Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Fee Jehova, Bụ́ Chineke nke Nnwere Onwe

Fee Jehova, Bụ́ Chineke nke Nnwere Onwe

“Ebe ọ bụla mmụọ Jehova dị, n’ebe ahụ ka nnwere onwe dị.”​—⁠2 KỌR. 3:⁠17.

ABỤ: 49, 73

1, 2. (a) Olee ihe mere ịgba ohu na nnwere onwe ji bụrụ okwu ọtụtụ ndị kpụ n’ọnụ n’oge Pọl onyeozi? (b) Ònye ka Pọl gwara ndị mmadụ na ọ bụ ya ga-eme ka ha nwere onwe ha?

NDỊ KRAỊST oge mbụ dịrị ndụ n’oge ndị Rom na-achị ụwa. Ndị Rom na-eji iwu ha, otú ha si ekpe ikpe, nakwa otú ha si nwere onwe ha etu ọnụ. Ma, ihe mere ka obodo Rom oge ochie maa mma ma na-ewu ewu bụ ọtụtụ ọrụ ndị ohu rụrụ. E nwere mgbe o ruru, e kee ndị bi na Rom ụzọ iri, ụzọ atọ bụ ndị ohu. O doro anya na ihe gbasara ịgba ohu na nnwere onwe bụ okwu ọtụtụ ndị kpụ n’ọnụ n’oge ahụ, ma Ndị Kraịst.

2 Akwụkwọ ozi ndị Pọl onyeozi dere kwuru ọtụtụ ihe gbasara nnwere onwe. Ma ihe o bu n’obi jee ozi ya abụghị ka o mee ka ihe ka mma, nke bụ́kwanụ ihe ọtụtụ ndị chọrọ n’oge ahụ. Kama ịtụkwasị ndị ọchịchị obi na ha ga-eme ka ndị mmadụ nwere onwe ha, Pọl na Ndị Kraịst ibe ya gbara mbọ zie ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke, meekwa ka ha mata uru na-enweghị atụ ha ga-erite n’àjà Jizọs Kraịst ji ndụ ya chụọ. Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya Onye ga-eme ka ha nwere onwe ha. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt, ọ gwara ha hoo haa, sị: “Jehova bụ Mmụọ ahụ; ebe ọ bụla mmụọ Jehova dị, n’ebe ahụ ka nnwere onwe dị.”​—⁠2 Kọr. 3:⁠17.

3, 4. (a) Gịnị mere Pọl ji kwuo ihe dị ná 2 Ndị Kọrịnt 3:17? (b) Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nweta nnwere onwe nke si n’aka Jehova?

3 N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt, o kwuru ihe mere Mozis mgbe o si n’Ugwu Saịnaị gbadata, mgbe ya na mmụọ ozi Jehova kwurịtachara okwu. Ihu ya bịara na-enwupụta ìhè. Mgbe ndị Izrel hụrụ Mozis, ụjọ tụrụ ha, ya ejirizie ákwà kpuchie ihu ya. (Ọpụ. 34:​29, 30, 33; 2 Kọr. 3:​7, 13) Pọl kwuru, sị: “Ma mgbe a laghachiri n’ebe Jehova nọ, a na-ewepụ ákwà mkpuchi ahụ.” (2 Kọr. 3:16) Gịnị ka ihe a Pọl kwuru pụtara?

4 Dị ka anyị tụlere n’isiokwu bu nke a ụzọ, ọ bụ naanị Jehova, Onye kere ihe niile, nwere ikike ime ihe ọ bụla masịrị ya. N’ihi ya, o ziri ezi ikwu na e nwere nnwere onwe n’ebe Jehova nọ nakwa n’ebe “ọ bụla mmụọ Jehova dị.” Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ inwere onwe anyị, anyị ga-alaghachi n’ebe Jehova nọ, ya bụ, anyị na ya ga-adị ná mma. Mgbe ndị Izrel nọ n’ala ịkpa, ha eleghị ihe anya otú Jehova si ele ihe anya. O yiri ka obi ha ọ̀ kpọchiri akpọchi. Ha chọrọ iji nnwere onwe ha nwere ugbu a mee ihe na-agụ anụ ahụ́ ha agụụ.​—⁠Hib. 3:​8-10.

5. (a) Olee ụdị nnwere onwe mmụọ Jehova na-eme ka anyị nwee? (b) Olee otú anyị si mara na mmadụ ịbụ ohu ma ọ bụ ịnọ ná mkpọrọ agaghị eme ka onye ahụ ghara inweta nnwere onwe si n’aka Jehova? (ch) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

5 Nnwere onwe nke mmụọ Jehova na-eme ka anyị nwee karịrị mmadụ inwere onwe ya n’ịgba ohu. Mmụọ Jehova na-eme ka anyị nwere onwe anyị karịa mbọ ndị mmadụ na-agba ka ha nwere onwe ha. Ọ na-eme ka anyị nwere onwe anyị n’aka mmehie na ọnwụ, nakwa n’aka okpukpe ụgha na ihe ndị ha na-eme. (Rom 6:23; 8:⁠2) E nweghị ihe a ga-eji tụnyere ụdị nnwere onwe a. Ụdị nnwere onwe a na-abara mmadụ uru a sịgodị na ọ bụ ohu ma ọ bụ na a tụrụ ya mkpọrọ. (Jen. 39:​20-23) Akụkọ gbasara Nwanna Nwaanyị Nancy Yuen na Nwanna Harold King, gosiri na nke a bụ eziokwu. Onye nke ọ bụla diri mkpọrọ a tụrụ ya ọtụtụ afọ n’ihi na ọ na-efe Jehova. I nwere ike ịhụ ebe a gbara ha ajụjụ ọnụ n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova. (Gaa n’ebe e dere AJỤJỤ ỌNỤ pịa ebe e dere IDI ỌNWỤNWA.) Ka anyị tụlee ajụjụ abụọ. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ ná nnwere onwe anyị nwere? Olee otú anyị ga-esi jiri nnwere onwe anyị mee ihe bara uru?

OTÚ ANYỊ GA-ESI JIRI NNWERE ONWE CHINEKE NYERE ANYỊ EME IHE BARA URU

6. Olee otú ụmụ Izrel si gosi na ha ejighị nnwere onwe Chineke mere ka ha nwee kpọrọ ihe?

6 Ọ bụrụ na mmadụ enye anyị onyinye dị oké ọnụ ahịa, anyị na-egosi onye ahụ na obi na-atọ anyị ụtọ maka ya. Ụmụ Izrel egosighị na obi dị ha ụtọ maka otú Jehova si mee ka ha nwere onwe ha mgbe ọ kpọpụtara ha n’ohu ha na-agbara ndị Ijipt. N’ime ọnwa ole na ole a kpọpụtara ha n’Ijipt, ihe ndị ha na-eri na ihe ndị ha na-aṅụ n’Ijipt malitere ịgụ ha agụụ, ha emewe mkpesa maka nri Jehova na-enye ha, mechaadị chọwa ịlaghachi Ijipt. Legodịnụ, ‘azụ̀, kukumba, wọtamelọn, lik, yabaasị na galik’ dị ha mkpa karịa nnwere onwe Jehova mere ka ha nwee iji fee ya. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji weso ha ezigbo iwe. (Ọnụ Ọgụ. 11:​5, 6, 10; 14:​3, 4) Ihe a na-akụziri anyị ezigbo ihe.

7. Olee otú Pọl si mee ihe o kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 6:1? Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ya?

7 Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị na ebe ọ bụ na Chineke esila n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst mee ka ha nwere onwe ha, ha kwesịrị iji nnwere onwe a kpọrọ ihe. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:⁠1.) I nwere ike icheta otú o si wute Pọl maka na ọ ma na ya bụ ohu nke mmehie na ọnwụ. Ma, o mechara jiri obi ụtọ kwuo, sị: “Ekele dịrị Chineke site n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị.” Gịnị mere o ji kwuo ihe a? Ọ gwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “N’ihi na iwu nke mmụọ nsọ ahụ nke na-enye ndụ n’ime Kraịst Jizọs emewo ka i si n’iwu nke mmehie na nke ọnwụ pụọ nwere onwe gị.” (Rom 7:​24, 25; 8:⁠2) Anyị kwesịrị iṅomi Pọl, ma ghara iwere ihe ọma Chineke mere gbapụta anyị n’ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ, ka ihe na-abaghị uru. N’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ, anyị nwere ike iji akọnuche dị ọcha na-efe Chineke anyị, obi ana-atọkwa anyị ụtọ na anyị na-efe ya.​—⁠Ọma 40:⁠8.

Ì ji ikike e nyere gị ikpebi ihe ị chọrọ ime ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, ka ì ji ya na-eme ihe ndị ga-abara naanị gị uru? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo na nke 10)

8, 9. (a) Olee aka ná ntị Pita dọrọ anyị gbasara ihe anyị ji nnwere onwe anyị eme? (b) Olee otú mmadụ nwere ike isi jiri nnwere onwe ya mewe ihe ndị na-abaghị uru?

8 Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị igosi na obi dị anyị ụtọ maka nnwere onwe Chineke mere ka anyị nwee, anyị kwesịkwara ịkpachara anya ka anyị ghara iji ya mee ihe na-abaghị uru. Pita onyeozi dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịkụdo aka ná nnwere onwe a anyị nwere, na-eme ihe na-agụ anụ ahụ́ anyị agụụ. (Gụọ 1 Pita 2:16.) Aka ná ntị a na-echetara anyị ihe mere ndị Izrel mgbe ha nọ n’ala ịkpa. Taa, aka ná ntị a dị anyị ezigbo mkpa karịchaa. Setan na ụwa ya na-ewepụta ọtụtụ ihe ndị nwere ike ịdọrọ anya anyị. Ụfọdụ n’ime ha bụ ejiji, ihe oriri na ihe ọṅụṅụ, ihe ndị e ji atụrụ ndụ, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ndị ma nke a na-akọ n’ịkpọsa ngwá ahịa na-eji ndị bụ́ asampete na-akpọsa ngwá ahịa ha iji mee ka anyị zụrụ ihe ndị na-adịghị anyị mkpa. O nwere ike ịdị mfe iji ha megharịa anyị anya, anyị ejirizie nnwere onwe anyị mewe ihe ndị na-abaghị uru.

9 Ihe a Pita kwuru gbasakwara ihe ndị dị mkpa ná ndụ. Ihe ndị ahụ bụ ebe anyị ga-agụru akwụkwọ, ụdị ọrụ anyị ga-arụ na ihe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, taa, a na-agwa ndị na-eto eto nọ n’ụlọ akwụkwọ ka ha gbalịsie ike ruo eru ịbanye na mahadum ndị kacha mma. A na-agwa ha na ọ bụrụ na ha agụkwuo akwụkwọ, na ọ ga-eme ka ha nweta ọrụ a ga na-akwụ ha ezigbo ụgwọ, ndị mmadụ ana-akwanyekwara ha ùgwù. A na-egosikwa ha ihe ndị na-eme ka ha na-eche na ndị gara mahadum na-enwe ego karịa ndị gara naanị ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Mgbe ndị na-eto eto na-ekpebi ihe ndị ha ga-eji ndụ ha eme, ịga mahadum nwere ike ịna-agụ ha agụụ. Gịnị ka ha na ndị mụrụ ha kwesịrị iburu n’uche?

10. Olee ihe anyị ga-eburu n’obi mgbe anyị chọrọ iji ikike e nyere anyị ekpebi ihe anyị chọrọ ime?

10 Ọtụtụ ndị nwere ike iche na ebe ọ bụ na ihe ndị ahụ bụ ihe ndị mmadụ ga-eji aka ha kpebie, na ha nwere ike ime ihe ọ bụla ha chọrọ ọ bụrụhaala na akọnuche ha anaghị enye ha nsogbu. Ọ ga-abụ na ha chetara ihe Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt banyere nri. Ọ gwara ha, sị: “Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ na akọ na uche onye ọzọ na-ekpe nnwere onwe m ikpe?” (1 Kọr. 10:29) Ọ bụ eziokwu na ọ bụ anyị ga-ekpebi ebe anyị ga-agụru akwụkwọ ma ọ bụ ụdị ọrụ anyị ga-arụ, anyị kwesịrị icheta na anyị enwereghị onwe anyị ime ihe ọ bụla masịrị anyị, nakwa na mkpebi ọ bụla anyị mere nwere ike ịbara anyị uru ma ọ bụ ghọ anyị ahịa. Ọ bụ ya mere Pọl ji buru ụzọ kwuo, sị: “Iwu kwadoro ihe niile; ma ọ bụghị ihe niile bara uru. Iwu kwadoro ihe niile; ma ọ bụghị ihe niile na-ewuli elu.” (1 Kọr. 10:23) Ihe a na-enyere anyị aka ịmata na mgbe ọ bụla anyị chọrọ iji ikike e nyere anyị ekpebi ihe anyị chọrọ ime ná ndụ, na e nwere ihe ndị ka mkpa anyị kwesịrị ibu ụzọ chebara echiche.

IJI NNWERE ONWE ANYỊ EJERE CHINEKE OZI

11. Olee ihe mere Jehova ji mee ka anyị nwere onwe anyị?

11 Mgbe Pita na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara iji nnwere onwe anyị na-eme ihe na-abaghị uru, o kwukwara ihe anyị kwesịrị iji ya na-eme. O kwuru ka anyị jiri ya bụrụ “ndị ohu Chineke.” N’ihi ya, isi ihe mere Jehova ji si n’aka Jizọs mee ka anyị nwere onwe anyị n’iwu nke mmehie na ọnwụ bụ ka anyị jiri ndụ anyị niile na-ejere ya ozi.

12. Olee ihe Noa na ezinụlọ ya mere anyị kwesịrị iṅomi?

12 Otú kacha mma anyị ga-esi jiri nnwere onwe anyị na-eme ihe ndị bara uru bụ iji oge anyị na ike anyị na-ejere Jehova ozi. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị ghara ikwe ka ịchụ ihe nke ụwa na ihe ndị na-agụ anyị agụụ bụrụ ihe ndị kacha anyị mkpa ná ndụ. (Gal. 5:16) Ka anyị tụlee banyere Noa na ezinụlọ ya. Ha biri n’ụwa tigbuo zọgbuo na omume rụrụ arụ juru na ya. Ma, ha ekweghị ka ihe ndị na-agụ ndị mmadụ agụụ na ihe ndị ha na-achụ megharịa ha anya. Olee ihe nyeere ha aka? Ha ji oge ha na-arụ ọrụ Chineke nyere ha. Ha wuru ụgbọ, chekwaa nri ha na ụmụ anụmanụ ga-eri n’ụgbọ ahụ, ma dọọ ndị mmadụ aka ná ntị. Baịbụl kwuru, sị: “Noa wee mee dị ka ihe niile Chineke nyere ya n’iwu si dị. O mere nnọọ otú ahụ.” (Jen. 6:22) Olee uru ihe ndị ahụ ha mere baara ha? A zọpụtara Noa na ndị ezinụlọ ya mgbe Chineke bibiri ndị ajọ omume n’oge ahụ.​—⁠Hib. 11:⁠7.

13. Olee ihe Jehova nyere anyị iwu ka anyị na-eme taa?

13 Olee ihe Jehova nyere anyị iwu ka anyị na-eme taa? Ebe anyi bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị ma ọrụ Chineke nyere anyị ka anyị na-arụ. (Gụọ Luk 4:​18, 19.) Taa, Setan emeela ka ọtụtụ mmadụ kpuo ìsì. Ha amaghị na ha bụ ohu nke okpukpe ụgha, akụnụba na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (2 Kọr. 4:⁠4) Anyị kwesịrị inyere ndị mmadụ aka ka ha mata Jehova, bụ́ Chineke nke nnwere onwe, ma na-efe ya otú ahụ Jizọs mere. (Mat. 28:​19, 20) Ọrụ a adịghị mfe. N’obodo ụfọdụ, ndị mmadụ achọghị iji ntị anụ ozi ọma, ụfọdụ na-ewedị iwe ma anyị chọọ izi ha ozi ọma. Ma, ajụjụ onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya bụ, ‘M̀ nwere ike iji nnwere onwe m jekwuoro Jehova ozi?’

14, 15. Olee ihe ọtụtụ ụmụnna na-eme ugbu a n’ihe gbasara ikwusa ozi ọma? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

14 Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ ụmụnna anyị achọpụtala na oge agwụla agwụ, ya emee ka ha hapụ ihe ụfọdụ iji nwee ike ịbanye n’ozi oge niile. (1 Kọr. 9:​19, 23) Ụfọdụ so ọgbakọ ha na-eje ozi, ndị ọzọ na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. N’afọ ise gara aga, ihe karịrị narị puku mmadụ abụọ na puku iri ise ghọrọ ndị ọsụ ụzọ. Ugbu a, e nwere ndị ọsụ ụzọ karịrị otu nde na otu narị puku. Ọ bụ ihe magburu onwe ya na ọtụtụ ụmụnna anyị na-eji nnwere onwe ha ejere Jehova ozi otú a.​—⁠Ọma 110:⁠3.

15 Olee ihe nyeere ụmụnna ndị a aka iji nnwere onwe ha na-eme ihe ndị bara uru? Ka anyị tụlee gbasara John na Judith nwunye ya. Ha nọ na-eje ozi ná mba dị iche iche kemgbe afọ iri atọ ugbu a. Ha kwuru na mgbe a malitere Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ n’afọ 1977, e kwusiri okwu ike ka ndị ọsụ ụzọ wepụta onwe ha gaa n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. John kwuru na ihe ya mere ka obi ha nwee ike ịdị na ya bụ na ya gbanwere ọrụ ọtụtụ ugboro ka ha ghara ịna-ebi ndụ okomoko. Mgbe John na nwunye ya mechara kwaga n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, ha chọpụtara na ikpe ekpere na ịtụkwasị Jehova obi na-enyere ha aka mgbe ha na-amụ asụsụ ọhụrụ, omenala ndị obodo ahụ, nakwa idi oge oyi ma ọ bụ oge okpomọkụ. Olee uru ọtụtụ afọ ha nọ na-ejere Jehova ozi baarala ha? John kwuru, sị: “Ahụtụbeghị m ihe ka ozi a m ji oge m niile na-ejere Jehova mma. Mụ na Jehova adịkwuola ná mma ugbu a, otú ahụ ezigbo nna na nwa ya si adị ná mma. Aghọtakwuola m ihe Jems 4:8 kwuru. Ebe ahụ sịrị: ‘Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.’ Ama m na achọtala m ihe m nọ na-achọ kemgbe, ya bụ, iji ndụ m na-eme ihe bara uru.”

16. Olee otú ọtụtụ puku ụmụnna si jiri nnwere onwe ha mee ihe bara uru?

16 E nwere ndị na-agaghị enweli ike ịbụ ndị ọsụ ụzọ ruo ọtụtụ afọ ka John na Judith n’ihi otú ihe si dịrị ha. Ma, e nwere ụmụnna na-ewepụta onwe ha na-arụ ụlọ ndị nzukọ Jehova na-arụ n’ụwa niile. Dị ka ihe atụ, mgbe a na-arụ isi ụlọ ọrụ anyị na Wọwik, dị na Niu Yọk, ụmụnna ruru puku iri abụọ na asaa wepụtara onwe ha rụọ ọrụ. Ụfọdụ rụrụ ọrụ izu abụọ, otu afọ ma ọ bụ karịa. Ọtụtụ n’ime ha hapụrụ ihe ndị ha na-eme ka ha nwee ike ịrụ ọrụ ebe ahụ. Ụmụnna ndị a ji nnwere onwe ha too Jehova, bụ́ Chineke nke nnwere onwe. Ha bụ ezigbo ndị anyị kwesịrị iṅomi.

17. Olee ihe ndị anyị ga-atụ anya ha ma anyị jiri nnwere onwe anyị na-eme ihe ndị bara uru?

17 Obi dị anyị ụtọ na anyị amatala Jehova, nakwa na anyị nweere onwe anyị n’ihi na anyị na-efe ya. Ka anyị niile si n’ihe ọ bụla anyị kpebiri ime gosi na anyị ejighị nnwere onwe a egwu egwu. Kama iji nnwere onwe a na-eme ihe ndị na-abaghị uru, ka anyị jiri ya na-ejere Jehova ozi otú anyị nwere ike. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enweta ọtụtụ ngọzi mgbe Jehova ga-emezu ihe a o kwuru. O kwuru, sị: “A ga-emekwa ka ihe e kere eke nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”​—⁠Rom 8:⁠21.