ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Eprel 2020

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Jun 1–Julaị 5, 2020.

Agha Ga-esi n’Ebe Ugwu Bịa

Isiokwu a na-amụ amụ nke 14: Jun 1-7, 2020. Olee ihe anọ mere o ji dị mkpa ka anyị gbanwee otú anyị sibu ghọta amụma dị na Joel isi nke 1 na nke 2?

Olee Otú I Si Ewere Ndị Ị Na-ezi Ozi Ọma?

Isiokwu a na-amụ amụ nke 15: Jun 8-14, 2020. Isiokwu a ga-akụziri anyị otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jizọs na Pọl onyeozi ma na-eche gbasara ihe ndị anyị na-ezi ozi ọma kweere na ihe ndị na-amasị ha, matakwa na ha nwere ike imecha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Na-eme Ka Jehova Ma Gị na Ụmụnna Gị Mekọwa Ihe

Isiokwu a na-amụ amụ nke 16: Jun 15-21, 2020. Jehova nyeere Jona, Ịlaịja, Hega, na Lọt aka. Isiokwu a ga-enyere gị aka ịmata otú i nwere ike isi mee ka Jehova ma i mesowe ndị ọzọ ihe.

“Ana M Akpọ Unu Ndị Enyi M”

Isiokwu a na-amụ amụ nke 17: Jun 22-28, 2020. E nwere ihe ndị na-eme ka o siere anyị ike ịbụ ezigbo ndị enyi Jizọs. Ma, anyị nwere ike imeri ha.

“Gbaruo ‘Ọsọ Ahụ n’Isi’

Isiokwu a na-amụ amụ nke 18: Jun 29–Julaị 5, 2020. Olee otú anyị niile nwere ike isi gbaruo ọsọ nke ndụ ahụ n’isi, ọ bụrụgodị na anyị na nká ma ọ bụ ọrịa na-alụ?