ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 3
ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya
Jehova Ga-enyere Gị Aka n’Oge Ihe Siiri Gị Ike
“[Jehova] ga-eme . . . ka unu kwụrụ chịm.”—1 PITA 5:10.
IHE A GA-AMỤ
Ihe anyị ga-eme ka Jehova nwee ike inyere anyị aka n’oge ihe siiri anyị ike.
1-2. Olee nsogbu ụfọdụ nwere ike ịbịara ezigbo ndị na-efe Jehova?
ỌDACHI nwere ike ịgbanwe ndụ anyị na mberede. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna ji obi ya niile na-efe Jehova. Aha ya bụ Luis. a A chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa kansa. Dọkịta ya gwara ya na ọ fọrọ naanị ọnwa ole na ole ka ọ nwụọ. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Monika na di ya na-arụsi ọrụ Jehova ike mgbe niile. Otu ụbọchị, Nwanna Nwaanyị Monika chọpụtara na di ya na-eme ihe ọjọọ na nzuzo kemgbe ọtụtụ afọ. Otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di aha ya bụ Olivia gbapụrụ n’ụlọ ya n’ihi na oké ifufe ga-amalite ibibi ihe n’ebe ha bi n’oge na-adịghị anya. Mgbe o mechara lọghachi, ọ chọpụtara na oké ifufe ahụ alaala ụlọ ya n’iyi. Ndụ ndị a niile anyị kwuru okwu ha gbanwere n’otu ntabi anya. Ụdị ihe mere ha ò metụla gị? È nwetụla ihe mere ka ndụ gị gbanwee?
2 Ọ bụ eziokwu na anyị na-efe Jehova, anyị na-enwekwa nsogbu ma na-arịa ọrịa otú ọ na-adị ndị ọzọ. Ndị kpọrọ ndị Chineke asị nwekwara ike ịna-emegide anyị. Ọ bụ eziokwu na Jehova anaghị ewepụrụ anyị ụdị nsogbu ndị a, ma o kwere nkwa na ọ ga-enyere anyị aka. (Aịza. 41:10) O nwere ike inyere anyị aka anyị ana-enwe ọṅụ, na-eme mkpebi dị mma ma na-efe ya ọ bụrụgodị na nsogbu siri ezigbo ike abịara anyị. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ anọ Jehova si enyere anyị aka ma ihe ndị dị ezigbo njọ mee ná ndụ anyị. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe anyị kwesịrị ime ka otú a o si enyere anyị aka baara anyị uru.
JEHOVA GA-ECHEBE GỊ
3. Ọdachi bịara anyị, olee ihe nwere ike isiri anyị ike omume?
3 Ihe mere o ji esiri anyị ike. Ọ bụrụ na ezigbo ihe ọjọọ emee anyị, o nwere ike isiri anyị ike iche echiche nke ọma na ime ezigbo mkpebi. Maka gịnị? Ọ bụ maka na obi nwere ike ịna-ajọ anyị ezigbo njọ. Anyị nwekwara ike ịna-echegbu onwe anyị. O nwere ike ịdị anyị ka ebe anyị na-aga n’ebe gbara ọchịchịrị n’amaghị ebe anyị ga-etinye isi. Legodị otú ọ dị ụmụnna nwaanyị abụọ ahụ anyị kwuru okwu ha mgbe ọnwụnwa bịaara ha. Nwanna Nwaanyị Olivia sịrị: “Mgbe oké ifufe ahụ mebichara ụlọ m, amaghị m ihe m ga-eme eme.” Nwanna Nwaanyị Monika kwuru gbasara ihe ọjọọ ahụ di ya mere, sị: “Ihe ahụ di m mere mechuru m ihu. Ọ dị m ka mmadụ ọ̀ mara m mma. Ọ na-esiziri m ike ime ihe ndị m na-emebu nke ọma. E nwetụbeghị mgbe m chere n’echiche na ụdị ihe ahụ ga-eme m.” Olee otú Jehova kwuru ọ ga-esi enyere anyị aka mgbe anyị na-amaghị ihe anyị ga-eme eme?
4. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 4:6, 7, gịnị ka Jehova kwere nkwa imere anyị?
4 Ihe Jehova na-emere anyị. Jehova kwere nkwa inye anyị ihe Baịbụl kpọrọ “udo Chineke na-enye.” (Gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7.) Ụdị udo a na-ekwu okwu ya ebe a bụ otú obi si eru anyị ala ma anyị na Chineke dịrị n’ezigbo mma. Udo a “karịrị nghọta mmadụ.” Ọ na-akpa ezigbo ike karịa otú anyị nwere ike iche n’echiche. È nwetụla mgbe obi ruru gị ala otú ị na-atụghị anya ya mgbe i kpesiri ekpere ike? Ọ bụ ya bụ “udo Chineke na-enye.”
5. Olee otú udo Chineke na-enye si eche obi anyị na echiche anyị nche?
5 Ndị Filipaị 4:7 kwukwara na udo Chineke na-enye ‘ga-eche obi anyị na echiche anyị nche.’ Okwu Grik e si sụgharịta “iche nche” bụ okwu ndị agha. A na-ejikarị ya akọwa otú ndị agha na-esi eche obodo nche ka aka ndị iro ghara ịkpara ya. Ọ bụrụ na ndị agha ana-eche obodo nche, obi na-eru ndị nọ na ya ala mgbe ha na-ehi ụra n’ihi na ha ma na e nwere ndị agha na-echebe ha. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa ma udo Chineke na-enye na-eche obi anyị na echiche anyị nche. Obi na-eru anyị ala n’ihi na anyị ma na e nweghị ihe ga-eme anyị. (Ọma 4:8) Dị ka anyị hụrụ n’ihe mere Hana, ọ bụrụgodị na ọnọdụ anyị agbanweghị ozugbo, obi ka nwere ike iru anyị ala. (1 Sam. 1:16-18) Ọ bụrụ na obi eruo anyị ala, ọ na-emekarị ka ọ dịrị anyị mfe iche echiche nke ọma ma mee mkpebi dị mma.
6. Gịnị ka anyị ga-eme ka udo Chineke na-enye nwee ike ịbara anyị uru? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
6 Ihe anyị kwesịrị ime. Ọ bụrụ na obi ekoro gị n’elu, rịọ Jehova ka o nyere gị aka otú ahụ ndị bi n’obodo si akpọ ndị nche ka ha bịa chebe ha. Olee otú ị ga-esi eme ya? Na-ekpe ekpere ruo mgbe Jehova mere ka obi ruo gị ala. (Luk 11:9; 1 Tesa. 5:17) Nwanna Luis anyị kwuburu okwu ya kọwara otú ya na nwunye ya Ana si tachie obi mgbe ha matara na ọ fọrọ naanị ọnwa ole na ole ka ọ nwụọ. Ọ sịrị: “N’ụdị oge a, ọ na-esi ezigbo ike mmadụ ikpebi ihe gbasara otú a ga-esi gwọọ ya na ihe ndị ọzọ. Ma, ekpere enyerela anyị aka na-enweghị atụ, mee ka obi ruo anyị ala n’oge ndị a.” Nwanna Luis na nwunye ya kwuru na ha kpesiri ekpere ike ọtụtụ ugboro rịọ Jehova ka o mee ka obi ruo ha ala, meekwa ka ha nwee amamihe ha ga-eji mee mkpebi dị mma. Ha chọpụtakwara na o nyeere ha aka. Ọ bụrụ na nsogbu abịara gị, akwụsịla ikpe ekpere. Ị ga-ahụ otú udo Chineke na-enye ga-esi eche obi gị na echiche gị nche.—Rom 12:12.
JEHOVA GA-EME KA Ị KWỤRỤ CHỊM
7. Olee otú obi nwere ike ịdị anyị ma nsogbu siri ike bịara anyị?
7 Ihe mere o ji esiri anyị ike. Nsogbu bịaara anyị nwere ike ime ka obi ghara ịna-adị anyị otú ọ na-adịbu anyị, anyị agharakwa ịna-eche echiche nke ọma ma ọ bụ na-eme ihe anyị kwesịrị ime. Otú ahụ ebili mmiri na-esi ebugharị ụgbọ mmiri n’ekweghị ya zuru ike ka nsogbu nwere ike ime ka obi ghara ịna-ezu anyị ike. O nwere ike iwe wetụ anyị, anyị atatụ onwe anyị ma ọ bụ ndị ọzọ ụta. Nwanna Nwaanyị Ana anyị kwuburu okwu ya kwuru na otú obi dị ya na-agbanwekarị ugboro ugboro mgbe di ya bụ́ Luis nwụchara. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ike ụwa na-agwụ m, mụ amalitekwa imetara onwe m ebere. Iwe nwekwara ike na-ewe m maka na di m anọghịzi ya.” E nwere oge ndị ọzọ ọ na-adị ya ka o nweghị mmadụ, obi ana-agbawakwa ya n’ihi na ọ ga-eme mkpebi n’ihe ndị na-anaghị esiri di ya ike ikpebi ihe a ga-eme na ha. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ya ka onye nọ n’osimiri ebili mmiri na-eme. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ma ọ dị anyị otú ahụ?
8. Dị ka e kwuru na 1 Pita 5:10, gịnị ka Jehova na-emesi anyị obi ike banyere ya?
8 Ihe Jehova na-emere anyị. Jehova kwere nkwa na ọ ga-eme ka anyị kwụrụ chịm. (Gụọ 1 Pita 5:10.) Ọ bụrụ na oké ifufe ana-efe n’osimiri, o nwere ike ịna-ebugharị ụgbọ mmiri si n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ. Iji mee ka ụgbọ mmiri ahụ ghara ikpu, e nwere ihe ndị a na-etinye n’akụkụ ya abụọ ka o nyere ya aka ịkwụrụ chịm. Ihe ndị ahụ nwere ike inyere ụgbọ mmiri aka ka oké ifufe ghara ịna-ebugharị ya, meekwa ka ahụ́ ruo ndị nọ na ya ala. Ma, ihe ndị ahụ a na-etinye n’ụgbọ mmiri ka oké ifufe ghara ịna-ebugharị ya na-arụ ọrụ nke ọma mgbe ụgbọ mmiri ahụ na-agba agba. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ọ bụrụ na anyị anọsie ike n’ofufe Jehova mgbe ihe siiri anyị ike, Jehova ga-eme ka anyị kwụrụ chịm.
9. Olee otú ihe ndị anyị ji eme nchọnchọ si enyere anyị aka ịkwụrụ chịm? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
9 Ihe anyị kwesịrị ime. Ọ bụrụ na nsogbu bịaara gị emee ka obi na-ajọ gị njọ, gbalịa ike gị niile ka ị na-ekpe ekpere, na-aga ọmụmụ ihe, ma na-ekwusasi ozi ọma ike. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike ị gaghị na-eme otú ị na-emebu. Ma, cheta na Jehova ga-aghọta otú ihe si dịrị gị. (I nwere ike ịtụle Luk 21:1-4.) Wepụtakwa oge ị ga-eji na-amụ ihe n’onwe gị ma na-atụgharị uche. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova na-esi n’aka nzukọ ya enye anyị ọtụtụ ihe si na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịkwụrụ chịm. I nwere ike iji ihe ndị e ji eme nchọnchọ chọpụta ihe ndị ga-enyere gị aka, ihe ndị dị ka JW Library® na Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ. Nwanna Nwaanyị Monika anyị kwuburu okwu ya kwuru na o mere nchọnchọ ka ọ mata ihe ndị ga-enyere ya aka mgbe obi malitere ịjọ ya njọ. Dị ka ihe atụ, o mere nchọnchọ n’okwu bụ́ “iwe.” N’oge ndị ọzọ, o mere nchọnchọ n’okwu bụ́ “ịgharịpụ mmadụ” ma ọ bụ “ikwesị ntụkwasị obi.” Ọ na-agụzi ihe ndị e kwuru n’isiokwu ndị ọ chọtara ruo mgbe obi dịtụrụ ya mma. Ọ sịrị: “Mgbe m na-ebido ime nchọnchọ, m na-echegbu onwe m nke ukwuu. Ma, ka m na-agụ ihe ndị m na-achọta, m bịara na-ahụ na Jehova si n’ihe m na-agụta na-amakụ m. Ka m na-agụ ya ka m na-achọpụta na Jehova na-aghọta otú niile obi na-adị m. Ọ na-enyekwara m aka.” Otú a Jehova si enyere anyị aka nwekwara ike ime ka ị kwụrụ chịm ruo mgbe obi ruru gị ala.—Ọma 119:143, 144.
JEHOVA GA-AKWADO GỊ
10. Olee otú o nwere ike ịdị anyị ma ihe na-agbawa obi mee anyị?
10 Ihe mere o ji esiri anyị ike. Ọ bụrụ na ihe na-agbawa obi emee anyị, e nwere ike inwe ụbọchị ndị ike ga na-agwụ anyị, obi agaghịkwa adị anyị mma. O nwere ike ịdị anyị otú ọ na-adị onye na-agbabu ezigbo ọsọ merụrụ ahụ́ ma na-etezi ụkwụ. O nwekwara ike ịna-esiri anyị ike ime ihe ndị na-adịburu anyị mfe omume ma ọ bụkwanụ ihe ndị na-atọbu anyị ụtọ agaghịzi na-agụcha anyị agụụ. Dịkwa ka Ịlaịja, o nwere ike isiri anyị ike ibili, naanị ihe ga na-agụ anyị abụrụ idina ala hiwe ụra. (1 Eze 19:5-7) Gịnị ka Jehova kwere nkwa imere anyị mgbe ike gwụrụ anyị?
11. Olee ụzọ ọzọ Jehova si enyere anyị aka? (Abụ Ọma 94:18)
11 Ihe Jehova na-emere anyị. Jehova kwere nkwa ịkwado anyị. (Gụọ Abụ Ọma 94:18.) E kwesịrị inyere onye na-agba ọsọ merụrụ ahụ́ aka ka o nwee ike ịna-agagharị. Otú ahụ ka o nwekwara ike ịdị mkpa ka e nyere anyị aka ịna-emechi ihe ndị gbasara ofufe Jehova anya. N’ụdị oge ahụ, Jehova na-agwa anyị, sị: “Mụnwa, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m na-asị gị, ‘Atụla egwu. M ga-enyere gị aka.’” (Aịza. 41:13) Eze Devid nwetara ụdị enyemaka a. Mgbe ọtụtụ nsogbu bịaara ya, ndị iro ana-emegidekwa ya, ọ sịrị Jehova: “Aka gị siri ike na-akwado m.” (Ọma 18:35) Oleekwanụ otú Jehova si akwado anyị?
12. Olee ndị Jehova nwere ike iji nyere anyị aka ma ike gwụ anyị?
12 Otú Jehova na-esikarị akwado anyị bụ imetụ ndị ọzọ aka n’obi ka ha nyere anyị aka. Dị ka ihe atụ, n’otu oge ike gwụrụ Devid, enyi ya bụ́ Jonatan bịara leta ya ma gbaa ya ume. (1 Sam. 23:16, 17) Jehova họkwaara Ịlaịsha ka o nyere Ịlaịja aka. (1 Eze 19:16, 21; 2 Eze 2:2) Taa, Jehova nwere ike iji ndị ezinụlọ anyị, ndị enyi anyị, ma ọ bụ ndị okenye nyere anyị aka. Ma, ọ bụrụ na obi adịghị anyị mma, o nwere ike ịdị anyị ka ndị ọzọ hapụtụ anyị aka ka anyị nọọrọ onwe anyị. O nweghị ihe o mere ma ọ bụrụ na ọ dị anyị otú ahụ. Gịnị ka anyị ga-eme ka Jehova kwado anyị?
13. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka otú Jehova si akwado anyị baara anyị uru? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
13 Ihe anyị kwesịrị ime. Gbasie mbọ ike ka ị ghara ịna-anọrọ onwe gị. Ọ bụrụ na anyị ana-anọrọ onwe anyị, o nwere ike ime ka anyị chewe naanị gbasara onwe anyị nakwa nsogbu ndị bịaara anyị. Iche ụdị ihe ahụ nwere ike ime ka anyị mee mkpebi na-adịghị mma. (Ilu 18:1) N’eziokwu, e nwere oge ụfọdụ anyị kwesịrị ịnọrọ onwe anyị, karịchaa ma ezigbo nsogbu bịara anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị na-anọrọ onwe anyị mgbe niile, o nwere ike ime ka anyị ghara ịnabata ụzọ ndị Jehova si na-akwado anyị. N’ihi ya, ọ bụrụ na nsogbu abịara gị, gbalịsie ike ka ị nabata aka ndị ezinụlọ gị, ndị enyi gị, na ndị okenye ga-enyere gị n’agbanyeghị na o nwere ike ọ gaghị adịchara gị mfe. Lee ha anya ka otú Jehova si na-akwado gị.—Ilu 17:17; Aịza. 32:1, 2.
JEHOVA GA-AKASI GỊ OBI
14. Olee ihe ndị nwere ike ime ka ụjọ tụwa anyị?
14 Ihe mere o ji esiri anyị ike. E nwere oge ndị ụjọ nwere ike ịtụwa anyị. Na Baịbụl, e nwere ndị ohu Jehova kwuru banyere oge ndị obi na-adịghị ha mma, ụjọ ana-atụkwa ha n’ihi ndị iro ha ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ. (Ọma 18:4; 55:1, 5) Taakwa, e nwere ike ịna-emegide anyị n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ọrụ, n’ezinụlọ anyị, ma ọ bụkwanụ ndị ọchịchị ana-akpagbu anyị. Anyị nwekwara ike ịtụ ụjọ na anyị ga-anwụ n’ihi ọrịa na-arịa anyị. O nwere ike ịdị anyị ka e nweghị onye ga-enyeliri anyị aka otú ahụ ọ na-adị ụmụaka. Olee otú Jehova si enyere anyị aka n’ụdị oge ndị a?
15. Gịnị ka Abụ Ọma 94:19 kwuru Jehova ga-emere anyị?
15 Ihe Jehova na-emere anyị. Jehova na-akasi anyị obi, na-emekwa ka ahụ́ ruo anyị ala. (Gụọ Abụ Ọma 94:19.) Ihe e kwuru n’abụ ọma a nwere ike ime ka anyị chee gbasara nwatakịrị ụjọ na-atụ n’abalị, nke mere ka ọ ghara ihi ụra n’ihi égbè eluigwe na-agba, nna ya abịa kuru ya, gụgụọkwa ya ruo mgbe ụra buuru ya. Ọ bụ eziokwu na égbè eluigwe ahụ ka na-agba, otú ahụ papa ya si kuru ya mere ka obi ruo ya ala. Ọ bụrụ na nsogbu na-emenye ụjọ abịara anyị, o nwere ike ịdị mkpa ka Nna anyị nke eluigwe kuru anyị ruo mgbe obi ga-eru anyị ala. Gịnị ka anyị ga-eme ka Jehova kasie anyị obi otú ahụ?
16. Gịnị ka anyị ga-eme ka otú Jehova si akasi anyị obi baara anyị uru? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
16 Ihe anyị kwesịrị ime. Na-ekpe ekpere mgbe niile. Na-agụkwa Okwu Chineke. (Ọma 77:1, 12-14) Ọ bụrụ na nsogbu abịara gị, ihe mbụ ga-abata gị n’obi nwere ike ịbụ ikpe ekpere kọọrọ Nna gị nke eluigwe ihe na-echegbu gị. Gwa Jehova ihe na-atụ gị ụjọ na ihe na-echegbu gị. Na-agụ Akwụkwọ Nsọ ma gee Chineke ntị. Ị ga-ahụ otú ọ ga-esi kasie gị obi. (Ọma 119:28) I nwere ike ịchọta ebe ụfọdụ na Baịbụl nwere ike ịkasi gị ezigbo obi ma ụjọ tụwa gị. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Job, Abụ Ọma, na Ilu nakwa ihe Jizọs kwuru na Matiu isi 6 nwere ike ịgba gị ume. Jehova ga-akasi gị obi ma ị na-ekpe ekpere ma na-agụ Okwu ya.
17. Olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya?
17 Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-anọnyere anyị ma nsogbu tara akpụ bịara anyị. Ọ gaghị ahapụ anyị. (Ọma 23:4; 94:14) Jehova kwere nkwa ichebe anyị, ime ka anyị kwụrụ chịm, ịkwado anyị, na ịkasi anyị obi. Aịzaya 26:3 kwuru banyere Jehova, sị: “Ị ga-echebe ndị ji obi ha niile tụkwasị gị obi. Ị ga-eme ka ha na-ebi n’udo mgbe niile, n’ihi na ọ bụ gị ka ha tụkwasịrị obi.” N’ihi ya, tụkwasị Jehova obi, meekwa ihe niile i nwere ike ime ka otú o si enyere anyị aka baara gị uru. I mee ya, ị ga-enweta ike ma mgbe ihe siiri gị ike.
GỊNỊ KA Ị GA-AZA?
-
Olee mgbe o nwere ike ịkacha dịrị anyị mkpa ka Jehova nyere anyị aka?
-
Olee ụzọ anọ Jehova si enyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị?
-
Gịnị ka anyị nwere ike ime ka otú Jehova si enyere anyị aka baara anyị uru?
ABỤ NKE 12 Jehova Chineke Dị Ukwuu
a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.