ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 53
Ụmụnna Nwoke Na-eto Eto, Gbalịanụ Bụrụ Ndị Kraịst Tozuru Etozu
“Dị ike, gosikwa na ị bụ dimkpa.”—1 EZE 2:2.
ABỤ NKE 135 Jehova Ji Obiọma Na-arịọ: “Mara Ihe, Nwa M”
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee ihe Onye Kraịst bụ́ nwoke kwesịrị ime ka ihe gaara ya nke ọma?
EZE Devid gwara Solomọn, sị: “Dị ike, gosikwa na ị bụ dimkpa.” (1 Eze 2:1-3) Ndị Kraịst niile bụ́ ụmụ nwoke taa kwesịrị ime ihe ahụ Devid gwara Solomọn. Ihe ga-enyere ha aka ime ya bụ ịmụta ịna-erubere iwu Chineke isi na ịna-eme ihe Baịbụl kwuru n’ihe niile ha na-eme. (Luk 2:52) Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka ụmụnna nwoke na-eto eto bụrụ Ndị Kraịst tozuru etozu?
2-3. Gịnị mere o ji dị mkpa ka nwanna nwoke na-eto eto ghọọ Onye Kraịst tozuru etozu?
2 Onye Kraịst bụ́ nwoke na-arụ ọtụtụ ọrụ dị mkpa n’ezinụlọ nakwa n’ọgbakọ. Ụmụnna nwoke na-eto eto, o doro anya na unu echeela banyere ọrụ ndị unu nwere ike ịrụ n’ọdịnihu. I nwere ike ibu n’obi ịbanye n’ozi oge niile, ịbụ ohu na-eje ozi, nakwa okenye ọgbakọ ma e mechaa. I nwekwara ike ịchọ ịlụ nwaanyị, mụta ụmụ. (Efe. 6:4; 1 Tim. 3:1) Ihe ga-enyere gị aka ime ihe ndị a nke ọma bụ ịbụ Onye Kraịst tozuru etozu. b
3 Gịnị ga-enyere gị aka ịbụ Onye Kraịst tozuru etozu? E nwere ihe ndị dị mkpa i kwesịrị ịmụta. N’ihi ya, olee ihe ndị ị ga-eme ugbu a iji kwadebe maka ihe ọ bụla ị ga-arụ n’ọdịnihu ma rụọ ya nke ọma?
IHE NDỊ Ị GA-EME KA Ị BỤRỤ ONYE KRAỊST TOZURU ETOZU
4. Olee ebe ị ga-achọta ndị na-akpa àgwà ọma ị ga na-eme ka ha? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
4 Họrọ ndị bụ́ ndị ezigbo mmadụ ị ga na-eme ka ha. Baịbụl gwara anyị banyere ọtụtụ ndị kpara àgwà ọma ụmụ nwoke na-eto eto nwere ike ịna-eme ka ha. Ha hụrụ Chineke n’anya, sikwa n’ụzọ dị iche iche lekọta ndị ya. I nwekwara ike ịhụ Ndị Kraịst tozuru etozu ị ga-amụta ihe n’aka ha n’ezinụlọ unu ma ọ bụ n’ọgbakọ unu. (Hib. 13:7) Onye kacha kpaa àgwà ọma anyị ga-amụta ihe n’aka ya bụ Jizọs Kraịst. (1 Pita 2:21) Ka ị na-amụ banyere ndị a, chebara àgwà ndị magburu onwe ha ha kpara echiche. (Hib. 12:1, 2) Kpebizie otú ị ga-esi na-eme ka ha.
5. Olee otú ị ga-esi mụta ịna-eche echiche nke ọma, gịnịkwa mere o ji dị mkpa? (Abụ Ọma 119:9)
5 Mụta ‘ịna-echebara ihe echiche nke ọma,’ ‘jidesiekwa ya aka ike.’ (Ilu 3:21) Nwoke na-echebara ihe echiche nke ọma anaghị eme ihe ọ bụla batara ya n’obi. Kama, ọ na-echebara ihe ọ chọrọ ime echiche nke ọma tupu ya emee ya. N’ihi ya, gbasie mbọ ike ka ị mụta ịna-eche echiche nke ọma. Maka gịnị? Ndị juru n’ụwa a bụ ụmụ okorobịa ndị na-eji ihe ha chere ma ọ bụ otú obi dị ha ekpebi ihe ha ga-eme. (Ilu 7:7; 29:11) Ihe ndị dị ka tiivi, fim, na Ịntanet nwere ike ime ka ị na-eche ma ọ bụ na-eme ihe ndị na-adịghị mma. Ma, olee otú ị ga-esi mụta ịna-eche echiche nke ọma? Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịmụ Baịbụl ka ị mụta otú obi na-adị Jehova na otú o si eche echiche, gị echeekwa ihe mere o ji dị mma ime ihe Jehova kwuru. Jirizie ihe Baịbụl kwuru kpebie ihe ndị ị ga-eme iji mee Jehova obi ụtọ. (Gụọ Abụ Ọma 119:9.) Ọ bụrụ na ị mụta àgwà a dị ezigbo mkpa, ọ ga-enyere gị ezigbo aka ịbụ Onye Kraịst tozuru etozu. (Ilu 2:11, 12; Hib. 5:14) Ka anyị leba anya n’otú iche echiche nke ọma ga-esi baara gị uru n’ụzọ ebe abụọ: (1) n’otú i si emeso ụmụnna nwaanyị na (2) mgbe ị na-ekpebi ihe gbasara ejiji gị.
6. Olee otú iche echiche nke ọma ga-esi nyere nwanna nwoke na-eto eto aka ịna-akwanyere ụmụnna nwaanyị ùgwù?
6 Iche echiche nke ọma ga-enyere gị aka ịna-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù. Ọ bụghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na nwanna nwoke enwee mmasị n’ebe nwanna nwaanyị nọ. Ma, ọ bụrụ na nwanna nwoke na-eche echiche nke ọma, ọ gaghị na-ekwu, na-ede, ma ọ bụ na-eme ihe ọ bụla ga-eme ka o yie ka ọ̀ chọrọ ka ya na nwanna nwaanyị kpawa ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịlụ ya. (1 Tim. 5:1, 2) Ọ bụrụ na ya na nwanna nwaanyị na-akpa maka ọlụlụ, ọ ga-agbalịsi ike ka ọ ghara imebi aha nwanna nwaanyị ahụ. Otú ọ ga-esi eme ya bụ izere naanị ha abụọ ịnọ ma ọ bụrụ na e nweghị onye ma nke a na-akọ so ha.—1 Kọr. 6:18.
7. Olee otú iche echiche nke ọma ga-esi nyere nwanna nwoke na-eto eto aka mgbe ọ na-ahọrọ ụdị uwe ọ ga na-eyi na ụdị isi ọ ga na-akpụ?
7 Otú ọzọ nwanna nwoke na-eto eto ga-esi egosi na ọ na-eche echiche nke ọma bụ ime mkpebi dị mma n’ihe gbasara ụdị uwe ọ ga na-eyi na ụdị isi ọ ga na-akpụ. Ọtụtụ mgbe, ndị na-akwa uwe na-ewu ewu na ndị na-akpọsa ya bụ ndị na-anaghị asọpụrụ Jehova. Ha nwekwara ike ịna-eme omume rụrụ arụ. N’ihi ya, uwe ha na-akwa na-atapara n’ahụ́ ma ọ bụkwanụ na-eme ka ụmụ nwoke dịrịzie ka ụmụ nwaanyị. Nwanna nwoke na-eto eto, nke na-agbalị ịbụ Onye Kraịst tozuru etozu, kpebiwe ihe ọ ga-eyi, o kwesịrị ime ka Jizọs ma chee gbasara ihe ga-amasị Jehova. Ọ ga na-ejikwa ejiji ka ndị na-eji ejiji nke ọma n’ọgbakọ. O nwere ike ịjụ onwe ya, sị: ‘Ụdị uwe m kpebiri iyi ọ̀ na-egosi na m na-eche echiche nke ọma ma na-echebara ndị ọzọ echiche? Uwe m na-eyi ọ̀ na-eme ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe ikweta na m bụ onye na-efe Chineke?’ (1 Kọr. 10:31-33; Taị. 2:6) Ọ bụrụ na onye na-eto eto ana-eche echiche nke ọma, ụmụnna ga na-akwanyere ya ùgwù, ihe ya ga-amasịkwa Nna ya nke eluigwe.
8. Olee otú nwanna nwoke na-eto eto nwere ike isi mụta ịbụ onye a ga-atụkwasịli obi?
8 Bụrụ onye a ga-atụkwasịli obi. Nwa okorobịa a ga-atụkwasịli obi na-arụsi ọrụ ọ bụla e nyere ya ike. (Luk 16:10) Chegodị banyere otú na-enweghị atụ Jizọs si mee ya. O nweghị mgbe o leghaara ọrụ ya anya ma ọ bụ jiri ya gwuo egwu. Kama ime otú ahụ, ọ rụrụ ọrụ niile Jehova nyere ya, ma mgbe o siiri ya ike ime otú ahụ. Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya, nke ka nke, ndị na-eso ụzọ ya, jirikwa obi ya niile were ndụ ya chụọ àjà maka ha. (Jọn 13:1) Na-eme ka Jizọs. Otú ị ga-esi na-eme ya bụ ịna-agbasi mbọ ike ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere gị. Ọ bụrụ na ị maghị otú ị ga-esi arụ ya, dịrị umeala n’obi ma rịọ ụmụnna tozuru etozu ka ha nyere gị aka. Arụkwala ọrụ e nyere gị naanị iji mezuo iwu. (Rom 12:11) Kama ime otú ahụ, e nye gị ọrụ, rụruo ya n’isi. Na-eme ya ‘dị ka ị̀ na-emere ya Jehova, ọ bụghị mmadụ.’ (Kọl. 3:23) Nke bụ́ eziokwu bụ na ebe ọ bụ na i zughị okè, i kwesịrị ịma ebe ike gị ruru. I mejọọkwa ihe, kweta na i mejọrọ.—Ilu 11:2.
MỤTA IHE NDỊ GA-ABARA GỊ URU
9. Gịnị mere nwanna nwoke na-eto eto ji kwesị ịmụta ihe ndị ga-abara ya uru?
9 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọ Onye Kraịst tozuru etozu, i kwesịrị ịmụta ihe ndị ga-abara gị uru. Ihe ndị a ga-enyere gị aka ịrụ ọrụ ndị e nyere gị n’ọgbakọ na ọrụ ị ga-eji na-akpa afọ gị ma ọ bụ nke ezinụlọ gị. Ọ ga-emekwa ka gị na ndị ọzọ na-adị ná mma. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ndị i nwere ike ịmụta ga-abara gị uru.
10-11. Olee otú nwanna nwoke na-eto eto ga-esi baara onwe ya uru, baakwara ọgbakọ ma ọ mụta ịgụ ihe na ide ihe nke ọma? (Abụ Ọma 1:1-3) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
10 Mụta ịgụ ihe na ide ihe nke ọma. Baịbụl kwuru na onye na-ewepụta oge kwa ụbọchị na-agụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya na-enwe obi ụtọ, ihe ọ na-eme ana-agakwa nke ọma. (Gụọ Abụ Ọma 1:1-3.) Ọ bụrụ na ị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, ị ga-amatakwu otú Jehova si eche echiche, nke ga-enyere gị aka ịna-eche echiche nke ọma ma mata otú ị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru. (Ilu 1:3, 4) Ọ bụ ụmụ nwoke na-eme otú ahụ ka a chọsiri ike n’ọgbakọ. Maka gịnị?
11 Ụmụnna anyị na-atụkarị anya isi n’aka ụmụnna nwoke na-akụzi ihe nke ọma na-enweta ntụziaka na ndụmọdụ si na Baịbụl. (Taị. 1:9) Ọ bụrụ na ị mụta ịgụ ihe na ide ihe nke ọma, ị ga-enwe ike ịna-akwadebe okwu na azịza bara uru ga-eme ka okwukwe ụmụnna sie ike. Ị ga-enwekwa ike ịna-ede ihe ga-abara gị uru mgbe ị na-amụ ihe nakwa mgbe ị na-ege okwu ndị a na-ekwu n’ọmụmụ ihe ọgbakọ nakwa ná mgbakọ. Ihe ndị ahụ i dere ga-enyere gị aka ime ka okwukwe gị na-esikwu ike, na-agbakwa ndị ọzọ ume.
12. Gịnị ga-enyere gị aka ịmụta otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-ekwurịta okwu?
12 Mụta otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-akparịta ụka. Nwoke bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịmụta otú ya na ndị ọzọ ga-esi na-akparịta ụka nke ọma. Ọ pụtara na o kwesịrị ịna-ege ntị nke ọma ma na-aghọta ihe ndị ọzọ chere na otú obi dị ha. (Ilu 20:5) Ọ ga-enwekwa ike isi n’ụda olu mmadụ na otú o dowere ihu nakwa ihe ndị ọzọ onye ahụ na-eme ghọta ihe o chere. Ị gaghị enwe ike ime ihe ndị a ma ọ bụrụ na gị na ndị mmadụ anaghị anọrị. Ọ bụrụ na ihe ị na-eme mgbe niile bụ ịna-apị ekwentị gị ma ọ bụ ihe yiri ya, jiri ya na-eziga ozi iimel, ma ọ bụ na-ezigara mmadụ ozi n’ekwentị, o nwere ike ime ka o siere gị ike ịna-agwa ndị mmadụ okwu ihu na ihu. N’ihi ya, wepụta oge ka gị na ndị ọzọ na-akparịta ụka ihu na ihu.—2 Jọn 12.
13. Olee ihe ọzọ nwoke na-eto eto kwesịrị ịmụta? (1 Timoti 5:8) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
13 Mụta otú ị ga-esi na-akpata ego ị ga-eji na-egbo mkpa gị. Nwoke tozuru etozu bụ́ Onye Kraịst kwesịrị inwe ike ịna-akpa afọ ya na ezinụlọ ya. (Gụọ 1 Timoti 5:8.) N’obodo ụfọdụ, ụmụ okorobịa nwere ike isi n’aka papa ha ma ọ bụ onye ikwu ha mụta aka ọrụ. N’obodo ụfọdụkwa, nwa okorobịa nwere ike ịmụta aka ọrụ ma ọ bụ nkà ndị ọzọ ga-abara ya uru n’oge ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ dị mma ka ị mụta ihe ga-enyere gị aka inweta ọrụ. (Ọrụ 18:2, 3; 20:34; Efe. 4:28) Gbasie mbọ ike ka a mara gị ka onye na-arụsi ọrụ ike na onye na-arụru ọrụ ya n’isi. I mee otú ahụ, o nwere ike ime ka i nweta ọrụ ma nọsie ike na ya. Àgwà na ihe ndị ọzọ anyị kwurula gbasara ha dịkwa Onye Kraịst bụ́ nwoke mkpa ka o nwee ike ịrụ ọrụ ndị o kwesịrị ịrụ n’ọdịnihu. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ọrụ ndị ahụ.
KWADEBE MAKA ỌRỤ NDỊ Ị GA-ARỤ N’ỌDỊNIHU
14. Olee otú nwanna nwoke na-eto eto nwere ike isi kwadebe ịbanye n’ozi oge niile?
14 Ịbanye n’ozi oge niile. Ọtụtụ ụmụnna nwoke tozuru etozu malitere ozi oge niile mgbe ha na-eto eto. Ịsụ ụzọ na-enyere nwa okorobịa aka ịmụta otú ya na ndị dị iche iche ga-esi na-arụkọ ọrụ nke ọma. Ọ na-enyekwara ya aka ịmụta otú ọ ga-esi jiri ego ya na-eme ihe bara uru ma ghara ịna-emefu karịa ihe ọ na-akpata. (Fil. 4:11-13) Otú i nwere ike isi banye n’ozi oge niile bụ ịrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ọtụtụ ndị na-abụ ọsụ ụzọ inyeaka ruo ọnwa ole na ole, nke na-enyere ha aka ijikere maka ịsụ ụzọ oge niile. Ịsụ ụzọ oge niile nwere ike imepere gị ụzọ ịbanye ụdị ozi oge niile dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ha bụ iso na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova na ije ozi na Betel.
15-16. Olee otú nwanna nwoke na-eto eto ga-esi ruo eruo ije ozi n’ọgbakọ?
15 Ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye. Ụmụ nwoke bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịgba mbọ ka ha ruo eruo ịbụ ndị okenye ọgbakọ ga na-ejere ụmụnna ha ozi. Baịbụl kwuru na “ezigbo ihe na-agụ” ụmụ nwoke ndị na-agba mbọ ka ha ruo eruo ịrụ ọrụ a. (1 Tim. 3:1) Tupu nwanna abụrụ okenye, ọ ga-ebu ụzọ ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi. Ndị ohu na-eje ozi na-enyere ndị okenye aka n’ọtụtụ ụzọ. Ma ndị okenye ma ndị ohu na-eje ozi na-ewetu onwe ha ala na-ejere ụmụnna ha ozi ma na-ekwusasi ozi ọma ike. Ụmụnna ndị na-eto eto nwere ike iru eru ịbụ ohu na-eje ozi ọ bụrụgodị na ha ka nọ n’agbata afọ iri na asaa na iri na itoolu. E nwekwara ike ịhọpụta ohu na-eje ozi na-eme nke ọma ka ọ bụrụ okenye mgbe o ruru afọ iri abụọ.
16 Àgwà ndị ga-eme ka mmadụ ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi nakwa okenye dị na Baịbụl. Ọ bụ otú i si hụ Jehova, ndị ezinụlọ gị, na ọgbakọ n’anya ga-eme ka ị gbaa mbọ na-akpa àgwà ndị ahụ. (1 Tim. 3:1-13; Taị. 1:6-9; 1 Pita 5:2, 3) Olee otú ị ga-esi ruo eruo ịrụ ọrụ ahụ? Gbalịsie ike ịghọta ihe àgwà nke ọ bụla pụtara. Kpee ekpere ka Jehova nyere gị aka ịmụta àgwà ndị ahụ Baịbụl kwuru. c
17. Olee otú nwanna nwoke na-eto eto nwere ike isi kwadebe ịbụ di na onyeisi ezinụlọ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
17 Ịbụ di na onyeisi ezinụlọ. Dị ka Jizọs kwuru, ụfọdụ Ndị Kraịst tozuru etozu na-ekpebi ịbụ okokporo. (Mat. 19:12) Ma, ọ bụrụ na i kpebiri ịlụ nwaanyị, ọ pụtara na ị ga-abụkwa di na onyeisi ezinụlọ. (1 Kọr. 11:3) Jehova chọrọ ka di hụ nwunye ya n’anya, na-egboro ya mkpa ya, na-emekwa ka obi dị ya mma nakwa ka ya na Jehova dịrị ná mma. (Efe. 5:28, 29) Àgwà ndị a anyị kwurula banyere ha n’isiokwu a, dị ka ịna-echebara ihe echiche nke ọma, ịna-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù, na ịbụ onye a ga-atụkwasịli obi, ga-enyere gị aka ịbụ ezigbo di. Ị ga-enwekwa ike ịkwadebe nke ọma ịrụ ọrụ ndị i nwere ike ịrụ n’ọdịnihu, nke bụ́ ịbụ di na onyeisi ezinụlọ.
18. Olee otú nwanna nwoke na-eto eto nwere ike isi kwadebe ịbụ nna?
18 Ịbụ nna. Ọ bụrụ na ị lụọ nwaanyị, i nwere ike ịghọ nna. Olee ihe i nwere ike ịmụta n’aka Jehova gbasara ịbụ ezigbo nna? E nwere ọtụtụ ihe i nwere ike ịmụta. (Efe. 6:4) Jehova gwara Ọkpara ya Jizọs n’ebe ndị ọzọ nọ na ọ hụrụ ya n’anya nakwa na ihe ya masịrị ya. (Mat. 3:17) Ọ bụrụ na ị ghọọ nna, gbalịsie ike ka ị na-emesi ụmụ gị obi ike mgbe niile na ị hụrụ ha n’anya. Na-aja ha mma mgbe niile maka ihe ndị ha na-emeta. Ọ bụrụ na ndị nna ana-eme ka Jehova, ha ga-enwe ike inyere ụmụ ha aka ịghọ Ndị Kraịst tozuru etozu. Ị ga-enwekwa ike ibido ugbu a na-akwadebe maka ọrụ ahụ dị mkpa. Otú ị ga-esi na-eme ya bụ iji obiọma na-elekọta ndị ezinụlọ gị na ndị nọ n’ọgbakọ, mụtakwa ịna-egosi ha na ị hụrụ ha n’anya nakwa na i ji ha kpọrọ ihe. (Jọn 15:9) Ime otú a ga-enyere gị aka ịbụ ezigbo di na nna n’ọdịnihu. Ka ọ dị ugbu a, ị ga-abara Jehova ezigbo uru, baakwara ma ezinụlọ gị ma ọgbakọ unu.
GỊNỊ KA Ị GA-EME UGBU A?
19-20. Gịnị ga-enyere ụmụnna nwoke na-eto eto aka ịbụ Ndị Kraịst tozuru etozu? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)
19 Ụmụnna nwoke na-eto eto, unu agaghị abụ Ndị Kraịst tozuru etozu n’agbaghị mbọ ọ bụla. Unu kwesịrị ịchọta ndị na-akpa àgwà ọma unu ga na-eme ka ha. Mụtanụ ịna-echebara ihe echiche, ịbụ ndị a ga-atụkwasịli obi, nakwa àgwà ndị ga-abara unu uru ná ndụ ma kwadebe maka ọrụ ndị unu ga-arụ n’ọdịnihu.
20 Mgbe ụfọdụ, i chechaa ọrụ ndị ị ga-arụ n’ọdịnihu, o nwere ike ịdị gị ka ị gaghị arụli ha. Ma, ị ga-arụli ha. Cheta na Jehova chọsiri ike inyere gị aka. (Aịza. 41:10, 13) Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụnna gị n’ọgbakọ ga-enyekwara gị aka. Ọ bụrụ na ị ghọọ Onye Kraịst tozuru etozu, ndụ gị ga-aka mma, gị ana-enwekwa obi ụtọ. Anyị hụrụ unu bụ́ ụmụ nwoke na-eto eto n’anya. Ka Jehova gọzie unu nke ukwuu ka unu na-agbalịsi ike ugbu a ịbụ Ndị Kraịst tozuru etozu.—Ilu 22:4.
ABỤ NKE 65 Gaa n’Ihu