ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Eprel 2018

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Jun 4 ruo Julaị 8, 2018.

Otú Anyị Ga-esi Enweta Ezigbo Nnwere Onwe

Ụfọdụ chọrọ inwere onwe ha n’ihe gbasara mmegbu, ịkpa ókè agbụrụ, na ịda ogbenye. Ndị ọzọ chọrọ ka e kwe ha na-ekwu uche ha ma ọ bụ na-eme ihe masịrị ha. Ò nwere mgbe ndị mmadụ ga-enweta ezigbo nnwere onwe?

Fee Jehova, Bụ́ Chineke nke Nnwere Onwe

Olee otú mmụọ Jehova si mee ka anyị nwere onwe anyị? Olee otú anyị ga-esi ghara iji nnwere onwe Chineke nyere anyị na-eme ihe na-abaghị uru?

Ndị Okenye na Ndị Ohu Na-eje Ozi Mụtanụ Ihe n’Aka Timoti

O yiri ka obi akachaghị Timoti mgbe ọ malitere iso Pọl na-eje ozi. Olee ihe ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nwere ike ịmụta n’aka Timoti?

Ṅomie Jehova Bụ́ Chineke nke Na-agba Ndị Ya Ume

A gbara ndị Jehova ume n’oge gara aga, na-agbakwa anyị ume taa.

Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume, Karịchaa Ugbu A

Ebe ọ bụ na ụbọchị Jehova dị ezigbo nso, anyị kwesịrị ịma mkpa ụmụnna anyị ka anyị nwee ike ịna-agba ha ume mgbe ọ dị mkpa.

Ndị Na-eto Eto, Ùnu Na-elekwasị Anya n’Ihe Unu Kpebiri Ime n’Ozi Jehova?

Ihe ndị na-eto eto nwere ike ime na mkpebi ha chọrọ ime, nwere ike ime ka ha ghara ịma ihe ha ga-eme eme. Olee otú ha ga-esi lezie anya họrọ ihe ndị ha ga-eme?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere na ọ dịghị mma ka mmadụ were akwụkwọ Ndịàmà Jehova tinye n’adres Ịntanet nke ya ma ọ bụ n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere e ji degharịa Abụ Ọma 144 ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee?