ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 50
Inwe Okwukwe na Ime Ihe Dị Mma Nwere Ike Ime Ka Anyị Bụrụ Ndị Ezi Omume
“[Nwee] okwukwe ka . . . nna anyị Ebreham.”—ROM 4:12.
ABỤ NKE 119 Ka Anyị Nwee Okwukwe
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Ọ bụrụ na anyị echee gbasara okwukwe Ebreham, olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ?
Ọ BỤ eziokwu na ọtụtụ ndị anụla gbasara Ebreham, ma e nweghị ezigbo ihe ọtụtụ ndị ma gbasara ya. Ma, ị ma ọtụtụ ihe gbasara Ebreham. Dị ka ihe atụ, ị ma na a kpọrọ ya “nna ndị niile nwere okwukwe.” (Rom 4:11) Ma, i nwere ike ịna-eche, sị: ‘M̀ nwere ike inwe ụdị okwukwe Ebreham nwere?’ Ee. I nwere ike.
2. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mụọ gbasara Ebreham? (Jems 2:22, 23)
2 Otu ụzọ anyị ga-esi nwee ụdị okwukwe Ebreham nwere bụ ịmụ gbasara ihe o mere. Ebreham mere ihe Chineke gwara ya mgbe niile. Dị ka ihe atụ, ọ kwagara mba dị anya, biri n’ụlọikwuu ruo ọtụtụ afọ, chọọkwa iji nwa ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Aịzik achụrụ Chineke àjà. Ihe ndị a o mere gosiri na o nwere okwukwe siri ike. Okwukwe Ebreham nwere na ihe dị mma o mere mere ka ihe ya masị Chineke, ya na ya abụrụ enyi. (Gụọ Jems 2:22, 23.) Jehova chọrọ ka anyị niile nweta ngọzi ndị a, ma gịnwa. N’ihi ya, o mere ka Pọl na Jems, bụ́ ndị so dee Baịbụl, kwuo gbasara ihe Ebreham mere. Ka anyị leba anya n’ihe ndị o mere e kwuru gbasara ha ná Ndị Rom isi 4 na Jems isi 2. Ebe ndị a kwuru ihe ndị dị ezigbo mkpa gbasara Ebreham.
3. Olee amaokwu Baịbụl ihe Pọl na Jems kwuru si na ya?
3 Ihe Pọl na Jems kwuru si na Jenesis 15:6, ebe sịrị: “[Ebreham] wee nwee okwukwe na Jehova, ya ejiri maka ya kpọọ ya onye ezi omume.” Jehova na-ewere mmadụ ka onye ezi omume ma ọ bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta ma ọ bụrụ na ihe onye ahụ masịrị ya. Ọ dị ịtụnanya na Jehova nwere ike iwere mmadụ ka onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta n’agbanyeghị na onye ahụ bụ onye mmehie, bụrụkwa onye na-ezughị okè. Ọ ga-abụkwa na gịnwa chọrọ ka Jehova si otú ahụ were gị. O kwekwara omume. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata ihe anyị ga-eme ka Jehova were anyị otú ahụ, anyị kwesịrị ịghọta ihe mere Jehova ji were Ebreham ka onye ezi omume.
ANYỊ GA-ENWERỊRỊ OKWUKWE TUPU CHINEKE EWERE ANYỊ KA NDỊ EZI OMUME
4. Olee ihe na-egbochi ụmụ mmadụ ịbụ ndị ezi omume?
4 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom, o kwuru na mmadụ niile bụ ndị mmehie. (Rom 3:23) Oleezi otú ihe anyị ga-esi masị Chineke, ya akpọọ anyị ndị ezi omume ma ọ bụ ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta? Iji nyere ezigbo Ndị Kraịst aka ịza ajụjụ ahụ, Pọl kwuru gbasara Ebreham.
5. Olee ihe mere Jehova ji kpọọ Ebreham onye ezi omume? (Ndị Rom 4:2-4)
5 Jehova kpọrọ Ebreham onye ezi omume mgbe o bi n’obodo Kenan. Olee ihe mere Jehova ji kpọọ ya onye ezi omume? Ọ̀ bụ n’ihi na Ebreham debere Iwu Mosis ruo n’isi? O doro anya na ọ bụghị ya. (Rom 4:13) E nyere ndị Izrel Iwu Mosis mgbe ihe karịrị narị afọ anọ (400) gachara Chineke kpọrọ Ebreham onye ezi omume. Gịnịzi mere Chineke ji kpọọ Ebreham onye ezi omume? Jehova meere Ebreham amara, kpọọ ya onye ezi omume n’ihi na o nwere okwukwe.—Gụọ Ndị Rom 4:2-4.
6. Gịnị na-eme ka Jehova kpọọ onye mmehie onye ezi omume?
6 Pọl kwuru na ọ bụrụ na mmadụ enwee okwukwe na Chineke, “a ga-akpọ onye ahụ onye ezi omume.” (Rom 4:5) Pọl kwukwara, sị: “Devid kwukwara banyere ụdị obi ụtọ onye Chineke kpọrọ onye ezi omume na-enwe n’agbanyeghị na ọ bụghị ọrụ ọ rụrụ mere e ji kpọọ ya onye ezi omume. Ọ sịrị: ‘Ndị a gbaghaara ihe ọjọọ ha mere na ndị e kpuchiri mmehie ha na-enwe obi ụtọ. Onye Jehova na-agaghị agụkọrọ mmehie ya na-enwe obi ụtọ.’” (Rom 4:6-8; Ọma 32:1, 2) Jehova na-agbaghara ma ọ bụ na-ekpuchi mmehie ndị nwere okwukwe na ya. Ọ na-agbaghara ha kpamkpam. Ọ naghịzi ata ha ahụhụ maka mmehie ahụ ha mere. Ọ na-ewere ndị dị otú ahụ ka ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta na ndị ezi omume n’ihi okwukwe ha.
7. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ndị fere Jehova n’oge gara aga bụ ndị ezi omume?
7 Ọ bụ eziokwu na Jehova kpọrọ Ebreham, Devid, na ndị ọzọ ji obi ha niile fee ya ndị ezi omume, ha ka bụkwa ndị mmehie na-ezughị okè. Ma, ebe ọ bụ na ha nwere okwukwe, Jehova weere ha ka ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta, karịchaa, ma o were ha tụnyere ndị na-anaghị efe ya. (Efe. 2:12) Pọl mere ka o doo anya n’akwụkwọ ozi o dere na ihe bụ́ isi ga-eme ka mmadụ na Chineke dịrị ná mma bụ onye ahụ inwe okwukwe. Ọ bụkwa okwukwe mere ka Ebreham na Devid na Chineke dịrị ná mma. Ọ bụkwa ya ga-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma.
OLEE IHE JIKỌRỌ OKWUKWE NA ỌRỤ?
8-9. Olee otú na-adịghị mma ụfọdụ ndị si ghọta ihe Pọl na Jems dere? Maka gịnị?
8 Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị isi okpukpe enweghị otu olu n’ihe jikọrọ okwukwe na ọrụ. Ụfọdụ ndị isi okpukpe na-akụzi na naanị ihe mmadụ ga-eme ka a zọpụta ya bụ ikwere n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. I nwere ike ịnụ ka ha na-ekwu ihe dị ka, “Nabata Jizọs ka a zọpụta gị.” Ndị isi okpukpe nwere ike ikwu na ọ bụ ihe Pọl kụziri n’ihi na ọ sịrị na Chineke nwere ike ịkpọ mmadụ onye ezi omume “n’agbanyeghị na ọ bụghị ọrụ ọ rụrụ mere e ji kpọọ ya onye ezi omume.” (Rom 4:6) Ma, e nwere ndị na-ekwu na i nwere ike ịzọpụta onwe gị ma ọ bụrụ na ị na-aga n’obodo nsọ nakwa ma ị na-eme ihe chọọchị kwuru ka a na-eme. Ha nwere ike ikwu na ihe mere ha ji akụzi ya bụ ihe e dere na Jems 2:24, ebe sịrị: “Ihe e ji agụ mmadụ n’onye ezi omume bụ ihe dị mma ọ na-eme, ọ bụghị naanị n’ihi okwukwe o nwere.”
9 N’ihi ihe ndị a dị iche iche ndị mmadụ kweere, ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl chere na Pọl na Jems enweghị otu olu n’ihe gbasara okwukwe na ọrụ. Ụfọdụ ndị isi okpukpe kwuru na Pọl na-ekwu na ọ bụ naanị okwukwe ga-eme ka ihe mmadụ dị Chineke mma, mana Jems na-ekwu na mmadụ kwesịrị ime ihe dị mma tupu ihe ya adị Chineke mma. Otu ọkachamara n’ihe gbasara nkụzi ndị chọọchị kwuru na “Jems aghọtaghị ihe Pọl bu n’obi kwuo na a ga-akpọ mmadụ onye ezi omume n’ihi okwukwe ya naanị, ọ bụghị n’ihi ọrụ ọ rụrụ.” Ma, ọ bụ Jehova mere ka Pọl na Jems dee ihe ha dere. (2 Tim. 3:16) N’ihi ya, a ga-enwerịrị otú ka mma a ga-esi aghọta ihe ha kwuru. N’eziokwu, e nwere. Anyị ga-aghọta ya ma anyị leba anya n’ihe ha nọ na-ekwu mgbe ha dere ihe ha dere.
10. Olee ọrụ Pọl na-ekwu okwu ya? (Ndị Rom 3:21, 28) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
10 Gịnị bụ “ọrụ” Pọl kwuru okwu ya ná Ndị Rom isi 3 na nke 4? Ọ nọ na-ekwu banyere ‘ime ihe e kwuru n’iwu,’ ya bụ, Iwu Mosis, nke Chineke nyere ya n’Ugwu Saịnaị. (Gụọ Ndị Rom 3:21, 28.) Ọ ga-abụ na n’oge Pọl, ọ na-esiri ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ike ikweta na a kagbuola Iwu Mosis na ọrụ ndị ha na ya so. N’ihi ya, Pọl kwuru ihe Ebreham mere iji gosi na ihe ga-eme ka mmadụ bụrụ onye ezi omume n’anya Chineke abụghị ‘ime ihe e kwuru n’Iwu Mosis,’ kama ọ bụ okwukwe onye ahụ. Ihe a na-agba anyị ume n’ihi na ọ na-eme ka obi sie anyị ike na anyị ga-emeli ihe ga-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma. Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga-enweli okwukwe na Chineke nakwa na Kraịst nke ga-eme ka ihe anyị dị Chineke mma.
11. Olee ụdị ọrụ Jems kwuru gbasara ya?
11 Ma, ime “ihe dị mma” ma ọ bụ ọrụ e kwuru na Jems isi 2 abụghị ‘ime ihe e kwuru n’Iwu Mosis’ Pọl kwuru okwu ya. Ihe Jems na-ekwu maka ya bụ ihe Ndị Kraịst na-eme kwa ụbọchị. Ihe ndị ahụ ga-egosi ma Onye Kraịst ò nwere ezigbo okwukwe na Chineke ma ọ bụ na o nweghị. Ka anyị lee ihe atụ abụọ Jems mere.
12. Olee otú Jems si kọwaa ihe jikọrọ okwukwe na ime ihe dị mma? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
12 N’ihe atụ nke mbụ, Jems kwuru na Onye Kraịst ekwesịghị ịna-ele mmadụ anya n’ihu. Ihe o ji mee ka a ghọta ihe ọ na-ekwu bụ otu nwoke menyeere ọgaranya ma leda ogbenye anya. Jems kwuru na nwoke ahụ nwere ike ikwu na ya nwere okwukwe, mana ihe ndị o mere egosighị ya. (Jems 2:1-5, 9) N’ihe atụ nke abụọ, Jems kwuru gbasara onye hụrụ “nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị na-enweghị uwe na ihe oriri,” mana, o nyereghị ya aka. Ọ bụrụgodị na onye ahụ na-ekwu na o nwere okwukwe, ihe o mere egosighị ya. N’ihi ya, okwukwe ya enweghị isi. Jems dere na “ọ bụrụ na mmadụ anaghị eme ihe dị mma, okwukwe ya abaghị uru ọ bụla.”—Jems 2:14-17.
13. Olee ihe atụ Jems mere iji gosi na anyị kwesịrị inwe okwukwe, na-emekwa ihe dị mma? (Jems 2:25, 26)
13 Jems kwuru na Rehab mere ihe gosiri na o nwere okwukwe. (Gụọ Jems 2:25, 26.) Ọ nụrụ gbasara Jehova, chọpụtakwa na Jehova na-enyere ndị Izrel aka. (Josh. 2:9-11) O mere ihe gosiri na o nwere okwukwe. O chebere ndị Izrel abụọ bịara inyopụta otú obodo ha dị mgbe a chọrọ igbu ha. Ihe a mere ka a kpọọ nwaanyị a na-ezughị okè, na-abụghịkwa onye Izrel, onye ezi omume, otú ahụ a kpọrọ Ebreham. Ihe Rehab mere na-egosi na ihe na-eme ka a mara na mmadụ nwere okwukwe bụ ihe ọma ọ na-eme.
14. Olee otú ihe Pọl kwuru si daba n’ihe Jems kwuru?
14 N’ihi ya, Pọl na Jems si ụzọ abụọ dị iche na-ekwu gbasara okwukwe na ọrụ ma ọ bụ ime ihe dị mma. Pọl na-agwa ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst na ihe ga-eme ka ha na Jehova dịrị ná mma abụghị ime ihe e kwuru n’Iwu Mosis. Jems na-ekwu na Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-emere ndị ọzọ ihe ọma iji gosi na ha nwere okwukwe.
15. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi si n’omume anyị gosi na anyị nwere okwukwe? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)
15 Jehova ekwughị na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a kpọọ anyị ndị ezi omume, na anyị ga-eme ihe ndị ahụ Ebreham mere. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi si n’omume anyị gosi na anyị nwere okwukwe. Anyị nwere ike ịnabata ndị ọhụrụ n’ọgbakọ anyị, nyere ụmụnna nọ ná mkpa aka, meekwara ndị ezinụlọ anyị ihe ọma. Ihe ndị a niile na-adị Jehova mma, na-emekwa ka ọ gọzie anyị. (Rom 15:7; 1 Tim. 5:4, 8; 1 Jọn 3:18) Ọrụ kacha mkpa na-egosi na anyị nwere okwukwe bụ iji ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. (1 Tim. 4:16) Anyị niile nwere ike isi n’omume anyị gosi na anyị nwere okwukwe na nkwa Chineke ga-emezu nakwa na ụzọ ya kacha mma. Anyị mee otú ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-akpọ anyị ndị ezi omume na ndị enyi ya.
INWE OLILEANYA GA-EME KA OKWUKWE ANYỊ SIKWUO IKE
16. Olee otú olileanya si gbasa okwukwe Ebreham nwere?
16 Ndị Rom isi 4 kwuru ihe ọzọ dị mkpa anyị ga-amụta n’aka Ebreham, ya bụ, uru inwe olileanya bara. Jehova kwere Ebreham nkwa na a ga-esi n’aka ya gọzie “ọtụtụ mba.” Chegodịnụ otú ihe a si mee ka Ebreham nwee olileanya magburu onwe ya. (Jen. 12:3; 15:5; 17:4; Rom 4:17) Ma, ruokwa mgbe Ebreham gbara otu narị (100) afọ, Sera agbaa afọ iri itoolu, ha amụtabeghị nwa ahụ e kwere ha ná nkwa. N’anya mmadụ, Ebreham na Sera ịmụta nwa yiri ihe na-agaghị ekwe omume. Ihe a bụụrụ Ebreham ezigbo ule. Baịbụl sịrị: “Ma n’ihi ihe ọ na-atụ anya ya, o nwere okwukwe na ya ga-abụ nna ọtụtụ mba.” (Rom 4:18, 19) Nkwa ahụ mechakwara mezuo. Ọ mụtara Aịzik, nwa ọ nọ na-atụ anya ya kemgbe.—Rom 4:20-22.
17. Olee otú anyị si mara na anyị ga-abụli ndị ezi omume na ndị enyi Chineke?
17 Ihe anyị ga-adịli Chineke mma, anyị abụrụkwa ndị ezi omume na ndị enyi ya otú ahụ Ebreham bụ. N’eziokwu, ọ bụ ihe Pọl kwuru okwu ya mgbe ọ sịrị: “Ọ bụghị naanị n’ihi [Ebreham] ka e ji dee na ‘a kpọrọ ya onye ezi omume,’ kama ọ bụkwa n’ihi anyịnwa ndị a ga-akpọkwa ndị ezi omume, n’ihi na anyị kweere n’onye si n’ọnwụ kpọlite Jizọs Onyenwe anyị.” (Rom 4:23, 24) Dịkwa ka Ebreham, anyị kwesịrị inwe okwukwe, na-eme ihe dị mma, nweekwa olileanya. Pọl kwuru ihe ndị ọzọ gbasara olileanya ná Ndị Rom isi 5. Ọ bụ ihe anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a.
ABỤ NKE 28 Ịbụ Enyi Jehova
a Anyị chọrọ ka ihe anyị na-adị Jehova mma nakwa ka o were anyị ka ndị ezi omume. N’isiokwu a, anyị ga-eji ihe Pọl na Jems dere kọwaa otú o si kwe omume nakwa ihe mere anyị ji kwesị inwe okwukwe ma na-eme ihe dị mma ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe anyị dị Jehova mma.
b NKỌWA FOTO: Pọl gbara ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ume ka ha lekwasị anya n’inwe okwukwe, ọ bụghị ‘ime ihe e kwuru n’iwu,’ dị ka iyi uwe a dụnyere eri na-acha anụnụ anụnụ, ime Ememme Ngabiga, na ịkwọ aka otú omenala ndị Juu kwuru.
c NKỌWA FOTO: Jems gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-emere ndị mmadụ ihe ọma, dị ka inyere ndị ogbenye aka, si otú ahụ na-egosi na ha nwere okwukwe.