Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eto Eto, Ùnu Na-elekwasị Anya n’Ihe Unu Kpebiri Ime n’Ozi Jehova?

Ndị Na-eto Eto, Ùnu Na-elekwasị Anya n’Ihe Unu Kpebiri Ime n’Ozi Jehova?

“Nyefee ọrụ gị n’aka Jehova, atụmatụ gị ga-eguzosikwa ike.”​​—⁠ILU 16:⁠3.

ABỤ: 135, 144

1-3. (a) Olee ihe na-anaghị adịrị ndị na-eto eto mfe ime? Olee ihe anyị nwere ike iji maa atụ ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka n’ụdị ihe a?

WERE ya na ị chọrọ ime njem gaa ebe dị anya maka ihe omume dị mkpa. Ka i nwee ike iru ebe ahụ, i kwesịrị ịba ụgbọala. Mgbe i rutere n’ọdụ ụgbọala, ị maghị ihe ị ga-eme eme n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị ọzọ na-eme njem, nakwa ọtụtụ ụgbọala n’ebe ahụ. Ma, ọ dị mma na ị ma ihe i bu n’obi ime, ya bụ, ịba n’ụgbọala ga-eburu gị ebe ị na-aga. Ị gaghị aba ụgbọala ọ bụla ị hụrụ n’ihi na ị ma na ọ gaghị eburu gị ebe ị chọrọ ịga.

2 E nwere ike iji ndị na-eto eto tụnyere ndị ahụ na-eme njem. E nwere ọtụtụ ihe ha ga-ekpebi ime ná ndụ. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ime ka ha ghara ịma ihe ha ga-eme eme. Ndị na-eto eto, unu nwere ike ime ka ihe dịrị unu mfe ma unu mara ihe unu chọrọ ime ná ndụ. Olee ebe unu kwesịrị ilekwasị anya?

3 Isiokwu a zara ajụjụ a. Ọ gbara ndị na-eto eto ume ka ha lekwasị anya n’ime ihe dị Jehova mma. Nke a pụtara ime ihe Jehova kwuru ma ha na-ekpebi ihe ndị dị ka ebe ha ga-agụru akwụkwọ, ụdị ọrụ ha ga-arụ, ma ọ bụ ma hà ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ma mụọ ụmụ. Ọ pụtakwara na ha ga-agbalịsi ike mee ihe ndị ha kpebiri ime n’ozi Jehova. Ọ bụrụ na ndị na-eto eto elekwasị anya n’ozi ha na-ejere Jehova, obi ga-esi ha ike na ọ ga-agọzi ha ma mee ka ihe gaziere ha.​—⁠Gụọ Ilu 16:⁠3.

GỊNỊ MERE NDỊ NA-ETO ETO JI KWESỊ INWE IHE NDỊ HA CHỌRỌ IME N’OZI JEHOVA?

4. Olee ihe anyị ga-eleba anya n’isiokwu a?

4 Ịmalite n’oge nwee ihe ndị anyị chọrọ ime n’ozi Jehova na-aba uru. Maka gịnị? Ka anyị leba anya n’ihe atọ mere o ji aba uru. Nke mbụ na nke abụọ ga-egosi na ọ bụrụ na anyị agbalịa na-eme ihe ndị anyị kpebiri ime n’ozi Jehova, ọ ga-eme ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma. Nke atọ ga-egosi uru ọ bara mmadụ ịmalite n’oge kpebie ihe ndị ọ ga-eme n’ozi Jehova.

5. Olee ihe kacha mkpa mere anyị ji ekpebi ihe ndị anyị ga-eme n’ozi Jehova?

5 Ihe kacha mkpa mere anyị ji ekpebi ihe ndị anyị ga-eme n’ozi Jehova bụ ka anyị gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka otú o si hụ anyị n’anya, nakwa n’ihi ihe ndị o meere anyị. Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Ọ dị mma ikele Jehova ekele . . . N’ihi na gị onwe gị, Jehova, emewo ka m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi ọrụ gị; m na-eti mkpu ọṅụ n’ihi ọrụ aka gị.” (Ọma 92:​1, 4) Ebe ị bụ onye na-eto eto, chee gbasara ihe niile Jehova meerela gị. O nyere gị ndụ, Baịbụl, ọgbakọ ya, mee ka ị mụta eziokwu Baịbụl, meekwa ka i nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. I kpebie ihe ndị ị ga-eme n’ozi Jehova, ị na-egosi Jehova na obi dị gị ụtọ maka ihe ọma ndị a. Nke a ga-eme ka ị bịarukwuo ya nso.

6. (a) Olee uru ikpebi ime ihe ndị anyị ga-eme n’ozi Jehova na-abara anyị? (b) Olee ihe ụmụaka nwere ike ikpebi na ha ga-eme n’ozi Jehova?

6 Ihe nke abụọ mere i ji kwesị ikpebi ihe ndị ị ga-eme n’ozi Jehova bụ na ị gbalịa na-eme ha, ị na-arụrụ Jehova ọrụ dị mma nke ga-eme ka gị na ya dịrịkwuo ná mma. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.” (Hib. 6:10) Ị dịghị ntakịrị ikpebi ihe ndị ị ga-eme n’ozi Jehova. Nwata nwaanyị aha ya bụ Christine dị afọ iri mgbe o kpebiri ịna-agụ akụkọ ndụ ndị ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi. Nwata nwoke aha ya bụ Toby dị afọ iri na abụọ mgbe o kpebiri na ya ga-agụcha Baịbụl tupu e mee ya baptizim. Maxim dị afọ iri na otu, nwanne ya nwaanyị aha ya bụ Noemi adịrị afọ iri mgbe e mere ha baptizim. Ha abụọ kpebiri na ha ga-eje ozi na Betel. Ka uche ha nwee ike ịdịgide na ya, ha mapawara fọm ndị chọrọ ije ozi na Betel na-edejupụta n’ahụ́ ụlọ ha. Gịnwa kwanụ? Ì nwere ike iche ụfọdụ n’ime ihe ndị i nwere ike ikpebi ime n’ozi Jehova ma gbalịa ka i mewe ha?​—⁠Gụọ Ndị Filipaị 1:​10, 11.

7, 8. (a) Olee otú mmadụ inwe ihe ndị ọ chọrọ ime n’ozi Jehova ga-esi mee ka ọ dịrị ya mfe ime mkpebi? (b) Gịnị mere otu onye na-eto eto ji kpebie na ọ gaghị aga mahadum?

7 Olee ihe nke atọ mere ndị na-eto eto ji kwesị ịmalite n’oge kpebie ihe ndị ha ga-eme n’ozi Jehova? Ọ bụ n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe ndị ha ga-ekpebi ime. Ha ga-ekpebi ebe ha ga-agụru n’akwụkwọ, ụdị ọrụ ha ga-arụ, nakwa ihe ndị ọzọ. Ime mkpebi dị ka mmadụ ịhọrọ ụzọ ọ ga-eso mgbe o ruru ebe ụzọ wara ngalaba. Ị mara ebe ị na-aga, ọ ga-adịrị gị mfe ịhọrọ ụzọ nke i kwesịrị iso. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe ndị ị na-eme ná ndụ. Ị mara ihe ndị ị chọrọ ime, ime ezigbo mkpebi agaghị esiri gị ike. Ilu 21:5 kwuru, sị: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru.” Ọ bụrụ na ị malite n’oge kpebiwe ihe ndị dị mma ị ga-eme, ihe ga-amalitekwa n’oge gaziwere gị. Mgbe Damaris na-eto eto, ọ chọpụtara na ime otú ahụ bara uru mgbe ọ chọrọ ikpebi ihe dị mkpa ọ ga-eme.

8 Damaris mere nke ọma n’ule ikpeazụ o lere n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ọ gaara aga mahadum gụọ gbasara iwu n’akwụghị ụgwọ ọ bụla, ma, ọ hapụrụ ya rụwa ọrụ n’ụlọ akụ̀. Maka gịnị? O kwuru, sị: “Ọ bụ mgbe m dị obere ka m kpebiri ịsụ ụzọ. Ọ pụtara na agaghị m eji oge m niile na-arụ ọrụ. A sị na m gara mahadum, m gaara na-arụ ọrụ a na-akwụ m ezigbo ụgwọ, ma ọ gaara esiri m ike inweta ọrụ m ga na-arụ ụbọchị ole na ole n’izu.” Damaris asụọla ụzọ afọ iri abụọ ugbu a. Ọ̀ na-adị ya ka o mere mkpebi dị mma mgbe ọ na-eto eto? Ọ sịkwara: “N’ebe m na-arụ ọrụ n’ụlọ akụ̀, m na-ahụ ndị ọkàiwu. Ha na-arụ ọrụ m gaara na-arụ ma ọ bụrụ na m gụrụ gbasara iwu. Ma, ọtụtụ n’ime ha anaghị enwe obi ụtọ n’ọrụ ha na-arụ. Mkpebi m mere ịsụ ụzọ emeela ka m ghara ịna-arụ ọrụ gaara eme m obi ọjọọ, meekwa ka obi na-atọ m ụtọ kemgbe ọtụtụ afọ m nọ na-ejere Jehova ozi.”

9. Gịnị mere e kwesịrị iji jaa ndị na-eto eto mma?

9 Ọtụtụ puku ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ n’ụwa niile kwesịrị ka a jaa ha mma. Ha ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi ma na-elekwasị anya n’ihe ndị ha kpebiri ime n’ozi Jehova. Ha na-enwekwa ezigbo obi ụtọ ma na-amụta otú ha ga-esi na-eme ihe Jehova chọrọ ha n’aka n’ihe niile ha na-eme, ma n’agụmakwụkwọ ha, ọrụ ha, nakwa n’ezinụlọ. Sọlọmọn kwuru, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi. . . . N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.” (Ilu 3:​5, 6) Jehova ejighị ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ egwu egwu. Ọ hụrụ ha n’anya nke ukwuu. Ọ ga-echebekwa ha, duzie ha ma gọzie ha.

KWADEBE NKE ỌMA ỊKỌRỌ NDỊ ỌZỌ BANYERE JEHOVA

10. (a) Gịnị mere ozi ọma ji kwesị ịbụ ihe dị anyị ezigbo mkpa? (b) Olee ihe anyị ga-eme ka anyị mụtakwuo otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma?

10 Onye na-eto eto anaghị eji ozi ọma eti epele ma o lekwasị anya n’ịchọ ime ihe dị Jehova mma. Jizọs Kraịst kwuru na ‘a ghaghị ibu ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ.’ (Mak 13:10) Ebe ọ bụ na e kwesịrị ikwusa ozi ọma n’egbughị oge, o kwesịrị ịbụ ihe kacha mkpa anyị kwesịrị ịna-eme. Ì nwere ike iwepụtakwu oge na-aga ozi ọma? Ì nwere ike ịsụ ụzọ? Ọ bụrụkwanụ na ịga ozi ọma anaghị atọcha gị ụtọ? Olee ihe ị ga-eme ka ị mụtakwuo otú ị ga-esi na-ezi ozi ọma? E nwere ihe abụọ ga-enyere gị aka: Kwadebe nke ọma, adala mbà ịgwa ndị ọzọ ihe ị ma banyere Jehova. I mee ihe ndị a, ị ga-ahụ otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ n’ozi ọma.

Olee otú i si akwadebe izi ndị mmadụ ozi ọma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)

11, 12. (a) Olee otú ndị na-eto eto nwere ike isi kwadebe izi ndị ọzọ ozi ọma? (b) Olee otú otu nwatakịrị nwoke si zie ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ ha?

11 I nwere ike ibu ụzọ kwadebe azịza ajụjụ ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe gị nwere ike ịjụ gị, dị ka “Olee ihe mere i ji kwere na Chineke dị?” E nwere isiokwu ndị dị na jw.org/⁠⁠ig ga-enyere ndị na-eto eto aka ịza ajụjụ ahụ. Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa ebe e dere NDỊ NA-ETO ETO, ị ga-ahụ akwụkwọ ị ga-eji edetu ihe nke isiokwu ya bụ, “Olee Ihe Mere M Ji Kwere na Chineke Dị?” Ọ ga-enyere gị aka ịkwadebe ihe ị ga-aza ma a jụọ gị ajụjụ a. Ị ga-ahụ amaokwu Baịbụl atọ ị ga-eji kọwaara ndị jụrụ gị ajụjụ gbasara ihe i kweere. Ha bụ Ndị Hibru 3:​4, Ndị Rom 1:​20, na Abụ Ọma 139:14. E nwekwara akwụkwọ ndị ọzọ e ji edetu ihe i nwere ike iji kwadebe azịza ajụjụ ndị ọzọ.​—⁠Gụọ 1 Pita 3:⁠15.

12 Mgbe ọ bụla i nwere ohere, gwa ụmụ akwụkwọ ibe gị ka ha na-aga na jw.org. Ọ bụ ihe a ka Luca mere. Mgbe ha na-ekwurịta banyere okpukpe dị iche iche na klas ha, ọ chọpụtara na akwụkwọ ha ji na-amụ ihe nwere ihe ndị na-abụghị eziokwu o kwuru banyere Ndịàmà Jehova. Ọ bụ eziokwu na ụjọ tụtụrụ ya, ọ gwara onye nkụzi ha na ya chọrọ ịkọwa nke bụ́ eziokwu banyere Ndịàmà Jehova, ya ekweta. Luca kọwaara ha ihe ndị o kweere, gosikwa ha ihe dị na jw.org. Onye nkụzi ahụ gwara ụmụ klas ya na ha laa, ka ha kirie katuun a na-ese na bọọdụ isiokwu ya bụ Otú Ị Ga-esi Emeri Onye Na-achọ Gị Okwu n’Emetụghị Ya Aka. Obi tọrọ Luca ezigbo ụtọ na ya ziri onye nkụzi ha na ụmụ klas ya ozi ọma.

13. Gịnị mere na ike ekwesịghị ịgwụ anyị mgbe nsogbu bịaara anyị?

13 Nsogbu bịara gị mgbe ụfọdụ, ike agwụla gị. (2 Tim. 4:⁠2) Gbalịa na-eme ihe ndị i kpebiri ime n’ozi Jehova. Ọ bụ ihe a ka Katharina mere. Mgbe ọ dị afọ iri na asaa, o kpebiri na ya ga na-ezi ndị niile ya na ha na-arụkọ ọrụ ozi ọma. Otu n’ime ha kparịrị ya ọtụtụ ugboro. Ma ọ kwụsịghị izi ha ozi ọma. Àgwà ọma ọ na-akpa mgbe ahụ a na-akparị ya masịrị onye ọrụ ibe ya aha ya bụ Hans. Hans malitere ịgụ akwụkwọ anyị, ịmụ Baịbụl, e meekwa ya baptizim. Katharina amaghịdị na ihe ndị a mere n’ihi na ọ kwagara ebe ọzọ. N’ihi ya, o juru ya anya mgbe afọ iri na atọ gachara, mgbe ya na ndị ezinụlọ ya bịara ọmụmụ ihe, na onye si esi bịa a kpọpụtara ka o kwuo okwu bụ Hans. Obi tọrọ Katharina ezigbo ụtọ na ya akwụsịghị ozi ọma ahụ o kpebiri na ya ga na-ezi ndị ọrụ ibe ya.

EKWELA KA IHE Ọ BỤLA MEGHARỊA GỊ ANYA

14, 15. (a) Gịnị ka ndị na-eto eto kwesịrị icheta ma ndị ọgbọ ha nyewe ha nsogbu ka ha soro ha na-eme ihe ọjọọ? (b) Olee ihe ga-enyere ha aka ka ha ghara ime ihe ndị ahụ?

14 Ihe ndị anyị kwurula n’isiokwu a agbaala gị ume ka i lekwasị anya ná mkpebi i mere ijere Jehova ozi. Nke a pụtara na ị ga-eji oge gị niile na-eme ihe ndị i kpebiri ime n’ozi Jehova. Ndị ọgbọ gị nwere ike iji oge ha niile na-ekpori ndụ. Ha nwekwara ike ịgwa gị ka i soro ha. I kwesịrị igosi ndị ọzọ na mkpebi ahụ i mere dị gị ezigbo mkpa. Ekwela ka ndị ọgbọ gị megharịa gị anya. Ọ bụrụ na ị nọ n’ọdụ ụgbọala ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a, ị̀ ga-abanye n’ụgbọala ọ bụla ị hụrụ n’ihi na ndị nọ na ya na-ekpori ndụ? Mbanụ.

15 E nwere ọtụtụ ụzọ ị ga-esi mee ka ndị ọgbọ gị ghara imegharị gị anya. Dị ka ihe atụ, gbaara ụdị ọnọdụ ọ bụla nwere ike ime ka ị baa ná nsogbu, ọsọ. (Ilu 22:⁠3) Chee gbasara nsogbu ndị o nwere ike ịkpatara gị ma i soro ha na-eme ihe ọjọọ. (Gal. 6:⁠7) Ihe ọzọ bụ ikweta na e kwesịrị inye gị ndụmọdụ. Ọ bụrụ na ị dị umeala n’obi, ọ ga-eme ka i gee ndị mụrụ gị nakwa ụmụnna ndị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ, ntị.​—⁠Gụọ 1 Pita 5:​5, 6.

16. Olee otú ihe mere Christoph si gosi na ọ dị mkpa ka anyị dịrị umeala n’obi?

16 Ịdị umeala n’obi mere ka Christoph nara ndụmọdụ e nyere ya. Obere oge e mechara ya baptizim, ọ malitere ịna-aga ebe a na-emega ahụ́. Ndị enyi ya nọ ebe ahụ gwara ya ka ọ bata n’òtù egwuregwu ha. Ọ gwara otu okenye gbasara ya. Okenye ahụ agwa ya ka o chee gbasara nsogbu o nwere ike ịkpatara ya tupu ya ekpebiwe ihe ọ ga-eme. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka ọ chọwa ịka ibe ya. Christoph mechara soro n’òtù ahụ. Ma ka oge na-aga, ọ chọpụtara na a na-eme ihe ike ebe ahụ, nakwa na e nwere ike imerụ ya ahụ́. Ọ gwakwara ụfọdụ ndị okenye, ha ejiri Baịbụl nye ya ndụmọdụ. Christoph kwuru, sị: “Jehova ziteere m ezigbo ndị ndụmọdụ, mụ egeekwa ya ntị, n’agbanyeghị na m gbutụrụ oge ime ihe ọ gwara m mee.” Ị̀ dị umeala n’obi ịnabata ezigbo ndụmọdụ e nyere gị?

17, 18. (a) Olee ihe Jehova chọrọ n’aka ndị na-eto eto taa? (b) Olee mmakwaara ndị agadi nwere ike ịna-akwa? Olee ihe ha ga-eme ka ha ghara ịkwa mmakwaara? Nye ihe atụ.

17 Baịbụl kwuru, sị: “Ṅụrịa ọṅụ, nwa okorobịa [ma ọ bụ nwa agbọghọbịa], mgbe ị bụ okorobịa, ka obi na-atọkwa gị ụtọ n’oge ị bụ okorobịa.” (Ekli. 11:⁠9) Ebe ị bụ nwa okorobịa ma ọ bụ agbọghọ, o doro anya na Jehova chọrọ ka obi na-atọ gị ụtọ. Isiokwu a akọwaala otu ụzọ i nwere ike isi eme ya. Lekwasị anya n’ihe ndị i kpebiri ime n’ozi Jehova, na-emekwa ihe Jehova kwuru n’ihe niile ị na-eme ná ndụ gị. Ị malite ngwa ngwa mewe ha, ị ga-ahụ na Jehova ga na-eduzi gị, na-echebe gị ma na agọzi gị. Chebara ndụmọdụ niile o si na Baịbụl na-enye gị echiche, ma mee ihe a Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.”​—⁠Ekli. 12:⁠1.

18 O nweghị onye ga-anọgide n’okorobịa. Ọ naghị ara ahụ́, ndị na-eto eto abụrụ agadi. Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị merela agadi na-akwa mmakwaara na ha emeghị mkpebi dị mma mgbe ha na-eto eto ma ọ bụkwanụ na o nweghị ihe ha kpebiri iji ndụ ha eme. Ma, ndị na-eto eto, bụ́ ndị lekwasịrị anya n’ihe ha kpebiri ime n’ozi Jehova ga na-enwe ezigbo obi ụtọ ugbu a, nakwa mgbe ha katarala ahụ́. Ọ bụ otú ahụ ka obi dị otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Mirjana. Mgbe ọ na-eto eto, ọ bụ azụ eru ala n’egwuregwu. A kpọrọ ya ka o soro n’Egwuregwu Olympic a na-eme n’oge snoo. Ma, ọ hapụrụ ya banye n’ozi oge niile. Mgbe ihe karịrị afọ iri atọ gachara, Mirjana na di ya ka nọ n’ozi oge niile. Mirjana sịrị: “Ịbụ onye a ma ama, onye a na-akwanyere ùgwù, onye ọnụ na-eru n’okwu, na onye bara ọgaranya anaghị adịgide, ọ naghịkwa eme ka mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ihe kacha mma mmadụ ga-ekpebi ime ná ndụ ya bụ ijere Chineke ozi, nakwa inyere ndị mmadụ aka ịmata ya.”

19. Gịnị mere o ji dị mma ka mmadụ lekwasị anya n’ihe ndị o kpebiri ime n’ozi Jehova mgbe ọ na-eto eto?

19 Ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ kwesịrị ka a jaa ha mma maka otú ha si lekwasị anya n’ozi ha na-ejere Jehova n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara ha. Otú ha si eme ya bụ ime ihe ndị ahụ ha kpebiri ime n’ozi Jehova, na iji ozi ọma kpọrọ ihe. Ihe ọzọ bụ na ha kpebisiri ike na ụwa agaghị emegharị ha anya. Obi kwesịrị isi ha ike na mbọ ha na-agba n’ozi Jehova agaghị efu ọhịa. Ụmụnna ha hụrụ ha n’anya, kwụ ha n’azụ. Ha tụkwasị Jehova obi, ihe ndị ha kpebiri ime ga-aga nke ọma.