Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-ele Mmanya Na-aba n’Anya Anya Otú Chineke Si Ele Ya

Na-ele Mmanya Na-aba n’Anya Anya Otú Chineke Si Ele Ya

O DORO anya na i ji onyinye ndị Jehova nyere anyị kpọrọ ihe, ma otú o si kwe ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe ndị anyị ga-eji ihe ndị o nyere anyị eme. Baịbụl kwuru na mmanya bụ onyinye Chineke nyere anyị. Ọ sịrị: “Nri na-eme ka mmadụ na-achị ọchị, mmanya na-emekwa ka ndụ na-atọ mmadụ ụtọ.” (Ekli. 10:19; Ọma 104:15) Ma, o nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ịṅụ mmanya na-aba n’anya aghọọrọla ụfọdụ ndị nsogbu. Ihe ọzọkwa bụ na olu ndị mmadụ abụghị otu gburugburu ụwa n’ihe gbasara ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Oleezi ihe ga-enyere Onye Kraịst aka ime mkpebi dị mma gbasara ịṅụ mmanya?

Anyị kpebiwe ihe anyị ga-eme, anyị kwesịrị ikpebi ya ka ọ daba n’ihe Chineke chọrọ, ọ bụghị n’ihe ndị nọ anyị gburugburu chere. Ọ bụ ihe a ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ.

O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ọtụtụ ndị n’ụwa taa na-aṅụ mmanya mgbe niile, na-aṅụfekwa ya ókè. Ụfọdụ ndị nwere ike ịṅụ mmanya n’ihi na ọ na-eme ka obi ruo ha ala. Ndị ọzọ na-aṅụ ya ka ha chefuo nsogbu ha. N’ebe ụfọdụkwa, a na-eji mmadụ ịṅụ oké mmanya amata na ọ bụ nwoke ma ọ bụ dimkpa.

Ma, e nwere ihe Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya gwara anyị bụ́ Ndị Kraịst gbasara ịṅụ mmanya. Dị ka ihe atụ, ọ gwara anyị ihe ọjọọ ịṅụ oké mmanya na-akpata. Ọ ga-abụ na anyị agụọla ihe e kwuru n’Ilu 23:29-35 ebe kọwara otú onye ṅụrụ oké mmanya si eme na nsogbu ụfọdụ ọ na-akpatara ya. a Otu okenye bi na Yurop aha ya bụ Daniel kwuru otú ndụ ya dị tupu ya aghọọ ezigbo Onye Kraịst. Ọ sịrị: “Ịṅụ oké mmanya mere ka m mee mkpebi ndị na-adịghị mma, ndị kpataara m ezigbo nsogbu. Obi anaghịkwa adị m mma mgbe ọ bụla m chetara ya.”

Olee otú Ndị Kraịst ga-esi mee mkpebi dị mma n’ihe gbasara ịṅụ mmanya ma zere nsogbu ịṅụ oké mmanya na-akpata? Ihe bụ́ isi ga-enyere anyị aka bụ ikwe ka otú Jehova si eche echiche na-eduzi echiche anyị na omume anyị.

Ka anyị lee ihe Baịbụl kwuru gbasara mmanya na-aba n’anya nakwa ihe mere ụfọdụ ndị ji aṅụ mmanya.

IHE BAỊBỤL KWURU

Okwu Chineke ekwughị na ịṅụ obere mmanya na-aba n’anya dị njọ. Baịbụl kwudịrị na ịṅụ mmanya nwere ike ime mmadụ obi ụtọ. Ọ sịrị: “Jiri obi ụtọ rie nri gị, jirikwa obi ụtọ ṅụọ mmanya gị.” (Ekli. 9:7) E nwere oge ndị Jizọs ṅụrụ mmanya. Ndị ọzọ ji obi ha niile fee Chineke ṅụkwara mmanya.​—Mat. 26:27-29; Luk 7:34; 1 Tim. 5:23.

Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ekwughị na ịṅụ mmanya na-aba n’anya bụ ihe ọjọọ, mana o kwuru na ịṅụ oké mmanya adịghị mma. Ọ sịrị: “Unu aṅụbigakwala mmanya ókè.” (Efe. 5:18) O kwudịrị na “ndị aṅụrụma . . . agaghị eketa Alaeze Chineke.” (1 Kọr. 6:10) N’eziokwu, Jehova kpọrọ ịṅụ oké mmanya na aṅụrụma asị. Kama ịna-eme ka ndị nọ gburugburu anyị, anyị kwesịrị ịna-eme mkpebi dabara n’ihe Chineke chọrọ.

Ụfọdụ ndị chere na ha nwere ike ịṅụ nnukwu mmanya mana ọ gaghị egbu ha egbu. Ma, ime otú ahụ na-akpata ezigbo nsogbu. Baịbụl kwuru na ‘ịṅụ oké mmanya’ nwere ike ime ka mmadụ mee ihe ọjọọ ma mehie Jehova. (Taị. 2:3; Ilu 20:1) Jizọs dọdịrị aka ná ntị na “ịṅụ oké mmanya” nwere ike ime ka mmadụ ghara ịbanye n’ụwa ọhụrụ Chineke. (Luk 21:34-36) Oleezi ihe ga-enyere Onye Kraịst aka izere nsogbu ndị ịṅụ oké mmanya na-akpata?

CHEE IHE MERE I JI AṄỤ MMANYA NA OTÚ MMANYA Ị NA-AṄỤ HÀ

Ọ dịghị mma mmadụ iji otú ndị bi n’ebe o toro si aṅụ mmanya ekpebi otú ọ ga-aṅụru mmanya. Ndị Kraịst na-ekpebi ihe ga-adị Jehova mma n’ihe gbasara nri na mmanya. Baịbụl chetaara anyị, sị: “Ma ùnu na-eri ihe ma ùnu na-aṅụ ihe ma ùnu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe niile otú ga-eme ka e too Chineke.” (1 Kọr. 10:31) Ka anyị leba anya n’ajụjụ ụfọdụ na ihe Baịbụl kwuru gbasara ha:

M̀ na-aṅụ mmanya ka a ghara ịchị m ọchị? Ọpụpụ 23:2 sịrị: “Esorola ìgwè mmadụ.” Jehova dọrọ ndị Izrel aka ná ntị ebe a ka ha ghara ịkpa àgwà ka ndị na-anaghị eme ihe dị ya mma. Ihe a ọ gwara ha na-abakwara Ndị Kraịst uru taa. Ọ bụrụ na anyị ejiri otú ndị mmadụ si were ịṅụ mmanya na-ekpebi otú anyị si aṅụ mmanya, o nwere ike ime ka anyị ghara iji iwu Jehova kpọrọ ihe, meekwa ka anyị na ya ghara ịdị ná mma.​—Rom 12:2.

M̀ na-aṅụ mmanya iji gosi na m bụ dimkpa? N’obodo ụfọdụ, ọtụtụ ndị na-aṅụ mmanya mgbe niile, na-aṅụfekwa ya ókè. A na-echekwa na e nweghị ihe o mere. (1 Pita 4:3) Ma, lee ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 16:13. Ebe ahụ sịrị: “Mụrụnụ anya. Meenụ ka okwukwe unu sie ike. Nweenụ obi ike, siekwanụ ezigbo ike.” Ịṅụ mmanya ọ̀ ga-enyeliri mmadụ aka isi ezigbo ike? Azịza ya bụ mba. Mmanya na-aba n’anya nwere ike ime ka mmadụ ghara ịna-eche echiche nke ọma, meekwa ka onye ahụ mee mkpebi ndị na-adịghị mma. N’ihi ya, ịṅụ oké mmanya anaghị egosi na mmadụ bụ dimkpa, kama ọ na-egosi na mmadụ dị iberiibe. Aịzaya 28:7 kwuru na onye kpafuru n’ihi mmanya na-adagharị, ọ naghịkwa ama ihe ọ na-eme eme.

Ezigbo ike anyị ga-eji eme ihe dị mma na-esi n’aka Jehova. Ọ ga-eme ka anyị mụrụ anya ma mee ka okwukwe anyị sie ike. (Ọma 18:32) Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịkpachara anya zere nsogbu ma na-eme mkpebi na-agaghị emebi adịm ná mma anyị na Jehova. Jizọs gosiri na o nwere ụdị ike ahụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọtụtụ ndị kwanyekwaara ya ùgwù na ọ bụ dimkpa nakwa na o kpebisiri ike ime ihe dị mma.

M̀ na-aṅụ mmanya ka m chefuo nsogbu m? Mmụọ nsọ mere ka otu ọbụ abụ dee, sị: “Mgbe m nọ na-echegbu onwe m,  kasiri m obi ma mee ka ahụ́ ruo m ala.” (Ọma 94:19) Ọ bụrụ na nsogbu abịara gị, gakwuru Jehova ka o nyere gị aka, ọ bụghị mmanya. Ụzọ dị mma anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ekpekwu ekpere ka Jehova nyere anyị aka. Ọtụtụ ndị achọpụtakwala na ịga ka enyi ha ma nke a na-akọ n’ọgbakọ nyere ha aka bara uru. N’eziokwu, mmadụ ịṅụ mmanya ka o nwee ike ichefu nsogbu ya nwere ike ime ka onye ahụ ghara ikpebisi ike ime ihe dị mma. (Hos. 4:11) Nwanna Daniel anyị kwuburu okwu ya sịrị: “M nọ na-echegbu onwe m, obi m ana-amakwa m ikpe. M ṅụrụ mmanya ka m chefuo nsogbu m, mana nsogbu m kakwuru njọ, ya emee ka mụ na ọtụtụ ndị enyi m see, meekwa ka m na-eche na mụ abaghị uru.” Oleezi ihe mechara nyere Nwanna Daniel aka? Ọ sịrị: “M chọpụtara na m kwesịrị ịnọ Jehova nso, ọ bụghị mmanya. O nyeziiri m aka idi nsogbu m ma merie ha.” Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova nọ anyị nso mgbe niile inyere anyị aka, ọ bụrụgodị na nsogbu bịaara anyị yiri ihe a na-enweghị ihe ọ bụla anyị ga-emeli gbasara ya.​—Fil. 4:6, 7; 1 Pita 5:7.

Ọ bụrụ na ị na-aṅụ mmanya mgbe ụfọdụ, ọ ga-adị mma ka i chee gbasara ajụjụ ndị a ka ị mara ma è nwere ihe ị ga-agbanwe n’otú i si aṅụ mmanya: ‘È nweela onye ezinụlọ m ma ọ bụ enyi m gwara m okwu gbasara otú m si aṅụ mmanya?’ Ọ bụrụ na e nweela, o nwere ike ịbụ na ị maghị na ị mụtawala àgwà na-adịghị mma ma ọ bụ na i nwewela nsogbu. ‘M̀ na-aṅụ mmanya karịa otú m na-aṅụbu?’ Ihe a nwere ike ime onye na-abụghị onye aṅụrụma, mana ya abụrụ na ịṅụ mmanya eriwela ya ahụ́. ‘Ọ̀ na-esiri m ike ịnọ ụbọchị ole na ole ma ọ bụ karịa n’aṅụghị mmanya?’ Ọ bụrụ na ị zara ee, o nwere ike ịbụ na ịṅụ mmanya eriela gị ahụ́. O nwekwara ike ịdị mkpa ka ndị ọkachamara nyere gị aka ka ị kwụsị ya.

Ebe ọ bụ na ịṅụ mmanya nwere ike ịkpata ọtụtụ nsogbu, ụfọdụ Ndị Kraịst ekpebiela na ha agaghị aṅụ mmanya ọ bụla na-aba n’anya. Ụfọdụ ndị nwere ike ikpebi na ha agaghị aṅụ mmanya na-aba n’anya n’ihi na ọ naghị atọ ha ụtọ. Onye gị na ya dị ná mma kpebie na ya agaghịzi aṅụ mmanya na-aba n’anya, i nwere ike igosi ya obiọma ma ị kwanyere ya ùgwù, gharakwa ịkatọ ihe ahụ o kpebiri.

O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ọ dị mma ka i kpebie otú ị ga-aṅụru mmanya. I nwere ike ikpebi ugboro ole ị ga na-aṅụ mmanya, dị ka otu ugboro n’izu ma ọ bụ ịṅụ obere mmanya ma i riwe nri. E nwere ndị nke kpebiri ụdị mmanya na-aba n’anya ha ga-aṅụ, dị ka ịṅụ obere waịn ma ọ bụ biya, mana ha ekpebie na ha agaghị aṅụ mmanya ọkụ, ọ bụrụgodị nke a gwakọtara ya na ihe ọzọ a na-aṅụ aṅụ. Mmadụ kpebie ihe ọ ga-eme gbasara ịṅụ mmanya, ọ ga-eme ka ọ dịrị ya mfe ime ya. Ihere ekwesịghịkwanụ ime Onye Kraịst tozuru etozu ma o mee ụdị mkpebi a ma nọsie ike na ya.

Anyị kpebiwe ihe anyị ga-eme gbasara mmanya na-aba n’anya, anyị kwesịrị ichebara ndị ọzọ echiche. Ndị Rom 14:21 sịrị: “Ọ ka mma ka ị ghara ịta anụ ma ọ bụ ịṅụ mmanya ma ọ bụ ime ihe ọ bụla ga-eme ka nwanna gị zọhie ụkwụ.” Olee otú i nwere ike isi eme ihe a? Na-egosi ụmụnna gị na ị hụrụ ha n’anya. Ọ bụrụ na ị chọpụta na ịṅụ mmanya ga-akpasu mmadụ iwe, i nwere ike ikpebi ịghara ịṅụ mmanya n’oge ahụ. Ị ga-esi otú ahụ egosi na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ gị n’obi, na ị na-akwanyere ha ùgwù, nakwa na ị na-achọ ihe ga-abara ha uru, ọ bụghị ihe ga-abara naanị gị uru.​—1 Kọr. 10:24.

Ihe ọzọ bụ na ndị ọchịchị nwere ike iti iwu gbasara ịṅụ mmanya na-aba n’anya. N’eziokwu, Onye Kraịst kwesịrị irubere iwu ndị ahụ isi. Iwu ndị ahụ nwere ike ikwu afọ ole mmadụ ga-eru tupu ya aṅụwa mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ ha ekwuo na mmadụ ekwesịghị ịṅụ mmanya na-aba n’anya tupu ya anyawa ụgbọala ma ọ bụ tupu ya ejiri ngwá ọrụ ụfọdụ na-arụ ọrụ.​—Rom 13:1-5.

Jehova kwanyeere anyị ùgwù kwe ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eji ọtụtụ onyinye o nyere anyị eme. Ikpebi ihe anyị ga-eri na ihe anyị ga-aṅụ sokwa na ha. Ka ihe anyị na-ekpebi gosi na anyị ji onyinye a Chineke nyere anyị kpọrọ ihe, ka anyị jirikwa ya na-eme ihe ga-adị Nna anyị nke eluigwe mma.

a Otu òtù na-ahụ maka igbochi ọrịa n’Amerịka kwuru na ụfọdụ nsogbu ịṅụ oké mmanya na-akpata bụ igbu ọchụ, mmadụ igbu onwe ya, idina mmadụ n’ike, mmadụ ịkụ di ya ma ọ bụ nwunye ya isi aba okpu, mmadụ inwe mmekọahụ rụrụ arụ nke nwere ike ịkpatara ya nsogbu, nakwa ime ịpụ nwaanyị.