Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 51

Obi Ga-eruli Gị Ala n’Oge Nsogbu

Obi Ga-eruli Gị Ala n’Oge Nsogbu

“Obi alọla unu mmiri, unu atụkwala egwu.”—JỌN 14:27.

ABỤ NKE 112 Jehova Bụ Chineke nke Udo

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị bụ “udo Chineke na-enye”? Oleekwa uru ọ na-abara anyị? (Ndị Filipaị 4:6, 7)

 E NWERE ụdị udo ndị ụwa na-amaghị gbasara ya. Ọ bụ “udo Chineke na-enye,” ya bụ, obi iru mmadụ ala maka na ya na Nna ya nke eluigwe dị n’ezigbo mma. Ọ bụrụ na anyị enwee udo ahụ Chineke na-enye, obi ga-eru anyị ala. (Gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7.) Anyị na ndị hụrụ Chineke n’anya ga-adị n’ezigbo mma, anyị na “Chineke nke udo” adịkwa n’ezigbo mma. (1 Tesa. 5:23) Ọ bụrụ na anyị amata Nna anyị nke eluigwe, hụ ya n’anya, na-erubekwara ya isi, udo Chineke na-enye nwere ike ime ka obi ruo anyị ala ma nsogbu bịara anyị.

2. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na anyị ga-enweli udo Chineke na-enye?

2 Ànyị ga-enweli udo Chineke na-enye ma nsogbu bịara anyị, nsogbu ndị dị ka ọrịa na-efe efe, ọdachi, ọgba aghara, ma ọ bụ mkpagbu? Ụdị nsogbu ndị a siri ike nwere ike ime ka ụjọ jide anyị. Ma, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Obi alọla unu mmiri, unu atụkwala egwu.” (Jọn 14:27) Obi dị anyị ụtọ na ụmụnna anyị na-eme ihe a Jizọs kwuru. Jehova enyerela ha aka obi eruo ha ala mgbe nsogbu bịaara ha.

OTÚ OBI GA-ESI RUO ANYỊ ALA MA E NWEE ỌRỊA NA-EFE EFE

3. Olee otú ọrịa na-efe efe n’otu obodo ma ọ bụ n’ụwa niile nwere ike isi mee ka obi ghara iru anyị ala?

3 E nwee ọrịa na-efe efe n’otu obodo ma ọ bụ n’ụwa niile, o nwere ike ịgbanwe ọtụtụ ihe ná ndụ anyị. Legodị ihe ọrịa koronavaịrọs kpataara ọtụtụ ndị. N’otu nchọpụta e mere, ihe karịrị ọkara n’ime ndị a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ụra ekweghị aga ha n’anya n’oge e nwere ọrịa koronavaịrọs. Ọrịa ahụ so mee ka e nwee ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha, ndị ike ụwa na-agwụ, ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, ndị na-akụ di ha ma ọ bụ nwunye ha ihe, nakwa ndị nwara igbu onwe ha. E nwee ụdị ọrịa a n’ebe i bi, gịnị ka ị ga-eme ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị ma nwee udo Chineke na-enye?

4. Gịnị mere ịmata amụma Jizọs buru gbasara oge ikpeazụ ji eme ka obi ruo anyị ala?

4 Jizọs buru amụma na n’oge ikpeazụ, ọrịa na-efe efe ga-adị “n’ebe dị iche iche.” (Luk 21:11) Olee otú ịma ihe a si eme ka obi ruo anyị ala? Ọ naghị eju anyị anya ihe mere e ji enwe ọrịa na-efe efe. Anyị ma na ọ bụ ihe Jizọs kwuru na-eme. N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ihe Jizọs gwara ndị ga-ebi n’oge ikpeazụ ka ha mee. Ọ sịrị ha: “Unu atụla ụjọ.”—Mat. 24:6.

Ige Baịbụl nke a na-egere egere nwere ike inyere gị aka ka obi ruo gị ala mgbe e nwere ọrịa na-efe efe (A ga-akọwa ya na paragraf 5)

5. (a) Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 4:8, 9, gịnị ka anyị kwesịrị ikpe ekpere gbasara ya ma e nwee ọrịa na-efe efe? (b) Olee otú ige ihe ndị a na-egere egere ọgbakọ Jehova wepụtaara anyị nwere ike isi baara gị uru?

5 Ọrịa na-efe efe malite, o nwere ike ime ka mmadụ chegbuwe onwe ya, tụwakwa ụjọ. Ọ bụ ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Desi. b Mgbe ọrịa koronavaịrọs gburu nwanne papa ya, nwa nwanne papa ya, na dọkịta ya, ụjọ bịara ya na ọ ga-ebute ọrịa ahụ ma bunye ya mama ya merela agadi. N’oge ahụ, ọ nọkwa na-echegbu onwe ya na a ga-akwụsị ya ọrụ, ya ana-echekwa otú ọ ga-esi na-enweta nri ma na-akwụ ụgwọ ụlọ. Ihe ndị a nọ na-echegbu ya, meekwa ka ọ ghara ịna-ehi ụra abalị. Ma, obi mechara ruo Nwanna Nwaanyị Desi ala. Gịnị nyeere ya aka? O kpere ekpere, rịọ Jehova ka o nyere ya aka ka obi ruo ya ala nakwa ka ọ na-eche ihe ndị dị mma. (Gụọ Ndị Filipaị 4:8, 9.) O gere Jehova ntị. Otú o si mee ya bụ ịna-ege Baịbụl nke a na-egere egere. Ọ sịrị: “Olu ndị ahụ dị jụụ e ji gụọ ya mere ka m kwụsị ichegbu onwe m, chetakwara m na ihe banyere m na-emetụ Jehova n’obi.”—Ọma 94:19.

6. Olee otú ịmụ ihe n’onwe gị na ịga ọmụmụ ihe ga-esi enyere gị aka?

6 Ọrịa na-efe efe nwere ike ime ka anyị ghara ịna-eme ụfọdụ ihe anyị na-emebu. Ma, ekwela ka o mee ka ị kwụsị ịna-amụ Baịbụl n’onwe gị ma ọ bụ ịna-aga ọmụmụ ihe. Ihe ndị ụmụnna anyị kọrọ n’akwụkwọ anyị nakwa na vidio anyị nwere ike ichetara gị na ụmụnna anyị ka na-efe Jehova n’agbanyeghị na ụdị nsogbu ndị ahụ bịaara ha. (1 Pita 5:9) Ịga ọmụmụ ihe ga-eme ka ihe ị ga na-eche bụrụ ihe ndị dị mma, dị na Baịbụl. Ọ ga-emekwa ka i nweta ohere ịgba ndị ọzọ ume nakwa ndị ọzọ ịgba gị ume. (Rom 1:11, 12) Iche gbasara otú Jehova si nyere ụmụnna anyị aka mgbe ha na-arịa ọrịa, mgbe ụjọ ji ha, ma ọ bụ mgbe ọ dị ha ka ha enweghị mmadụ, ga-eme ka okwukwe gị sikwuo ike, meekwa ka obi sie gị ike na ọ ga-akwado gị.

7. Olee ihe anyị ga-amụta n’aka Jọn onyeozi?

7 Gbalịa na-akpọtụrụ ụmụnna gị. Ọrịa na-efe efe malite, e nwere ike ịsị ndị mmadụ anọla ibe ha oké nso, ma mgbe anyị na ụmụnna anyị nọ. N’ụdị oge ahụ, o nwere ike ịdị gị otú ọ dị Jọn onyeozi. Ọ chọrọ ka ya na Geyọs enyi ya hụ ihu na ihu. (3 Jọn 13, 14) Ma, Jọn ma na ọ gaghị ahụli Geyọs n’oge ahụ. N’ihi ya, Jọn mere ihe ọ ga-emeli. O degaara ya akwụkwọ ozi. Ọ bụrụ na ị gaghị agali n’ụlọ ụmụnna gị, gbalịa kpọọ ha n’ekwentị, zigara ha ozi n’ekwentị, ma ọ bụ gị esi n’Ịntanet kpọọ ha. Ọ bụrụ na ị gbalịa na-akpọtụrụ ụmụnna gị, obi ga-esikwu gị ike na i nwere mmadụ, obi eruokwa gị ala. Kpọtụrụ ndị okenye ma ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị, kwekwa ka ha gbaa gị ume.—Aịza. 32:1, 2.

OTÚ OBI GA-ESI RUO ANYỊ ALA MGBE ỌDACHI MERE

8. Olee otú ọdachi nwere ike isi mee ka obi gharazie iru gị ala?

8 Ọ bụrụ na idei mmiri, ala ọma jijiji, ma ọ bụ ọkụ emebitụla ihe gị, o nwere ike ime ka ị na-echegbu onwe gị ruo ogologo oge. Ọ bụrụ na mmadụ nwụnahụrụ gị ma ọ bụ na ihe i nwere lara n’iyi, o nwere ike ịna-ewute gị, na-ewedị gị iwe, ma ọ bụ gị echee na ihe agaghịzi adị mma. Ihe a apụtaghị na i weere akụnụba ka ihe kacha mkpa ma ọ bụ na i nweghị okwukwe. Ihe mere gị adịghị mfe, ụfọdụ nwekwara ike ịna-ele gị anya ka i mee ihe na-adịghị mma. (Job 1:11) Ma, n’agbanyeghị na ihe siiri gị ike, obi ka nwere ike iru gị ala. Gịnị ga-enyere gị aka?

9. Olee ihe Jizọs kwuru iji kwadebe anyị maka ọdachi?

9 Cheta ihe Jizọs buru n’amụma. Anyị adịghị ka ụfọdụ ndị nọ n’ụwa a kwetara na ọdachi enweghị ike ịdakwasị ha. Anyị ma na a ga na-enwekwu ọdachi n’oge a, nakwa na ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịdakwasị anyị. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na “oké ala ọma jijiji” na ọdachi ndị ọzọ ga-eme tupu ọgwụgwụ abịa. (Luk 21:11) O bukwara amụma na ‘mmebi iwu ga-eju ebe niile.’ Anyị na-ahụkwa ya taa. Dị ka ihe atụ, anyị na-ahụ mpụ, tigbuo zọgbuo, na arụ ndị omekome na-akpa. (Mat. 24:12) Jizọs ekwughị na ọ bụ naanị ndị Jehova jụrụ ka ọdachi ndị a ga-adakwasị. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweela ọtụtụ ndị ohu Jehova ọdachi dakwasịrị. (Aịza. 57:1; 2 Kọr. 11:25) E nwere ike Jehova agaghị arụ ọrụ ebube chebe anyị ka ọdachi ndị ahụ ghara ịdakwasị anyị. Ma, ọ ga-enye anyị ihe ọ bụla ga-eme ka obi ruo anyị ala.

10. Gịnị mere ịkwadebe maka ọdachi ji egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi? (Ilu 22:3)

10 Ihe gbata gbata mee, ọ ga-aka adịrị anyị mfe obi iru anyị ala ma ọ bụrụ na anyị ebula ụzọ jikere maka ya. Ma, ijikere maka ọdachi ọ̀ na-egosi na anyị enweghị okwukwe na Jehova? Mbanụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-egosi na anyị nwere okwukwe na ọ ga-elekọta anyị. Gịnị mere anyị ji kwuo ya? Baịbụl gwara anyị ka anyị na-akwadebe maka ọdachi ndị nwere ike ime. (Gụọ Ilu 22:3.) Nzukọ Jehova esikwala n’akwụkwọ anyị, n’ọmụmụ ihe anyị, nakwa n’ọkwa ndị ha na-amara anyị na-agwa anyị ọtụtụ ugboro ka anyị kwadebe maka ihe gbata gbata. c Ànyị tụkwasịrị Jehova obi? Ọ bụrụ na anyị tụkwasịrị ya obi, ka anyị mee ihe ha gwara anyị ugbu a, tupu ọdachi emee.

Ịkwadebe akwadebe tupu ọdachi emee nwere ike ịzọ gị ndụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) d

11. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Margaret?

11 Legodị ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Margaret. A gwara ya ka ọ kwapụ n’ụlọ ya mgbe ọkụ na-agba n’ebe ha bi. Ụzọ niile kpọchiri akpọchi n’ihi na ọtụtụ ndị ji ụgbọala ha na-achọ ịgbapụ n’otu oge. Anwụrụ ọkụ juru ebe niile. Nwanna Nwaanyị Margaret enweghịkwa ike ịpụta n’ụgbọala ya. Ma, ihe zọrọ ya bụ na ọ kwadebere akwadebe. O tinyere n’akpa ya map ga-enyere ya aka ịmata ụzọ ọzọ ọ ga-esi agbapụ. Ọ gbaadịla ụzọ ahụ tupu oge ahụ ka o nwee ike ịmata otú ọ ga-esi agba ya ma ihe gbata gbata mee. Ọ bụ otú ahụ o si kwadebe zọrọ ya ndụ.

12. Gịnị mere anyị ji eme ihe ndị a gwara anyị mee iji chebe anyị?

12 Iji chebe anyị na ndị ọzọ, ndị ọchịchị nwere ike ịgwa anyị ka anyị ghara ịpụta èzí n’oge ụfọdụ n’ụbọchị, ka anyị kwapụ, ma ọ bụ ka anyị mee ihe ndị ọzọ. Ụfọdụ ndị anaghị eme ihe ndị a ndị ọchịchị kwuru n’ihi na ha achọghị ịhapụ ihe ndị ha nwere. Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ime? Baịbụl gwara anyị, sị: “Jirinụ maka Onyenwe anyị na-erubere ndị niile ụmụ mmadụ họpụtara isi, ma eze, n’ihi na ọ karịrị unu, ma ndị gọvanọ, n’ihi na eze họpụtara ha.” (1 Pita 2:13, 14) Nzukọ Jehova na-agwakwa anyị ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ịbanye ná nsogbu. A na-echetara anyị mgbe ọ bụla ka anyị nye ndị okenye akara ekwentị anyị na adres anyị ka ha nwee ike inweta anyị ma ihe gbata gbata mee. Ì meela ya? Ndị okenye nwekwara ike ịgwa anyị ka anyị ghara isi n’ụlọ anyị pụọ ma ọ bụ ka anyị kwapụ, gwakwa anyị otú anyị ga-esi enweta ihe e ji gbatara anyị ọsọ enyemaka, ma ọ bụ otú anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka na mgbe anyị ga-eme ya. Anyị jụ irube isi, o nwere ike itinye anyị na ndị okenye ndị ahụ ná nsogbu. Cheta na ụmụnna ndị a na-eche anyị nche. (Hib. 13:17) Nwanna Nwaanyị Margaret sịrị: “Obi siri m ezigbo ike na ihe zọrọ m ndụ bụ ime ihe ndị okenye na nzukọ Jehova kwuru.”

13. Gịnị mere ka obi na-adị ọtụtụ Ndị Kraịst gbapụrụ n’ụlọ ha ụtọ, obi eruokwa ha ala?

13 Ọtụtụ ụmụnna ọdachi, agha, ma ọ bụ ọgba aghara mere ka ha gbapụ n’ụlọ ha gbalịsiri ike nabata otú ihe sizi dịrị ha ma malite ime ihe ndị gbasara ofufe Jehova ozugbo. Ha akwụsịghị ‘ịna-ekwusa okwu Chineke,’ otú ahụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi na-akwụsịghị mgbe a na-akpagbu ha. (Ọrụ 8:4) Ikwusa ozi ọma na-enyere ha aka ilekwasị anya n’Alaeze Chineke kama ilekwasị anya n’otú ihe si siere ha ike. O mere ka obi na-adị ha ụtọ, obi eruokwa ha ala.

OTÚ OBI GA-ESI RUO ANYỊ ALA MGBE A NA-AKPAGBU ANYỊ

14. Olee otú mkpagbu nwere ike isi mee ka obi ghara iru anyị ala?

14 Mkpagbu nwere ike ime ka anyị gharazie ịna-eme ihe ndị na-eme ka obi ruo anyị ala. Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị gbakọta ọnụ ma ọ bụ na-ezi ozi ọma n’enweghị onye na-enye anyị nsogbu, nakwa ma anyị na-eme ihe ndị dịịrị anyị n’ụbọchị n’atụghị ụjọ na a ga-anwụchi anyị. E nyewe anyị nsogbu n’ihi ihe ndị a, anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị, na-echekwa ihe nwere ike ime anyị. Anyị chewe otú ahụ, o nweghị ihe o mere. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya. Jizọs kwuru na mkpagbu nwere ike ime ka ndị na-eso ụzọ ya dapụ n’okwukwe. (Jọn 16:1, 2) N’ihi ya, olee otú obi nwere ike isi ruo anyị ala mgbe a na-akpagbu anyị?

15. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-atụ ụjọ mkpagbu? (Jọn 15:20; 16:33)

15 Baịbụl gwara anyị, sị: ‘A ga-akpagbu ndị niile na-ebi ndụ otú na-egosi na ha na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.’ (2 Tim. 3:12) O siiri otu nwanna aha ya bụ Andrei ike ikweta na a ga-akpagbu Ndịàmà Jehova niile nọ n’obodo ha mgbe a machiri anyị ikwusa ozi ọma n’obodo ha. Ọ sịrị: ‘E nwere ọtụtụ Ndịàmà Jehova n’obodo a. Olee otú ndị ọchịchị ga-esi anwụchi anyị niile?’ Ma, iche ihe ahụ emeghị ka obi ruo Nwanna Andrei ala, kama o mere ka obi koro ya n’elu mgbe niile. Ụmụnna ndị ọzọ tụkwasịrị Jehova obi. Ha anọghị na-eche na a gaghị anwụchi ha. Ha ma na e nwere ike ịnwụchi ha. Ma, ha anọghị na-echegbu onwe ha ka Andrei. N’ihi ya, Nwanna Andrei malitere ịtụkwasị Jehova obi ka ha. Ọ dịghị anya, obi eruo ya ala. Obi na-adịkwa ya ụtọ ugbu a n’agbanyeghị nsogbu. Otú ahụ ka o nwere ike ịdị anyị. Ọ bụ eziokwu na Jizọs gwara anyị ka anyị na-atụ anya mkpagbu, o mesikwara anyị obi ike na anyị ga-atachili obi.—Gụọ Jọn 15:20; 16:33.

16. Olee ndị anyị kwesịrị ịna-erubere isi n’oge a na-akpagbu anyị?

16 Ọ bụrụ na a machie anyị ikwusa ozi ọma ma ọ bụ ime ihe ụfọdụ, alaka ụlọ ọrụ na ndị okenye nwere ike ịgwa anyị ihe anyị ga-eme. Ihe mere ha ji agwa anyị ihe ndị ahụ bụ iji chebe anyị ma hụ na anyị nwetara ihe ndị ga-eme ka anyị na Jehova dịrị ná mma, nakwa iji nyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma otú o kwere omume. Gbalịa na-erube isi n’ihe ndị ahụ ha kwuru ọ bụrụgodị na ị ghọtachaghị ihe mere ha ji gwa anyị ihe ndị ahụ. (Jems 3:17) Ihe ọzọ bụ, anwala anwa gwa ndị ọzọ ihe ha na-ekwesịghị ịma gbasara ụmụnna anyị ma ọ bụ ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ.—Ekli. 3:7.

Gịnị ga-enyere gị aka ka obi na-eru gị ala ma mgbe ihe siri ike? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17) e

17. Dị ka ndịozi Jizọs mere, gịnị ka anyị kpebisiri ike ime?

17 Otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mere Ekwensu ji alụso ndị Chineke agha bụ na e nyere ha “ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.” (Mkpu. 12:17) Ekwela ka Ekwensu na ụwa ya menye gị ụjọ. Ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl n’agbanyeghị mkpagbu na-eme ka obi na-adị anyị ụtọ, obi eruokwa anyị ala. Mgbe ndị ọchịchị ndị Juu nyere ndịozi Jizọs iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ha rubeere Chineke isi. Ha akwụsịghị ikwusa ozi ọma. Ọrụ ahụ mekwara ha obi ụtọ. (Ọrụ 5:27-29, 41, 42) N’eziokwu, anyị kwesịrị ịkpachara anya ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị machiri anyị ime ihe ụfọdụ. (Mat. 10:16) Ma, ọ bụrụ na anyị emee ike anyị niile, obi ga-eru anyị ala maka na anyị na-eme ihe Jehova chọrọ ma na-ekwusa ozi ọma a na-azọ ndụ.

‘CHINEKE NKE UDO GA-ANỌNYERE UNU’

18. Olee ihe anyị kwesịrị icheta gbasara Onye ga-eme ka anyị nwee ụdị udo dị anyị mkpa?

18 Obi sie gị ike na obi ga-eruli anyị ala, ma mgbe ihe kacha siere anyị ike. N’ụdị oge ahụ, anyị kwesịrị icheta na ụdị udo dị anyị mkpa bụ udo Chineke na-enye, ya bụ, udo nke ọ bụ naanị Jehova na-eme ka mmadụ nwee. Tụkwasị ya obi ma e nwee ọrịa na-efe efe, ọdachi, ma ọ bụ ma a kpagbuwe anyị. Nọsie ike n’ọgbakọ ya. Na-ele anya ihe ndị magburu onwe ha ga-emere gị n’ọdịnihu. Ka ị na-eme otú ahụ, ‘Chineke nke udo ga-anọnyere gị.’ (Fil. 4:9) N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-ahụ otú anyị ga-esi enyere ụmụnna anyị ndị nsogbu bịaara aka ka ha nwee udo Chineke na-enye.

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

a Jehova kwere nkwa na ọ ga-eme ka ndị hụrụ ya n’anya nwee udo. Gịnị bụ udo ahụ Chineke na-eme ka anyị nwee? Oleekwa otú anyị ga-esi enweta ya? Olee otú inwe “udo Chineke na-enye” ga-esi enyere anyị aka ma e nwee ọrịa na-efe efe, ọdachi, ma ọ bụ ma a kpagbuwe anyị? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.

b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

c Gụọ isiokwu bụ́ “Ọdachi Mee, Olee Ihe Ndị Nwere Ike Ịzọ Anyị Ndụ?” nke gbara na Teta! Nke 5 n’afọ 2017.

d NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-akwadebe tupu ọdachi emee ka o nwee ike isi n’ụlọ ya gbapụ.

e NKỌWA FOTO: Ebe nwanna bi n’ebe a machiri anyị ikwusa ozi ọma na-ekwusa ozi ọma, ma ọ na-akpachara anya.