Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume, Karịchaa Ugbu A

Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume, Karịchaa Ugbu A

“Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche . . . , na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.”​—⁠HIB. 10:​24, 25.

ABỤ: 90, 87

1. Gịnị mere Pọl onyeozi ji gwa Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru n’oge ndịozi Jizọs ka ha na-agbarịta ibe ha ume “karị”?

GỊNỊ mere anyị kwesịrị iji gbalịsie ike na-agba ndị ọzọ ume? Pọl onyeozi gwara anyị ihe mere anyị kwesịrị iji mee otú ahụ n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru. Ọ gwara ha, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.” (Hib. 10:​24, 25) N’ihe na-erughị afọ ise o kwuchara ihe a, ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst bi na Jeruselem ga-ahụ ka ‘ụbọchị Jehova’ na-abịa. Ha ghọtara na ha kwesịrị isi n’obodo ahụ gbapụ, otú ahụ Jizọs gwara ha mee. (Ọrụ 2:​19, 20; Luk 21:​20-22) Ụbọchị Jehova ahụ bịara n’afọ 70, mgbe ndị Rom bibiri Jeruselem.

2. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nwekwuo mmasị ịgba ụmụnna anyị ume taa?

2 Taa, o doro anyị anya na ‘oké ụbọchị Jehova, nke dịkwa oké egwu,’ dị nso. (Joel 2:11) Zefanaya onye amụma kwuru, sị: “Oké ụbọchị Jehova dị nso. Ọ dị nso, o jikwa oké ọsọ na-abịa.” (Zef. 1:14) Amụma a gbasakwara anyị taa. N’ihi otú ụbọchị Jehova si dịrị nso, Pọl gwara anyị ka anyị “na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.” (Hib. 10:24) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-echebakwuru ụmụnna anyị echiche, ka anyị nwee ike ịna-agba ha ume mgbe ọ dị mkpa.

OLEE NDỊ E KWESỊRỊ ỊGBA UME

3. Gịnị ka Pọl onyeozi kwuru gbasara ịgba ndị ọzọ ume? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Baịbụl sịrị: “Ọ bụ nchegbu nke dị n’obi mmadụ ga-anyịgbu ya, ma, ọ bụ okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.” (Ilu 12:25) Ihe a na-eme anyị niile. E kwesịrị ịna-agba anyị niile ume mgbe ụfọdụ. Ihe Pọl kwuru gosiri na onye na-agba ndị ọzọ ume kwesịkwara ka a gbaa ya ume. O degaara Ndị Kraịst bi na Rom akwụkwọ ozi, sị: “Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu, ka m wee nyetụ unu onyinye ime mmụọ, ka e wee mee ka unu guzosie ike; ma ọ bụ, kama nke ahụ, ka anyị wee gbarịta ibe anyị ume, onye ọ bụla site n’okwukwe nke ibe ya, ma nke unu ma nke m.” (Rom 1:​11, 12) N’ihi ya, e kwesịkwara ịgba Pọl ume mgbe ụfọdụ.​—⁠Gụọ Ndị Rom 15:​30-32.

4, 5. Olee ndị anyị kwesịrị ịgba ume taa? Maka gịnị?

4 E kwesịrị ịja ụmụnna ndị hapụrụ ihe ụfọdụ ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi, mma. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọsụ ụzọ ji obi ha niile na-eje ozi. Ọtụtụ n’ime ha hapụrụ ihe ndị ha na-eme iji sụọ ụzọ. Otú ahụkwa ka ndị ozi ala ọzọ, ndị na-eje ozi na Betel, ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha, nakwa ndị na-arụ ọrụ n’ọfis ndị nsụgharị hapụrụ ihe ndị ha na-eme. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agba ha ume. Ndị ọzọ obi na-atọ ụtọ ma a gbaa ha ume bụ ndị chọrọ ịnọgide n’ozi oge niile, ma n’ihi otú ihe si dịrị ha, ha akwụsị.

5 Ụmụnna anyị ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi na ha chọrọ ime ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ ka anyị lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị,” bụkwa ndị ọzọ anyị kwesịrị ịgba ume. (1 Kọr. 7:39) Ndị bụ́ nwunye na-enwekwa obi ụtọ ma di ha gwa ha okwu na-agba ha ume. (Ilu 31:​28, 31) Ndị Kraịst a na-akpagbu ma ọ bụ ndị na-arịa ọrịa ma ha anọgide na-efe Jehova, kwesịkwara ka a gbaa ha ume. (2 Tesa. 1:​3-5) Jehova na Kraịst na-akasi ụmụnna ndị a niile na-efe ya, obi.​—⁠Gụọ 2 Ndị Tesalonaịka 2:​16, 17.

NDỊ OKENYE NA-AGBALỊ ỊGBA ANYỊ UME

6. Olee ọrụ ndị okenye na-arụ, nke e kwuru gbasara ya n’Aịzaya 32:​1, 2?

6 Gụọ Aịzaya 32:​1, 2Jizọs si n’aka ụmụnna ya e tere mmanụ nakwa “ndị isi,” ya bụ, ndị okenye so n’atụrụ ọzọ na-agba ndị dara mbà n’obi ume ma na-eduzi ha n’oge a ihe siri ike. Ndị okenye ndị a abụghị “ndị nwe” okwukwe anyị, kama ha bụ “ndị ọrụ ibe” anyị, ndị na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ.​—⁠2 Kọr. 1:⁠24.

7, 8. E wezụga ịgwa mmadụ okwu iji gbaa ya ume, olee ihe ọzọ ndị okenye kwesịrị ime iji gbaa ụmụnna ha ume?

7 Pọl onyeozi mere ihe ndị okenye kwesịrị iṅomi. O degaara Ndị Kraịst a na-akpagbu na Tesalonaịka akwụkwọ ozi, sị: “Ebe anyị nwere ịhụnanya dị ukwuu n’ebe unu nọ, ọ masịrị anyị ọ bụghị naanị izi unu ozi ọma Chineke, kamakwa inye unu mkpụrụ obi anyị, n’ihi na unu ghọrọ ndị anyị hụrụ n’anya.”​—⁠1 Tesa. 2:⁠8.

8 Ihe Pọl gwara ndị okenye nọ n’Efesọs gosiri na ịgwa mmadụ okwu iji gbaa ya ume abụghị naanị ihe anyị kwesịrị ime. Ọ gwara ha, sị: “Unu aghaghị inyere ndị na-adịghị ike aka, unu aghaghịkwa iburu okwu Onyenwe anyị Jizọs n’uche, mgbe ya onwe ya sịrị, ‘A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.’ ” (Ọrụ 20:35) Ọ bụghị naanị na Pọl dị njikere ịgba ụmụnna ya ume, kama ọ dịkwa njikere ‘ikwe ka e jiri ya mee ihe n’ụzọ zuru ezu,’ maka ha. (2 Kọr. 12:15) Ndị okenye kwesịkwara ime ka Pọl. Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka ha kwesịrị iji na-agba ụmụnna ha ume, kama ha kwesịkwara igosi na ihe banyere ụmụnna ha na-emetụ ha n’obi, si otú ahụ gbaa ha ume.​—⁠1 Kọr. 14:⁠3.

9. Olee otú ndị okenye ga-esi nye ụmụnna ndụmọdụ ya agbaa ha ume?

9 Mgbe ụfọdụ, ndị okenye kwesịrị inye ụmụnna ha ndụmọdụ iji gbaa ha ume. Ha kwesịrị isi na Baịbụl mụta otú ha ga-esi eme ya. Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, o gosiri anyị ụzọ magburu onwe ya anyị kwesịrị isi enye ndụmọdụ mgbe o zigaara ọgbakọ ndị dị n’Eshia Maịnọ ozi. O nwere ndụmọdụ ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ ọ ga-enye ọgbakọ ndị dị n’Efesọs, Pagamọm, na Tayataịra. Ma, tupu ya enye ha ndụmọdụ ndị ahụ, ọ jara ha mma maka ihe ọma niile ha na-eme. (Mkpu. 2:​1-5, 12, 13, 18, 19) Ọ gwara ọgbakọ dị na Leodisia, sị: “Ndị niile m hụrụ n’anya nke ukwuu ka m na-abara mba, na-adọkwa aka ná ntị. Ya mere, na-anụ ọkụ n’obi, chegharịakwa.” (Mkpu. 3:19) Ndị okenye kwesịkwara iṅomi Kraịst ma ha nyewe ndụmọdụ.

Ọ BỤGHỊ NAANỊ NDỊ OKENYE KWESỊRỊ ỊNA-AGBA NDỊ ỌZỌ UME

Ndị nne na nna, ùnu na-akụziri ụmụ unu otú ha ga-esi na-agba ndị ọzọ ume? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Olee otú anyị niile nwere ike isi gbarịta ibe anyị ume?

10 Ọ bụghị naanị ndị okenye kwesịrị ịna-agba ndị ọzọ ume. Pọl gbara Ndị Kraịst niile ume ka ha na-ekwu “okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma.” (Efe. 4:29) Anya kwesịrị ịna-eru anyị ala ka anyị mata mgbe ụmụnna anyị nwere mkpa. Pọl gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru, sị: “Na-agbatịnụ aka kụdara akụda na ikpere na-adịghị ike, na-emerenụ ụkwụ unu ụzọ kwụ ọtọ, ka e wee ghara ikwokapụ ihe dara ngwọrọ ná nkwonkwo ya, kama ka e wee gwọọ ya.” (Hib. 12:​12, 13) Anyị niile, ma ndị na-eto eto, nwere ike iji okwu ọnụ anyị gbarịta ibe anyị ume.

11. Olee ihe nyeere Nwanna Nwaanyị Marthe aka mgbe ọ dara mbà n’obi?

11 Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Marthe * nwere mgbe ọ dara mbà n’obi. Ọ sịrị: “Mgbe m kpechara ekpere otu ụbọchị, ahụrụ m otu nwanna nwaanyị katarala ahụ́. O gosiri m na ya hụrụ m n’anya ma metere m ebere, bụ́kwanụ ihe m chọrọ mgbe ahụ. Ọ kọọrọ m ihe ndị o mere mgbe ụdị ihe a mere ya. Ihe ndị ọ gwara m mere ka m mata na ọ bụghị naanị m nwetụrụla nsogbu a.” O nwere ike ịbụ na nwanna nwaanyị ahụ amaghị na ihe ahụ ọ gwara Marthe baara ya uru.

12, 13. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 2:​1-4?

12 Pọl gwara ndị nọ n’ọgbakọ Filipaị, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na e nwere agbamume ọ bụla n’ime Kraịst, ọ bụrụ na e nwere ngụgụ obi ọ bụla nke ịhụnanya, ọ bụrụ na e nwere mmụọ ọ bụla nke ichebara ibe unu echiche, ọ bụrụ na e nwere obi ọmịiko na obi ebere ọ bụla, meenụ ka ọṅụ m zuo ezu site n’inwe otu obi nakwa inwe otu ịhụnanya, bụrụ ndị e jikọrọ ná mkpụrụ obi, na-eburu otu echiche ahụ n’uche, ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu, na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”​—⁠Fil. 2:​1-4.

13 Anyị niile kwesịrị ịgba mbọ na-achọ ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Ka anyị nwee ike ịgba ụmụnna anyị ume, anyị kwesịrị iji ịhụnanya na-akasi ha obi, na-egosi ha na anyị na-echebara ha echiche, ma na-enwere ha ọmịiko.

IHE NDỊ NWERE IKE ỊGBA ANYỊ UME

14. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi gbaa mmadụ ume?

14 Anyị nụ na ndị anyị nyeere aka n’oge ndị gara aga ka na-efe Jehova, ọ na-agba anyị ume. Otú ahụ ka ọ dịkwa Jọn onyeozi. Ọ sịrị: “Ọ dịghị ihe ọzọ ga-eme ka m nwee obi ekele karịa ihe a, ya bụ, na m ga na-anụ na ụmụ m na-eje ije n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Obi na-atọ ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ ụtọ ma ha nụ na ụfọdụ n’ime ndị ha nyeere aka ọtụtụ afọ gara aga ha abata n’ọgbakọ ka na-efe Jehova, ma ọ bụdị na ha na-asụ ụzọ. Ichetara ọsụ ụzọ dara mbà n’obi ihe ndị o mere n’oge gara aga nke mere ya obi ụtọ, nwere ike ịgba ya ume.

15. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi gbaa ndị ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi, ume?

15 Ọtụtụ ndị nlekọta sekit kwuru na ha na ndị nwunye ha letachaa ọgbakọ, ụmụnna edetara ha akwụkwọ ozi iji kelee ha, na ọ na-agba ha ume. Otú ahụ ka ọ na-adịkwa ndị okenye, ndị ozi ala ọzọ, ndị ọsụ ụzọ na ndị na-eje ozi na Betel ma a na-ekele ha maka ozi ha na-ejere Jehova.

OTÚ ANYỊ NIILE GA-ESI NA-AGBARỊTA IBE ANYỊ UME

16. Olee ihe ndị dị mfe anyị nwere ike ime iji gbaa mmadụ ume?

16 Ọ gaghị adị mma ma anyị chee na anyị agaghị agbali ndị ọzọ ume n’ihi na ọ naghị adịrị anyị mfe ịgwa mmadụ okwu. Ịgba ndị ọzọ ume esighị oké ike. I nwere ike mụmụọrọ mmadụ ọnụ ọchị ma i kelewe ya, ma ọ mụmụrụghị gị ọnụ ọchị, o nwere ike ịbụ na e nwere ihe na-enye ya nsogbu. Naanị ige ya ntị nwere ike ịgba ya ume.​—⁠Jems 1:⁠19.

17. Olee ihe gbara otu nwanna na-eto eto ume?

17 Obi jọrọ otu nwanna na-eto eto aha ya bụ Henri njọ mgbe ndị ikwu ya hapụrụ ọgbakọ. Papa ya, onye bụbu okenye a na-akwanyere ùgwù, sokwa hapụ ọgbakọ. Otu onye nlekọta sekit chọpụtara na obi adịchaghị ya mma, ya akpọrọ ya gaa n’ebe a na-ere kọfị. O gere ya ntị mgbe ọ na-akọrọ ya otú o si dịrị ya n’obi. Ihe a onye nlekọta a mere gbara ya ume. Henri bịaziri ghọta na ihe ọ ga-eme iji nyere ndị ezinụlọ ya aka ka ha lọghachi n’ọgbakọ bụ ịnọgide na-efe Jehova. Ihe ọzọ kasiri ya obi bụ ịgụ Abụ Ọma 46; Zefanaya 3:17; na Mak 10:​29, 30.

Anyị niile nwere ike ịgbarịta ibe anyị ume (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. (a) Gịnị ka Eze Sọlọmọn kwuru banyere ịgba mmadụ ume? (b) Olee ihe Pọl onyeozi kwuru ka anyị mee?

18 Akụkọ Marthe na Henri na-egosi na anyị nwere ike ịgba nwanna kwesịrị ka a gbaa ya ume, ume. Eze Sọlọmọn kwuru, sị: “Leekwa nnọọ ka okwu e kwuru n’oge ya si dị mma! Ìhè nke anya na-eme ka obi ṅụrịa; akụkọ dị mma na-eme ka ọkpụkpụ maa abụba.” (Ilu 15:​23, 30) Ihe ọzọ nwere ike ịgba onye dara mbà n’obi ume bụ ịgụrụ ya ihe dị n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na jw.org. Ihe Pọl kwuru gosiri na ịgụkọ abụ Alaeze ọnụ nwere ike ịgba mmadụ ume. Ọ sịrị: “Jirinụ abụ ọma na otuto a na-enye Chineke na abụ ime mmụọ na amara na-ezi ibe unu ihe, na-adụkwa ibe unu ọdụ *, na-abụkunụ Jehova abụ n’ime obi unu.”​—⁠Kọl. 3:16; Ọrụ 16:⁠25.

19. Olee ihe mere ịgbarịta ibe anyị ume ga-eji dị ezigbo mkpa n’ọdịnihu? Gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịna-eme?

19 Anyị kwesịrị ịna-agbarịta ibe anyị ume, karịchaa ugbu a anyị na-ahụ ka ụbọchị Jehova “na-eru nso.” (Hib. 10:25) Obi ga-adị anyị ụtọ ma anyị mee ihe Pọl kwuru. Ọ sịrị: “Na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu, dị nnọọ ka unu na-eme.”​—⁠1 Tesa. 5:⁠11.

^ para. 11 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 18 Ma ọ bụ na-agbakwa ibe unu ume.