Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 4

ABỤ NKE 30 Nna M, Chineke M na Enyi M

Ihe Banyere Gị Na-emetụ Jehova n’Obi

Ihe Banyere Gị Na-emetụ Jehova n’Obi

“Ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ Jehova n’obi.”​—JEMS 5:11.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụ otú ịhụnanya Jehova si eme ka anyị bịaruo ya nso, na-eme ka obi ruo anyị ala, na-eme ka anyị nweta ume, na-emekwa ka anyị mata na ọ na-elekọta anyị.

1. Gịnị na-abata gị n’obi ma i chee gbasara Jehova?

 È NWETỤLA mgbe ị gbalịrị iche otú Jehova dị? Ị gwawa Jehova okwu n’ekpere, olee ihe na-abata gị n’obi? Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị ahụ Jehova anya, Baịbụl si ụzọ dị iche iche kọwaa ya. A kpọrọ Jehova “anyanwụ” na “ọta” nakwa “ọkụ na-erechapụ ihe.” (Ọma 84:11; Hib. 12:29) N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, o kwuru na Jehova dị ka nkume safaya, ọla na-egbu maramara, na eke na egwurugwu na-enwu gbaa. (Ezik. 1:26-28) Ụfọdụ n’ime ihe ndị a e ji kọwaa Jehova nwere ike ime ka ụjọ na-atụ anyị ma ọ bụdị mee ka anyị chee na anyị abaghị uru ọ bụla.

2. Olee ihe nwere ike igbochi ụfọdụ ndị ịbịaru Jehova nso?

2 Ebe ọ bụ na anyị anaghị ahụ Jehova anya, o nwere ike isiri anyị ike ikweta na ọ hụrụ anyị n’anya. Ụfọdụ ndị nwere ike iche na Jehova agaghị ahụli ha n’anya n’ihi ihe ndị mere ná ndụ ha n’oge gara aga. O nwekwara ike ịbụ na ha enweghị nna hụrụ ha n’anya. Jehova na-aghọta otú ihe ndị a na-adị anyị nakwa otú ha si akpa anyị aka. Iji nyere anyị aka, ọ kọwaara anyị àgwà ya ndị magburu onwe ha na Baịbụl.

3. Gịnị mere anyị kwesịrị iji mụkwuo gbasara ịhụnanya Jehova?

3 Otu okwu kacha daba adaba iji kọwaa Jehova bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Chineke bụ ịhụnanya. Ọ bụ ịhụnanya na-eme ka ọ na-eme ihe niile ọ na-eme. Ịhụnanya Jehova siri ezigbo ike nke na ndị ọ na-ahụ n’anya abụghị naanị ndị hụrụ ya n’anya. (Mat. 5:44, 45) N’isiokwu a, anyị ga-amụ gbasara Jehova na ịhụnanya ya. Ọ bụrụ na anyị ana-amụtakwu gbasara Chineke anyị, anyị ga na-ahụkwu ya n’anya.

JEHOVA HỤRỤ ANYỊ N’ANYA NKE UKWUU

4. Olee otú obi na-adị gị n’ihi ịhụnanya Jehova? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

4 Baịbụl sịrị: “Ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ Jehova n’obi.” (Jems 5:11) Na Baịbụl, Jehova ji onwe ya tụnyere nne hụrụ nwa ya n’anya. (Aịza. 66:12, 13) Chegodị gbasara otú nne na-esi ahụ nwa ya dị obere n’anya ma na-elekọta ya. Ọ na-ekuru ya n’ụkwụ ya, na-atụli ya elu na-aghọrọ ma jiri nwayọọ na-agwa ya okwu. Ọ bụrụ na o bewe ákwá ma ọ bụkwanụ na o merụrụ ahụ́, ọ na-agba mbọ ịhụ na o meere ya ihe o kwesịrị imere ya. Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya. Otu ọbụ abụ dere, sị: “Mgbe m nọ na-echegbu onwe m, ị kasiri m obi ma mee ka ahụ́ ruo m ala.”​—Ọma 94:19.

“M ga na-akasi unu obi otú nne si akasi nwa ya nwoke obi” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)


5. Olee otú i si were ịhụnanya Jehova?

5 Jehova hụrụ anyị n’anya. (Ọma 103:8) Ọ naghị akwụsị ịhụ anyị n’anya ma anyị mee ihe ọjọọ. Ụmụ Izrel mejọrọ Jehova ọtụtụ ugboro. Ma, ọ bụrụ na ha echegharịa, ọ na-agwa ha na ọ hụrụ ha n’anya. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ha, sị: “Ejighị m unu egwu egwu. Agụrụ m unu ná ndị e kwesịrị ịkwanyere ùgwù. M hụkwara unu n’anya.” (Aịza. 43:4, 5) Ịhụnanya Chineke agbanwebeghị. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ na-ahụ anyị n’anya mgbe niile. Ọ bụrụgodị na ihe anyị mere dị ezigbo njọ, Jehova anaghị ahapụ anyị. Anyị chegharịa ma lọghachikwute ya, ọ ka ga-ahụkwa anyị n’anya. O kwere anyị nkwa na “ọ ga-agbaghara . . . kpamkpam.” (Aịza. 55:7) Baịbụl kọwara na Jehova gbaghara anyị, ‘ọ ga-eme ka obi ruo anyị ala.’​—Ọrụ 3:19.

6. Gịnị ka Zekaraya 2:8 na-akụziri anyị gbasara Jehova?

6 Gụọ Zekaraya 2:8. Ebe ọ bụ na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ na-ahụ otú obi dị anyị ozugbo. Ọ dị njikere ichebe anyị. Ihe na-ewute anyị na-ewutekwa ya. N’ihi ihe a, anyị nwere ike ikpe ekpere, sị: “Chebe m ka mkpụrụ anya gị.” (Ọma 17:8) Obere ihe nwere ike imerụ mmadụ ahụ́ n’anya. Ọ bụ ya mere na mmadụ anaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee anya ya. N’ihi ya, mgbe Jehova ji anyị tụnyere mkpụrụ anya ya, o yiri ka ọ̀ na-agwa anyị, sị, ‘Onye ọ bụla merụrụ unu bụ́ ndị m ahụ́ na-emerụ ihe dị m ezigbo mkpa ahụ́.’

7. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mee ka obi sikwuo anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya?

7 Jehova chọrọ ka obi sie anyị ike na ọ hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị n’anya. Ma, ọ makwa na n’ihi ihe ndị mere ná ndụ anyị n’oge gara aga, anyị nwere ike iche na o nweghị ike ịhụ anyị n’anya, ma ọ bụkwanụ nsogbu ndị bịaara anyị ana-eme ka ọ na-esiri anyị ike ikweta na Jehova hụrụ anyị n’anya. Gịnị ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya? Ọ bụ ịmụ otú Jehova si gosi na ọ hụrụ Jizọs, ndị e tere mmanụ, na anyị niile n’anya.

OTÚ JEHOVA SI EGOSI NA Ọ HỤRỤ ANYỊ N’ANYA

8. Gịnị mere obi ji sie Jizọs ike na Nna ya hụrụ ya n’anya?

8 Ruo ọtụtụ afọ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, Jehova na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya hụrụ ibe ha n’anya nke ukwuu. Ha abụọ dị ná mma ruo ogologo oge karịa ndị ọ bụla ọzọ. Jehova mere ka o doo anya na ọ hụrụ Jizọs n’anya, dị ka e kwuru na Matiu 17:5. Jehova chọọ, ọ gaara asị naanị, ‘Onye a bụ onye ihe ya masịrị m.’ Ma, ọ chọrọ ka anyị mara otú ọ hụruru Jizọs n’anya. N’ihi ya, ọ kpọrọ ya “Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya.” Jehova ji Jizọs eme ọnụ n’ihi ụdị onye ọ bụ nakwa n’ihi ihe ọ ga-eme. (Efe. 1:7) O dokwara anya na o nweghị mgbe o mere Jizọs obi abụọ ma ihe gbasara ya ọ̀ na-emetụ Nna ya n’obi. Obi siri ya ezigbo ike na Nna ya hụrụ ya n’anya nke ukwuu. O jikwa obi ike kwuo ọtụtụ ugboro na Nna ya hụrụ ya n’anya.​—Jọn 3:35; 10:17; 17:24.

9. Olee ihe Baịbụl kwuru gosiri otú Jehova si hụ ndị e tere mmanụ n’anya? Kọwaa. (Ndị Rom 5:5)

9 Jehova kwukwara na ọ hụrụ ndị e tere mmanụ n’anya. (Gụọ Ndị Rom 5:5.) Ihe e kwuru ebe a gosiri otú Jehova hụruru ndị e tere mmanụ n’anya. Ọ sịrị na Jehova mere ka “ịhụnanya ya ju n’obi” ha. Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl ji otú Chineke si hụ ha n’anya tụnyere iyi na-asọ asọ. Ihe a gosiri na Jehova hụrụ ndị e tere mmanụ n’anya nke ukwuu. Ndị e tere mmanụ makwa na ha bụ ‘ndị Chineke hụrụ n’anya.’ (Jud 1) Jọn onyeozi kwuru otú ọ dị ha n’obi mgbe o dere, sị: “Nna anyị hụrụ anyị n’anya nke ukwuu wee kwe ka a kpọọ anyị ụmụ Chineke.” (1 Jọn 3:1) Ọ̀ bụ naanị ndị e tere mmanụ ka Jehova hụrụ n’anya? Mba. Jehova gosikwara na ọ hụrụ anyị niile n’anya.

10. Olee ihe kacha egosi na Jehova hụrụ gị n’anya?

10 Olee ihe kachanụ Jehova ji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya? Ọ bụ ihe mgbapụta ahụ. Jehova ji ya gosi na ọ hụrụ anyị n’anya karịa otú onye ọ bụla metụrụla. (Jọn 3:16; Rom 5:8) Jehova nyere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Jizọs ka ọ nwụọ maka ụmụ mmadụ niile ka e nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị, anyị na ya abụrụ enyi. (1 Jọn 4:10) Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’ụgwọ Jehova na Jizọs kwụrụ iji nye ihe mgbapụta ahụ, ọ ga-eme ka anyị ghọtakwuo otú ha hụruru onye ọ bụla n’ime anyị n’anya. (Gal. 2:20) Ihe mere Jehova ji nye ihe mgbapụta ahụ abụghị naanị n’ihi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ bụ onyinye gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. Jehova egosikwala na ọ hụrụ anyị n’anya, jiri Jizọs bụ́ onye ọ kacha hụ n’anya chụọ àjà. Jehova kwere ka Ọkpara ya taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị.

11. Gịnị ka anyị na-amụta na Jeremaya 31:3?

11 Dị ka anyị hụrụla, ọ bụghị naanị na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ na-agwakwa anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. (Gụọ Jeremaya 31:3.) Jehova dọtara anyị n’ebe ọ nọ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. (I nwere ike ịtụle Diuterọnọmi 7:7, 8.) O nweghị onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ga-emeli ka Chineke ghara ịhụ anyị n’anya. (Rom 8:38, 39) Olee otú obi dị gị maka ịhụnanya Chineke? Gụọ Abụ Ọma nke 23, ka ị hụ otú obi dị Devid n’ihi otú Jehova si hụ ya n’anya, ihe gbasara ya ana-emetụkwa ya n’obi, nakwa otú obi ga-adị anyị niile maka ya.

OLEE OTÚ OBI DỊ GỊ MAKA NA JEHOVA HỤRỤ GỊ N’ANYA?

12. Olee otú ị ga-esi chịkọta Abụ Ọma nke 23?

12 Gụọ Abụ Ọma 23:1-6. N’Abụ Ọma nke 23, Devid kwuru na obi siri ya ike na Jehova hụrụ ya n’anya ma na-elekọta ya. O kwuru na ya na Jehova bụ ezigbo enyi. Ọ kpọrọ Jehova Onye na-azụ ya dị ka atụrụ. Obi ruru Devid ala maka na o kwere ka Jehova na-eduzi ya. Ọ tụkwasịkwara ya obi kpamkpam. Devid ma na Jehova ga-egosi ya na ọ hụrụ ya n’anya ná ndụ ya niile. Olee ihe mere ka obi sie ya ike otú ahụ?

13. Gịnị mere obi ji sie Devid ike na Jehova na-elekọta ya?

13 “E nweghị ihe ga-akọ m.” Devid ma na e nweghị ihe kọrọ ya n’ihi na Jehova na-enye ya ihe niile dị ya mkpa mgbe niile. Ọ ma na Jehova bụ enyi ya nakwa na ihe ya dị Jehova mma. Ọ bụ ya mere obi ji sie ya ike na n’agbanyeghị ihe ọ bụla ga-eme n’ọdịnihu, Jehova ga na-egboro ya mkpa ya niile. Ebe ọ bụ na obi siri Devid ike na Jehova hụrụ ya n’anya nakwa na ọ ga-elekọta ya, o nyeere ya aka ka ọ ghara ịna-echegbu onwe ya, kama ka ọ na-enwe obi ụtọ, ihe o nwere ana-ejukwa ya afọ.​—Ọma 16:11.

14. Olee otú Jehova nwere ike isi lekọta anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya?

14 Jehova na-elekọta anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, karịchaa, ma ọ bụrụ na ihe ọjọọ emee ná ndụ anyị. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Claire. a O jeela ozi na Betel ihe karịrị afọ iri abụọ. Ọtụtụ nsogbu dakwasịrị ndị ezinụlọ ya. Ọ maghịkwa otú o nwere ike isi nyere ha aka. Papa ya rịara strok, a chụọ otu nwanne ya nwaanyị n’ọgbakọ. Ndị ezinụlọ ha nwekwara nsogbu ego, a narakwa ha ụlọ ha. Olee otú Jehova si gosi ha na ọ hụrụ ha n’anya ma na-elekọta ha? Nwanna Nwaanyị Claire sịrị: “Jehova nyere ndị ezinụlọ m ihe dị ha mkpa n’ụbọchị ọ bụla. Ọtụtụ ugboro kwa, Jehova nyere anyị karịa ihe anyị nwere ike ichetụdị n’echiche. M na-echekarị gbasara oge ndị Jehova gosiri na ọ hụrụ m n’anya. M jikwa oge ndị ahụ kpọrọ ihe. Ihe ndị a m na-echeta enyerela m aka ịghara ịda mbà ma nsogbu bịara m.”

15. Gịnị mere Devid ji nweta ume? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

15 “Ọ na-eme ka m nweta ume.” Mgbe ụfọdụ, ike na-agwụ Devid n’ihi nsogbu na ọnwụnwa ndị na-abịara ya. (Ọma 18:4-6) N’agbanyeghị ya, otú Jehova si hụ ya n’anya ma na-elekọta ya mere ka o nweta ume. Jehova du enyi ya a ike gwụrụ gaa “n’ebe ahịhịa ndụ juru” nakwa “n’ebe a na-ezu ike nke dị n’akụkụ mmiri.” Ihe a mere ka Devid nwetaghachi ike, meekwa ka o jiri ọṅụ fere Jehova na-aga.​—Ọma 18:28-32.

Otú Jehova si hụ Devid n’anya ma na-elekọta ya mere ka o nweta ume, ma n’oge ọ nọ na-agba ọsọ ndụ ( A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)


16. Olee otú ịhụnanya Jehova si mee ka i nweta ume?

16 Taakwa, “ọ bụ ịhụnanya Jehova mere na anyị anwụchabeghị” mgbe ọnwụnwa na ihe isi ike na-abịara anyị. (Ákwá 3:22; Kọl. 1:11) Ka anyị legodị akụkọ Nwanna Nwaanyị Rachel. Obi gbawara ya mgbe di ya hapụrụ ma ya ma Jehova n’oge ọrịa koronavaịrọs. Gịnị ka Jehova meere ya? Ọ sịrị: “Jehova mere ka m mata na ọ hụrụ m n’anya. O mere ka ndị enyi m nọrọ m nso, mụ na ha ana-anọrịkwa. Ha buteere m nri, zitere m ozi na amaokwu Baịbụl na-agba ume. Ha mụmụụrụ m ọnụ ọchị, na-echetakwara m na Jehova na-elekọta m. M na-ekele Jehova mgbe niile maka inye m ezinụlọ buru ibu nke hụrụ m n’anya.”

17. Gịnị mere Devid atụghị “egwu na ihe ọ bụla ga-eme” ya?

17 “Agaghị m atụ egwu na ihe ọ bụla ga-eme m, n’ihi na ị nọnyeere m.” E nwere ọtụtụ mgbe a chọrọ igbu Devid. O nwekwara ọtụtụ ndị iro siri ike. Ma, otú Jehova si hụ ya n’anya mere ka obi ruo ya ala, obi esiekwa ya ike na aka agaghị akpara ya. Devid chọpụtara na Jehova nọnyeere ya n’ọnọdụ ọ bụla ọ nọ na ya. Ihe a mekwara ka obi sie ya ike. Ọ bụ ya mere o ji bụọ abụ, sị: “[Jehova] napụtara m n’ihe niile na-emenye m ụjọ.” (Ọma 34:4) Ọ bụ eziokwu na e nwere oge ndị ezigbo ụjọ ji Devid, ma ọ kwụsịrị ịtụ ụjọ n’ihi na ọ ma na Jehova hụrụ ya n’anya.

18. Olee otú otú Jehova si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya nwere ike isi mee ka obi sie gị ike ma ụjọ tụwa gị?

18 Olee otú ịmara na Jehova hụrụ anyị n’anya si eme ka anyị nwee ike mgbe ụjọ na-atụ anyị? E nwere otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Susi. Ọ kọwara otú obi dị ya na di ya mgbe nwa ha nwoke gburu onwe ya. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ihe ike emee mmadụ na mberede, ọ na-akpa onye ahụ ezigbo aka, meekwa ka ụjọ na-atụ ya. Ma, otú Jehova si hụ anyị n’anya mere ka obi ruo anyị ala, obi esiekwa anyị ike na ọ ga-echebe anyị.” Nwanna Nwaanyị Rachel anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Otu abalị, obi gbawara m. M nọkwa na-echegbu onwe m, ụjọ ana-atụ m. M bere ákwá rịọ Jehova ka o nyere m aka. Ozugbo ahụ, m chọpụtara na Jehova mere ka obi ruo m ala otú ahụ nne na-emere nwa ya, ụra eburu m. Agaghị m echefu oge ahụ.” Otu okenye aha ya bụ Tasos nọrọ n’ụlọ mkpọrọ afọ anọ n’ihi na ọ jụrụ ịga agha. Olee otú o si chọpụta na Jehova hụrụ ya n’anya ma na-elekọta ya? Ọ sịrị: “Jehova gbooro m mkpa m niile, meekwara m ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ihe a mere ka obi sie m ike na m ga-atụkwasịli ya obi kpamkpam. Jehova jikwa mmụọ nsọ ya mee ka m na-enwe obi ụtọ, n’agbanyeghị na ụlọ mkpọrọ bụ ebe ike ụwa na-agwụkarị ndị mmadụ. Ihe a mere ka obi sie m ike na ọ bụrụ na mụ anọrọkwuo ya nso, ọ ga-eme ka ịdị mma ya na-abakwuru m uru. N’ihi ya, m ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile n’ụlọ mkpọrọ.”

BỊARUO CHINEKE GỊ HỤRỤ GỊ N’ANYA NSO

19. (a) Olee otú anyị ga-esi ekpe ekpere ma anyị mara na Jehova hụrụ anyị n’anya? (b) Olee ihe a kọwara gbasara ịhụnanya Jehova nke kacha metụ gị n’obi? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Okwu Ndị Na-eme Ka Anyị Ghọta na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya Nke Ukwuu.”)

19 Akụkọ ndị anyị lebarala anya gosiri na Jehova, bụ́ ‘Chineke hụrụ anyị n’anya,’ nọnyeere anyị. (2 Kọr. 13:11) Ihe gbasara onye nke ọ bụla n’ime anyị na-emetụ ya n’obi. Obi siri anyị ike na “ịhụnanya Jehova na-echebe” anyị. (Ọma 32:10) Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharịkwu uche n’otú Jehova si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya, ọ ga-eme ka anyị na-achọpụtakwu na ọ na-elekọta anyị, meekwa ka anyị na-abịarukwu ya nso. Ọ ga-eme ka ọ dịkwara anyị mfe ikpe ekpere gwa ya otú ịhụnanya ya dịruru anyị mkpa. Anyị nwere ike ịkọrọ ya ihe niile na-echegbu anyị, obi esie anyị ike na ọ na-aghọta anyị, nakwa na ọ chọsiri ike inyere anyị aka.​—Ọma 145:18, 19.

20. Olee otú ịhụnanya Jehova si eme ka anyị bịarukwuo ya nso?

20 Ọ bụrụ na oyi ana-atụ, ọ na-amasị anyị ịga ebe a kwanyere ọkụ. Otú ahụ ka ịhụnanya Jehova si amasịkwa anyị. Ọ bụ eziokwu na ịhụnanya Jehova na-akpa ezigbo ike, ọ na-emekwa ka obi ruo anyị ala. N’ihi ya, ka obi na-adị gị ụtọ maka na Jehova hụrụ gị n’anya. Ka anyị niile gosikwa na anyị hụrụ Jehova n’anya ma kwuo, sị: “M hụrụ Jehova n’anya.”​—Ọma 116:1.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee otú ị ga-esi akọwa ịhụnanya Jehova?

  • Gịnị mere obi kwesịrị iji sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya nke ukwuu?

  • Olee otú obi dị gị maka na Jehova hụrụ gị n’anya?

ABỤ NKE 108 Ịhụnanya Chineke

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.