ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 52
Na-enyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Die Nsogbu Bịaara Ha
“Ajụla imere ndị i kwesịrị imere ihe ọma ihe ọma ma ọ bụrụ na i nwere ike inyere ha aka.”—ILU 3:27.
ABỤ NKE 103 Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ Onyinye Jehova Nyere Anyị
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee otú Jehova na-esikarị aza ekpere ndị ohu ya?
Ị̀ MA na Jehova ga-ejili gị za mmadụ ekpere ya? Ọ ga-ejili gị ma ị̀ bụ okenye, ohu na-eje ozi, ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye nkwusa, ma ị̀ ka na-eto eto ma ị̀ bụ agadi, ma ị̀ bụ nwanna nwoke ma ị̀ bụ nwanna nwaanyị. Onye hụrụ Jehova n’anya rịọ ya ka o nyere ya aka, Chineke anyị na-ejikarị ndị okenye na ndị ohu ya ndị ọzọ ‘akasi onye ahụ obi.’ (Kọl. 4:11) Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ isi otú ahụ na-ejere Jehova na ụmụnna anyị ozi. Anyị ga-enwe ike inyere ụmụnna anyị aka ma na-akasi ha obi ma e nwee ọrịa na-efe efe, ọdachi, ma ọ bụ mkpagbu.
NA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA MGBE E NWERE ỌRỊA NA-EFE EFE
2. Gịnị na gịnị nwere ike ime ka o siere anyị ike inyere ndị ọzọ aka mgbe e nwere ọrịa na-efe efe?
2 E nwee ọrịa na-efe efe, o nwere ike ime ka o siere anyị ike inyere ibe anyị aka. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịchọ ịga leta ndị enyi anyị, ma ya abụrụ na o nwere ike ime ka anyị bute ọrịa ma ọ bụ bunye ha ọrịa. Anyị nwere ike ịchọ ịkpọ ndị ihe na-esiri ike ka ha bịa soro anyị rie nri, ma ya abụrụkwa na ọ gaghị ekwe omume. Anyị nwere ike ịchọ inyere ndị ọzọ aka, ma ọ ga-esiri anyị ike ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ anyị nọ ná nsogbu. N’agbanyeghị nsogbu ndị ahụ, anyị chọrọ ịna-enyere ụmụnna anyị aka. Obi na-adịkwa Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike inyere ha aka. (Ilu 3:27; 19:17) Gịnị ka anyị nwere ike ime?
3. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe ndị okenye nọ n’ọgbakọ Nwanna Nwaanyị Desi hà mere? (Jeremaya 23:4)
3 Ihe ndị okenye nwere ike ime. Ọ bụrụ na ị bụ okenye, mara atụrụ Chineke nke ọma. (Gụọ Jeremaya 23:4.) Nwanna nwaanyị ahụ aha ya bụ Desi, anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ, sịrị: “Ndị okenye ndị nọ n’ìgwè ozi ubi anyị na-esokarị mụ na ndị ọzọ aga ozi ọma nakwa ntụrụndụ.” b Ihe a mere ka ọ dịkwuoro ndị okenye ndị ahụ mfe inyere Nwanna Nwaanyị Desi aka mgbe ọrịa koronavaịrọs bidoro ma gbuo ụfọdụ ndị ezinụlọ ya.
4. Gịnị mere ndị okenye ji nwee ike inyere Nwanna Nwaanyị Desi aka? Oleekwa ihe anyị na-amụta na ya?
4 Nwanna Nwaanyị Desi sịrị: “Ebe ọ bụ na m weere ndị okenye ka ndị enyi m, o sighịrị m ike ịkọrọ ha otú obi dị m nakwa ihe ndị na-echegbu m.” Gịnị ka ihe a na-akụziri ndị okenye? Na-agaranụ ụmụnna nleta ọzụzụ atụrụ mgbe a na-enwebeghị nsogbu. Bụrụnụ ndị enyi ha. E nwee ọrịa na-efe efe na-ekweghị unu gaa leta ha, sinụ n’ụzọ ndị ọzọ kpọtụrụ ha. Nwanna Nwaanyị Desi sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ndị okenye dị iche iche na-akpọ m ma ọ bụ zitere m ozi n’ekwentị n’otu ụbọchị. Amaokwu Baịbụl ndị ha gụụrụ m metụrụ m n’ahụ́ n’agbanyeghị na m mabu amaokwu ndị ahụ.”
5. Olee otú ndị okenye nwere ike isi mata ihe bụ́ mkpa ụmụnna ma nyere ha aka?
5 Otú i nwere ike isi mata ihe bụ́ mkpa nwanna bụ ịjụ ya ajụjụ ndị na-agaghị emenye ya ihere. (Ilu 20:5) Hà nwere nri ga-ezuru ha, ọgwụ, na ihe ndị ọzọ? À chọrọ ịchụ ha n’ọrụ ma ọ bụ ịchụpụ ha n’ụlọ ha? Hà chọrọ ka e nyere ha aka dejuo akwụkwọ ụfọdụ ka ndị ọchịchị nwee ike inyere ha aka? Ụmụnna nyere Nwanna Nwaanyị Desi onyinye iji nyere ya aka. Ma, ihe kacha nyere ya aka idi nsogbu ndị bịaara ya bụ otú ndị okenye si hụ ya n’anya ma jiri Baịbụl na-agba ya ume. Ọ sịrị: “Ndị okenye kpeere m ekpere. N’agbanyeghị na agaghị m echetali ihe ndị ha kwuru, m ka na-echeta otú ekpere ahụ mere ka obi dị m. Ọ dị m nnọọ ka Jehova ò si otú ahụ na-asị m, ‘Ọ bụghị naanị gị nọ.’”—Aịza. 41:10, 13.
6. Gịnị ka ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
6 Ihe ụmụnna ndị ọzọ nwere ike ime. Anyị na-atụ anya ka ndị okenye bụrụ ndị mbụ na-enyere ụmụnna aka. Ma, Jehova na-agwa anyị niile ka anyị na-agba ndị ọzọ ume ma na-enyere ha aka. (Gal. 6:10) Ọ bụrụgodị obere ihe ka anyị mere iji nyere onye na-arịa ọrịa aka, ọ ga-agba ya ezigbo ume. Nwatakịrị nwere ike iso papa ya ma ọ bụ mama ya gaa leta nwanna ma ọ bụ nyere ya aka. Onye na-eto eto nwere ike ịgara nwanna nwaanyị ozi ma ọ bụ gaa zụtara ya ihe. Ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nwekwara ike isiri onye ahụ́ na-adịghị nri ma butere ya n’ụlọ ya. Ma, ọ bụrụ na e nwere ọrịa na-efe efe, e kwesịrị ịna-agba onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ume. A gbasaa ọmụmụ ihe, anyị nwere ike ịnọtụkwu ka anyị na ụmụnna nwee ike ịkparịta ụka, ma ọ̀ bụ ihu na ihu ma ọ̀ bụ n’Ịntanet. E kwesịkwara ịna-agba ndị okenye ume. Ụfọdụ ụmụnna na-ede ozi ekele zigara ndị okenye. Ị manụ na e nwee ọrịa na-efe efe, ọrụ ndị okenye na-aka nke oge ndị ọzọ. Ọ na-amagbu onwe ya ma anyị mee ihe anyị kwesịrị ime iji ‘na-agba ibe anyị ume ma na-eme ka ibe anyị dị ike.’—1 Tesa. 5:11.
NA-ENYERE NDỊ ỌDACHI DAKWASỊRỊ AKA
7. Olee nsogbu ọdachi nwere ike ịkpata?
7 Ọdachi nwere ike ịkụghasịrị mmadụ ihe niile n’otu ntabi anya. O nwere ike ime ka ndị ọ dakwasịrị gbara aka ngwongwo ha na ụlọ ha. O nwedịrị ike igbu ndị ha hụrụ n’anya. Ụmụnna anyị sokwa ná ndị ọdachi na-adakwasị. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ha aka?
8. Gịnị ka ndị okenye na ndị isi ezinụlọ nwere ike ime tupu e nwee ọdachi?
8 Ihe ndị okenye nwere ike ime. Ndị okenye, na-enyerenụ ụmụnna aka ịkwadebe maka ọdachi. Hụnụ na ndị niile nọ n’ọgbakọ ma ihe ha kwesịrị ime ka ọkọ ghara ịkọ ha nakwa otú ha ga-esi kpọtụrụ ndị okenye. Nwanna Nwaanyị Margaret, anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ, sịrị: “Ndị okenye anyị mere ihe omume mkpa ọgbakọ, dọọ anyị aka ná ntị na a ka nwere ike inwe ọkụ ọgbụgba n’ọhịa ndị dị anyị gburugburu. Ha kwuru na anyị kwesịrị ịgbapụ ozugbo ma ndị ọchịchị nye iwu ka a gbapụ ma ọ bụkwanụ ma e nwee ọdachi nwere ike ịta isi mmadụ.” Ha kwuru ihe ahụ n’oge kwesịrị ekwesị n’ihi na ọkụ ọjọọ bidoro ịgba mgbe izu ise gara. Ndị isi ezinụlọ nwere ike iji oge ofufe ezinụlọ kọwaa ihe onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ kwesịrị ime. Ọ bụrụ na gị na ụmụ gị akwadebe, o nwere ike ime ka obi ghara ịmapụ unu ma e nwee ọdachi.
9. Olee otú ndị okenye nwere ike isi hazie ihe ha ga-eme tupu ọdachi emee nakwa mgbe o mechara?
9 Ọ bụrụ na ị bụ onye nlekọta ìgwè, echela ka e nwee ọdachi tupu gị anata ndị niile nọ n’ìgwè gị akara ekwentị ha na ihe ndị ọzọ dị mkpa banyere ha. Depụta ihe ndị ahụ. Ị nọtụ, gị achọpụta ma è nweela nke gbanwere. I mee otú ahụ, ị ga-enwe ike ịkpọtụrụ onye nkwusa nke ọ bụla iji mara ihe bụ́ mkpa ya ma e nwee ọdachi. Ozugbo ahụ, kọọrọ onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ ihe ị chọpụtara. Ọ bụzi ya ga-akpọtụrụ onye nlekọta sekit. Ọ bụrụ na ụmụnna ndị a agbakọọ aka, o nwere ike ịba ezigbo uru. Mgbe ọku ahụ gbachara, ụra agaghị onye nlekọta sekit Margaret hà n’anya ruo otu ụbọchị na ọkara ka ọ nọ na-ahazi mbọ ndị okenye na-agba ịkpọtụrụ ihe dị ka narị ụmụnna anọ na iri ise gbara ọsọ ndụ nakwa ilekọta ha. (2 Kọr. 11:27) E si otú ahụ nyere ha niile aka inweta ebe ha ga-anọ.
10. Gịnị mere ndị okenye kwesịrị iji were nleta ọzụzụ atụrụ ka ihe dị mkpa? (Jọn 21:15)
10 Ihe so n’ọrụ ndị okenye bụ iji Baịbụl na-agba ụmụnna ume na inyere ndị na-echegbu onwe ha aka. (1 Pita 5:2) Ọdachi mee, ndị okenye kwesịrị ibu ụzọ chọpụta ma nwanna nke ọ bụla ọ̀ nọ n’ebe ihe na-agaghị eme ya, nweekwa nri, uwe, na ebe ọ ga-anọ. Ma, o nwere ike ịdị mkpa ka e jiri Baịbụl na-agba ụmụnna ndị ahụ ume ruodị ọtụtụ ọnwa. (Gụọ Jọn 21:15.) E nwere otu nwanna aha ya bụ Harold, onye so na Kọmitii Alaka. Ya na ọtụtụ ụmụnna ndị ọdachi dakwasịrị enweekwala nnọkọ. Ọ sịrị: “Ọ bụ ka oge na-aga ka ha ga na-enweta onwe ha. Ha nwere ike iji nwayọọ nwayọọ chefutụwa ihe mere ha. Ma, ihe na-agaghị apụ ha apụ n’obi nwere ike ịbụ onye nwụnahụrụ ha, otu ihe pụrụ iche ha nwere nke lara n’iyi, ma ọ bụ otú ha si laa ná ntá. Ha nwere ike ịna-eme, ha chetahaala ya, ha ebewekwa. Ọ pụtaghị na ha enweghị okwukwe, kama, ọ bụ otú ndị ọdachi dakwasịrị na-emekarị.”
11. Olee ihe o nwere ike ịdị mkpa ka a na-emere ezinụlọ dị iche iche?
11 Ndị okenye ‘na-eso ndị na-ebe ákwá bee ákwá’ otú ahụ Baịbụl kwuru. (Rom 12:15) E kwesịrị ịna-emesi ndị ọdachi dakwasịrị obi ike na Jehova na ụmụnna ha ka hụrụ ha n’anya. Ndị okenye kwesịrị ịna-enyere ndị ezinụlọ ụmụnna ndị ahụ aka ịna-eme ihe ndị ga-eme ka okwukwe ha na-esikwu ike, ma ikpe ekpere ma ịmụ ihe ma ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Ndị okenye nwekwara ike ịgba ndị nne na nna ume ka ha na-enyere ụmụ ha aka ilekwasị anya n’ihe ọdachi ọ bụla na-enweghị ike imebi. Ndị nne na nna, na-echetaranụ ụmụ unu na Jehova ga-abụli Enyi ha mgbe niile nakwa na ọ ga na-enyere ha aka. Gbalịsie ike ịna-akọwara ha na ha nwere ụmụnna zuru ụwa ọnụ ga-agbatara ha ọsọ enyemaka.—1 Pita 2:17.
12. Gịnị ka ụmụnna ndị ọzọ nwere ike ime iji nyere ndị ọdachi dakwasịrị aka? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
12 Ihe ụmụnna ndị ọzọ nwere ike ime. Ọdachi mee n’ebe dị nso n’ebe i bi, jụọ ndị okenye otú i nwere ike isi nye aka. I nwere ike inye ndị gbatara ọsọ ndụ ma ọ bụ ụmụnna ndị so na-arụziri ha ụlọ ebe ha ga-anọ ruo obere oge. I nwere ike inye ndị nkwusa ihe siiri ike nri na ihe ndị ọzọ. Ọdachi mee n’ebe dị ezigbo anya, ị ka nwere ike inye aka. Olee otú i nwere ike isi eme ya? Ọ bụ ịna-echeta ndị ahụ o mere n’ekpere. (2 Kọr. 1:8-11) I nwekwara ike iji ego gị kwado ihe a na-ebugara ha iji nyere ha aka. Otú ị ga-esi eme ya bụ inye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. (2 Kọr. 8:2-5) Ọ bụrụ na ị ga-agali nye aka n’ebe ọdachi ahụ mere, jụọ ndị okenye otú i nwere ike isi nye aka. A kpọọ gị ka i nye aka, e nwere ike inye gị ọzụzụ ka i nwee ike inye aka n’ebe nakwa n’oge kacha mma.
NA-ENYERE ỤMỤNNA AKA KA HA DIE MKPAGBU
13. Olee nsogbu ụmụnna bi ná mba ndị a machiri ozi ọma anyị iwu na-enwe?
13 Ná mba ndị a machiri ozi ọma anyị iwu, mkpagbu nwere ike ime ka ihe sikwuoro ụmụnna anyị ike. Nsogbu ndị ọzọ na-abịara ha bụ ụkọ ego, ọrịa, na ọnwụ onye ha hụrụ n’anya. Ma, iwu ahụ a machiri ozi ọma anyị nwere ike ime ka ndị okenye ghara inwe ike ịga leta ndị e kwesịrị ịgba ume ma ọ bụ ha na ha ịna-ezirịta ozi. Ọ bụ ihe mere Nwanna Andrei anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ. Ego kọrọ otu nwanna nwaanyị nọ n’ìgwè ozi ubi ya. Ka a na-ekwu nke ahụ, nwanna nwaanyị ahụ enwee ihe mberede okporo ụzọ. N’ihi ya, e kwesịrị ịwa ya ahụ́ ugboro ugboro. Ọ naghịkwa arụli ọrụ. N’agbanyeghị ọrịa koronavaịrọs na iwu ahụ a machiri ozi ọma anyị, ụmụnna gbalịsiri ike nyere ya aka. Jehova hụkwara ihe na-eme.
14. Olee otú ndị okenye nwere ike isi gosi otú e si atụkwasị Jehova obi?
14 Ihe ndị okenye nwere ike ime. Nwanna Andrei kpere ekpere, meekwa ihe ọ ga-emeli. Olee otú Jehova si zaa ekpere ya? O metụrụ ụmụnna ndị ọzọ nwere ike ịgagharị agagharị aka n’obi inyere nwanna nwaanyị ahụ aka. Ụfọdụ n’ime ha na-ebuga nwanna nwaanyị ahụ ụlọ ọgwụ. Ụfọdụ nyere ya ego. Jehova metụrụ ha aka n’obi inyere ya aka, gọziekwa mbọ ha ji otu obi na obi ike gbaa. (Hib. 13:16) Ndị okenye, ọ bụrụ na a machiri ozi ọma anyị iwu, gwanụ ụmụnna ndị ọzọ ka ha nye aka. (Jere. 36:5, 6) Nke kacha mkpa bụ ịtụkwasị Jehova obi. Ọ ga-enyere unu aka ịna-egboro ụmụnna anyị mkpa ha.
15. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu mgbe a na-akpagbu anyị?
15 Ihe ụmụnna ndị ọzọ nwere ike ime. Ndị ọchịchị machie ozi ọma anyị iwu, anyị na ụmụnna anyị nwere ike ịna-ezukọ naanị n’obere ìgwè. N’ihi ya, ọ bụ mgbe ahụ ka ọ kacha dịrị mkpa ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo. Na-alụso Setan ọgụ, ọ bụghị ibe unu. Leghara ihe nwanna gị mejọrọ anya, ma ọ bụ gị agaa ozugbo ka gị na ya kwurịta ya. (Ilu 19:11; Efe. 4:26) Dịrịnụ njikere inyere ibe unu aka. (Taị. 3:14) Aka ụmụnna nyeere nwanna nwaanyị ahụ ihe siiri ike baara ndị nọ n’ìgwè ozi ubi ha uru. O mere ka ha dịkwuo ná mma ka otu ezinụlọ.—Ọma 133:1.
16. Dị ka e kwuru ná Ndị Kọlọsi 4:3, 18, olee otú anyị nwere ike isi nyere ụmụnna anyị a na-akpagbu aka?
16 Ọtụtụ puku ụmụnna anyị na-efe Jehova n’agbanyeghị iwu ndị ọchịchị machiri ozi ọma anyị. Ụfọdụ ụmụnna nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi ihe ha kweere. Anyị nwere ike ịna-ekpe ekpere maka ha na ndị ezinụlọ ha nakwa maka ụmụnna ndị katara obi na-akwado ha n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka a nwụchiekwa hanwa. Ụmụnna ndị ahụ na-eji Baịbụl agba ndị ahụ a tụrụ mkpọrọ ume, na-egboro ha mkpa ha, na-agbachitekwara ha n’ụlọikpe. c (Gụọ Ndị Kọlọsi 4:3, 18.) Echefula na ekpere gị nwere ike ịkpa ike.—2 Tesa. 3:1, 2; 1 Tim. 2:1, 2.
17. Olee otú i nwere ike isi jikere ugbu a maka mkpagbu?
17 Gị na ezinụlọ gị nwere ike iji ugbu a jikere maka mkpagbu. (Ọrụ 14:22) Ọ pụtaghị na ị ga na-eche banyere ihe ọjọọ niile nwere ike ime. Kama ime otú ahụ, mee ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma, nyekwara ụmụ gị aka ime otú ahụ. I chegbuwe onwe gị mgbe ụfọdụ, gwa Jehova ihe niile dị gị n’obi. (Ọma 62:7, 8) Gị na ezinụlọ gị kwurịta ihe niile mere unu ji kwesị ịtụkwasị ya obi. d Tupu ọdachi emee, otú i si kwadebe nke ọma na otú i si tụkwasị Jehova obi ga-akụziri ụmụ gị inwe obi ike, obi eruokwa ha ala.
18. Olee ihe ọma ga-emere anyị n’ọdịnihu?
18 Udo Chineke na-enye na-eme ka obi ruo anyị ala. (Fil. 4:6, 7) Jehova na-eji ya eme ka obi ruo anyị ala n’agbanyeghị ọrịa, ọdachi, na mkpagbu nwere ike ịbịara anyị taa. Ọ na-eji ndị okenye na-arụsi ọrụ ike elekọta anyị. O nyekwara anyị niile ohere inyere ibe anyị aka. Udo anyị nwere ugbu a ga-eme ka anyị jikere maka ọnwụnwa ndị kanụ ga-abịa, ma “oké mkpagbu.” (Mat. 24:21) N’oge ahụ, ọ ga-adị mkpa ka anyị dịrị n’udo, nyekwara ndị ọzọ aka ime otú ahụ. Ma oge ahụ gachaa, anyị agaghị na-enwe nsogbu ga-ekowe anyị obi n’elu. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ga-enwe ihe Jehova chọrọ ka anyị nwee kemgbe, ya bụ, ezigbo udo nke ga-adịru ebighị ebi.—Aịza. 26:3, 4.
ABỤ NKE 109 Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya
a Jehova na-ejikarị ndị ohu ya enyere ndị nsogbu bịaara aka. O nwere ike iji gị gbaa nwanna gị ume. Ka anyị hụ otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ma nsogbu bịara ha.
b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
c Alaka ụlọ ọrụ ma ọ bụ ndị nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị agaghị ezigaliri ụmụnna nọ n’ụlọ mkpọrọ akwụkwọ ozi ụmụnna ha degaara ha.
d Gụọ isiokwu bụ́ “Jikere Ugbu A Maka Mkpagbu,” nke gbara n’Ụlọ Nche Julaị 2019.
e NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na nwunye ya buteere otu ezinụlọ gbatara ọsọ ndụ nri mgbe ọdachi mechara.