Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ịṅụ iyi?
Ịṅụ iyi abụghị ihe e ji egwu egwu. Ọ bụ otú mmadụ si ekwe nkwa na ọ ga-eme ihe. A na-akpọkarị Chineke ka ọ bụrụ onye akaebe na ya. E nwere ike ikwu ya n’ọnụ ma ọ bụ dee ya edee.
Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche na ịṅụ iyi dị njọ n’ihi na Jizọs sịrị: “Aṅụla iyi ọ bụla. . . . Naanị ka ‘Ee’ unu kwuru bụrụ ee, ka ‘Ee e’ unu kwuru bụrụ ee e, n’ihi na ihe gafere ihe ndị a si n’aka ajọ onye ahụ.” (Mat. 5:33-37) Jizọs ma nke ọma na Iwu Mosis kwuru na mmadụ nwere ike ịṅụ iyi mgbe ụfọdụ. Ọ makwa na e nwere ndị ji obi ha niile fee Chineke ṅụrụ iyi. (Jen. 14:22, 23; Ọpụ. 22:10, 11) Ọ makwa na e nwere oge ụfọdụ Jehova n’onwe ya ṅụrụ iyi. (Hib. 6:13-17) N’ihi ya, ihe Jizọs na-ekwu abụghị na anyị ekwesịghị ịṅụ iyi, kama ihe ọ na-ekwu bụ ka anyị ghara ịṅụ iyi n’ihi ihe na-enweghị isi ma ọ bụ ihe na-enweghị uru ọ bara. Anyị kwesịrị ịna-eme ihe ọ bụla anyị kwere nkwa ime n’ihi na ọ bụ ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme.
Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma a gwa anyị ṅụọ iyi? Nke mbụ, anyị kwesịrị ijide n’aka na anyị ga-emeli ihe ahụ anyị chọrọ ịṅụ iyi ime. Ọ bụrụ na obi esighị anyị ike na anyị ga-emeli ihe ahụ, ọ ga-akacha mma ka anyị ghara ịṅụ iyi. Okwu Chineke dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ọ ka mma na i kweghị nkwa kama ị ga-ekwe nkwa ma ghara imezu ya.” (Ekli. 5:5) Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ichebara ihe Baịbụl kwuru gbasara ịṅụ iyi echiche, gị ejirizie akọnuche gị e ji Baịbụl zụọ kpebie ihe ị ga-eme. Olee ụfọdụ ihe Baịbụl kwuru gbasara ịṅụ iyi?
Ụfọdụ iyi a na-aṅụ emegideghị uche Chineke. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova chọrọ ịlụ di na nwunye na-ekwe ibe ha nkwa n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha. Ụdị nkwa a bụ ịṅụ iyi. Ha na-anọ n’ihu Chineke na ndị gbakọtara ebe ahụ kwe ibe ha nkwa na ha ga-ahụ ibe ha n’anya, jiri ibe ha kpọrọ ihe, ma na-asọpụrụ ibe ha “n’oge niile [ha] abụọ ga-adị ndụ.” (Di na nwunye kwuru ihe a ma ọ bụ ihe ndị yiri ya kwere ibe ha nkwa n’ihu Chineke.) Ha mechazie ya, a na-ekwu na ha aghọọla di na nwunye. Ha kwesịkwara ịbụ di na nwunye ná ndụ ha niile. (Jen. 2:24; 1 Kọr. 7:39) Nkwa a ha kwere dị mma. Ọ dabakwara n’uche Chineke.
Ụfọdụ iyi a na-aṅụ megidere uche Chineke. Ezigbo Onye Kraịst ekwesịghị ịṅụ iyi iji ngwá agha echebe obodo ya ma ọ bụkwanụ na ya agaghịzi efe Chineke. Ịṅụ ụdị iyi a bụ imebi iwu Chineke. Ndị Kraịst ekwesịghị ịbụ “nke ụwa.” N’ihi ya, anyị ekwesịghị itinye aka n’esemokwu ya ma ọ bụkwanụ n’agha ya.—Jọn 15:19; Aịza. 2:4; Jems 1:27.
E nwere ụfọdụ iyi Ndị Kraịst ga-eji akọnuche ha kpebie ịṅụ ma ọ bụ hapụ ịṅụ. Mgbe ụfọdụ, Luk 20:25.
ihe Jizọs kwuru nke bụ́ “kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke” nwere ike inyere anyị aka ịma ma ànyị ga-aṅụ iyi ụfọdụ.—Ma, gịnị ka Onye Kraịst ga-eme ma ọ bụrụ na o tinye akwụkwọ ka e mee ya nwa amaala obodo ma ọ bụkwanụ ka e nye ya akwụkwọ ikike ọ ga-eji baa obodo ọzọ, ma ya achọpụta na a chọrọ ka ọ ṅụọ iyi iji gosi na ọ ga na-erubere iwu obodo ahụ isi? Ọ bụrụ na ịṅụ ụdị iyi ahụ n’obodo ahụ ga-eme ka mmadụ mebie iwu Chineke, akọnụche ya e ji Baịbụl zụọ agaghị ekwe ka ọ ṅụọ ụdị iyi ahụ. Ma, ndị ọchịchị nwere ike ikwe ka ọ gbanwetụ okwu ụfọdụ dị n’iyi ahụ ọ ga-aṅụ ka akọnuche ya nwee ike ikwe ya ka ọ ṅụọ ya.
Ịṅụ ụdị iyi a nwere ike ịdaba n’ihe e kwuru ná Ndị Rom 13:1, ebe sịrị: “Ka onye ọ bụla na-erubere ndị ọchịchị isi.” N’ihi ya, Onye Kraịst nwere ike ikpebi na o nweghị ihe dị njọ ma ọ ṅụọ iyi ime ihe Chineke chọrọ ka Ndị Kraịst na-eme.
Onye Kraịst kwesịkwara ime ihe akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ gwara ya ka o mee ma ọ bụrụ na a sị ya jiri ihe ṅụọ iyi ma ọ bụkwanụ ka o mee ihe ụfọdụ ma ọ na-aṅụ iyi. Ndị Rom oge ochie na ndị Sitia na-eji mma agha ha aṅụ iyi. Ihe ọ pụtara bụ na ha na-eji ihe na-anọchi anya chi agha aṅụ iyi na ihe ha na-ekwu bụ eziokwu. Ndị Grik na-eweli aka ha n’eluigwe ma ha na-aṅụ iyi. Ha si otú a na-egosi na ha ma na e nwere chi na-anụ ihe ha na-ekwu ma na-ahụ ihe ha na-eme, nakwa na mmadụ niile nọ n’ụwa ga-aza ya ajụjụ ihe ha metara.
O doro anya na onye ọ bụla na-efe Jehova agaghị eji ihe ọ bụla na-anọchi anya obodo nwere otú o si gbasa okpukpe ụgha ṅụọ iyi. Ma, ọ bụrụkwanụ na ị gaa ụlọikpe, a gwa gị ka i dokwasị aka na Baịbụl ṅụọ iyi na ihe ọ bụla ị ga-ekwu ga-abụ eziokwu? N’ụdị ihe a, Onye Kraịst nwere ike ikpebi ime otú ahụ, ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru gbasara ndị fere Chineke mere ihe ụfọdụ mgbe ha na-aṅụ iyi. (Jen. 24:2, 3, 9; 47:29-31) Ọ dịkwa mkpa icheta na ị ṅụọ ụdị iyi a, ị na-ekwu n’ihu Chineke na ihe niile ị ga-ekwu bụ eziokwu. I kwesịrị ikwu eziokwu n’ihe ọ bụla a jụrụ gị.
Ebe ọ bụ na anyị ji adịm ná mma anyị na Jehova kpọrọ ezigbo ihe, anyị kwesịrị ikpe ekpere ma chee echiche nke ọma tupu anyị aṅụọ iyi ọ bụla a chọrọ ka anyị ṅụọ, iji hụ na anyị agaghị ada iwu Chineke ma ọ bụ mee ihe ọ bụla akọnuche anyị ga-eji apịa anyị ụtarị. Ọ bụrụ na i kpebie ịṅụ iyi, i kwesịrị ịgbalị mee ihe i kwuru.—1 Pita 2:12.