe, nri, na ebe obibi. Anyị ga-arụ ezigbo ọrụ iji gbooro ha mkpa ndị ahụ. Anyị ga na-arụ ọrụ ga-eme ka ụwa bụrụ Paradaịs otú ahụ Chineke nyere Adam na Iv ọrụ ilekọta ogige Iden. Chegodị ụdị obi ụtọ anyị ga-enwe mgbe anyị ga na-akụziri ọtụtụ nde ndị a kpọlitere n’ọnwụ ihe, ndị na-amaghị banyere Jehova na nzube ya. Anyị ga-enyekwara ndị ezi omume dịrị ndụ ọtụtụ afọ tupu oge Jizọs aka ịmụta ihe ndị mere kemgbe ha nwụrụ.

7. Gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya? Maka gịnị?

7 Obi kwesịrị isi anyị ike na mgbe anyị ga-ebi na Paradaịs, udo ga-adị, anyị enwee ihe niile na-akpa anyị, a haziekwa anyị nke ọma. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jehova ebula ụzọ tụpenye anyị azụ̀ otú ihe ga-adị n’ọchịchị Ọkpara ya. Anyị ga-achọpụta ya ma anyị gụọ ihe Baịbụl kọrọ banyere Eze Solomọn.

ỌCHỊCHỊ EZE SOLOMỌN GOSITỤRỤ ANYỊ OTÚ PARADAỊS GA-ADỊ

8. Olee otú ihe e kwuru n’Abụ Ọma 37:10, 11, 29 si mezuo mgbe Eze Devid dechara ya? (Kọwaa ihe e kwuru ‘n’Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,’ nke gbara n’Ụlọ Nche a.)

8 Eze Devid si n’ike mmụọ nsọ dee banyere otú ihe ga-adị n’ọdịnihu mgbe eze ma ihe nke na-erubere Jehova isi ga na-achị. (Gụọ Abụ Ọma 37:10, 11, 29.) Anyị na-agụkarị Abụ Ọma 37:11 mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ gbasara Paradaịs na-abịa abịa. Ọ dabara adaba maka na Jizọs kwughachiri ya n’ihe ọ kụziri n’elu ugwu, nke gosiri na ọ ka ga-emezu n’ọdịnihu. (Mat. 5:5) Ma, ihe a Devid kwuru gosikwara otú ihe ga-adị n’ọchịchị Eze Solomọn. Mgbe Solomọn chịrị Izrel, ndị Chineke nwere ezigbo udo, ihe ana-agazikwara ha, n’ala “mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” Chineke ebula ụzọ gwa ha, sị: “Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m kwuru . . . , m ga-eme ka udo dịrị n’ala unu. E nweghị onye ga-eme ka unu tụọ egwu mgbe unu na-ehi ụra.” (Lev. 20:24; 26:3, 6) Nkwa ndị ahụ mezuru n’oge Solomọn na-achị. (1 Ihe 22:9; 29:26-28) Jehova kwukwara na ndị ọjọọ “agaghịzi anọ.” (Ọma 37:10) N’ihi ya, ihe ahụ e kwuru n’Abụ Ọma 37:10, 11, 29 bu ụzọ mezuo n’oge ochie. Ọ ga-emezukwa ọzọ n’ọdịnihu.

9. Gịnị ka eze nwaanyị Shiba kwuru banyere ọchịchị Eze Solomọn?

9 Eze nwaanyị Shiba nụrụ akụkọ banyere udo na ọganihu ndị Izrel nwere n’oge ọchịchị Solomọn. O si n’obodo ya dị ezigbo anya gaa Jeruselem ka o jiri anya ya hụ. (1 Eze 10:1) Mgbe ọ hụchara ihe na-eme n’ọchịchị Solomọn, ọ sịrị: “A gwarughịdị m ọkara ihe m hụrụ. . . . Ndị gị ga na-enwe obi ụtọ. Ndị na-ejere gị ozi, ndị gị na ha na-anọ mgbe niile, ha ana-ege ntị n’okwu onye amamihe ị na-ekwu, ga na-enwekwa obi ụtọ.” (1 Eze 10:6-8) Ma otú ihe dị n’ọchịchị Solomọn dị ka ịtụpenye anyị azụ̀ ihe Jehova ga-emere ndị mmadụ mgbe Ọkpara ya bụ́ Jizọs ga na-achị.

10. Olee otú Jizọs si ka Solomọn?

10 Jizọs ka Solomọn. O nweghị ebe Solomọn hụrụ azụ ya anya. Solomọn bụ mmadụ na-ezughị okè. Ihe ndị o mejọrọ mechara mee ka ihe siwere ndị Chineke ike. Ma, Jizọs bụ Onye Ọchịchị zuru okè nke na-anaghị emejọ ihe. (Luk 1:32; Hib. 4:14, 15) Jizọs meriri ọnwụnwa ndị tara akpụ Setan nwara ya. Jizọs egosikwala na ya agaghị eme mmehie ma ọ bụ mee ihe ọ bụla ga-akpatara ndị ọ ga-achị nsogbu. Obi atọgbuola anyị na ọ bụ ya bụ Eze anyị.

11. Olee ndị ga-enyere Jizọs aka n’ọchịchị ya?

11 Ọ bụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ndị ga-eso Jizọs chịa ka ya na ha ga-agbakọ aka na-elekọta ndị mmadụ ma mezuo ihe Jehova bu n’obi maka ụwa. (Mkpu. 14:1-3) Ha diri ọtụtụ ọnwụnwa na nsogbu ndị bịaara ha mgbe ha nọ n’ụwa. N’ihi ya, ha ga na-emetara ndị ha na-achị ebere. Olee ọrụ ndị ahụ ga-eso Jizọs chịa ga-arụ?

OLEE ỌRỤ NDỊ E TERE MMANỤ GA-ARỤ?

12. Olee ọrụ Jehova ga-enye ndị so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ?

12 Ọrụ Chineke ga-enye Jizọs na ndị ga-eso ya chịa karịrị ọrụ o nyere Solomọn. Eze Solomọn chịrị nde mmadụ ole na ole bi naanị n’ala Izrel. Ma, ndị ga-achị n’Alaeze Chineke ga-enye aka na-elekọta ọtụtụ ijeri mmadụ n’ụwa niile. Ihe a bụ ọrụ magburu onwe ya Jehova ga-enye ndị so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.

13. Olee ọrụ pụrụ iche ndị ga-eso Jizọs chịa ga-arụ?

13 Dị ka Jizọs, ndị so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà. (Mkpu. 5:10) N’Iwu Mosis, ọ bụ ndị nchụàjà na-enyere ndị Izrel aka ka ahụ́ nwee ike ịna-adị ha mma nakwa ka ha na Jehova na-adị ná mma. Iwu ahụ “nọchiri anya ihe ọma ndị na-abịa abịa.” N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ndị ga-eso Jizọs chịa ga na-enyere ndị Chineke aka ka ahụ́ nwee ike ịna-adị ha mma, ha na Jehova ana-adịkwa ná mma. (Hib. 10:1) Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ga-amata otú ndị a ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà ga-esi na-agwa ndị ha ga-achị n’ụwa okwu. Otú ọ bụla Jehova si hazie ya, ka obi sie anyị ike na a banye na Paradaịs, ndị ga-ebi n’ụwa ga na-enweta ntụziaka ha kwesịrị inweta.—Mkpu. 21:3, 4.

GỊNỊ KA NDỊ SO ‘N’ATỤRỤ ỌZỌ’ GA-EME IJI RUO ERUO IBI NA PARADAỊS?

14. Olee ihe jikọrọ ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ na “ìgwè atụrụ nta”?

14 Jizọs kpọrọ ndị ahụ ga-eso ya chịa “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) O kwukwara banyere ndị ọzọ ọ kpọrọ “atụrụ ọzọ.” Ụzọ ndị abụọ a bụ otu ìgwè atụrụ dị n’otu. (Jọn 10:16) Ha abụọ na-arụkọ ọrụ ọnụ ugbu a. Ha ka ga na-arụkọ ọrụ ọnụ mgbe ụwa ga-aghọ Paradaịs. Ma, n’oge ahụ, “ìgwè atụrụ nta” ahụ ga-anọ n’eluigwe, ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ anọrọ n’ụwa, nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ma, e nwere ihe ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ kwesịrị ịna-eme ugbu a ka ha ruo eruo ibi na Paradaịs.

Anyị ga-egosili ugbu a na anyị na-ejikere ibi na Paradaịs na-abịanụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15) b

15. (a) Olee otú ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ na ụmụnna Jizọs si arụkọ ọrụ? (b) Olee otú ị ga-esi na-eme ka nwanna ahụ nọ n’ebe a na-ere ọgwụ? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

15 Onye omekome ahụ chegharịrịnụ nwụrụ tupu ya enwee ohere igosi na obi dị ya ụtọ maka ihe Jizọs meere ya. Ma, anyị bụ́ ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ nwere ọtụtụ ohere ugbu a igosi otú obi dị anyị maka ihe Jizọs mere. Dị ka ihe atụ, otú anyị si emeso ụmụnna Jizọs e tere mmanụ ga-egosi ma ànyị hụrụ Jizọs n’anya. Jizọs kwuru na ọ bụ ihe ya ga-eji ekpe ndị bụ́ atụrụ ikpe. (Mat. 25:31-40) Otú anyị ga-esi na-akwado ụmụnna Jizọs bụ iji obi anyị niile na-enyere ha aka n’ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 28:18-20) Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịna-eji akwụkwọ ndị ha nyere anyị na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, dị ka akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na e nwebeghị onye i ji ya amụrụ ihe, ọ ga-adị mma ka i kpebisie ike ịna-agwa ndị ọ bụla ị hụrụ ka ị mụwara ha Baịbụl.

16. Olee ihe anyị ga-eme ugbu a iji soro ná ndị Alaeze Chineke ga-achị?

16 Anyị ekwesịghị ichewe ka anyị banye na Paradaịs tupu anyị amụta ụdị àgwà Jehova chọrọ ka ndị ga-ebi na ya na-akpa. Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-ekwu eziokwu, na-akwụwa aka ọtọ, gharakwa ịna-emefe ihe ókè. Anyị kwesịkwara ịna-erubere Jehova isi, na-akwado ụmụnna anyị, gharakwa ịhapụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-agbalịsi ike irubere Chineke isi n’ụwa ọjọọ a, ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-eme otú ahụ na Paradaịs. Anyị ga na-amụtakwa nkà na àgwà ndị na-egosi na anyị na-ejikere ibi n’ụwa ọhụrụ. Gụọ isiokwu bụ́ “Ì Jikerela ‘Iketa Ụwa’?” nke gbara n’Ụlọ Nche a.

17. Ike ò kwesịrị ịgwụ anyị maka mmehie anyị mere n’oge gara aga? Kọwaa.

17 Anyị kwesịkwara ịgbasi mbọ ike ka anyị ghara ikwe ka obi na-ama anyị ikpe maka na anyị mere mmehie ndị dị oké njọ n’oge gara aga. Anyị ma na anyị agaghị ewere àjà Jizọs chụrụ ka ihe anyị ga-akụdo aka ‘kpachara anya na-eme mmehie.’ (Hib. 10:26-31) Ma, ọ bụrụ na anyị ejirila obi anyị niile chegharịa ná mmehie dị oké njọ anyị mere, rịọ Jehova na ndị okenye ka ha nyere anyị aka, gbanweekwa omume anyị, ka obi sie anyị ike na Jehova agbagharala anyị kpamkpam. (Aịza. 55:7; Ọrụ 3:19) Cheta na Jizọs sịrị ndị Farisii: “Ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie.” (Mat. 9:13) Ike àjà ahụ ọ chụrụ na-akpa ga-eme ka Chineke gbaghara mmehie anyị niile.

Ị GA-ADỊLI NDỤ EBIGHỊ EBI NA PARADAỊS

18. Olee ihe ị ga-achọ ka gị na onye omekome ahụ e gburu ya na Jizọs kwurịta?

18 Weregodị ya na ị nọ na Paradaịs, gị na onye omekome ahụ Jizọs gwara okwu ana-akparịta ụka. O doro anya na unu abụọ ga-ekwu otú obi si dị unu ụtọ maka àjà Jizọs chụrụ. I nwere ike ịjụ ya ka ọ kọkwuoro gị ihe mere n’awa ndị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa nakwa otú obi dị ya mgbe Jizọs kwetara imere ya ihe ọ rịọrọ ya. Yanwa nwekwara ike ịjụ gị otú ọ dị gị mgbe i bi n’oge ikpeazụ ụwa Setan. Ịmụrụ ụdị onye ahụ Okwu Chineke ga-amagbu onwe ya.—Efe. 4:22-24.

N’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị, otu nwanna ji obi ụtọ na-agba mbọ ịmụtakwu ọrụ ọ tụsiri anya ike ịrụ n’ụwa ọhụrụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

19. Gịnị mere ibi na Paradaịs agaghị na-agwụ ike? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

19 Ibi na Paradaịs agaghị na-agwụ ike. O nweghị mgbe anyị na-agaghị enwe ndị ọ ga-amasị anyị ịhụ nakwa ọrụ bara uru anyị ga na-arụ. Nke ka nke bụ na, kwa ụbọchị, anyị ga-enwe ike ịna-amatakwu Nna anyị nke eluigwe, ihe ndị o nyere anyị ana-atọkwa anyị ụtọ. A ga-enwe ihe ndị anyị ga na-amụtakwu banyere ya nakwa ọtụtụ ihe anyị ga-amụta banyere ihe ndị o kere eke. Ka anyị na-adịkwu ndụ ka anyị ga na-ahụkwu Chineke n’anya. Anyị ji obi anyị niile na-ekele Jehova na Ọkpara ya maka ikwe anyị nkwa na anyị ga-adịli ndụ ebighị ebi na Paradaịs.

ABỤ NKE 22 Alaeze Chineke Na-achị—Ya Bịawa

a Ị̀ na-echekarị otú ibi na Paradaịs ga-adị? Iche ya na-agba anyị ume. Ọ bụrụ na anyị ana-echekwu gbasara ihe Jehova ga-emere anyị n’ọdịnihu, obi ga na-adịkwu anyị ụtọ ịkụziri ndị ọzọ banyere ụwa ọhụrụ. Isiokwu a ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike na paradaịs ahụ Jizọs kwere ná nkwa ga-abịa.

b NKỌWA FOTO: Ebe nwanna nke na-atụ anya iso kụziere ndị a kpọlitere n’ọnwụ ihe na-akụziri ndị ọzọ ihe ugbu a.