Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 14

“Sochie Nzọụkwụ Ya Anya”

“Sochie Nzọụkwụ Ya Anya”

“Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.”—1 PITA 2:21.

ABỤ NKE 13 Ọ Bụ Kraịst Ka Anyị Na-eso

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

Jizọs hapụụrụ anyị nzọụkwụ ya ka anyị na-esochi ya anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2)

1-2. Gịnị mere iso nzọụkwụ Jizọs ga-eji kwe anyị omume? Nye ihe atụ.

KA E were ya na i so ná ndị na-agafe n’ala ịkpa snoo juru. E nwere onye ma ụzọ ahụ nke ọma du unu na-aga. Ka ọ na-aga, ị na-ahụ nzọụkwụ ya na snoo ahụ. Ma, e nwere ebe o ruru, ị naghịzi ahụ ya. Ma, ụjọ atụghị gị. Kama, gị na ndị ọzọ gị na ha so nọ na-agbalị iso nzọụkwụ ya.

2 Ụwa ọjọọ a anyị bi na ya taa tara ezigbo akpụ. Ezigbo Ndị Kraịst dịkwa ka ndị ahụ na-aga ije n’ala ịkpa snoo juru. Ma, Jehova nyere anyị ezigbo onye anyị ga na-eso nzọụkwụ ya, ya bụ, Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst. Anyị nwere ike isochi nzọụkwụ ya anya. (1 Pita 2:21) Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru na n’amaokwu a, Pita ji Jizọs tụnyere onye du ndị mmadụ na-aga ije, ha ana-ahụ nzọụkwụ ya n’ala. Jizọs hapụụrụ anyị nzọụkwụ anyị nwere ike iso. Ka anyị tụlee ajụjụ atọ gbasara iso nzọụkwụ Jizọs Kraịst. Gịnị ka iso nzọụkwụ Jizọs pụtara? Gịnị mere anyị kwesịrị iji mee ya? Oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ya?

GỊNỊ KA ISO NZỌỤKWỤ JIZỌS PỤTARA?

3. Gịnị ka iso nzọụkwụ mmadụ pụtara?

3 Gịnị ka iso nzọụkwụ mmadụ pụtara? Mgbe ụfọdụ, Baịbụl kwuo banyere ‘ije ije’ na “ụkwụ,” ọ na-apụta otú mmadụ si ebi ndụ. (Jen. 6:9; Ilu 4:26) E nwere ike iji otú mmadụ si ebi ndụ tụnyere nzọụkwụ ya. N’ihi ya, iso nzọụkwụ mmadụ pụtara ime ka onye ahụ ma ọ bụ ime ihe onye ahụ na-eme.

4. Gịnị ka iso nzọụkwụ Jizọs pụtara?

4 Oleezi ihe iso nzọụkwụ Jizọs pụtara? Ọ pụtara ịna-eme ka Jizọs. N’amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu a, Pita onyeozi na-ekwu gbasara otú Jizọs si bụrụ onye e ji ama atụ n’ịtachi obi. Ma, e nwere ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ anyị nwere ike isi na-eme ka Jizọs. (1 Pita 2:18-25) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị iṅomi ihe niile Jizọs mere ná ndụ ya, ma ihe ndị o kwuru ma ihe ndị o mere.

5. Ụmụ mmadụ na-ezughị okè hà nwere ike iso nzọụkwụ Jizọs bụ́ onye zuru okè? Kọwaa.

5 Ebe anyị bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ànyị nwere ike iso nzọụkwụ Jizọs? Ee, anyị nwere ike. Cheta na ihe Pita gwara anyị bụ ka anyị “sochie nzọụkwụ [Jizọs] anya,” ọ bụghị ka anyị metachaa ihe niile o mere. Ọ bụrụ na anyị elezie anya na-eso nzọụkwụ Jizọs, ya bụ, ọ bụrụ na anyị ana-eme ike anyị niile ime ka Jizọs, anyị ga na-eme ihe Jọn onyeozi kwuru. Ọ sịrị: ‘Nọgide na-eje ije dị ka onye ahụ jere.’—1 Jọn 2:6.

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ISO NZỌỤKWỤ JIZỌS?

6-7. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ịna-eme ka Jizọs ga-eme ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma?

6 Iso nzọụkwụ Jizọs ga-eme ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Nke mbụ bụ na Jizọs bụ onye kacha bie ndụ otú dị Chineke mma. (Jọn 8:29) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ana-eso nzọụkwụ Jizọs, anyị ga na-eme ihe ndị dị Jehova mma. Obi ga-esikwa anyị ike na Jehova na-abịaru ndị na-agbalịsi ike ịbụ enyi ya nso. —Jems 4:8.

7 Nke abụọ, Jizọs mere nnọọ ka Nna ya. Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) Anyị nwere ike ịna-akpa àgwà ka Jizọs, na-emesokwa ndị ọzọ otú o si emeso ha. Dị ka ihe atụ, o meere onye ekpenta ebere, meere nwaanyị ajọ ọrịa ji ebere, nweekwara ndị mmadụ nwụnahụrụ ọmịiko. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka Jizọs, anyị na-emekwa ka Jehova. (Mak 1:40, 41; 5:25-34; Jọn 11:33-35) Ka anyị na-agbakwu mbọ ịna-eme ka Jehova, ka anyị na ya na-adịkwu ná mma.

8. Kọwaa otú iso nzọụkwụ Jizọs nwere ike isi nyere anyị aka ‘imeri ụwa.’

8 Iso nzọụkwụ Jizọs ga-enyere anyị aka ka ụwa ọjọọ a ghara imegharị anyị anya. N’abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa, o kwuru, sị: “Emeriwo m ụwa.” (Jọn 16:33) Ihe a o kwuru pụtara na o kweghị ka otú ụwa si eche echiche, ihe ndị ha na-agbalị ime, na àgwà ha megharịa ya anya. Jizọs ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka uche ya gharazie ịdị n’ihe mere e ji zite ya n’ụwa, ya bụ, ime ka a ghara ịna-akọcha aha Jehova. Anyịnwa kwanụ? N’ụwa a, e nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịdọpụ anyị uche. Ma, ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’ime uche Jehova otú ahụ Jizọs mere, anyị ‘ga-emeri’ ụwa.—1 Jọn 5:5.

9. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ma anyị chọọ inweta ndụ ebighị ebi?

9 Iso nzọụkwụ Jizọs na-eme ka mmadụ nweta ndụ ebighị ebi. Mgbe otu nwa okorobịa jụrụ ihe ọ ga-eme ka o nweta ndụ ebighị ebi, Jizọs sịrị ya: ‘Bịa bụrụ onye na-eso ụzọ m.’ (Mat. 19:16-21) Jizọs gwara ụfọdụ ndị Juu na-ekweghị na ọ bụ Kraịst, sị: “Atụrụ m . . . na-esokwa m. M na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi.” (Jọn 10:24-29) E nwere otu onye Sanhedrin aha ya bụ Nikọdimọs. O nwere mmasị n’ihe ndị Jizọs na-akụzi. Jizọs gwara ya na ndị “nwere okwukwe na ya” ga-enwe “ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Anyị na-egosi na anyị nwere okwukwe na Jizọs ma anyị na-eme ihe ndị ọ kụziri na ihe ndị o mere. Ọ bụrụkwa na anyị ana-eme otú ahụ, anyị nwere ike inweta ndụ ebighị ebi.—Mat. 7:14.

OLEE OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI NA-ESOCHI NZỌỤKWỤ JIZỌS ANYA?

10. Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji ‘mata’ Jizọs nke ọma? (Jọn 17:3)

10 Tupu anyị enwee ike isochi nzọụkwụ Jizọs anya, anyị kwesịrị ịmata ya. (Gụọ Jọn 17:3.) “Ịmata” Jizọs abụghị ihe a na-eme naanị otu ugboro. Anyị kwesịrị ịna-amatakwu onye ọ bụ, ịna-amụ gbasara àgwà ya, otú o si eche echiche, na ihe ndị ọ kpọrọ ihe ọma na ihe ọjọọ. N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ịna-amatakwu Jehova na Ọkpara ya bụ́ Jizọs.

11. Gịnị ka e dere n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn?

11 Jehova mere ka e dee akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn iji nyere anyị aka ịmatakwu Ọkpara ya nke ọma. N’akwụkwọ Baịbụl anọ ndị a, a kọrọ gbasara ndụ Jizọs na ozi ya. Akwụkwọ Baịbụl ndị ahụ gwara anyị ihe ndị Jizọs kwuru, ihe ndị o mere, nakwa otú obi dị ya gbasara ihe ụfọdụ. Ha na-enyekwara anyị aka ‘ichesi echiche ike’ banyere ihe ndị Jizọs mere. (Hib. 12:3) E dere ihe ndị Jizọs mere anyị kwesịrị ime na ha. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị amụọ akwụkwọ Baịbụl anọ ndị a, anyị ga-amatakwu Jizọs nke ọma. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịna-esochi nzọụkwụ ya anya.

12. Olee ihe anyị ga-eme ka ihe anyị na-agụ n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn baara anyị uru?

12 Ihe ga-eme ka akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn baara anyị uru abụghị naanị ịgụ ha agụ. Anyị kwesịrị iwepụta oge mụọ ha nke ọma, chebakwara ihe anyị gụtara na ha echiche. (Tụlee Joshụa 1:8.) Ka anyị tụlee ihe abụọ nwere ike inyere anyị aka ichebara akwụkwọ Baịbụl anọ ndị a echiche na ime ihe ndị anyị mụtara na ha.

13. Gịnị ka ị ga-eme ka ọ dị gị ka ị nọ mgbe ihe ị na-agụ n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn na-eme?

13 Were ya na ị nọ ya mgbe ihe ndị ị na-agụ na-eme. Were ya na ị na-ahụ ma na-anụ ihe ndị na-eme ebe ahụ. Werekwa ya na ọ bụ gịnwa ka ihe ndị ahụ na-eme. Ihe ga-enyere gị aka ime ya bụ iji akwụkwọ ndị nzukọ Jehova wepụtara na-eme nchọnchọ. Gbalịa chọpụta ihe ndị gbara amaokwu ahụ ị na-agụ gburugburu, ya bụ, ihe ndị mere tupu ihe ahụ ị na-agụ emee nakwa ihe ndị mere mgbe o mechara. Chọọ ihe ndị ga-enyere gị aka ịmatakwu gbasara ebe ma ọ bụ ndị a kọrọ akụkọ ha n’ebe ahụ ị na-agụ. Jiri ihe otu onye n’ime ndị dere akwụkwọ Baịbụl anọ ahụ kọrọ tụnyere ihe ndị nke ọzọ kọrọ gbasara ihe ị na-agụ. Mgbe ụfọdụ, otu onye nwere ike ikwu ihe dị ezigbo mkpa onye nke ọzọ na-ekwughị.

14-15. Olee otú anyị ga-esi eme ihe anyị mụtara n’akụkọ ndị a kọrọ gbasara Jizọs?

14 Nke abụọ, na-eme ihe ndị ị mụtara na ha. (Jọn 13:17) Ọ bụrụ na ị mụchaa otu ihe a kọrọ gbasara Jizọs nke ọma, jụọ onwe gị, sị: ‘È nwere ihe m ga-amụta n’akụkọ a m nwere ike ịna-eme ná ndụ m? Olee otú m ga-esi jiri ihe m mụtara n’akụkọ a nyere onye ọzọ aka?’ Chee banyere otu onye i nwere ike iji ya nyere aka. E mechazie n’oge dabara adaba, wetuo obi jiri akọ gwa onye ahụ ihe ị mụtara.

15 Ka anyị jiri otu ihe atụ leba anya n’otú anyị nwere ike isi mee ihe abụọ ndị a. Anyị ga-ekwu gbasara otu nwaanyị di ya nwụrụ Jizọs hụrụ n’ụlọ nsọ.

NWAANYỊ DI YA NWỤRỤ NỌ N’ỤLỌ NSỌ

16. Olee otú ị ga-esi akọwa ihe e dere na Mak 12:41?

16 Were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ na-eme. (Gụọ Mak 12:41.) Were ya na ị na-ahụ ihe na-eme n’abalị iri na otu n’ọnwa Naịsan, afọ 33, mgbe ọ na-erughịzi otu izu tupu e gbuo Jizọs. Jizọs nọrọ ọtụtụ awa n’ụlọ nsọ na-akụzi ihe n’ụbọchị ahụ. Ndị okpukpe na-akpagbu ya mekwara ka ihe siere ya ike. Tupu mgbe ahụ, ụfọdụ n’ime ha ajụọla ebe o si nweta ikike o ji na-arụ ọrụ ebube ndị ọ na-arụ. Ụfọdụ jụkwara ya ajụjụ ndị ha chere na ọ gaghị azali. (Mak 11:27-33; 12:13-34) Ugbu a, Jizọs esila ebe ahụ ọ nọ gaa ebe ọzọ n’ụlọ nsọ ahụ. O nwere ike ịbụ na ihe a na-akpọ ebe ọ nọ ugbu a bụ Ogige Ụmụ Nwaanyị. Ọ nọ ebe ahụ na-ahụ igbe onyinye. Ọ nọ ọdụ na-ele ka ndị mmadụ na-atụnye ego n’igbe onyinye ahụ. Ọ hụkwara ka ọtụtụ ndị bara ọgaranya na-atụnye ọtụtụ mkpụrụ ego n’ime ya. O nwere ike ịbụ na ọ nọtụ igbe onyinye ahụ nso nke mere ka ọ na-anụ ụda ego ndị a na-atụnye n’ime ya.

17. Gịnị ka nwaanyị ahụ di ya nwụrụ e kwuru okwu ya na Mak 12:42 mere?

17 Gụọ Mak 12:42. Ka obere oge gachara, Jizọs hụrụ otu “nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye.” (Luk 21:2) Ihe na-esiri ya ezigbo ike. Ọ ga-abụ na ọ na-esiri ya ike inweta ihe ndị dị ya mkpa ná ndụ. Ma, ọ gara n’otu n’ime igbe onyinye ndị dị ebe ahụ tụnye mkpụrụ ego abụọ dị ezigbo nta. Ọ ga-abụ na mkpụrụ ego ndị ahụ ọ tụnyere emechaghị mkpọtụ mgbe ọ tụnyere ha. Jizọs hụrụ ego ole ọ tụnyere. Ọ bụ mkpụrụ ego lepta abụọ. Ọ bụ ego kacha nta n’oge ahụ. Ọ gaghịdị ezu iji zụọ otu mkpụrụ nza, bụ́kwanụ nnụnụ a na-eri eri kacha ọnụ ala n’oge ahụ.

18. Dị ka e kwuru na Mak 12:43, 44, gịnị ka Jizọs kwuru gbasara onyinye nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nyere?

18 Gụọ Mak 12:43, 44. Ihe nwaanyị a di ya nwụrụ mere tọgburu Jizọs atọgbu. N’ihi ya, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya, gosi ha nwaanyị ahụ ma sị ha: “Nwaanyị a di ya nwụrụ, bụ́ onye dara ogbenye, tụnyere ihe karịa ihe ndị niile ahụ na-atụnye ego n’igbe ndị ahụ a na-atụnye ego tụnyere.” Ọ kọwara ihe mere o ji kwuo ihe ahụ. Ọ sịrị: “N’ihi na ha niile tụnyere ihe site n’ọtụtụ ihe ha nwere, ma nwaanyị a tụnyere ihe niile o nwere, ihe dum o ji biri, n’agbanyeghị na ọ nọ n’ụkọ.” Ihe mere nwaanyị a ji tụnye ihe niile o nwere n’igbe ahụ n’ụbọchị ahụ bụ na ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-egboro ya mkpa ya niile.—Ọma 26:3.

Dị ka Jizọs, ị hụ ndị na-enye Jehova ihe kacha mma ha nwere, na-aja ha mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19 na nke 20) *

19. Olee ihe dị mkpa anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jizọs kwuru gbasara nwaanyị ahụ dara ogbenye di ya nwụrụ?

19 Na-eme ihe ị mụtara n’akụkọ a. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m nwere ike ịmụta n’ihe Jizọs kwuru gbasara nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke dara ogbenye?’ Chee gbasara nwaanyị ahụ di ya nwụrụ. O doro anya na ọ ga-adị ya ka ya bụrụ na o nwekwuru ihe ọ ga-enye Jehova. Ma, o mere ihe ọ ga-emeli. O nyere Jehova ihe kacha mma o nwere. Jizọs makwa na Jehova ji onyinye a nwaanyị a nyere kpọrọ ihe. Otu ihe dị mkpa anyị ga-amụta n’akụkọ a bụ na obi na-adị Jehova ezigbo ụtọ ma anyị na-enye ya ihe kacha mma anyị nwere, ya bụ, ma anyị jiri obi anyị niile na-ejere ya ozi. (Mat. 22:37; Kọl. 3:23) Obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ hụ ka anyị na-eme ike anyị niile n’ozi ya. Obi na-adịkwa ya ụtọ maka oge na ike anyị na-eji eme ihe gbasara ofufe ya, dị ka ịga ozi ọma na ọmụmụ ihe.

20. Olee otú i nwere ike isi na-eme ihe ị mụtara n’akụkọ nwaanyị ahụ di ya nwụrụ? Nye ihe atụ.

20 Olee otú i nwere ike isi na-eme ihe ị mụtara n’akụkọ nwaanyị ahụ di ya nwụrụ? Chee gbasara otu onye i nwere ike iji akụkọ a mee ka obi sie ike na Jehova ji ihe niile ọ na-eme n’ofufe ya kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, è nwere nwanna nwaanyị merela agadi ị ma na obi ya na-ama ikpe ma ọ bụ na-eche na o nweghịzi uru ọ bara n’ihi na ọ naghị emelizi ihe ndị ọ na-emebu n’ofufe Jehova n’ihi ọrịa ma ọ bụ na ike anaghịzi adị ya? Ò nwere nwanna nwoke na-arịa ọrịa na-ada mbà n’ihi na ọ naghị abịalizi ọmụmụ ihe niile? Otú ị ga-esi enyere ụmụnna ndị a aka bụ ịna-agwa ha “okwu dị mma maka iwuli elu.” (Efe. 4:29) Kọọrọ ha ihe ndị a na-eme obi ụtọ anyị mụtara n’akụkọ nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke dara ogbenye. Okwu ndị na-agba ume ị gwara ha nwere ike ime ka obi sie ha ike na obi na-adị Jehova ụtọ ma anyị nye ya ihe kacha mma anyị nwere. (Ilu 15:23; 1 Tesa. 5:11) Mgbe ị na-aja ndị ọzọ mma maka inye Jehova ihe kacha mma ha nwere, n’agbanyeghị na o nwere ike iyi ihe dị obere, ị na-esochi nzọụkwụ Jizọs anya.

21. Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

21 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn kọrọ ọtụtụ ihe gbasara ndụ Jizọs. Ihe ndị ahụ ha kọrọ ga-enyere anyị aka ịna-eme ka ya. Gbalịa mụọ akwụkwọ Baịbụl ndị a n’onwe gị ma ọ bụ unu amụọ ha n’ofufe ezinụlọ unu. Ka anyị cheta na ihe ga-enyere anyị aka ịmụta ezigbo ihe na ha bụ ma anyị were ya na anyị nọ mgbe ihe anyị na-agụ na-eme nakwa ma anyị na-eme ihe ndị anyị mụtara na ha. Anyị kwesịrị ịna-eme ihe ndị Jizọs mere, na-egekwa ntị n’ihe o kwuru. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe anyị ga-amụta n’ihe ikpeazụ Jizọs kwuru tupu ya anwụọ.

ABỤ NKE 15 Too Ọkpara Jehova

^ par. 5 Ebe anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ‘ịna-esochi nzọụkwụ Jizọs anya.’ Olee “nzọụkwụ” Jizọs hapụụrụ anyị ka anyị na-eso? Isiokwu a ga-aza ajụjụ a. Anyị ga-atụlekwa ihe mere anyị ji kwesị isochi nzọụkwụ Jizọs anya na otú anyị nwere ike isi mee ya.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: Mgbe otu nwanna nwaanyị chechara banyere ihe Jizọs kwuru gbasara nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye, ọ gara na-aja nwanna nwaanyị ọzọ merela agadi mma maka otú o si jiri obi ya niile na-efe Jehova.