Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Otú Ndị Bụ́bu Ndị Sista Si Ghọọ Ezigbo Ụmụnna Nwaanyị

Otú Ndị Bụ́bu Ndị Sista Si Ghọọ Ezigbo Ụmụnna Nwaanyị

ỌTỤTỤ afọ gara aga, nwanne m nwaanyị nke m tọrọ aha ya bụ Araceli were iwe, jiri olu ike sị m: “Agwazila m okwu. Achọghị m ịnụ ihe ọ bụla gbasara okpukpe gị ọzọ. Ọ na-agbakasị m ahụ́. Achọghịzi m iji anya ahụ gị.” Ihe a o kwuru wutere m nke ukwuu. Adị m afọ iri itoolu na otu ugbu a. Ma, m ka na-echeta ihe ndị ahụ o kwuru. Ma, dị́ ka Ekliziastis 7:8 kwuru, “Njedebe okwu dị mma karịa mmalite ya.”—Felisa.

Felisa: Etoro m na Spen, n’ezinụlọ na-abaghị ọgaranya. Anyị bụ ndị Katọlik. Anyị anaghịkwa eji ịga chọọchị egwu egwu. Mmadụ iri na atọ bụ́ ndị ikwu anyị bụ ndị fada, ndị sista, ma ọ bụ na-arụ ihe ndị ọzọ na chọọchị Katọlik. Nwa nwanne mama m bụ fada na onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik. Mgbe ọ nwụrụ, Poopu John Paul nke Abụọ kwanyeere ya ùgwù ma kwuo na ọ bụzi onye sentị. Papa m na-eji ígwè akpụ ihe, mama m ana-arụ ọrụ ugbo. Ọ bụ m bụ nke mbụ n’ime ụmụ asatọ ha mụrụ.

Mgbe m dị afọ iri na abụọ, a malitere ịlụ agha na Spen. Mgbe agha ahụ biri, a tụrụ papa m mkpọrọ maka na ihe ọ na-ekwu gbasara ọchịchị na-ewe ndị ọchịchị iwe. O siiri mama m ike inweta nri ga na-ezuru anyị niile. N’ihi ya, ọ kpọọrọ ụmụnne m ntakịrị atọ bụ́ Araceli, Lauri, na Ramoni kpọga n’obodo Bilbao ka ha soro ndị sista biri. Ha ga na-eriju afọ ebe ahụ.

Araceli: M dị afọ iri na anọ mgbe ahụ, Lauri adịrị afọ iri na abụọ, Ramoni adịrị afọ iri. Ọ nọ na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ ndị ezinụlọ anyị. Ihe anyị nọ na-arụ ebe ahụ bụ ihichasị ebe niile. Mgbe afọ abụọ gachara, ndị sista ahụ zigara anyị ná nnukwu ebe ndị sista na-ebi, nke dị́ na Zaragoza. A na-elekọta ndị agadi n’ebe ahụ. Anyị rụsiri ọrụ ike n’ihichasị usekwu dị́ ebe ahụ, o mekwara ka ike na-agwụ anyị.

Felisa: Mgbe e zigara ụmụnne m n’ebe ndị sista na-ebi, nke dị́ na Zaragoza, mama m na nwanne ya nwoke, bụ́ fada na chọọchị anyị, kpebiri na ha ga-akpọgakwa m ebe ahụ. Ihe mere ha ji chọọ ịkpọga m ebe ahụ bụ ka otu nwa okorobịa nwere mmasị n’ebe m nọ ghara ịna-ahụ m. M nọ na-atụsi anya ike ịga biri ebe ahụ n’ihi na m hụrụ Chineke n’anya. M na-aga chọọchị ụbọchị niile, m chọkwara ịbụ onye sista a ga-eziga mba ọzọ otú e zigara nwa nwanne mama m n’Afrịka.

Aka ekpe: Ebe ndị sista na-ebi na Zaragoza, dị́ na Spen; aka nri: Baịbụl Nácar-Colunga

Ma mgbe m gara bitụ n’ebe ndị sista na-ebi, m chọpụtara na agaghị m emeli ọtụtụ n’ime ihe m chọrọ ime. Ndị sista nọ́ ebe ahụ agbaghị m ume ka m gaa mba ọzọ jewere Chineke ozi otú m tụburu anya ya. N’ihi ya, mgbe otu afọ gachara, m laghachiri n’ụlọ anyị ka m nwee ike lekọtawa nwanne mama m ahụ bụ́ fada. M nọ na-arụrụ ya ọrụ n’ụlọ, anyị na-ejikwa chaplet ekpekọ ekpere ọnụ ná mgbede ọ bụla. Ọ na-amasịkwa m ịna-ahazi okooko osisi ndị dị́ na chọọchị anyị na ịna-achọ Meri na ndị “sentị” a kpụrụ akpụ mma.

Araceli: Mgbe m nọ na Zaragoza, m ṅụrụ iyi nke mbụ mmadụ na-aṅụ tupu ya aghọọ onye sista. Ndị sista ahụ kpebiri na anyị bụ́ ụmụnne agaghịzi anọ n’otu ebe. N’ihi ya, ha zigara m ebe ọzọ ndị sista na-ebi, nke dị́ na Madrid, ziga Lauri na nke dị́ na Valenshia. A hapụrụ Ramoni ka ọ nọrọ na Zaragoza. Mgbe m nọ na Madrid, m ṅụrụ iyi nke abụọ mmadụ na-aṅụ tupu ya aghọọ onye sista. Ọtụtụ ndị na-abịakarị arahụ ebe ahụ, ma ụmụ akwụkwọ ma ndị agadi ma ndị ọzọ. N’ihi ya, ọrụ na-ezu anyị ahụ́. M na-arụ n’ụlọ ọgwụ dị́ ebe ahụ.

M nọ na-atụsi anya ike mgbe m ga-abụ onye sista. Echere m na anyị ga-ewepụta ezigbo oge na-agụ Baịbụl, na-amụkwa banyere ya. Ma, ahụghị m ihe m tụrụ anya ya. A naghị ekwute okwu Baịbụl. A naghịdị ekwu banyere Chineke ma ọ bụ Jizọs. M mụtatụrụ asụsụ Latịn, na-efe Meri, na-amụkwa banyere otú “ndị sentị” ndị Katọlik si bie ndụ. Ma, ọtụtụ mgbe, anyị na-arụ ụdị ọrụ siri ezigbo ike.

M malitere ịna-echegbu onwe m. Obi m nọ na-agwa m na m kwesịrị ịna-akpata ego m ga-eji na-enyere ndị ezinụlọ anyị aka kama ịnọ na-arụ ọrụ n’ebe ndị sista bi iji na-eme ka ndị ọzọ baa ọgaranya. N’ihi ya, m gwara onyeisi ndị sista otú obi dị m nakwa na m chọrọ ịla. Ma, ọ kpọchiri m n’otu ọnụ ụlọ dị́ n’ebe ahụ. O chere na ihe ahụ o mere m ga-eme ka m ghara ịla.

Ndị sista kpọpụtara m ebe ahụ. Ma, mgbe ha chọpụtara na m ka chọrọ ịla, ha kpọchiri m ọzọ. Ha kpọchiri m ugboro atọ, mechaa sị m na tupu ha ekweta ka m laa, na m ga-ede, sị: “Ihe mere m ji ala bụ na m chọrọ ife Setan kama ife Chineke.” Akpata oyi wụrụ m. M chọsiri ike ịla, ma ọ bụghị ya ga-eme ka m dee ụdị ihe ahụ. M mechara gwa ha na m chọrọ ịhụ fada. M gara kọọrọ ya ihe niile merenụ. Ọ natara bishọp ikike ka a kpọga m n’ebe ọzọ ndị sista na-ebi, nke dị́ na Zaragoza. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, a hapụrụ m ka m lawa. Obere oge, Lauri na Ramoni alawakwa.

AKWỤKWỌ MERE KA ANYỊ KEWAA

Felisa

Felisa: Ka oge na-aga, m lụrụ di, gaa biri n’obodo Kantabria, dị́ na Spain. M ka nọkwa na-agachi chọọchị anya. Otu ụbọchị Sọnde anyị nọ na chọọchị, fada anyị ji iwe tie mkpu, sị, “Ùnu hụrụ akwụkwọ a?” Ya egosi anyị akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. Ya asịzie, “Ọ bụrụ na e nweela onye nyere gị akwụkwọ a, wetara m ya ma ọ bụ gị atụfuo ya!”

Enweghị m akwụkwọ ahụ, ma m chọrọ inweta ya. Mgbe ụbọchị ole na ole gachara, ụmụ nwaanyị abụọ bụ́ Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ m, nye m akwụkwọ ahụ. Agụrụ m ya n’abalị ụbọchị ahụ. Ụmụ nwaanyị ahụ mechara bịaghachi jụọ m ma m̀ chọrọ ịmụ Baịbụl, mụ asị ha ee.

Akwụkwọ Ezi-Okwu Ahu

Kemgbe ụwa, m na-achọ ime ihe dị́ Chineke mma. M mụtara eziokwu banyere Jehova, malite ịhụ ya n’anya nke ukwuu. M chọrọ ịkọrọ onye ọ bụla banyere ya. E mere m baptizim n’afọ 1973. Mgbe ọ bụla o kwere omume, m gbara mbọ ịkọrọ ndị ezinụlọ anyị banyere eziokwu Baịbụl. Ma ndị ezinụlọ anyị, karịchaa nwanne m nwaanyị bụ́ Araceli, siri ọnwụ na ihe m kweere bụ ụgha.

Araceli: Ihe ọjọọ ndị e mere m n’ebe ahụ ndị sista na-ebi mere ka okpukpe m wewe m iwe. Ma, akwụsịghị m ịga chọọchị n’ụbọchị Sọnde. M na-ejikwa chaplet ekpe ekpere kwa ụbọchị. Ma m ka chọsiri ike ịghọta Baịbụl, na-arịọkwa Chineke ka o nyere m aka. Felisa gwara m ihe ndị ọ mụtara. Otú ihe o kweere si na-eme ya obi ụtọ mere ka m chee na ọ na-agbazi ya ara. Ekwetaghị m ihe ndị ọ na-ekwu.

Araceli

Mgbe afọ ole na ole gara, m laghachiri Madrid gaa rụwa ọrụ, mechaa lụọ di. Kemgbe ọtụtụ afọ, m chọpụtara na ndị na-agachi chọọchị anya anaghị eme ihe Jizọs kụziri. N’ihi ya, m kwụsịrị ịga chọọchị. Ekweghịzi m ná ndị sentị ma ọ bụ n’ọkụ ala mmụọ. Ekwetaghịkwa m na fada nwere ike ịgbaghara mmehie. M tụfudịrị ihe oyiyi niile m nwere. Amaghị m ma ihe m na-eme ọ̀ dị mma. Ike okpukpe gwụrụ m. Ma, m nọ na-arịọ Chineke, sị: “Achọrọ m ịmata gị. Nyere m aka.” M chetara na Ndịàmà Jehova akụọla aka n’ọnụ ụzọ m ọtụtụ ugboro, ma o nwebeghị mgbe m megheere ha ụzọ. Atụkwasịghị m okpukpe ọ bụla obi.

Nwanne m nwaanyị bụ́ Lauri bi na Frans mgbe ahụ, Ramoni ebiri na Spen. N’ihe dị́ ka afọ 1980, ha na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. M chere na e duhiela ha otú ahụ e si duhie Felisa. M mechara mata otu onye agbata obi m aha ya bụ Angelines, mụ na ya aghọọ ezigbo enyi. Yanwa bụkwa Onyeàmà Jehova. Ya na di ya jụrụ m ọtụtụ ugboro ma m̀ chọrọ ka mụ na ha mụwa Baịbụl. Ha chọpụtara na n’agbanyeghị na m kwuru na enweghịzi m mmasị n’ihe gbasara okpukpe, m chọrọ ịmata ihe Baịbụl kwuru. Ka oge na-aga, m sịrị ha: “Ngwanụ. M ga-ekweta ka mụ na unu mụwa ihe naanị ma unu kweta na m ga na-eji Baịbụl nke m.” M nwere Baịbụl a na-akpọ Nácar-Colunga.

OTÚ BAỊBỤL SI MEE KA ANYỊ DỊ N’OTU

Felisa: Mgbe e mere m baptizim n’afọ 1973, Ndịàmà Jehova nọ́ na Santanda, bụ́ isi obodo Kantabria, dị ihe dị́ ka iri asaa. Ebe anyị na-ekwusa ozi ọma buru ezigbo ibu. N’ihi ya, anyị na-eji ma bọs ma obere ụgbọala aga ezi ozi ọma n’ebe ahụ niile. Anyị na-esi n’otu obodo gaa n’ọzọ ruo mgbe anyị gachara ime obodo niile dị́ n’ebe ahụ.

Kemgbe ọtụtụ afọ, amụọlara m ọtụtụ ndị Baịbụl, mmadụ iri na otu n’ime ha emee baptizim. Ọtụtụ n’ime ndị m mụụrụ ihe bụ ndị Katọlik. M kwesịrị inwere ha ndidi. Otú ahụ ọ dịbu m ka ọ dị ha. Ọ ga-ewe oge tupu ha aghọta na ihe ha kweere abụghị eziokwu. M ma na ọ bụ naanị Baịbụl na mmụọ nsọ Jehova nwere ike inyere mmadụ aka ịgbanwe ihe o chere ma ghọta nke bụ́ eziokwu. (Ndị Hibru 4:12) Di m, bụ́ Bienvenido, bụbu onye uwe ojii. E mere ya baptizim n’afọ 1979. Mama m malitekwara ịmụ Baịbụl obere oge tupu ya anwụọ.

Araceli: Mgbe mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, atụkwasịghị m ha obi. Ma, ka oge na-aga, ọ dịghịzi m otú ahụ. Ọ bụghị naanị na Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu Baịbụl, kama ha na-eme ihe ha na-akụziri ndị mmadụ. Okwukwe m nwere na Jehova nakwa na Baịbụl sikwuru ike, obi ana-adịkwu m ụtọ. Ụfọdụ ndị agbata obi m chọpụtara mgbanwe a ma sị m, “Araceli, nọsie ike n’ụzọ a ị họọrọ.”

M na-echeta mgbe m kpere ekpere, sị, “Jehova, m na-ekele gị maka na ike m agwụghị gị nakwa maka otú i si mee ka m nwee ọtụtụ ohere ịchọta ihe m nọ na-achọ, ya bụ, eziokwu Baịbụl.” M rịọkwara nwanne m nwaanyị bụ́ Felisa ka ọ gbaghara m maka okwu ọjọọ niile m gwara ya. Mụ na ya anaghịzi ese okwu. Obi na-adịzi anyị ụtọ ikwurịta ihe gbasara Baịbụl. E mere m baptizim n’afọ 1989, mgbe m dị afọ iri isii na otu.

Felisa: Adị m afọ iri itoolu na otu ugbu a. Di m anwụọla, anaghịkwa m emeli ihe ụfọdụ m na-emebu. Ma, m ka na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-agakwa ọmụmụ ihe na ozi ọma mgbe ọ bụla ahụ́ kwere m.

Araceli: Ọ na-amasị m ịgwa ndị fada na ndị sista niile m hụrụ banyere Jehova. O nwere ike ịbụ n’ihi na m bụbu onye sista. Ihe mụ na ụfọdụ n’ime ha kwurịtara tọrọ m ezigbo ụtọ, ọtụtụ n’ime ha anarakwa akwụkwọ na magazin m nyere ha. M na-echeta otu onye fada. Mgbe m gwachara ya okwu ugboro ole na ole, o kwetara ihe m nọ na-agwa ya. Ya asị m: “Ma, olee ebe m ga-aga ugbu a isi charala m awọ́? Gịnị ka ndị chọọchị m na ndị ezinụlọ m ga-ekwu?” M sịrị ya: “Gịnịkwanụ ka Chineke ga-ekwu?” Ọ ghọtara na ihe m kwuru bụ eziokwu, mụ achọpụta na obi adịghị ya mma. Ma, ọ dị ka obi akaghị ya ịgbanwe.

M gaghị echefu mgbe di m gwara m na ya chọrọ iso m aga ọmụmụ ihe. Ọ karịala afọ iri asatọ mgbe ọ bịara ọmụmụ ihe mbụ ya. Malite mgbe ahụ, ọ kwụsịghị ịga ọmụmụ ihe. Ọ mụrụ Baịbụl ma bido ikwusa ozi ọma. Obi na-adị m ụtọ ma m cheta ọtụtụ mgbe mụ na ya rụrụ n’ozi ọma. Ọ nwụrụ ọnwa abụọ tupu ụbọchị a ga-eme ya baptizim eruo.

Felisa: Mgbe m malitere ife Jehova, ụmụnne m nwaanyị atọ m tọrọ nọ na-emegide m. Ma, ha mechara fewekwa Jehova. O so n’ihe kacha eme m obi ụtọ. Kemgbe ahụ, obi na-adị anyị ụtọ ịnọrị ma na-ekwurịta banyere Jehova, bụ́ Chineke anyị anyị hụrụ n’anya nakwa banyere Okwu ya. Anyị niile mechara fewe Jehova. *

^ para. 29 Araceli dị afọ iri asatọ na asaa, Felisa adịrị afọ iri itoolu na otu, Ramoni adịrị afọ iri asatọ na atọ. Ha niile ka ji obi ha niile na-efe Jehova. Lauri nwụrụ n’afọ 1990. Yanwa fekwara Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ.