Otú Anyị Ga-esi Enweta Ezigbo Nnwere Onwe
“Ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga-enwere onwe unu n’ezie.”—JỌN 8:36.
1, 2. (a) Olee ihe gosiri na ndị mmadụ na-agbalị ka ha nwere onwe ha? (b) Olee ihe mbọ a ha na-agba na-akpata?
TAA, ndị mmadụ na-ekwukarị gbasara imeso onye ukwu ihe otú e mesoro onye nta, nakwa gbasara nnwere onwe. N’ọtụtụ ebe n’ụwa, ndị mmadụ chọrọ inwere onwe ha ma a bịa n’ihe gbasara mmegbu, ịkpa ókè agbụrụ, nakwa ịda ogbenye. Ndị ọzọ chọrọ ka a hapụ ha ka ha na-ekwu ihe ha chọrọ ikwu, na-ahọrọ ihe ndị masịrị ha, nakwa ka ha na-ebi ndụ otú ha chọrọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ niile chọrọ ka ha nwere onwe ha.
2 Ma, ihe bụzi mkpa bụ otú ha ga-esi enweta ihe ndị ahụ ha chọrọ. Ka ha nwee ike inweta ihe ndị ahụ, ha na-eme ngagharị iwe, na-enupụrụ ndị ọchịchị isi, na-achọdị ka a gbanwee ọchịchị obodo ha. Ma, hà na-enwetanụ ihe ha chọrọ n’eziokwu? N’ebeekwanụ. Kama, ihe ọ na-akpatakarị bụ ahụhụ na ọnwụ. Ihe ndị a niile na-egosi na ihe Eze Sọlọmọn kwuru bụ eziokwu. O kwuru na ‘mmadụ achịwo mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’—Ekli. 8:9.
3. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ, ahụ́ eruokwa anyị ala?
Jems 1:25) Jehova, bụ́ onye nyere iwu ahụ, ma ihe ndị ga-akacha eme ka ụmụ mmadụ nwee obi ụtọ, ahụ́ eruokwa ha ala. O nyere Adam na Iv ihe niile ga-eme ka ha nwee obi ụtọ, meekwa ka ha nwere onwe ha.
3 Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems kwuru ihe dị mkpa mmadụ ga-eme ka o nwee ike inweta ezigbo obi ụtọ, ma nwere onwe ya. O kwuru, sị: “Onye na-enyocha iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe, onye nọgidekwara n’ime ya, ga-enwe obi ụtọ n’ime ya eme.” (MGBE ỤMỤ MMADỤ NWERE EZIGBO NNWERE ONWE
4. Olee ụdị nnwere onwe Adam na Iv nwere? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
4 Anyị gụwa isi nke mbụ na isi nke abụọ n’akwụkwọ Jenesis, anyị ga-achọpụta na Adam na Iv nweere onwe ha, bụ́ ụdị nnwere onwe ndị mmadụ na-achọ ka ha nweta taa. O nweghị ihe kọrọ ha, o nweghị ihe ha na-atụ ụjọ ya, o nweghịkwa onye na-emegbu ha. Adam na Iv anatụdịghị echegbu onwe ha maka nri, ọrụ, ọrịa ma ọ bụkwanụ ọnwụ. (Jen. 1:27-29; 2:8, 9, 15) Ọ̀ pụtara na ha nweere onwe ha kpamkpam? Ka anyị chọpụta.
5. N’agbanyeghị ihe ọtụtụ ndị na-eche, olee ihe ga-eme ka ndị mmadụ nwere onwe ha?
5 Ọtụtụ ndị taa chere na ihe ga-eme ka ha nwee ezigbo nnwere onwe bụ ma ha na-eme ihe ọ bụla ha chọrọ ime, n’agbanyeghị ihe o nwere ike ịkpatara ha. Otu akwụkwọ kọwara mmadụ inwere onwe ya dị ka “mmadụ iji aka ya ahọrọ ihe ndị ọ ga-eme na ime ha eme.” Akwụkwọ a kwukwara, sị: “A bịa n’ihe gbasara iwu, ndị mmadụ nweere onwe ha ma ọ bụrụ na e nyeghị ha iwu ndị na-enweghị isi na ọdụ.” Nke a pụtara na iwu ụfọdụ kwesịrị ekwesị ka onye ọ bụla nwee ike inwere onwe ya. Ajụjụ abụrụzie: Ònye ka ọ dị n’aka ikpebi iwu ndị kwesịrị ekwesị?
6. (a) Gịnị mere o ji bụrụ naanị Jehova nwere ikike ime ihe ọ bụla masịrị ya? (b) Olee ụdị nnwere onwe ụmụ mmadụ nwere? N’ihi gịnịkwa?
6 Anyị kwesịrị iburu n’obi na ọ bụ naanị Jehova Chineke nwere ikike ime ihe ọ bụla masịrị ya. Maka gịnị? Maka na ọ bụ ya kere ihe niile, bụrụkwa Ọkaakaa eluigwe na ụwa. (1 Tim. 1:17; Mkpu. 4:11) Eze Devid ji okwu ndị magburu onwe ha kọwaa otú Jehova si dị ukwuu. (Gụọ 1 Ihe E Mere 29:11, 12.) Ma, ihe niile e kere eke n’eluigwe nakwa n’ụwa nweere onwe ha ime ihe ụfọdụ. Ha kwesịrị icheta na ọ bụ naanị Jehova Chineke nwere ikike inye iwu ndị kwesịrị ekwesị. Ihe a ka Jehova Chineke mere mgbe o kere mmadụ.
7. Olee ihe ụfọdụ anyị na-eme nke na-eme anyị obi ụtọ?
7 Ọ bụ eziokwu na Adam na Iv nweere onwe ha ime ọtụtụ ihe, ma e nwere ihe ndị ha na-enweghị ike ịsị na ha agaghị eme. Ụfọdụ n’ime ha bụ ihe ahụ́ ha ga na-asị ha mee n’ihi otú e si kee ha. Dị ka ihe atụ, ha ma na ha kwesịrị iku ume, iri nri, ihi ụra, nakwa ime ihe ndị ọzọ ka ha nwee ike ịdị ndụ. Nke a, ọ̀ pụtara na ha enwereghị onwe ha? Mbanụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova mere ka ime ihe ndị ahụ na-atọ ha ụtọ. (Ọma 104:14, 15; Ekli. 3:12, 13) È nwere onye obi na-anaghị atọ ụtọ ma o kuru ikuku ndụ, rie nri na-amasị ya, ma ọ bụkwanụ hie ezigbo ụra n’abalị? Anyị mewe ihe ndị a, obi na-atọ anyị ụtọ, ọ naghị adị anyị ka è kere anyị agbụ. O doro anya na otú ahụ ka ọ dịkwa Adam na Iv.
8. Olee iwu Chineke nyere Adam na Iv? Gịnị mere o ji nye ha ya?
8 Jehova gwara Adam na Iv hoo haa ka ha mụjuo ụwa, ma na-elekọta ya. Jen. 1:28) Iwu a Chineke nyere ha, ò mere ka ha ghara inwere onwe ha? Mbanụ. Jehova nyere ha iwu a ka ha nwee ike imezu ihe o bu n’obi. Ọ chọrọ ka ha mee ka ụwa niile bụrụ paradaịs ka ụmụ mmadụ zuru okè biri na ya ruo mgbe ebighị ebi. (Aịza. 45:18) Taa, ọ bụrụ na ndị mmadụ ekpebie na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụkwanụ na ha lụọ, ha agaghị amụ nwa, ha adaghị iwu Chineke. Ma, ndị mmadụ na-alụ di na nwunye, na-amụ ụmụ n’agbanyeghị nsogbu ụfọdụ o nwere ike ịkpatara ha. (1 Kọr. 7:36-38) N’ihi gịnị? N’ihi na ime ihe ndị ahụ na-eme ka ha nwee obi ụtọ. (Ọma 127:3) A sị na Adam na Iv gere Chineke ntị, ha gaara enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha, nakwa n’ezinụlọ ha ruo mgbe ebighị ebi.
(OTÚ ỤMỤ MMADU SI TỤFUO EZIGBO NNWERE ONWE HA NWERE
9. Gịnị mere iwu ahụ Chineke nyere na Jenesis 2:17 abụghị ihe na-ekwesịghị ekwesị?
9 Jehova nyekwara Adam na Iv iwu ọzọ ma gwa ha hoo haa ihe ga-eme ha ma ha nupụ isi. Ọ gwara ha, sị: ‘Erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, unu ga-anwụrịrị.’ (Jen. 2:17) È nwere ike ikwu na iwu a ekwesịghị ekwesị? Ò mere ka Adam na Iv ghara inwere onwe ha? Mba. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta Baịbụl kwuru na iwu a Chineke nyere ha kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, otu onye ọkà mmụta Baịbụl kwuru, sị: “Iwu a Chineke nyere na [Jen. 2:16, 17] gosiri na ọ bụ naanị Chineke maara ihe dị mma . . . maka ụmụ mmadụ, ọ bụkwa naanị Chineke maara ihe na-adịghị mma . . . maka ha. Ka ụmụ mmadụ nwee ike inweta ‘ihe dị mma,’ ha ga-atụkwasị Chineke obi ma mee ihe ọ gwara ha. Ha nupụrụ ya isi, ha ga-ejizi aka ha na-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma . . . na ihe bụ́ ihe ọjọọ.” Nke ahụ ga-esiri ndị mmadụ ike ime.
10. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwu na mmadụ ikpebi ihe ọ ga-eme, na mmadụ ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, bụ otu ihe?
10 Ọtụtụ ndị taa gụọ iwu ahụ Jehova nyere Adam, ha echee na iwu ahụ mere ka Adam ghara inwere onwe ya ime ihe ndị ọ chọrọ ime. Iche otú ahụ na-egosi na ha aghọtaghị na mmadụ iji aka ya na-ekpebi ihe ndị ọ ga-eme dị iche na mmadụ iji aka ya ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Adam na Iv nweere onwe ha ikpebi ma hà ga-ege Chineke ntị ma ọ bụkwanụ na ha agaghị ege ya ntị. Ma, ọ bụ naanị Jehova ka ọ dịịrị ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. “Osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ” ahụ dị n’ogige Iden na-echetara Adam na Iv na ọ bụ naanị Chineke ka ọ dị n’aka ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Jen. 2:9) Ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-ama ma ihe anyị kpebiri ime ọ̀ ga-abara anyị uru ma ọ bụ ghọ anyị ahịa, anyị amaghịkwa ma hà ga-abara anyị uru mgbe niile. Ọ bụ ya mere na ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ na-ebu ihe ọma n’obi kpebie ihe ha chọrọ ime, ma ya emechaa kpatara ha ahụhụ ma ọ bụkwanụ ọdachi. (Ilu 14:12) Ihe na-akpatakarị ya bụ na ọ bụghị ihe niile ka ụmụ mmadụ ga-emeli. Jehova ji iwu ahụ kụziere Adam na Iv na ha ga-erubere ya isi ma ha chọọ inweta ezigbo nnwere onwe. Gịnị ka Adam na Iv mere?
11, 12. Gịnị mere ihe Adam na Iv mere ji ghọ ha ahịa? Nye ihe atụ.
11 Nne na nna anyị mbụ mechara nupụrụ Chineke isi. Iv kwetara ihe Setan gwara ya. Ọ gwara ya, sị: “Anya unu ga-emeghe, unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Jen. 3:5) Ihe a Adam na Iv mere, ò mere ka ha nwerekwuo onwe ha? Mbanụ. Isi a ha nupụụrụ Chineke emeghị ka ha nweta ihe ahụ Setan kwuru na ha ga-enweta. O teghị aka, ha achọpụta na isi ha nupụụrụ Chineke mewe otú masịrị ha, kpataara ha nsogbu. (Jen. 3:16-19) Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Jehova enyeghị ụmụ mmadụ ikike iji aka ha ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.—Gụọ Ilu 20:24; Jeremaya 10:23.
12 E nwere ike iji ihe a ha mere tụnyere onye na-akwọ ụgbọelu. Ọ chọọ iru ebe ọ na-aga n’enweghị nsogbu, ọ ga-agbarịrị ebe a chọrọ ka ọ gbaa. Ọ ga na-elekwa anya n’ihe ndị a rụnyere n’ụgbọelu ahụ ga-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga. Ya na ndị ọrụ ha bụ ịgwa ya ebe ndị ọ ga-agba, mgbe ọ ga-efeli na mgbe ọ ga-efeda, ga na-ekwurịta okwu, ka ya na ụgbọelu ndị ọzọ ghara ịkụkọta. Ma, ọ bụrụ na onye na-akwọ ụgbọelu ahụ ekpebie na ya agaghị eme ihe ndị a gwara ya ma tinye isi ebe masịrị ya, o nwere ike ịkpọkasị. E nwere ike iji Adam na Iv tụnyere ọkwọ ụgbọelu a. Ha chọrọ ime otú masịrị ha. Ha emeghị ihe Chineke gwara ha. Gịnị ka ọ kpataara ha? E nwere ike ikwu na ha kpọkasịrị, ya bụ, na ọ kpataara ha na ụmụ ndị ha mechara mụta, mmehie na ọnwụ. (Rom 5:12) Iji aka ha na-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ emeghị ka ha nwerekwuo onwe ha.
OTÚ ANYỊ GA-ESI NWEE EZIGBO NNWERE ONWE
13, 14. Olee otú anyị ga-esi nweta ezigbo nnwere onwe?
13 Ndị mmadụ nwere ike ị na-eche na ọ bụrụ na ha enwerekwuo onwe ha, na ihe ga-akara ha mma. Ma, ọ̀ bụ eziokwu? Ọ bụ eziokwu na mmadụ inwere onwe ya nwere ọtụtụ uru ọ na-aba, ma olee otú i chere ụwa gaara adị ma a sị na e nweghị iwu ọ bụla? Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia kwuru na iwu obodo dị iche iche na-echebe ndị mmadụ, ma na-egbochi ha ime ihe ụfọdụ ha chọrọ ime. Nke a anaghị adị mfe mgbe niile. Ọ bụ ya mere e ji nwee ọtụtụ iwu, ọtụtụ ndị ọkàiwu, nakwa ndị ọkàikpe na-akọwara ha ndị mmadụ, ma na-ahụ na ha debere ha.
14 Jizọs kwuru ihe anyị ga-eme ka anyị nweta ezigbo nnwere onwe. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu Jọn 8:31, 32) E nwere ihe abụọ Jizọs kwuru anyị ga-eme ka anyị nwee ike inwe ezigbo nnwere onwe. Nke mbụ, anyị ga-ekweta eziokwu ndị ọ kụziri. Nke abụọ, anyị ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya. Ime ihe ndị a ga-eme ka anyị nweta ezigbo nnwere onwe. Ma, olee ihe anyị ga-enwere onwe anyị na ya? Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme mmehie bụ ohu nke mmehie. . . . Ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga-enwere onwe unu n’ezie.”—Jọn 8:34, 36.
bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (15. Olee otú nnwere onwe Jizọs kwere anyị ná nkwa ga-esi mee ka anyị ‘nwere onwe anyị n’eziokwu’?
15 Nnwere onwe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha ga-enwe karịrị nnwere onwe ọtụtụ mmadụ chọsiri ike ka ha nwee taa. Mgbe Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga-enwere onwe unu n’ezie,” ọ na-ekwu gbasara ime ka ndị mmadụ gharazie “ịbụ ohu nke mmehie,” bụ́ ihe kacha kee ha agbụ ma na-emekpọ ha ọnụ kemgbe. Ọ bụghị naanị na mmehie nwere ike ime ka anyị na-eme ihe ọjọọ, kama, o nwekwara ike ime ka anyị ghara ịna-eme ihe anyị ma na o ziri ezi, ma ọ bụ mee ka anyị ghara ime ihe anyị nwere ike imeli. Nke a mere ka anyị bụrụ ohu nke mmehie, ya emezie ka ike ụwa na-agwụ anyị, anyị ana-ata ahụhụ, n’ikpeazụ, anyị anwụọ. (Rom 6:23) Ụdị ihe a kpakwara Pọl onyeozi aka ọjọọ. (Gụọ Ndị Rom 7:21-25.) Ọ bụ naanị mgbe a tọhapụrụ anyị n’agbụ nke mmehie ka anyị ga-enwere onwe anyị otú ahụ Adam na Iv nwere tupu ha enupụrụ Chineke isi.
16. Olee otú anyị ga-esi nwere onwe anyị n’eziokwu?
16 Mgbe Jizọs sịrị, “ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m,” ihe ọ na-ekwu bụ na e nwere ihe a chọrọ ka anyị mee, ka o mee ka anyị nwere onwe anyị. Ebe ọ bụ na anyị enyefeela Chineke onwe anyị, anyị ajụla onwe anyị ma kpebie ịna-eme ihe Kraịst na-akụzi ebe ọ bụ na anyị bụ ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 16:24) Dị ka Jizọs kwere anyị ná nkwa, anyị ga-enwere onwe anyị n’eziokwu ma anyị rite uru zuru ezu n’ihe mgbapụta ahụ.
17. (a) Gịnị ga-eme ka ndụ anyị nwee isi, ahụ́ eruokwa anyị ala? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
17 Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ịna-eme ihe ndị ọ na-akụziri anyị ga-eme ka ndụ anyị nwee isi, ahụ́ eruokwa anyị ala. Ihe a ga-eme ka anyị nwere onwe anyị n’aka mmehie na ọnwụ kpamkpam n’ọdịnihu. (Gụọ Ndị Rom 8:1, 2, 20, 21.) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi jiri nnwere onwe anyị nwere ugbu a na-eme ihe bara uru, ka anyị nwee ike ito Jehova, bụ́ Chineke nke ezigbo nnwere onwe, ruo mgbe ebighị ebi.