Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 51

Olileanya I Nwere Maka Ọdịnihu Agaghị Emenye Gị Ihere

Olileanya I Nwere Maka Ọdịnihu Agaghị Emenye Gị Ihere

“Olileanya a anaghị emenye anyị ihere.”​—ROM 5:5.

ABỤ NKE 142 Ka Anyị Jidesie Olileanya Anyị Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na e nwere ezigbo ihe mere Ebreham ji nwee olileanya?

 JEHOVA kwere enyi ya Ebreham nkwa na ọ ga-amụta nwa a ga-esi n’aka ya gọzie mba niile dị n’ụwa. (Jen. 15:5; 22:18) Ebe ọ bụ na Ebreham nwere okwukwe siri ike na Chineke, obi siri ya ezigbo ike na nkwa Chineke kwere ya ga-emezu. N’agbanyeghị ya, mgbe Ebreham dị otu narị (100) afọ, nwunye ya adịrị iri afọ itoolu, ha amụtabeghị nwa ọ bụla. (Jen. 21:1-7) Ma, Baịbụl kwuru na Ebreham “nwere okwukwe na ya ga-abụ nna ọtụtụ mba otú e kwuru ya.” (Rom 4:18) Ị manụ na ihe Ebreham nwere olileanya ya mechara mezuo. Ọ mụtara Aịzik, bụ́ nwa nwoke ọ na-atụ anya ya kemgbe. Gịnị mere obi ji sie Ebreham ike na Jehova ga-emezu nkwa ya?

2. Gịnị mere obi ji sie Ebreham ike na nkwa Jehova kwere ya ga-emezu?

2 Ebreham ma Jehova nke ọma. Ọ bụ ya mere ‘obi ji sie ya ezigbo ike na Chineke ga-eme ihe o kwere ná nkwa.’ (Rom 4:21) Ihe Ebreham masịrị Jehova, ya akpọọ ya onye ezi omume n’ihi na o nwere okwukwe. (Jems 2:23) Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 4:18, Ebreham nwere ma okwukwe ma olileanya. Ka anyị lebazie anya n’ihe Pọl onyeozi kwuru banyere olileanya, nke e dere ná Ndị Rom isi 5.

3. Gịnị ka Pọl kọwara gbasara olileanya?

3 Pọl kọwara ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na ‘olileanya anyị agaghị emenye anyị ihere.’ (Rom 5:5) O nyekwaara anyị aka ịghọta otú olileanya Ndị Kraịst nwere ike isi na-esikwu ike. Ka anyị na-eleba anya n’ihe Pọl kwuru ná Ndị Rom 5:1-5, chee otú ụdị ihe a si mee ná ndụ gị. I mee otú ahụ, o nwere ike inyere gị aka ịghọta na ị na-enwekwu olileanya ka oge na-aga. Ihe anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu a ga-enyere gị aka ịma otú ị ga-esi eme ka olileanya gị na-esikwu ike karịa ka ọ dị ugbu a. Ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’olileanya magburu onwe ya Pọl kwuru na ọ gaghị emenye anyị ihere.

OLILEANYA MAGBURU ONWE YA ANYỊ NWERE

4. Olee ihe e kwuru ná Ndị Rom 5:1, 2?

4 Gụọ Ndị Rom 5:1, 2. Ọ bụ ọgbakọ dị na Rom ka Pọl degaara ihe ndị a. Ụmụnna ndị o degaara akwụkwọ ozi ahụ amụtala banyere Jehova na Jizọs, nwee okwukwe, ghọọkwa Ndị Kraịst. N’ihi ya, Chineke ‘kpọrọ ha ndị ezi omume maka na ha nwere okwukwe.’ O jikwa mmụọ nsọ ya tee ha mmanụ. N’eziokwu, ha nwere olileanya magburu onwe ya. Obi sikwara ha ike na ọ ga-emezu.

5. Olee olileanya ndị e tere mmanụ nwere?

5 Pọl mechara degara Ndị Kraịst e tere mmanụ n’Efesọs akwụkwọ ozi gbasara olileanya Chineke mere ka ha nwee. Ihe so n’olileanya ahụ bụ inweta ‘ihe ọma dị ebube o kwere nkwa inye ndị nsọ.’ (Efe. 1:18) Pọl chetakwaara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi ebe ha ga-enweta ụgwọ ọrụ ha. Ọ kpọrọ ya ‘olileanya inweta ihe e doweere ha n’eluigwe.’ (Kọl. 1:4, 5) N’ihi ya, olileanya Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere bụ na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha adịrị ndụ ebighị ebi n’eluigwe, bụ́ ebe ha ga-eso Kraịst chịa.​—1 Tesa. 4:13-17; Mkpu. 20:6.

Nwanna F. W. Franz kwuru otú obi si sie Ndị Kraịst e tere mmanụ ike na olileanya ha ga-emezu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Gịnị ka otu nwanna e tere mmanụ kwuru banyere olileanya ya?

6 Ndị Kraịst e tere mmanụ ji olileanya a ha nwere kpọrọ ihe. Otu n’ime ha bụ Nwanna Frederick Franz. O si n’obi ya kwuo na olileanya ha bụ ihe e ji n’aka, nke ga-emezuchara onye ọ bụla so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ndị so n’ìgwè atụrụ nta ahụ, nakwa na ọ ga-emezu karịadị otú ha chetụrụla n’echiche. N’afọ 1991, mgbe o ji obi ya niile jeere Chineke ozi ruo ọtụtụ afọ, ọ sịrị na ha ka ji olileanya ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu, na ka ha na-eche ya ka ha na-ejikwu ya akpọrọ ihe. O kwuru na ha dị njikere ichere ya ọ bụrụgodị na ha ga-echere ya ruo otu nde afọ, nakwa na ya ji olileanya ha kpọrọ ihe karịa otú o jibu ya kpọrọ.

7-8. Olee olileanya ọtụtụ n’ime anyị nwere? (Ndị Rom 8:20, 21)

7 Olileanya ọtụtụ ndị na-efe Jehova taa nwere dị iche. Ọ bụ olileanya ahụ Ebreham nwere, ya bụ, ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe Alaeze Chineke ga na-achị. (Hib. 11:8-10, 13) Pọl dere gbasara ihe magburu onwe ya ndị nwere olileanya a ga-enweta. (Gụọ Ndị Rom 8:20, 21.) Mgbe mbụ ị mụtara nkwa ndị Baịbụl kwere maka ọdịnihu, olee nke kacha masị gị? Ọ̀ bụ na otu ụbọchị, ị ga-ezu okè, ị gaghịzikwa abụ onye mmehie? Ka ọ̀ masịrị gị mgbe ị mụtara na a ga-akpọlite ndị gị nwụrụ anwụ, ha adịrị ndụ ọzọ n’ụwa nke bụ́ paradaịs? E nwere ọtụtụ ihe ị na-atụ anya ha ‘ebe ọ bụ na i nwere olileanya.’

8 Ma ànyị na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, anyị nwere olileanya magburu onwe ya nke mere anyị ji kwesị ịna-aṅụrị ọṅụ. Olileanya a nwere ike ịna-esikwu ike n’obi anyị. Ihe ọzọ Pọl dere kọwara otú o nwere ike isi eme. Ka anyị tụlee ihe o dere gbasara olileanya anyị. Ime otú ahụ ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na olileanya anyị ga na-esikwu ike nakwa na ọ gaghị emenye anyị ihere.

OTÚ OLILEANYA ANYỊ SI ESIKWU IKE

Ndị Kraịst niile kwesịrị ịtụ anya mkpagbu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10)

9-10. Dị ka ihe mere Pọl gosiri, gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ịtụ anya ya? (Ndị Rom 5:3) (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

9 Gụọ Ndị Rom 5:3. Ọ̀ kwa ị hụrụ na mkpagbu nwere ike ime ka olileanya anyị sikwuo ike? Ihe a nwere ike iju anyị anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị niile na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ịtụ anya mkpagbu. Ka anyị leba anya n’ihe mere Pọl. Ọ gwara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka, sị: “Mgbe anyị na unu nọ, anyị na-adị agwa unu tupu ya ebido ime na a ga-akpagbu anyị. Unu makwa na ihe anyị kwuru emeela.” (1 Tesa. 3:4) O degakwaara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt akwụkwọ ozi, sị: “Ụmụnna anyị, anyị chọrọ ịgwa unu gbasara ahụhụ anyị tara . . . Anyị ejighịzi ndụ anyị n’aka.”​—2 Kọr. 1:8; 11:23-27.

10 Ndị Kraịst taa kwesịkwara ịtụ anya na mkpagbu ga-abịara ha. (2 Tim. 3:12) Gịnwa kwanụ? Kemgbe i nwere okwukwe na Jizọs ma na-eso ụzọ ya, mkpagbu ọ̀ bịarala gị? O nwere ike ịbụ na ndị enyi gị na ndị ikwu gị akwaala gị emo. O nwedịrị ike ịbụ na ha emesiela gị ike. Otú i si kpebisie ike na ị ga na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile ò meela ka i nwee nsogbu n’ebe ị na-arụ ọrụ? (Hib. 13:18) Ndị ọchịchị hà emegidela gị n’ihi na ị na-akọrọ ndị ọzọ gbasara olileanya i nwere? Ma, n’agbanyeghị ụdị mkpagbu nwere ike ịbịara anyị, Pọl kwuru na anyị kwesịrị ịna-aṅụrị ọṅụ. Maka gịnị?

11. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpebisie ike ịtachi obi n’ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị?

11 Anyị ga-aṅụrịli ọṅụ mgbe a na-akpagbu anyị n’ihi na anyị ma na ọ ga-enyere anyị aka ịmụta àgwà dị ezigbo mkpa. Ndị Rom 5:3 sịrị na “mkpagbu na-eme ka anyị tachie obi.” A ga-akpagbu Ndị Kraịst niile. N’ihi ya, Ndị Kraịst niile kwesịrị ịtachi obi. Anyị kwesịrị ikpebisi ike idi ụdị ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ịbịara anyị. Ọ bụ naanị ya ga-eme ka anyị nweta ihe ndị anyị na-atụ anya ha. Anyị achọghị ime ka ndị ahụ Jizọs bu n’obi mgbe ọ na-ekwu gbasara mkpụrụ dara n’ala nkume. Ha ji ọṅụ nabata okwu ahụ na mbụ. Ma, “ozugbo nsogbu ma ọ bụ mkpagbu” bịara, ha kwụsịrị ikwere okwu ahụ. (Mat. 13:5, 6, 20, 21) Nke bụ́ eziokwu bụ na mkpagbu anaghị adị mfe. Ọ naghịkwanụ atọ ụtọ. Ma, ọ bụrụ na anyị edie ya ma ka na-efe Jehova, ọ ga-abara anyị ezigbo uru. Olee uru ọ bụ?

12. Olee uru anyị na-erite ma anyị tachie obi n’ọnwụnwa?

12 Jems onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru uru ịtachi obi ná mkpagbu ga-abara anyị. O dere, sị: “Ọ bụrụkwa na unu ana-atachi obi mgbe niile, ọ ga-eme ka unu zụọ onwe unu nke ọma, nwee ike izu ezu, na-emekwa nke ọma n’ihe niile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ unu.” (Jems 1:2-4) Otú Jems si kọwaa ntachi obi dị ka à ga-asị na e nwere ọrụ ọ na-arụ. Gịnị bụ ọrụ ntachi obi na-arụ? O nwere ike inyere anyị aka ịmụtakwu àgwà ndị dị ka ndidi, okwukwe, na ịtụkwasị Jehova obi. Ma, e nwere uru ọzọ ntachi obi na-abara anyị.

13-14. Gịnị na-eme ma anyị tachie obi? Oleekwa otú o si gbasa olileanya anyị? (Ndị Rom 5:4)

13 Gụọ Ndị Rom 5:4. Pọl kwuru na ịtachi obi na-eme “ka anyị na Chineke dịrị ná mma.” Ị tachie obi, ọ ga-eme ka gị na Jehova dịrị ná mma. Ihe a apụtaghị na ọ na-atọ Jehova ụtọ ma ọnwụnwa ma ọ bụ nsogbu bịara anyị. Ihe na-eme Jehova obi ụtọ bụ gịnwa, ọ bụghị ahụhụ ị na-ata. Otú i si tachie obi na-eme ka gị na ya dịrị ná mma. Ihe a bụ ngọzi magburu onwe ya.​—Ọma 5:12.

14 Cheta na Ebreham tachiri obi mgbe ọnwụnwa bịaara ya, nke mere ka ya na Jehova dịrị ná mma. Jehova weere ya ka enyi ya ma kpọọ ya onye ezi omume. (Jen. 15:6; Rom 4:13, 22) Jehova nwere ike iwere anyị otú ahụ. Ihe na-eme ka anyị na Jehova dịrị ná mma abụghị otú ọrụ anyị na-arụ n’ozi ya hà ma ọ bụkwanụ ụdị ọrụ e nyere anyị ná nzukọ ya. Ihe na-eme ka anyị na ya dịrị ná mma bụ ma anyị tachie obi na-efe ya ma nsogbu bịara anyị. N’agbanyeghị afọ ole anyị dị, otú ihe si dịrị anyị, ma ọ bụ ihe ndị anyị ga-emeli, anyị niile nwere ike ịtachi obi. È nwere nsogbu ị na-edi ugbu a ma ka na-efe Jehova? Ọ bụrụ na e nwere, ka obi sie gị ike na ị na-eme Jehova obi ụtọ. Ịmata na ihe anyị na-eme dị Jehova mma nwere ike ịkpa ezigbo ike ná ndụ anyị. O nwere ike ime ka olileanya anyị sikwuo ike.

OLILEANYA NWERE IKE ISIKWU IKE

15. Olee ihe ọzọ Pọl kwuru? Oleekwa ihe mere o nwere ike iji eju ụfọdụ ndị anya?

15 Dị ka Pọl kwuru, anyị na Jehova na-adị ná mma ma ọ bụrụ na anyị ana-atachi obi n’ọnwụnwa ma ka na-efe ya. Ihe ọzọ Pọl kwuru bụ: “Anyị na Chineke ịdị ná mma na-eme ka anyị nwee olileanya. Olileanya a anaghị emenye anyị ihere.” (Rom 5:4, 5) Ihe a nwere ike iju ụfọdụ ndị anya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na tupu Pọl ekwuo ihe ahụ, o kwuru ná Ndị Rom 5:2 na Ndị Kraịst ndị ahụ nọ na Rom ebula ụzọ nwee olileanya, ya bụ, ‘olileanya na ha ga-enweta ebube Chineke.’ O nwere ike ime ka mmadụ jụọ, sị, ‘Ọ bụrụ na Ndị Kraịst ndị ahụ ebula ụzọ nwee olileanya, gịnịzi mere Pọl ji mechaakwa kwuo banyere inwe olileanya?’

Ka oge na-aga, obi esikwuola gị ike na olileanya gị ga-emezu. Ị na-atụkwa anya ya karịa otú ị na-atụ na mbụ. Obi adịkwuola gị ụtọ maka ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)

16. Olee otú olileanya mmadụ si amalite isi ike? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

16 Anyị nwere ike ịghọta ihe mere Pọl ji kwuo ya ma ọ bụrụ na anyị eburu n’obi na olileanya nwere ike isikwu ike. Iji maa atụ, ì chetara mgbe mbụ ị nụrụ banyere olileanya magburu onwe ya dị n’Okwu Chineke? N’oge ahụ, o nwere ike ịbụ na i chere na ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ paradaịs bụ ịmụ anya arọ nrọ. Ma, ka ị na-amatakwu Jehova na nkwa ndị o kwere na Baịbụl, obi bịara na-esikwu gị ike na otu ụbọchị, olileanya ahụ ga-emezu.

17. Olee otú olileanya gị si na-esikwu ike kemgbe i nyefechara Jehova onwe gị, mee baptizim?

17 I nyefechagodị Jehova onwe gị ma mee baptizim, olileanya gị ga na-esikwu ike ka ị na-amụtakwu ihe ma na-aghọkwu Onye Kraịst tozuru etozu. (Hib. 5:13–⁠6:1) O nwere ike ịbụ na ihe e kwuru ná Ndị Rom 5:2-4 emeela ná ndụ gị. Ọtụtụ nsogbu abịarala gị. Ma, i diri ha niile, hụkwa na o mere ka gị na Jehova dịrị ná mma. Ebe ọ bụ na obi siri gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya, i nwekwuola ezigbo ihe mere i ji atụ anya inweta ihe ndị o kwere gị ná nkwa. Olileanya gị esikwuola ike karịa otú ọ dị ná mmalite. Obi esikwuola gị ike na ọ ga-eme eme. Ọ na-akpakwu ike ná ndụ gị, ya bụ, ọ na-agbanwe ihe niile ị na-eme, otú i si emeso ndị ezinụlọ gị, otú i si ekpebi ihe ndị ị ga-eme, na ihe ndị ị na-eji oge gị eme.

18. Olee otú Jehova si eme ka obi sie anyị ike na nkwa o kwere anyị ga-emezu?

18 Pọl onyeozi kwuru ihe ọzọ dị ezigbo mkpa banyere olileanya i nwere mgbe gị na Chineke bịara dị ná mma. O mere ka obi sie gị ike na olileanya i nwere ga-emezu. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie gị ezigbo ike? Pọl si n’ike mmụọ nsọ gwa Ndị Kraịst ihe mere obi ji kwesị isi ha ike. Ọ sịrị: “Olileanya a anaghị emenye anyị ihere; n’ihi na Chineke ji mmụọ nsọ o nyere anyị mee ka ịhụnanya ya ju n’obi anyị.” (Rom 5:5) Obi kwesịrị isi gị ezigbo ike na Jehova ga-emezuru gị ihe ndị i nwere olileanya ha.

19. Gịnị ka obi kwesịrị isi gị ike na ya banyere olileanya i nwere?

19 Na-eche banyere nkwa Chineke kwere Ebreham nakwa ihe Ebreham mere ka ihe ya nwee ike ịdị Jehova mma, ya abụrụkwa enyi ya. Ihe Ebreham nwere olileanya ya mechara mezuo. Baịbụl sịrị: “Ọ bụ mgbe Ebreham nwechara ndidi ka e kwere ya nkwa a.” (Hib. 6:15; 11:9, 18; Rom 4:20-22) E nweghị mgbe ọ bụla olileanya Ebreham menyere ya ihere. Obi kwesịrị isi gị ike otú ahụ na ọ bụrụ na ị nọsie ike n’ofufe Chineke, ihe i nwere olileanya ya ga-emezu. E nwere ọtụtụ ihe mere i ji kwesị ịna-aṅụrị ọṅụ n’ihi na ị ma na olileanya gị ga-emezurịrị. Ọ gaghị emenye gị ihere. (Rom 12:12) Pọl dere, sị: “Ka Chineke onye na-eme ka anyị nwee olileanya mee ka unu nwee ọṅụ na udo zuru ezu ebe ọ bụ na unu tụkwasịrị ya obi, ka ike mmụọ nsọ wee mee ka unu nwee olileanya.”​—Rom 15:13.

ABỤ NKE 139 Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ

a N’isiokwu a, anyị ga-amụ ihe bụ́ olileanya anyị nwere maka ọdịnihu nakwa ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na ọ ga-emezu. Ndị Rom isi 5 ga-enyere anyị aka ịhụ ihe dị iche n’otú olileanya anyị dị ugbu a na otú ọ dị mgbe mbụ anyị mụtara eziokwu Baịbụl.