Ì Chetara?
Ị̀ gụọla Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’afọ a nke ọma? Ngwa, lee ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:
Gịnị ka ‘ịgbanwe otú anyị si eche echiche’ pụtara? (Rom 12:2)
Ihe ọ pụtara abụghị naanị ịna-eme ihe ọma. Ọ pụtakwara na anyị ga-eleru onwe anyị anya ma gbanwee ihe ọ bụla anyị kwesịrị ịgbanwe ka ndụ anyị nwee ike ịdaba n’ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme.—w23.01, peeji nke 8 na nke 9.
Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi ka anyị na-ahụ ihe ndị na-eme n’ụwa?
Ọ na-atọ anyị ụtọ ịhụ otú ihe ndị na-eme n’ụwa taa si emezu amụma Baịbụl. Ma, anyị ekwesịghị ikwuwe ihe anyị chere nwere ike ime n’ihi na o nwere ike ime ka ọgbakọ ghara ịdị n’otu. Kama, ihe anyị na ndị ọzọ na-ekwurịta kwesịrị ịbụ ihe nzukọ Jehova bipụtara. (1 Kọr. 1:10)—w23.02, peeji nke 16.
Olee otú baptizim e mere Jizọs si dị iche na nke e mere ndị na-eso ụzọ ya?
Ebe ọ bụ na a mụrụ Jizọs ná mba e nyefere Jehova, ọ dịghị mkpa ka o nyefee Jehova onwe ya otú anyịnwa na-eme. Jizọs zuru okè, o meghịkwa mmehie. O kwesịghị ichegharị ná mmehie ya.—w23.03, peeji nke 5.
Olee otú anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe?
Anyị kwesịrị ịza ajụjụ dị nkenke. Ọ ga-enye ndị ọzọ ohere ịza ajụjụ. Anyị ekwesịghịkwa ikwu banyere ọtụtụ ihe. Ọ ga-eme ka ndị ọzọ nwee ihe ha ga-aza.—w23.04, peeji nke 23.
Gịnị bụ “Ụzọ Dị Nsọ” e kwuru okwu ya n’Aịzaya 35:8?
N’oge ochie, ọ nọchiri anya okporo ụzọ ndị Izrel si laa obodo ha mgbe ha si Babịlọn a dọọrọ ha n’agha na-alaghachi. Oleekwanụ maka oge anyị a? Ọtụtụ narị afọ tupu afọ 1919, a kwadebere ụzọ ahụ. A malitere ịsụgharị Baịbụl na ibi ya, meekwa ihe ndị ọzọ. Ndị Chineke na-aga ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ,’ nke na-enyere anyị aka ịna-efe Jehova ugbu a nakwa n’ọdịnihu, mgbe Alaeze Chineke ga-eme ka ọtụtụ ihe ọma mee n’ụwa a.—w23.05, peeji nke 15 ruo na nke 19.
Olee ụmụ nwaanyị abụọ Ilu isi 9 nyere ndụmọdụ gbasara ha?
Ilu kwuru gbasara “nwaanyị nzuzu,” onye ndị zara òkù ya na-abanye n’ime “ili,” kwuokwa gbasara “ezigbo amamihe,” nke e ji otu nwaanyị mee ihe atụ ya, onye ndị zara òkù ya ‘ga na-ebi ndụ otú na-egosi na ha na-aghọta ihe.’ Ha ga-enwetakwa ndụ. (Ilu 9:1, 6, 13, 18)—w23.06, peeji nke 22 ruo na nke 24.
Olee otú otú Jehova si meso Lọt ihe si gosi na ọ dị umeala n’obi ma na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị?
Jehova gwara Lọt ka o si Sọdọm gbaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu. Mgbe Lọt rịọrọ Jehova ka o kwe ka ọ gbaga Zoa kama ịgbaga ebe ahụ Jehova kwuru, Jehova kwere.—w23.07, peeji nke 21.
Olee ihe nwaanyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na di ya na-ele ndị gba ọtọ?
O kwesịrị icheta na ọ bụghị yanwa ka ụta dịịrị. O kwesịrị ilekwasị anya n’ihe ndị ga-eme ka ya na Jehova dịrị ná mma, tụgharịa uche n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara ụmụ nwaanyị nọ na-echegbu onwe ha, Chineke enyere ha aka. O nwere ike inyere di ya aka izere ihe ndị nwere ike itinye ya n’ọnwụnwa.—w23.08, peeji nke 14 ruo na nke 17.
Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ anyị ajụjụ gbasara ihe anyị kweere, olee otú nghọta ga-esi enyere anyị aka ịdị nwayọọ?
Anyị nwere ike iche gbasara otú ajụjụ ahụ nwere ike isi mee ka anyị mata ihe dị ya n’obi. Ọ ga-eme ka anyị meda obi zaghachi ya.—w23.09, peeji nke 17.
Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Meri si nweta ike?
Mgbe Meri matara na ya ga-abụ nne Mezaya, o kwere ka ndị ọzọ nyere ya aka. Gebriel na Elizabet si n’Akwụkwọ Nsọ gbaa ya ume. Ụmụnna anyị nwekwara ike ime ka anyị dị ike.—w23.10, peeji nke 15.
Olee otú Jehova nwere ike isi aza ekpere anyị?
Jehova kwere nkwa na ọ ga-ege ntị n’ekpere anyị. Ọ na-echebakwara otú ekpere anyị si gbasa nzube ya echiche. (Jere. 29:12) Otú o nwere ike isi aza otu ihe ndị ohu ya rịọrọ ya nwere ike ịdị iche iche, ma ọ ga-akwado anyị mgbe niile.—w23.11, peeji nke 21 na nke 22.
Ndị Rom 5:2 kwuru gbasara “olileanya.” Gịnịzi mere e ji kwuo gbasara ya ọzọ n’amaokwu nke 4?
Mmadụ nụ ozi ọma, o nwere ike inwe olileanya na ọ ga-ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ paradaịs. Ma, ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara ya, ya edie ya, hụkwa na ya na Chineke dị ná mma, o nwere ike ime ka olileanya ya sikwuo ike, obi esikwuokwa ya ike na ọ ga-emezu.—w23.12, peeji nke 12 na nke 13.