Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 52

Ụmụnna Nwaanyị Na-eto Eto, Gbalịanụ Bụrụ Ndị Kraịst Tozuru Etozu

Ụmụnna Nwaanyị Na-eto Eto, Gbalịanụ Bụrụ Ndị Kraịst Tozuru Etozu

“Ụmụ nwaanyị kwesịkwara ịbụ ndị . . . na-emeru ihe n’ókè, na ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ihe niile.”​—1 TIM. 3:11.

ABỤ NKE 133 Fee Jehova n’Oge Ị Na-eto Eto

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Olee ihe anyị kwesịrị ime ka anyị ghọọ Ndị Kraịst tozuru etozu?

 Ọ NA-ATỤ anyị n’anya otú nwatakịrị na-esi eto ngwa ngwa ghọọ dimkpa. O yichakwara ka o nweghị mbọ ọ bụla ọ na-agba ka o nwee ike ito. Ma, mmadụ ga-agbarịrị mbọ ka o nwee ike ịghọ Onye Kraịst tozuru etozu. b (1 Kọr. 13:11; Hib. 6:1) Ka anyị nwee ike mee ya, anyị kwesịrị ime ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Mmụọ nsọ ya dịkwa anyị mkpa iji mụta ịkpa àgwà Ndị Kraịst, mụta ihe ndị ga-abara anyị uru, jikerekwa maka ọrụ ndị anyị ga-arụ n’ọdịnihu.​—Ilu 1:5.

2. Gịnị ka anyị mụtara na Jenesis 1:27, oleekwa ihe anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu a?

2 Jehova kere ụmụ mmadụ ka ha bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. (Gụọ Jenesis 1:27.) I lee nwoke anya, ị ga-ahụ na ọ dị iche na nwaanyị. Mana, e nwekwara ụzọ ndị ọzọ ha si dị iche. Dị ka ihe atụ, Jehova kere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ka e nwee ọrụ ndị ha ga na-arụ. N’ihi ya, ha kwesịrị ịmụta àgwà na ihe ndị ọzọ dị mkpa ga-enyere ha aka ịrụ ọrụ Chineke nyere ha. (Jen. 2:18) N’isiokwu a, anyị ga-ahụ ihe nwanna nwaanyị na-eto eto ga-eme ka ọ ghọọ Onye Kraịst tozuru etozu. N’isiokwu na-eso ya, anyị ga-ahụ ihe ụmụnna nwoke na-eto eto ga-eme.

MỤTA ỊKPA ÀGWÀ NDỊ NA-AMASỊ CHINEKE

Ịmụta àgwà ọma ụmụ nwaanyị ndị ji obi ha niile fee Jehova, dị ka Ribeka, Esta, na Abigel, ga-enyere gị aka ịghọ Onye Kraịst tozuru etozu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 na nke 4)

3-4. Olee ebe ụmụnna nwaanyị na-eto eto nwere ike ịchọta ndị ha ga na-eme ka ha? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

3 Baịbụl kwuru gbasara ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị hụrụ Jehova n’anya ma fee ya. (Gaa na jw.org gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Ụmụ Nwaanyị Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha na Baịbụl.”) Ha mere ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu a, ya bụ, ‘imeru ihe n’ókè’ na ịbụ “ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ihe niile.” Ụmụnna nwaanyị nwekwara ike ịchọta ụmụnna nwaanyị tozuru etozu n’ọgbakọ ha ndị ha ga na-akpa àgwà ka ha.

4 Ụmụnna nwaanyị na-eto eto, ọ ga-adị mma ka unu chọpụta ụfọdụ ụmụnna nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst tozuru etozu ndị unu ma unu nwere ike ịna-akpa àgwà ka ha. Chọpụta àgwà ọma ndị ha nwere. Chezie otú i nwere ike isi na-akpa àgwà ndị ahụ. Na paragraf ndị na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’àgwà atọ dị ezigbo mkpa nwanna nwaanyị tozuru etozu kwesịrị ịna-akpa.

5. Gịnị mere nwanna nwaanyị tozuru etozu ji kwesị ịdị umeala n’obi?

5 Ịdị umeala n’obi bụ àgwà dị ezigbo mkpa ga-enyere anyị aka ịbụ Ndị Kraịst tozuru etozu. Ọ bụrụ na nwaanyị adịrị umeala n’obi, ya na Jehova na ndị ọzọ ga-adị ná mma. (Jems 4:6) Dị ka ihe atụ, nwaanyị hụrụ Jehova n’anya na-adị umeala n’obi ma na-akwado ndokwa Nna ya nke eluigwe mere ka e nwee onyeisi. (1 Kọr. 11:3) Ihe a ga-abara ya uru ma n’ọgbakọ ma n’ezinụlọ. c

6. Gịnị ka ụmụnna nwaanyị na-eto eto nwere ike ịmụta n’aka Ribeka gbasara ịdị umeala n’obi?

6 Ka anyị kwuo gbasara Ribeka. Ọ bụ nwaanyị ma ihe ná ndụ ya niile. Ọ katara obi mee mkpebi. Ọ makwa oge o kwesịrị ime ihe na otú o kwesịrị isi mee ya. (Jen. 24:58; 27:5-17) N’agbanyeghị ya, o rubere isi ma dịrị njikere iso ntụziaka. (Jen. 24:17, 18, 65) Ọ bụrụ na ị dịrị umeala n’obi ma kwado ndokwa Jehova mere otú ahụ Ribeka mere, ọ ga-abara ezinụlọ gị na ọgbakọ uru.

7. Olee otú ụmụnna nwaanyị na-eto eto nwere ike isi eme ka Esta n’ịma ebe ike ha ruru?

7 Àgwà ọzọ dị ezigbo mkpa Ndị Kraịst tozuru etozu kwesịrị inwe bụ ịma ebe ike ha ruru. Baịbụl kwuru na Ndị Kraịst kwesịrị ịdị umeala n’obi ma mara ebe ike ha ruru. (Ilu 11:2) Esta bụ nwaanyị na-atụ egwu Jehova, marakwa ebe ike ya ruru. Àgwà a nyeere ya aka ka onwe ya ghara ibu ya isi mgbe ọ ghọrọ nwunye eze. O gere ntị na ndụmọdụ nwa nwanne nna ya bụ́ Mọdekaị nyere ya ma mee ihe ọ gwara ya. (Esta 2:10, 20, 22) I nwere ike ịkpa àgwà a ma ọ bụrụ na ị na-agwa ndị ọzọ ka ha nye gị ezigbo ndụmọdụ ma na-eme ihe ha gwara gị.​—Taị. 2:3-5.

8. Dị ka e kwuru na 1 Timoti 2:9, 10, olee otú nwanna nwaanyị ga-esi na-emeru ihe n’ókè n’ihe gbasara ejiji?

8 E nwekwara ụzọ ọzọ Esta si gosi na ọ ma ebe ike ya ruru. Ọ “mara mma, bụrụkwa asampete.” N’agbanyeghị ya, ọ chọwaghị ka ndị ọzọ hụchatawa ya. (Esta 2:7, 15) Olee ihe nwanna nwaanyị nwere ike ịmụta n’aka Esta? E dere otu n’ime ha na 1 Timoti 2:9, 10. (Gụọ ya.) Pọl onyeozi gwara ụmụ nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst ka ha na-eji ejiji ga-egosi na ha na-emeru ihe n’ókè ma na-ele ihe anya otú dị mma. Okwu Grik a sụgharịrị ihe a Pọl kwuru ebe a na-egosi na nwaanyị bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịna-eji ejiji otú a ga na-akwanyere ya ùgwù nakwa otú na-egosi na ọ na-eche gbasara otú obi na-adị ndị ọzọ. Anyị ji ụmụnna nwaanyị na-eme ihe a Pọl kwuru ebe a eme ọnụ.

9. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Abigel?

9 Nghọta bụ àgwà ọzọ dị mkpa ụmụ nwaanyị niile bụ́ Ndị Kraịst tozuru etozu kwesịrị inwe. Gịnị bụ nghọta? Ọ bụ mmadụ inwe ikike ịmata ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi ma mee ihe ziri ezi. Ka anyị kwuo gbasara Abigel. Di ya mere mkpebi na-adịghị mma ga-akpatara ndị niile bi n’ụlọ ya nsogbu. Abigel mere ihe ozugbo. Ihe ahụ o mere zọrọ ọtụtụ ndị ndụ. (1 Sam. 25:14-23, 32-35) Nghọta na-enyekwara anyị aka ịma mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu na mgbe anyị kwesịrị ịgba nkịtị. Ọ na-eme ka anyị ghara imenye ndị ọzọ ihere ebe anyị na-egosi ha na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ.​—1 Tesa. 4:11.

MỤTA IHE NDỊ GA-ABARA GỊ URU

Olee otú ịmụta ịgụ ihe na ide ihe nke ọma sirila baara gị uru? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

10-11. Olee otú ịmụta ịgụ ihe na ide ihe nke ọma ga-esi baara gị na ndị ọzọ uru? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

10 Nwaanyị bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịmụta ihe ndị ga-abara ya uru. Ụfọdụ ihe nwata nwaanyị mụtara mgbe ọ ka dị obere na-abara ya uru ná ndụ ya niile. Ka anyị lee ụfọdụ n’ime ha.

11 Mụta ịgụ ihe na ide ihe nke ọma. N’obodo ụfọdụ, a naghị ewere ya na ụmụ nwaanyị kwesịrị ịmụta ịgụ ihe na ide ihe. Ma, ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst niile mụta ịgụ ihe na ide ihe nke ọma. d (1 Tim. 4:13) N’ihi ya, ekwekwala ka ihe ọ bụla gbochie gị ịmụta otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe nke ọma. Olee otú o nwere ike isi baara gị uru? Ịmụta ihe ndị a nwere ike inyere gị aka inweta ọrụ ma nọsie ike na ya. Ọ ga-enyekwara gị aka ịna-amụ Okwu Chineke nke ọma, na-akụzikwara ya ndị ọzọ. Nke kachanụ bụ na ị ga-abịarukwu Chineke nso ka ị na-agụ Okwu ya ma na-atụgharị uche na ya.​—Josh. 1:8; 1 Tim. 4:15.

12. Gịnị ka ị mụtara n’Ilu 31:26?

12 Mụta otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-akparịta ụka. Ọ dị ezigbo mkpa ka Ndị Kraịst mụta ime ihe a. Ọ bụ ya mere Jems ji nye anyị ndụmọdụ dabara adaba. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla kwesịrị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-anaghị ekwu okwu ngwa ngwa.” (Jems 1:19) Ọ bụrụ na ị na-ege ntị nke ọma mgbe ndị ọzọ na-ekwu okwu, ọ na-egosi na ‘ihe banyere ha na-emetụ gị n’obi.’ (1 Pita 3:8) Ọ bụrụ na ị ghọtachaghị ihe mmadụ kwuru ma ọ bụ otú obi dị ya, jụọ ya ajụjụ ga-eme ka ị ghọta ihe o kwuru, gị echetụzie echiche tupu gị ekwuo okwu. (Ihe e dere n’ala ala peeji Ilu 15:28.) Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe m chọrọ ikwu ọ̀ bụ eziokwu ma na-agba ume? Ọ̀ na-egosi na m na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma dị obiọma?’ Mụta ihe n’aka ụmụnna nwaanyị ndị ma otú e si akparịta ụka. (Gụọ Ilu 31:26.) Chebara ihe ndị ha na-ekwu na otú ha si ekwu ya echiche. Ị mụta ya, ọ ga-eme ka gị na ndị ọzọ na-adị ná mma.

Nwanna nwaanyị na-elekọta ụlọ nke ọma na-abara ma ezinụlọ ya ma ọgbakọ ezigbo uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Olee otú i nwere ike isi mụta ilekọta ụlọ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

13 Mụta otú e si elekọta ụlọ. N’ọtụtụ ebe, ọ bụ ụmụ nwaanyị na-arụ ọtụtụ ọrụ dị n’ụlọ. Mama gị ma ọ bụ nwanna nwaanyị ọzọ ma nke a na-akọ nwere ike inyere gị aka ịmụta ịrụ ọrụ ndị a nke ọma. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Cindy sịrị: “Otu n’ime onyinye ndị kachanụ mama m nyere m bụ ịkụziri m na ịrụsi ọrụ ike na-eme obi ụtọ. Ịmụta ọrụ ndị dị ka isi nri, ime ka ụlọ dị ọcha, ịkwa ákwà, na ịzụ ihe mere ka ihe dịrị m mfe, meekwa ka m nwee ike ịna-elekọta onwe m ma na-arụkwu ọrụ n’ozi Jehova. Mama m kụzikwaara m otú e si ele ọbịa. Ihe a mere ka m mata ụmụnna ndị m mụtara ihe n’aka ha.” (Ilu 31:15, 21, 22) Nwaanyị na-arụsi ọrụ ike, na-ele ọbịa, ma na-elekọta ụlọ na-abụrụ ma ezinụlọ ya ma ọgbakọ ngọzi.​—Ilu 31:13, 17, 27; Ọrụ 16:15.

14. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Crystal? Gịnịkwa ka i kwesịrị iburu n’uche?

14 Mụta ịna-emere onwe gị ihe. Onye Kraịst ọ bụla tozuru etozu kwesịrị ịmụta otú ọ ga-esi na-emere onwe ya ihe, ihe o nwere ejukwa ya afọ. (Fil. 4:11) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Crystal sịrị: “Nne na nna m nyeere m aka ịhọrọ ihe m ga-amụ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị ga-enyere m aka. Papa m gwara ka m mụọ gbasara idekọ ego. Ihe a nyeere m ezigbo aka.” E wepụ ịmụta ihe ga-enyere gị aka inweta ọrụ, gbalịa mụta otú ị ga-esi eji ego ị na-enweta eme ihe bara uru ka ị ghara imefu karịa ihe ị na-enweta. (Ilu 31:16, 18) Lekwasị anya n’ihe ndị i kpebiri ime n’ozi Jehova. Ihe ga-enyere gị aka ime ya bụ izere iji ụgwọ na-enweghị isi, ihe i nwere iju gị afọ, na ikowe akpa gị ebe aka gị ga-eru.​—1 Tim. 6:8.

KWADEBE MAKA ỌRỤ NDỊ I NWERE IKE ỊRỤ N’ỌDỊNIHU

15-16. Olee otú ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di si abara ndị ọzọ uru? (Mak 10:29, 30)

15 Ịmụta àgwà Ndị Kraịst na ihe ndị ga-abara gị uru ga-enyere gị aka ijikere maka ọdịnihu. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ ihe ndị i nwere ike ime.

16 I nwere ike ikpebi icheretụ tupu gị alụọ di. N’ihi ihe Jizọs kwuru, ụfọdụ ụmụ nwaanyị kpebiri na ha agaghị alụ di, ọ bụrụgodị na ndị obodo ha na-ele nwaanyị ịnọ n’alụghị di anya ọjọọ. (Mat. 19:10-12) Ụfọdụ ndị nwekwara ike ịnọ n’alụghị di n’ihi ihe ndị ọzọ. Ka obi sie gị ike na Jehova na Jizọs anaghị eleda Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye anya. Gburugburu ụwa, ụmụnna nwaanyị na-alụghị di na-abara ọgbakọ ezigbo uru. Otú ha si hụ ụmụnna ha n’anya ma na-egosi na ihe gbasara ha na-emetụ ha n’obi emeela ka ha ghọọrọ ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ nne na ụmụnne ndị nwaanyị.​—Gụọ Mak 10:29, 30; 1 Tim. 5:2.

17. Olee otú nwanna nwaanyị na-eto eto nwere ike isi kwadebe ugbu a maka ịbanye ozi oge niile?

17 I nwere ike ịbanye ozi oge niile. E nwere ọtụtụ ọrụ ụmụnna nwaanyị na-arụ n’ikwusa ozi ọma gburugburu ụwa. (Ọma 68:11) Ì nwere ike ịhazi otú ị ga-esi banye ozi oge niile? I nwere ike ịbụ ọsụ ụzọ oge niile, na-eso arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova, ma ọ bụkwanụ jewe ozi na Betel. Kpee ekpere gbasara nke ọ bụla ị chọrọ ime. Gị na ndị ọzọ na-eme ya kwurịtakwa okwu ka ha gwa gị ihe ndị i kwesịrị ime ka i nwee ike iru eru. Hazizie otú ị ga-esi eme ihe ahụ i kpebiri. Ịbanye n’ozi oge niile ga-eme ka i nwee ọtụtụ ohere magburu onwe ha n’ozi Jehova.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ di, i kwesịrị ịsa anya ná mmiri họrọ onye ị ga-alụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. Gịnị mere nwanna nwaanyị kwesịrị iji saa anya ná mmiri ma ọ họrọwa onye ọ ga-alụ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

18 I nwere ike ikpebi ịlụ di. Àgwà na ihe ndị ọzọ anyị kwurula okwu ha ga-enyere gị aka ịghọ ezigbo nwunye. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ di, i kwesịrị ịsa anya ná mmiri họrọ onye ị ga-alụ. Ọ bụ otu n’ime mkpebi ndị kacha mkpa ị ga-eme ná ndụ gị. Cheta na ị ga-anọzi n’okpuru nwoke lụrụ gị. (Rom 7:2; Efe. 5:23, 33) N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Nwanna a ọ̀ bụ Onye Kraịst tozuru etozu? Ihe kacha ya mkpa ọ̀ bụ ihe gbasara ofufe Jehova? Ọ̀ na-eme ezigbo mkpebi? Ọ̀ na-ekweta ihe o mejọrọ? Ọ̀ na-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù? Ọ̀ ga-enyere m aka ka mụ na Jehova dịrịkwuo ná mma, na-egboro m mkpa m, na-emekwa m obi ụtọ? Ọ̀ na-arụ ọrụ ya nke ọma? Dị ka ihe atụ, olee ọrụ ndị ọ na-arụ n’ọgbakọ? Oleekwa otú o si arụ ha?’ (Luk 16:10; 1 Tim. 5:8) N’eziokwu, ọ bụrụ na ị chọrọ ịchọta ezigbo di, gịnwa kwesịkwara ịbụ ezigbo nwaanyị.

19. Gịnị mere obi nwere ike iji adị nwunye ụtọ na a kpọrọ ya “onye inyeaka” di ya?

19 Baịbụl kwuru na ezigbo nwaanyị bụ “onye inyeaka” di ya na “onye ga-eme ka o zuo ezuo.” (Jen. 2:18) Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ na-eweda ụmụ nwaanyị ala? Mba. Onye inyeaka nwaanyị bụ na-eme ka o nwee ùgwù. Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl na-ekwukarị na Jehova bụ ‘onye na-enyere anyị aka.’ (Ọma 54:4; Hib. 13:6) Nwunye na-abụ ezigbo onye inyeaka di ya ma ọ na-akwado ya ma na-enyere ya aka ime ihe ndị o kpebiri n’ezinụlọ ha. Ebe ọ bụ na ọ hụrụ Jehova n’anya, ọ na-agba mbọ ka a na-akwanyere di ya ùgwù. (Ilu 31:11, 12; 1 Tim. 3:11) Otú ị ga-esi akwadebe ugbu a maka ọrụ a i nwere ike ịrụ n’ọdịnihu bụ ịhụkwu Jehova n’anya na ịna-enyere ndị ọzọ aka n’ụlọ unu nakwa n’ọgbakọ.

20. Olee ihe ọma nne nwere ike imere ezinụlọ ya?

20 I nwere ike ịghọ nne. Ị lụchaa di, gị na di gị nwere ike ịmụta ụmụ. (Ọma 127:3) N’ihi ya, ọ dị mma ka i chee gbasara ihe ndị ga-eme ka ị bụrụ ezigbo nne. Àgwà na ihe ndị ọzọ anyị kwuru gbasara ha n’isiokwu a ga-enyere gị aka ịbụ ezigbo nwunye na ezigbo nne. Ịhụnanya gị, obiọma gị, na ndidi gị ga-enye aka mee ka ahụ́ na-eru di gị na ụmụ gị ala, obi ana-atọkwa ha ụtọ.​—Ilu 24:3.

Ọtụtụ ụmụnna nwaanyị na-eto eto e ji Akwụkwọ Nsọ kụziere ihe, ha emeekwa ihe ha mụtara, aghọọla Ndị Kraịst tozuru etozu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 21)

21. Olee otú obi dị anyị gbasara ụmụnna anyị ndị nwaanyị? N’ihi gịnị? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

21 Ụmụnna nwaanyị, anyị hụrụ unu n’anya maka ihe niile unu na-emere Jehova na ndị ya. (Hib. 6:10) Unu na-agba mbọ ịkpa àgwà Ndị Kraịst, ịmụta ihe ndị ga-enyere ma ununwa ma ndị ọzọ aka, nakwa ịkwadebe maka ọrụ ndị unu nwere ike ịrụ n’ọdịnihu. Unu bara ezigbo uru n’ọgbakọ Jehova.

ABỤ NKE 137 Ụmụ Nwaanyị Ndị Nwere Okwukwe

a Unu bụ́ ụmụnna nwaanyị na-eto eto anyị hụrụ n’anya bara ezigbo uru n’ọgbakọ. Unu nwere ike ịghọ Ndị Kraịst tozuru etozu ma unu mụta àgwà Ndị Kraịst, mụta ihe ndị ga-abara unu uru, kwadebekwa maka ọrụ ndị unu nwere ike ịrụ n’ọdịnihu. Ọ ga-eme ka unu nweta ọtụtụ ngọzi n’ozi Jehova.

b NKỌWAKWU: Onye Kraịst tozuru etozu bụ onye mmụọ nsọ Chineke na-eduzi, ọ bụghị amamihe ụwa. Ọ na-eme ka Jizọs, na-agbasi mbọ ike ka ya na Jehova dịrị ná mma, na-egosikwa ndị ọzọ ezigbo ịhụnanya.

d Ị chọọ ịmata uru ịgụ ihe bara, gaa na jw.org gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Mere Ịgụ Ihe Ji Dịrị Ụmụaka Mkpa—Nke 1: Ịgụ Akwụkwọ Ka Ọ̀ Bụ Ile Vidio?