Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 15

Ihe Anyị Ga-amụta n’Ihe Ndị Ikpeazụ Jizọs Kwuru

Ihe Anyị Ga-amụta n’Ihe Ndị Ikpeazụ Jizọs Kwuru

“Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m; geenụ ya ntị.”—MAT. 17:5.

ABỤ NKE 17 “Achọrọ M”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Kọwaa ihe nọ na-eme mgbe Jizọs kwuru okwu ndị ikpeazụ o kwuru tupu ya anwụọ.

MGBE e bochara Jizọs ebubo ma ma ya ikpe ọnwụ maka ihe ọ na-emeghị, kwaa ya emo, pịa ya ihe, a kpọgideziri ya n’osisi ịta ahụhụ, kụọ ya ntu n’ụkwụ na n’aka. Ahụ́ na-afụ ya ụfụ ma ọ chọọ iku ume ma ọ bụ chọọ ikwu okwu. Ma, ọ ga-ekwurịrị okwu n’ihi na e nwere ihe dị mkpa ọ chọrọ ikwu. Ihe a na-eme n’ehihie abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, afọ 33.

2 Ka anyị leba anya n’ihe ndị ahụ Jizọs kwuru nakwa n’ihe ndị anyị ga-amụta na ha. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ka anyị ‘gee ya ntị.’—Mat. 17:5.

“NNA, GBAGHARA HA”

3. Olee ndị ọ ga-abụ ha ka Jizọs bu n’obi sị: “Nna, gbaghara ha”?

3 Gịnị ka Jizọs kwuru? Mgbe a kpọgidere Jizọs n’elu osisi ịta ahụhụ, ọ rịọrọ Nna ya, sị: “Nna, gbaghara ha.” Ole ndị ọ sị ka a gbaghara? Ihe ọzọ o kwuru mere ka o doo anya. Ọ sịrị: “N’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.” (Luk 23:33, 34) Ọ ga-abụ na ọ bụ ndị agha Rom ahụ kpọgidere ya n’osisi ịta ahụhụ ka ọ sịrị ka a gbaghara. N’eziokwu, ha amaghị onye ọ bụ. Ndị ọzọ o bu n’obi nwekwara ike ịbụ ụfọdụ ndị so n’ìgwè mmadụ ahụ kwuru ka a kpọgide ya n’elu osisi ndị ga-emecha ghọọ ndị na-eso ụzọ ya. (Ọrụ 2:36-38) Jizọs ekweghị ka ihe ọjọọ ha mere ya mee ka o wewe iwe ma ọ bụ buwere ha iwe n’obi. (1 Pita 2:23) Kama nke ahụ, ọ rịọrọ Jehova ka ọ gbaghara ndị ahụ chọrọ igbu ya.

4. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si dị njikere ịgbaghara ndị na-emegide ya?

4 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ Jizọs kwuru? Anyị kwesịrị ịdị njikere ịgbaghara ndị ọzọ otú ahụ Jizọs mere. (Kọl. 3:13) Ụfọdụ ndị, ma ndị ikwu anyị, nwere ike ịna-emegide anyị n’ihi na ha aghọtaghị ihe anyị kweere na otú anyị si ebi ndụ. Ha nwere ike ikwu ihe na-abụghị eziokwu gbasara anyị, menye anyị ihere n’ihu ndị ọzọ, mebisie akwụkwọ anyị ma ọ bụkwanụ kwuo na ha ga-emerụ anyị ahụ́. Kama ibuwere ndị na-emegide anyị iwe n’obi, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o mepee anya ha ka ha nabata eziokwu. (Mat. 5:44, 45) Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike ịgbaghara ndị na-emegide anyị, nke kacha nke, ma ọ bụrụ na ha emekpọọla anyị ọnụ. Ma, anyị buwere ha iwe n’obi, anyị na-akpatara onwe anyị nsogbu. Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “M ghọtara na ọ bụrụ na mụ agbaghara mmadụ, ọ pụtaghị na ihe ahụ o mere m dị m mma ma ọ bụkwanụ na m gbara nkịtị ka ọ na-eme m ihe masịrị ya. Ihe ọ pụtara bụ na m kpebiri na agaghị m eburu ya iwe n’obi.” (Ọma 37:8) Ọ bụrụ na anyị agbaghara mmadụ, ihe ọ pụtara bụ na anyị achọghị ka ihe ọjọọ o mere anyị ka na-ewe anyị iwe.—Efe. 4:31, 32.

“MỤ NA GỊ GA-ANỌ NA PARADAỊS”

5. Olee nkwa Jizọs kwere onye omekome a kpọgidere ya na ya n’elu osisi ịta ahụhụ? Oleekwa ihe mere o ji kwe ya nkwa ahụ?

5 Gịnị ka Jizọs kwuru? E nwere ndị omekome abụọ a kpọgidere ha na Jizọs n’elu osisi ịta ahụhụ. Na mbụ, ha abụọ nọ na-akọcha Jizọs. (Mat. 27:44) Ma, otu n’ime ha mechara gbanwee obi ya. Ọ ghọtara na o nweghị ihe “na-ekwesịghị ekwesị” Jizọs mere. (Luk 23:40, 41) O kwuru ihe gosiri na o kwetara na a ga-akpọlite Jizọs n’ọnwụ, e mechaakwa, ya aghọọ eze. Ọ gwara Jizọs, sị: “Jizọs, cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” (Luk 23:42) Nwoke ahụ gosiri na o nwere ezigbo okwukwe. Jizọs gwara ya, sị: “N’ezie, ana m asị gị taa, mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) * Ị̀ chọpụtara na ihe Jizọs kwuru mere ka o doo anya na ọ bụ nwoke ahụ ka o kwere nkwa ahụ? Jizọs gwara onye omekome ahụ ihe ga-eme ka o nwee olileanya n’ihi na ọ ma na Nna ya bụ onye obi ebere.—Ọma 103:8.

6. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Jizọs gwara onye omekome ahụ?

6 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ Jizọs kwuru? Jizọs na-eme nnọọ ka Nna ya. (Hib. 1:3) Jehova dị njikere ịgbaghara anyị na imere anyị ebere ma ọ bụrụ na anyị egosi na ihe ọjọọ anyị mere n’oge gara aga wutere anyị ma gosi na anyị nwere okwukwe na ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị n’ihi àjà ahụ Jizọs Kraịst chụrụ. (1 Jọn 1:7) O nwere ụfọdụ ndị ọ na-esiri ike ikweta na Jehova ga-agbaghara ha mmehie ndị ha mere n’oge gara aga. Ọ bụrụ na ọ na-adị gị otú ahụ mgbe ụfọdụ, chebaragodị ihe a echiche: Obere oge tupu Jizọs anwụọ, o meere onye omekome ahụ ka malitere inwe okwukwe n’ebe ọ nọ ebere. O doro anya na Jehova ga-emere ndị ohu ya na-agbalịsi ike irubere iwu ya isi ebere karịa.—Ọma 51:1; 1 Jọn 2:1, 2.

“LEE NWA GỊ! . . . LEE NNE GỊ!”

7. Dị ka e kwuru na Jọn 19:26, 27, gịnị ka Jizọs gwara Meri na Jọn, gịnịkwa mere o ji gwa ha ya?

7 Gịnị ka Jizọs kwuru? (Gụọ Jọn 19:26, 27.) Jizọs nọ na-eche gbasara nne ya, onye o nwere ike ịbụ na o nweghịzi di. O nwere ike ịbụ na ụmụnne ya ga-enyeli mama ya ihe ndị dị ya mkpa. Ma, ònye ga-enyere ya aka ịnọgide na-efe Chineke? O nweghị ihe gosiri na ụmụnne Jizọs aghọọla ndị na-eso ụzọ ya n’oge ahụ. Ma, Jọn bụ otu n’ime ndịozi Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi. Ya na Jizọs dịkwa n’ezigbo mma. Jizọs na-ewere ndị sooro ya na-efe Jehova ka ndị ezinụlọ ya. (Mat. 12:46-50) N’ihi ya, ebe Jizọs na-eche gbasara nne ya, ọ gwara Jọn ka ọ na-elekọta ya n’ihi na ọ ma na ọ ga-enyere ya ka ịnọgide na-efe Jehova. Ọ gwaziri nne ya, sị: “Lee nwa gị!” Gwakwa Jọn, sị: “Lee nne gị!” Malite ụbọchị ahụ gawa, Jọn weere Meri ka nne ya, na-elekọtakwa ya otú ọ ga-esi elekọta nne nke ya. Ihe a Jizọs mere gosiri na ọ hụrụ nne ya n’anya n’ihi na ọ bụ ya lekọtara ya mgbe a mụrụ ya, nọnyekwara ya mgbe ọ na-anwụ.

8. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jizọs gwara Meri na Jọn?

8 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ Jizọs kwuru? Anyị na ụmụnna anyị nwere ike ịdị ná mma karịa ndị ezinụlọ anyị. Ndị ezinụlọ anyị nwere ike imegide anyị ma ọ bụdị gbahapụ anyị. Ma, Jizọs kwere anyị nkwa na ọ bụrụ na anyị anọrọ Jehova na ọgbakọ ya nso, anyị ga-enweta ihe ndị funahụrụ anyị “okpukpu otu narị.” Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị ga-abụrụ anyị ụmụ ndị nwoke, ụmụ ndị nwaanyị, nne ma ọ bụ nna hụrụ anyị n’anya. (Mak 10:29, 30) Olee otú obi na-adị gị na i so n’ezinụlọ dị n’otu n’ihi na ha nwere okwukwe ma hụ ibe ha na Jehova n’anya?—Kọl. 3:14; 1 Pita 2:17.

“CHINEKE M, GỊNỊ MERE I JI HAPỤ M?”

9. Gịnị ka ihe Jizọs kwuru na Matiu 27:46 na-agwa anyị?

9 Gịnị ka Jizọs kwuru? Obere oge tupu Jizọs anwụọ, o tiri mkpu, sị: “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?” (Mat. 27:46) Baịbụl ekwughị ihe mere Jizọs ji kwuo ihe a. Ma, chetụgodịnụ echiche ihe okwu ahụ pụtara. Otu ihe anyị ma bụ na ihe ndị ahụ Jizọs kwuru mezuru amụma e buru n’Abụ Ọma 22:1. * Ihe ọzọ bụkwa na okwu ndị ahụ mere ka anyị ghọta na Jehova agbaghị Ọkpara ya “ogige gburugburu.” (Job 1:10) Jizọs ghọtara na Nna ya hapụrụ ya ka ndị iro ya nwaa ya ruo ọnwụ. O nwetụbeghịkwa onye ọzọ a nwara otú ahụ. Ihe ọzọ bụkwa na okwu ndị ahụ gosiri na o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla Jizọs mere a ga-eji maka ya gbuo ya.

10. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jizọs gwara Nna ya?

10 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ Jizọs kwuru? Otu ihe anyị ga-amụta bụ na anyị ekwesịghị ịtụwa anya na Jehova ga-ewepụrụ anyị ihe niile nwere ike itinye anyị n’ọnwụnwa. Ebe ọ bụ na a nwara Jizọs ruo ọnwụ, anyịnwa kwesịkwara ịdị njikere ikwesị ntụkwasị obi, ọ bụrụgodị na a ga-anwa anyị ruo ọnwụ. (Mat. 16:24, 25) Ma, obi siri anyị ike na Chineke agaghị ekwe ka a nwaa anyị karịa ihe anyị ga-edili. (1 Kọr. 10:13) Ihe ọzọ anyị mụtara bụ na e nwere ike ịta anyị ahụhụ maka ihe anyị na-emeghị otú ahụ e mere Jizọs. (1 Pita 2:19, 20) Ihe mere e ji na-emegide anyị abụghị n’ihi na o nwere ihe ọjọọ anyị mere. Kama, ọ bụ n’ihi na anyị abụghị nke ụwa, nakwa n’ihi na anyị na-ekwusa ozi ọma. (Jọn 17:14; 1 Pita 4:15, 16) Jizọs ghọtara ihe mere Jehova ji kwe ka ọ taa ahụhụ. Ma, e nwere ụfọdụ ndị na-efe Chineke tara ahụhụ ma na-eche mgbe ụfọdụ ihe mere Chineke ji kwe ka ihe ụfọdụ mee ha. (Hab. 1:3) Chineke anyị bụ́ onye na-enwe ndidi na onye obi ebere anaghị ewere ha ka ndị na-enweghị okwukwe, kama, ọ ma na nkasi obi nke naanị ya nwere ike inye dị ha mkpa.—2 Kọr. 1:3, 4.

“AKPỊRỊ NA-AKPỌ M NKỤ”

11. Gịnị mere Jizọs ji kwuo ihe e dere na Jọn 19:28?

11 Gịnị ka Jizọs kwuru? (Gụọ Jọn 19:28.) Gịnị mere Jizọs ji sị: “Akpịrị na-akpọ m nkụ.” Ọ bụ “iji mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ,” ya bụ, amụma ahụ e dere n’Abụ Ọma 22:15, ebe sịrị: “Ike adịkwaghị m, adịzi m ka ibe eju, e mewokwa ka ire m rapara n’ágbụ̀ m.” Ihe ọzọ bụkwa na ọ ga-abụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ n’ihi ahụhụ ndị ọ tarala nakwa ahụ́ fụrụ ụfụ n’elu osisi ịta ahụhụ ahụ. Ọ chọrọ ihe ga-atụjụ ya akpịrị.

12. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’okwu Jizọs bụ́, “Akpịrị na-akpọ m nkụ”?

12 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ Jizọs kwuru? Jizọs ewereghị ya na onye dị ka ya ekwesịghị ikwu otú ọ dị ya. Anyịnwa kwesịkwara ịna-ekwu otú ọ dị anyị. Ụfọdụ n’ime anyị anaghị achọkarị ịgwa ndị ọzọ otú ihe si dịrị ha. Ma, ọ bụrụ na ọ daba na anyị chọrọ ka e nyere anyị aka, anyị kwesịrị ikwu ozugbo ka e nyere anyị aka. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị emeela okenye ma ọ bụkwanụ na ahụ́ esichaghị anyị ike, anyị nwere ike ịgwa enyi anyị ka o buru anyị gaa ebe anyị ga-azụrụ ihe ma ọ bụ gaa ụlọ ọgwụ. Ọ bụrụ na anyị dara mbà ma ọ bụkwa na o nwere ihe mere obi ji na-ajọ anyị njọ, anyị nwere ike ịgwa otu okenye ma ọ bụ Onye Kraịst ọzọ ma nke a na-akọ ka o gee anyị ntị ma ọ bụ gwa anyị “okwu ọma” ga-eme ka obi dị anyị mma. (Ilu 12:25) Ka anyị chetakwa na ụmụnna anyị hụrụ anyị n’anya, ha chọkwara inyere anyị aka ‘n’oge nsogbu.’ (Ilu 17:17) Ma, ha agaghị amatali ihe dị anyị n’obi. Ha agaghị ama na anyị chọrọ enyemaka, ọ gwụla ma ànyị gwara ha.

“E MECHAWO YA!”

13. Gịnị ka isi Jizọs rubeere Chineke ruo ọnwụ rụzuru?

13 Gịnị ka Jizọs kwuru? N’ihe dị ka n’elekere anya atọ nke ehihie abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, Jizọs tiri mkpu, si: “E mechawo ya!” (Jọn 19:30) Ihe Jizọs kwuru mere ka anyị mata na obere oge tupu ya anwụọ, ọ ma na ya emechaala ihe niile Jehova chọrọ ka o mee. Isi Jizọs rubeere Nna ya ruo ọnwụ mere ka o mezuo ọtụtụ ihe. Nke mbụ, o gosiri na Ekwensu bụ onye ụgha. O gosiri na mmadụ zuru okè nwere ike ikwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ihe ọ bụla Ekwensu mere ya. Nke abụọ, Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ. Ndụ ya o ji chụọ àjà mere ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè na Chineke dịrị ná mma, meekwa ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Nke atọ, Jizọs mekwara ka a mata na ọ bụ Nna ya kwesịrị ịchị, meekwa ka a ghara ịna-ata Nna ya ụta.

14. Olee otú anyị kwesịrị ikpebisi ike isi na-ebi ndụ kwa ụbọchị? Kọwaa.

14 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ Jizọs kwuru? Anyị kwesịrị ikpebisi ike irubere Chineke isi kwa ụbọchị. Ka anyị leba anya n’ihe Nwanna Maxwell Friend kwuru. Ọ kụziri ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mgbe ọ na-ekwu gbasara irubere Chineke isi n’otu mgbakọ mba niile, ọ sịrị: “Echerekwala ka echi ruo tupu gị emee ihe i kwesịrị ime ma ọ bụ kwuo ihe i kwesịrị ikwu. Ì ji n’aka na echi ahụ ga-abịa? Na-ewere ụbọchị ọ bụla ka ụbọchị ikpeazụ i nwere igosi na i ruru eru ịdị ndụ ebighị ebi.” Ka anyị were ya na ụbọchị niile bụ ụbọchị ikpeazụ anyị nwere irubere Jehova isi. Anyị mee otú ahụ, anyị nọrọgodị n’ọnụ ọnwụ, anyị ga-enwe ike ịsị: “Jehova, emeela m ike m niile irubere gị isi, ime ka Setan bụrụ onye ụgha, na ime ka e doo aha gị nsọ ma gosi na ọ bụ naanị gị ruru eru ịchị eluigwe na ụwa.”

“N’AKA GỊ KA M NA-ENYEFE MMỤỌ M”

15. Dị ka e kwuru na Luk 23:46, olee ihe Jizọs ji obi ike kwuo?

15 Gịnị ka Jizọs kwuru? (Gụọ Luk 23:46.) Jizọs ji obi ike kwuo, sị: “Nna, n’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” Jizọs ma na ndụ ọ ga-adị n’ọdịnihu dị n’aka Jehova. Ọ makwa na Nna ya ga-echeta ya.

16. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ otu nwanna dị afọ iri na ise?

16 Gịnị ka anyị nwere ike ịmuta n’ihe ahụ Jizọs kwuru? Dị njikere inyefe ndụ gị n’aka Jehova. Ka i nwee ike ime otú ahụ, i kwesịrị iji “obi gị dum tụkwasị Jehova obi.” (Ilu 3:5) Ka anyị tụlee gbasara otu nwa okorobịa dị afọ iri na ise aha ya bụ Jọshụa. Ọ bụ Onyeàmà Jehova. E nwere ọrịa ọjọọ ya na ya na-alụ. O kweghị ka e si ụzọ megidere iwu Chineke gwọọ ya. Obere oge tupu ya anwụọ, ọ gwara mama ya, sị: “Mama, anọ m n’aka Jehova. . . . Obi sikwara m ike ịgwa gị na ama m na Jehova ga-akpọlite m n’ụbọchị mbilite n’ọnwụ. Ọ ma obi m. Ọ makwa na m hụrụ ya n’anya nke ukwuu.” * Anyị niile kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ọ bụrụ na mụ anọrọ n’ọnụ ọnwụ, m̀ ga-enyefe ndụ m n’aka Jehova ma nwee obi ike na ọ ga-echeta m?’

17-18. Olee ihe ndị anyị mụtarala? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị Anyị Na-amụta n’Ihe Ndị Ikpeazụ Jizọs Kwuru.”)

17 Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe dị mkpa n’ihe ndị ikpeazụ Jizọs kwuru. E chetaara anyị na anyị kwesịrị ịgbaghara ndị ọzọ ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-agbaghara anyịnwa. Anyị nwere ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị ndị dị njikere inyere anyị aka. Ọ bụrụ na anyị achọọ enyemaka, anyị kwesịrị ịgwa ha ka ha nyere anyị aka. Anyị ma na Jehova ga-enyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị. Anyị mụtakwara na ọ dị mkpa ka anyị were ụbọchị ọ bụla ka ụbọchị ikpeazụ anyị nwere irubere Jehova isi, obi esiekwa anyị ike na ọ ga-akpọlite anyị ma anyị nwụọ.

18 N’eziokwu, okwu ndị Jizọs kwuru mgbe ọ chọrọ ịnwụ n’osisi ịta ahụhụ nwere ike ịkụziri anyị ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị anyị mụtara, anyị na-eme ihe Jehova gwara anyị gbasara Ọkpara ya, nke bụ́, “Geenụ ya ntị.”—Mat. 17:5.

ABỤ NKE 126 Mụrụ Anya, Ka Okwukwe Gị Sie Ike, Dị Ike

^ par. 5 Dị ka e kwuru na Matiu 17:5, Jehova chọrọ ka anyị na-ege Ọkpara ya ntị. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịmụta n’ihe ndị Jizọs kwuru mgbe ọ nọ n’elu osisi ịta ahụhụ.

^ par. 5 Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na onye omekome ahụ ga-aga eluigwe, kama, na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ, ya ebiri na Paradaịs.

^ par. 9 Iji mata ihe ndị ọzọ ọ ga-abụ ha mere Jizọs ji kwuo ihe dị n’Abụ Ọma 22:1, gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” dị n’Ụlọ Nche a.

^ par. 16 Gụọ isiokwu bụ́ “Okwukwe Jọshụa Gosiri na Ụmụaka Nwere Ike Ikpebi Otú Ha Chọrọ Ka E Si Gwọọ Ha.” Ọ gbara na Teta! Bekee nke January 22, 1995.