IHE I NWERE IKE ỊMỤ
Ihe I Nwere Ike Ịmụ
Ọ bụghị naanị mgbe anyị gara ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbakọ ka anyị na-efe Jehova. Kama, anyị nwere ike ife Jehova n’onwe anyị ma ọ bụkwanụ n’ezinụlọ anyị. Lee ihe ụfọdụ unu nwere ike ịmụ n’ofufe ezinụlọ ma ọ bụkwanụ ma ị mụwa ihe n’onwe gị.
-
Kwadebenụ maka ọmụmụ ihe. Unu nwekwara ike ịmụ abụ ndị a ga-abụ n’ọmụmụ ihe, nyekwara onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu aka ịkwadebe ajụjụ ọ ga-aza.
-
Gụọnụ otu akụkọ Baịbụl. Unu gụchaa, unu esee ihe ndị mere n’akụkọ ahụ ma ọ bụkwanụ unu edee ihe ndị unu mụtara na ya.
-
Mụọnụ otu ekpere dị na Baịbụl, unu ekwurịtazie otú o nwere ike isi nyere unu aka ime ka ekpere unu ka mma.
-
Leenụ otu vidio si na jw.org, unu ekwurịta ya ma ọ bụkwanụ unu edee ihe unu mụtara na ya.
-
Kwadebenụ maka ozi ọma. Unu nwere ike ịmụgharị otú unu ga-esi ezi mmadụ ozi ọma.
-
Unu nwere ike ileru ihe ndị Chineke kere eke anya ma tụgharịa uche na ha ma ọ bụkwanụ unu ekwurịta ihe ha na-akụziri unu gbasara Jehova. a
a Gụọ isiokwu bụ́ “Si n’Ihe Ndị Jehova Kere Mụtakwuo Gbasara Ya.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Mach 2023.