Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Na “Baịbụl Nsọ​—⁠Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013, ihe e kwuru n’Abụ Ọma 144:​12-15 gbasara ndị Chineke. Ma, otú e sibu dee ya gosiri na ọ bụ ndị mba ọzọ obi tara mmiri e kwuru banyere ha n’amaokwu nke 11, ka ọ na-ekwu maka ya. Gịnị mere e ji gbanwee otú e sibu dee ya?

Otú e si dee ya na Hibru nwere ike ịpụta ha abụọ. Ihe ndị a mere e ji degharịa ya ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013:

  1. Otú e si degharịa nke ọhụrụ a dabara n’otú e si ekwu okwu n’asụsụ Hibru. Ihe ga-eme ka a ghọta ihe e kwuru n’Abụ Ọma 144:​12-15 nakwa n’amaokwu ndị bu ya ụzọ, dabeere n’ihe okwu Hibru bụ́ asher e ji malite amaokwu nke 12 pụtara. Asher nwere ike ịpụta ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịpụta “onye” ma ọ bụ “ndị.” Ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee nke afọ 1984, ọ bụ “ndị” ka e dere na ya. Nke a meziri ka o yie ka ọ̀ bụ ndị ajọ omume amaokwu ndị bu ụzọ kwuru gbasara ha, ga-enweta ihe ọma ndị e kwuru n’amaokwu nke 12 ruo na nke 14. Ma, okwu ahụ bụ́ asher nwekwara ike igosi ihe mechara mee. N’ihi ya, e nwere ike ịsụgharị ya ka ọ bụrụ “nke ga-eme ka” ma ọ bụ “maka na” ma ọ bụkwanụ “mgbe ahụ.” Ihe e dere ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013, nakwa ná nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ bụ, “mgbe ahụ.”

  2. Okwu ahụ e degharịrị edegharị dabara nnọọ n’ihe e kwuru n’amaokwu ndị nke ọzọ. “Mgbe ahụ” e dere n’amaokwu nke 12, mere ka a ghọtakwuo na ọ bụ ndị ezi omume, bụ́ ndị na-arịọ ‘ka ha nwere onwe ha, a napụtakwa ha’ n’aka ndị ọjọọ (amaokwu nke 11), ga-enweta ihe ọma ndị e kwuru okwu ha n’amaokwu nke 12 ruo na nke 14. Amaokwu nke 15 kwuru banyere obi ụtọ ugboro abụọ. Okwu ahụ e degharịrị meziri ka a ghọtakwuo ndị ga-enwe “obi ụtọ” e kwuru n’amaokwu ahụ. N’ihi ya, ndị ahụ e kwuru ga-enwe obi ụtọ bụ otu ndị, ya bụ, “ndị Chineke ha bụ Jehova.” Anyị kwesịrị icheta na n’asụsụ Hibru e ji dee Baịbụl, a naghị enwe akara edemede, dị ka akara na-egosi ihe mmadụ kwuru. Ihe ga-enyere ndị nsụgharị aka bụ ịghọta otú Ndị Hibru si ede abụ uri, ihe a na-ekwu okwu ya, nakwa amaokwu ndị ọzọ kwuru ụdị ihe ahụ na Baịbụl.

  3. Otú e si sụgharịa nke ọhụrụ a dabara n’ihe amaokwu Baịbụl ndị ọzọ kwuru maka nkwa ọma Chineke kwere ndị ezi omume. Otú a e si degharịa okwu a bụ́ asher mere ka Abụ Ọma ahụ daba adaba ugbu a n’olileanya Devid nwere, ya bụ, na mgbe Jehova napụtachara ndị Izrel n’aka ndị iro ha, ọ ga-eme ka ha nwee obi ụtọ, meekwa ka ihe gaziere ha. (Lev. 26:​9, 10; Diut. 7:13; Ọma 128:​1-6) Dị ka ihe atụ, Diuterọnọmi 28:4 kwuru, sị: “Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, tinyere ihe ala gị ga-emepụta na ụmụ anụ ụlọ gị, ya bụ, ụmụ ehi gị nakwa ụmụ ewu na atụrụ gị.” Ihe a mezuru n’oge nwa Devid bụ́ Sọlọmọn na-achị. N’oge ahụ, ezigbo udo dị n’ala Izrel niile, ihe gazikwaara ha. Ihe ọzọ bụ na ihe ụfọdụ mere mgbe Sọlọmọn na-achị gosiri otú ihe ga-adị ma Mesaya chịwa.​—⁠1 Eze 4:​20, 21; Ọma 72:​1-20.

Ihe anyị na-ekwu bụ na otú ahụ e si degharịa okwu ahụ bụ́ asher n’Abụ Ọma nke 144 agbanweghị otú anyị sibu ghọta ihe Baịbụl na-akụzi. Kama, o mere ka olileanya magburu onwe ya ndị ohu Jehova na-atụ anya ya kemgbe ụwa dokwuo anya. Nke ahụ bụ na Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume, o bibichaa ha, ndị ezi omume enwee udo ruo mgbe ebighị ebi, ihe ana-agazikwara ha.​—⁠Ọma 37:​10, 11.