Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkọ Mere Eme

Akụkọ Mere Eme

Inwere Ụdị Mmadụ Niile Ọmịiko

Otu ụbọchị, otu nwanna nwaanyị na Niu Ziland lere vidio aha ya bụ Na-elekọta Ibe Anyị,’ ebe e kwuru otú Jehova si enwere anyị ọmịiko na otú o si enyere anyị aka. (Aịza. 63:7-9) O kpebiri na ọ ga-eme ihe ọ mụtara ma na-enyere ndị ọzọ aka. Mgbe ọ gara ịzụrụ ihe ná mgbede ụbọchị ahụ, ọ hụrụ otu nwaanyị na-enweghị ụlọ ma gwa ya na ọ chọrọ ịzụnye ya nri. Nwaanyị ahụ kwetara. Mgbe nwanna nwaanyị ahụ wetaara ya ihe ọ zụtaara ya, o ji ohere ahụ gwa ya gbasara Jehova ma gosi ya traktị isiokwu ya bụ Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị?

Nwaanyị ahụ malitere ibe ákwá. Ọ gwara ya na ndị ezinụlọ ha bụ Ndịàmà Jehova nakwa na ọ pụrụ n’ọgbakọ ọtụtụ afọ gara aga. Ma, ọ dịbeghị anya ọ rịọwara Jehova ka o nyere ya aka ka ọ lọghachi n’ọgbakọ. Nwanna nwaanyị ahụ nyere ya Baịbụl, haziekwa otú ọ ga-esi na-amụrụ ya ihe. a

Anyị nwere ike ịna-enwere ndị mmadụ ọmịiko ka Jehova, ma ndị ikwu anyị ma ụmụnna anyị. Otú ọzọ anyị nwere ike isi na-enwere ndị ọzọ ọmịiko bụ ịna-achọ ohere anyị ga-eji na-ezi ha ozi ọma.

a Ị chọọ ịmụta otú i nwere ike isi nyere ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma aka, gụọ isiokwu bụ́ “Lọghachikwutenụ M” nke gbara n’Ụlọ Nche Jun 2020.