Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-enyere Gị Aka ma Ị Na-echegbu Onwe Gị

Ihe Ga-enyere Gị Aka ma Ị Na-echegbu Onwe Gị

NCHEGBU nwere ike ịdị ka ibu dị ezigbo arọ n’obi anyị. (Ilu 12:25) È nwetụla mgbe nchegbu mere ka ike gwụ gị? È nwere mgbe ọ dị gị ka ị gaghị edili ya? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị naanị gị. E nweela ihe ụfọdụ mere ka ike gwụ ọtụtụ n’ime anyị, ha ana-echegbu onwe ha, ike ụwa agwụkwa ha. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-elekọta onye ezinụlọ ha ahụ́ na-adịghị. Mmadụ anwụnahụla ụfọdụ. Ọdachi ndị na-emere onwe ha akpaakwala ụfọdụ aka ọjọọ. Ma, gịnị nwere ike inyere anyị aka ma anyị chegbuwe onwe anyị? *

Ọ bụrụ na anyị amụọ gbasara Eze Devid, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe ga-enyere anyị aka ma anyị na-echegbu onwe anyị. E nwere ọtụtụ nsogbu bịaara ya, ma ndị nke chọrọ ịta isi ya. (1 Sam. 17:​34, 35; 18:​10, 11) Gịnị nyeere Devid aka mgbe ọ na-echegbu onwe ya? Olee otú anyị nwere ike isi eme ka ya?

GỊNỊ NYEERE DEVID AKA MGBE Ọ NA-ECHEGBU ONWE YA?

Ọtụtụ nsogbu bịaara Devid otu mgbe. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe mere ya mgbe ọ na-agba ọsọ ndụ n’ihi Eze Sọl. E nwere otu oge ya na ụmụ nwoke ya na ha so gara agha. Mgbe ha lọtara, ha hụrụ na ndị iro ezukọrọla ihe ndị ha nwere, gbaa ụlọ ha ọkụ, kpụrụkwa ndị ezinụlọ ha. Gịnị ka Devid mere? Baịbụl sịrị: “Devid na ndị ya na ha so wee malite ibe ákwá, na-ebesikwa ya ike ruo mgbe ike ibe ákwá na-adịghịzi ha.” Ihe ọzọkwa nyere Devid nsogbu bụ na ụmụ nwoke ndị ọ tụkwasịrị obi “nọ na-asị ka a tụọ ya nkume.” (1 Sam. 30:​1-6) Nsogbu atọ kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara Devid mgbe ahụ bụ na a dọọrọ ndị ezinụlọ ya n’agha, ụjọ nọ na-atụ ya na ndị ya na ha so ga-egbu ya, Eze Sọl ka na-achọkwa ya ka o gbuo ya. Chegodị otú ihe ndị a ga-esi na-echegbu ya.

Gịnịzi ka Devid mere? “Devid tụkwasịrị Jehova bụ́ Chineke ya obi, ya emesie ya obi ike.” Olee otú o nwere ike ịbụ na Devid si mee ya? Anyị ma na Devid na-arịọ Jehova ka o nyere ya aka, na-echekwa gbasara otú Jehova si nyere ya aka n’oge gara aga. (1 Sam. 17:37; Ọma 18:​2, 6) Devid ma na o kwesịrị ịjụ Jehova ihe ọ ga-eme. N’ihi ya, ọ jụrụ Jehova ihe ọ ga-eme. Mgbe Jehova gwachara ya ihe ọ ga-eme, o mere ya ozugbo. N’ihi ya, Jehova gọziri Devid na ndị ya na ha so, mee ka ha napụta ndị ezinụlọ ha, nwetakwa ihe ha ndị ha bukọọrọ. (1 Sam. 30:​7-9, 18, 19) Ị̀ hụrụ ihe atọ Devid mere? O kpere ekpere rịọ Jehova ka o nyere ya aka, chebara ihe ndị Jehova meere ya n’oge gara echiche, meekwa ihe Jehova gwara ya mee. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Devid? Legodị ihe atọ anyị nwere ike ime.

NA-EME KA DEVID MA E NWEE IHE NA-ECHEGBU GỊ

1. Kpee ekpere. Mgbe ọ bụla ị malitere ichegbu onwe gị, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ma nye gị amamihe. Ọ bụrụ na anyị ewetuo obi kọọrọ Jehova ihe niile na-echegbu anyị, o nwere ike ime ka obi na-eru anyị ala. Anyị nwekwara ike ikpe ekpere dị nkenke ma ọ bụkwanụ kpee ya n’ime obi anyị ma ọ bụrụ naanị ihe anyị ga-emeli n’oge ahụ. Mgbe ọ bụla anyị rịọrọ Jehova ka o nyere anyị aka, anyị na-egosi na anyị tụkwasịrị ya obi otú ahụ Devid mere. Devid sịrị: “Jehova bụ nkume m dị elu na ebe m a rụsiri ike na Onye na-anapụta m. Chineke m bụ oké nkume m. M na-agbaba n’ime ya.” (Ọma 18:2) Ekpere ọ̀ na-enye aka n’eziokwu? Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Kahlia sịrị: “M kpechaa ekpere, obi na-eru m ala. Ekpere na-enyere m aka ịna-eche echiche ka Jehova na ịna-atụkwasịkwu ya obi.” N’eziokwu, ekpere bụ ihe na-akpa ezigbo ike Jehova nyere anyị. Ọ na-enyere anyị aka ma anyị chegbuwe onwe anyị.

2. Chee otú Jehova si nyere gị aka n’oge gara aga. Ọ bụrụ na i chee ihe mere n’oge gara aga, ị̀ na-echeta ọnwụnwa ndị i diri ị na-agaraghị edili ma a sị na Jehova enyereghị gị aka? Ọ bụrụ na anyị echee gbasara otú Jehova si anọnyere anyị na otú o si nyere ndị fere ya n’oge gara aga aka, obi ga-erukwu anyị ala, anyị ana-atụkwasịkwu ya obi. (Ọma 18:​17-19) Otu okenye aha ya bụ Joshua sịrị: “E nwere ebe m deturu ekpere ndị Jehova zara m. Ọ na-enyere m aka icheta oge ndị m rịọrọ Jehova otu ihe, ya emeekwara m ya otú ahụ m si rịọ ya.” N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe ndị Jehova meere anyị n’oge gara aga, ọ ga-enyere anyị aka ma anyị chegbuwe onwe anyị.

3. Mee ihe i kwesịrị ime. Tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme, i nwere ike ịchọ n’Okwu Chineke ka i nweta ndụmọdụ ga-akacha baara gị uru. (Ọma 19:​7, 11) Ọtụtụ ndị achọpụtala na ime nchọnchọ gbasara otu amaokwu Baịbụl na-enyere ha aka ịghọtakwu otú amaokwu Baịbụl ahụ si gbasa ha. Otu okenye aha ya bụ Jarrod kwuru, sị: “Ime nchọnchọ na-enyere m aka ịghọta amaokwu Baịbụl nke ọma na ịghọta ihe Jehova ji ya na-agwa m. Ọ na-enyere m aka ikwetasi ike n’ihe m na-agụ ka m nwee ike ime ya eme.” Ọ bụrụ na anyị agụọ Baịbụl iji mata ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme, na-emekwa ya eme, obi ga-eru anyị ala, anyị ana-enwekwa ọṅụ ma e nwee ihe chọrọ ime ka anyị chegbuwe onwe anyị.

JEHOVA GA-ENYERE GỊ AKA MGBE Ị NA-ECHEGBU ONWE GỊ

Devid ghọtara na ọ bụ Jehova ga-enyere ya aka ma o chegbuwe onwe ya. Obi dịkwa ya ụtọ maka ihe ndị Jehova mere iji nyere ya aka. Ọ bụ ya mere o ji sị: “M ga-awụfeli mgbidi n’ihi ike Chineke na-enye m. Ọ bụ ezi Chineke bụ onye na-eme ka m dị ike.” (Ọma 18:​29, 32) Nsogbu na-abịara anyị nwere ike ịdị anyị ka mgbidi anyị na-agaghị awụfeli. Ma, Jehova ga-enyeliri anyị aka imeri ha. N’eziokwu, anyị kpee ekpere ka Jehova nyere anyị aka, na-eche gbasara ihe niile o meere anyị n’oge gara aga, na-emekwa ihe ọ gwara anyị, ka obi sie anyị ike na ọ ga-enye anyị ike na amamihe ma e nwee ihe na-echegbu anyị.

^ Ọ bụrụ na mmadụ na-echegbukarị onwe ya gafee ókè, o nwere ike ịka mma ka ọ gaara ya ụlọ ọgwụ.