ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 17
ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ
Ahapụkwala Paradaịs Ihe Atụ
“Ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi dịkwa unu ụtọ ruo mgbe ebighị ebi maka ihe m na-eke.”—AỊZA. 65:18.
IHE A GA-AMỤ
Anyị ga-amụ otú paradaịs ihe atụ si abara anyị uru nakwa otú anyị ga-esi eme ka ndị ọzọ bata na ya.
1. Gịnị bụ paradaịs ihe atụ? Gịnịkwa ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
E NWERE paradaịs dị n’ụwa taa. Ndị juru na ya bụ ndị na-agba mbọ mgbe niile na-eme ihe dị mma. Ha bụ ọtụtụ nde mmadụ ndị nwere ezigbo udo. Ndị nọ na paradaịs a kpebisiri ike na ha agaghị ahapụ ya. Ha chọkwara ka ọtụtụ ndị soro ha nọrọ na ya. Olee paradaịs a na-ekwu maka ya? Ọ bụ paradaịs ihe atụ. a
2. Olee ihe dị ịtụnanya gbasara paradaịs ihe atụ?
2 Ọ dị ịtụnanya na Jehova mere ka e nwee ebe ndị mmadụ nọ n’udo, dịrịkwa n’otu n’agbanyeghị na ha bi n’ụwa ọjọọ Ekwensu, ebe ndị mmadụ kpọrọ ibe ha asị. (1 Jọn 5:19; Mkpu. 12:12) Chineke anyị hụrụ anyị n’anya na-ahụ nsogbu ụwa ọjọọ Setan na-akpata. Ma, ọ na-eme ka obi ruo ndị ya ala ka ha nwee ike iji obi ụtọ na-efe ya. Okwu ya bụ́ Baịbụl kwuru na paradaịs ihe atụ bụ “ebe ndị mmadụ ga-agbaba” aka aghara ịkpa ha nakwa “ubi nke mmiri na-ede nke ọma.” (Aịza. 4:6; 58:11) Ndị nọ na paradaịs ihe atụ a na-enwe obi ụtọ, obi na-erukwa ha ala n’oge ikpeazụ a tara ezigbo akpụ n’ihi na Jehova na-agọzi ha.—Aịza. 54:14; 2 Tim. 3:1.
3. Olee otú amụma e dere n’Aịzaya isi 65 si mezuo n’oge ochie?
3 Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kọwaa otú ịnọ na paradaịs ihe atụ ga-adị. I nwere ike ịhụ otú e si kọwaa ya n’Aịzaya isi 65. Amụma a mezuru na nke mbụ ya n’afọ 537 Tupu Oge Ndị Kraịst. N’oge ahụ, a hapụrụ ndị Juu chegharịrị e ji na Babịlọn, ha alaghachi n’obodo ha. Jehova gọziri ndị ya ma nyere ha aka ịrụghachi Jeruselem e bibiri ebibi, ya amaa mma ọzọ, rụziekwa ụlọ nsọ ya, ndị mmadụ anọrọkwa na ya na-efe Jehova n’Izrel.—Aịza. 51:11; Zek. 8:3.
4. Olee otú amụma e dere n’Aịzaya isi 65 si emezu n’oge a?
4 Amụma Aịzaya malitere imezu nke abụọ ya n’afọ 1919, mgbe Jehova mere ka ndị ya si na Babịlọn Ukwu pụta. Paradaịs ihe atụ ahụ maliteziri ịgbasa n’ụwa niile. Ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze hiwere ọtụtụ ọgbakọ, na-akpakwa àgwà e ji mara Ndị Kraịst. Ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ndị nọbu na-eme tigbuo zọgbuo, na-ebikwa ndụ rụrụ arụ, malitere ‘ịna-akpa àgwà dị iche na nke ha na-akpabu, n’ihi na ọ bụ ihe Chineke chọrọ.’ (Efe. 4:24) N’eziokwu, ọtụtụ ngọzi Aịzaya kwuru okwu ha ga-emezu n’ụwa ọhụrụ. Ma, e nwere ọtụtụ uru anyị na-erite na paradaịs ihe atụ ugbu a. Anyị ga-ekwu otú paradaịs a si gbasa anyị, nakwa ihe mere anyị ekwesịghị ịhapụ ya.
IHE E JI MARA NDỊ NỌ NA PARADAỊS IHE ATỤ
5. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 65:13, olee ngọzi ndị anyị na-enweta na paradaịs ihe atụ?
5 A na-enyeju ha afọ, ahụ́ ana-ama ha pokopoko. Amụma Aịzaya kwuru otú ndị nọ na paradaịs ihe atụ si dị ezigbo iche ná ndị na-anọghị na ya. (Gụọ Aịzaya 65:13.) Jehova na-enye ndị na-efe ya ihe niile dị ha mkpa iji na-efe ya. Anyị nwere mmụọ nsọ ya, Okwu ya bụ́ Baịbụl, nakwa ihe ndị e ji akụziri anyị Baịbụl ka anyị nwee ike ‘ịna-eri, na-aṅụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ.’ (I nwere ike ịtụle Mkpughe 22:17.) Ma, “agụụ ga na-agụ” ndị na-anọghị na paradaịs ihe atụ ahụ, ‘akpịrị ga na-akpọ ha nkụ,’ ‘ihere ga na-emekwa ha.’ Ha amaghị Chineke.—Emọs 8:11.
6. Olee otú Joel 2:21-24 si kọwaa ụfọdụ onyinye ndị Jehova na-enye anyị, oleekwa otú ha nwere ike isi baara anyị uru?
6 N’amụma Joel buru, o ji ihe ndị dị mkpa dị ka ọka, mmanya, na mmanụ oliv gosi na Jehova na-emesapụrụ ndị ya aka, na-enye ha ihe ndị dị ha mkpa, ma ihe ndị o ji Baịbụl akụziri ha. (Joel 2:21-24) Dị ka ihe atụ, o nyere anyị Baịbụl, akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ọmụmụ ihe anyị, na mgbakọ dị iche iche. Ihe ndị a nwere ike ịbara anyị uru kwa ụbọchị, mee ka ahụ́ na-agbasi anyị ike, anyị ana-amakwa pokopoko.
7. Gịnị na-eme ka ‘obi dị anyị mma’? (Aịzaya 65:14)
7 Ha na-enwe obi ụtọ, ihe ha nwere ejukwa ha afọ. Ndị Chineke nwere ike ‘iti mkpu ọṅụ’ n’ihi na obi dị ha ezigbo ụtọ maka ihe Jehova na-emere ha. (Gụọ Aịzaya 65:14.) Eziokwu ndị na-eme ka okwukwe anyị sie ike, nkwa ndị na-akasi anyị obi dị n’Okwu Chineke, nakwa olileanya siri ike anyị nwere n’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ na-eme ka ‘obi dị anyị mma.’ Anyị na ụmụnna anyị ikwurịta ihe ndị a na-eme ka obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ.—Ọma 34:8; 133:1-3.
8. Olee ihe abụọ a kacha jiri mara paradaịs ihe atụ?
8 Otú ndị Jehova si hụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu bụ ihe abụọ a kacha jiri mara paradaịs ihe atụ a. Ihe a Baịbụl kpọrọ “ịhụnanya na-eme ka mmadụ niile dịrị n’otu” na-atụpenyetụ anyị azụ̀ otú ihe ga-adị n’ụwa ọhụrụ, ebe Jehova ga-eme ka ndị ya hụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu karịa otú ha dị taa. (Kọl. 3:14) Otu nwanna nwaanyị kọwara ihe ọ chọpụtara gbasara ndị Jehova n’oge mbụ ọ matara ha. Ọ sịrị: “Amabughị m otú e si enwe obi ụtọ, ma n’ezinụlọ m. Oge mbụ m hụrụ ndị hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu bụ mgbe m hụrụ Ndịàmà Jehova.” Onye chọrọ inwe ezigbo obi ụtọ, ihe o nwere ejukwa ya afọ, kwesịrị ịnọ na paradaịs ihe atụ anyị. N’agbanyeghị otú ndị mmadụ si ele ndị ohu Jehova anya, Jehova na ndị niile na-efe ya ma n’eluigwe ma n’ụwa na-ele ha anya ọma.—Aịza. 65:15.
9. Gịnị ka Aịzaya 65:16, 17 kwere anyị nkwa ya gbasara ahụhụ ndị anyị na-ata ugbu a?
9 Ahụ́ na-eru ha ala, ụjọ anaghịkwa atụ ha. Aịzaya 65:14 kwuru na ndị kpebiri na ha agaghị abata na paradaịs ihe atụ ‘ga-eti mkpu ákwá n’ihi na obi na-agbawa ha. Ha ga-ebekwa ákwá n’ihi na ike ụwa agwụla ha.’ Ma, gịnị ka a ga-eme gbasara ihe ndị merela ka obi gbawaa ndị Chineke nakwa ahụhụ niile ha na-ata? Ka oge na-aga, a “ga-echefu” ha, Chineke ‘agaghịkwa eji anya ya ahụ’ ha. (Gụọ Aịzaya 65:16, 17.) Jehova ga-eme ka nsogbu anyị niile kwụsị. Anyị ga-emecha chefuo otú nsogbu ndị ahụ mere ka obi dịrị anyị.
10. Gịnị mere obi ji dị gị ụtọ na i nwere ohere gị na ụmụnna gị ịnọ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
10 Taadị, obi na-eru anyị ala ma anyị gaa ọmụmụ ihe anyị. Anyị na-anọ ebe ahụ ahụ́ eruo anyị ala, anyị echefuo nsogbu ụwa Ekwensu a na-akpata. Anyị na-eso eme ka ahụ́ na-eru ụmụnna anyị ala ma anyị na-akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke, ndị dị ka ịhụnanya, ọṅụ, udo, obiọma, na ịdị nwayọọ. (Gal. 5:22, 23) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nọ ná nzukọ Jehova. Ndị nọsiri ike na paradaịs ihe atụ a ga-eji anya ha hụ mgbe Jehova ga-emezu nkwa o kwere iweta “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.”
11. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 65:18, 19, olee ihe paradaịs ihe atụ Jehova mere ka anyị nwee kwesịrị ime ka anyị mee?
11 Obi dị ha ụtọ, ọ na-anụkwa ha ọkụ n’obi. Aịzaya kwukwara ihe mere anyị kwesịrị iji ‘ṅụrịa ọṅụ, obi adịkwa anyị ụtọ’ na paradaịs ihe atụ. Ọ bụ Jehova kere paradaịs ihe atụ a. (Gụọ Aịzaya 65:18, 19.) N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na Jehova na-eji anyị enyere ndị mmadụ aka ka ha hapụ òtù ndị dị n’ụwa a, bụ́ ebe a na-anaghị akụziri ha eziokwu gbasara Chineke, ma bata na paradaịs ihe atụ a magburu onwe ya. Obi na-atọkwa anyị ụtọ maka ngọzi ndị anyị na-enweta n’ọgbakọ Jehova. Ọ na-agụsikwa anyị agụụ ike ịgwa ndị ọzọ gbasara ha.—Jere. 31:12.
12. Olee otú nkwa e dere n’Aịzaya 65:20-24 na-eme ka obi dị gị, n’ihi gịnị?
12 Olileanya anyị nwere n’ihi na anyị nọ na paradaịs ihe atụ na-eme anyị obi ụtọ, na-anụkwa anyị ọkụ n’obi. Chegodị gbasara ihe niile anyị ga-ahụ ma mee n’ụwa ọhụrụ Chineke. Baịbụl kwere anyị nkwa, sị: “A gaghịzi enwe nwa ọhụrụ ga-anọ naanị ụbọchị ole na ole nwụọ. . . . Ndị m ga-anọ ogologo ndụ otú osisi si anọ.” Anyị “ga-arụ ụlọ, birikwa na ha. [Anyị] ga-akọ ubi vaịn, rie ihe si na ya.” Anyị “agaghị arụsi ọrụ ike na nkịtị” n’ihi na anyị ga-abụ ndị “Jehova gọziri agọzi.” O kwere anyị nkwa na anyị ga na-enwe obi ụtọ. O nweghị ihe ga-eme anyị, ndụ anyị enweekwa isi. Jehova ma ihe onye ọ bụla chọrọ “tupudị ha akpọkuo” ya. Ọ ga-ewerekwa “ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.”—Aịza. 65:20-24; Ọma 145:16.
13. Olee otú Aịzaya 65:25 si kọwaa ihe ndị mmadụ na-agbanwe ná ndụ ha ma ha malite ife Jehova?
13 Ha na-anọ n’udo, obi eruokwa ha ala. Ọtụtụ n’ime ndị na-akpabu àgwà ka anụ ọhịa agbanweela ọtụtụ ihe ná ndụ ha. (Gụọ Aịzaya 65:25.) Ha agbasiela mbọ ike kwụsị àgwà ndị na-adịghị mma ha na-akpabu. (Rom 12:2; Efe. 4:22-24) N’eziokwu, ndị Jehova ka bụkwa ndị na-ezughị okè. N’ihi ya, anyị ga na-emejọ ihe. Ma Jehova akpọkọtala “ụdị mmadụ niile,” ndị hụrụ ya n’anya ma hụ ibe ha n’anya. Ihe a emeela ka ha dịrị n’otu, dịrịkwa n’udo. (Taị. 2:11) Ihe a bụ ọrụ ebube naanị Chineke pụrụ ime ihe niile ga-arụli.
14. Olee otú ihe e dere n’Aịzaya 65:25 si mezuo ná ndụ otu nwanna?
14 Ndị mmadụ hà ga-agbanweli àgwà ha? Legodị ihe atụ a. E nwere otu nwa okorobịa garala mkpọrọ ọtụtụ ugboro ka ọ na-erule afọ iri abụọ. Ọ na-aṅụ omume rụrụ arụ ka mmiri, na-emekwa tigbuo zọgbuo. A tụọla ya mkpọrọ n’ihi izu ụgbọala, ịkụka ụlọ ndị mmadụ zuru ihe ha, na mpụ ndị ọzọ jọgburu onwe ha. Ọ na-adịkwa njikere ịlụso onye ọ bụla ọgụ mgbe niile. N’oge mbụ ọ nụrụ eziokwu Baịbụl na-akụzi ma malite ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, obi siri ya ike na ọ chọtala ihe dị ezigbo mkpa mere ọ ga-eji adị ndụ, ya bụ, ife Jehova na paradaịs ihe atụ. Mgbe o mechara baptizim, ọ na-echetakarị otú ihe e kwuru n’Aịzaya 65:25 si gbasa ya. Ọ gbanweela. Ọ naghịzi eme tigbuo zọgbuo ka ọdụm. Ọ na-emezi udo ka atụrụ.
15. Gịnị mere anyị ji chọọ ịkpọ ndị ọzọ ka ha sonyere anyị na paradaịs ihe atụ, oleekwa otú anyị nwere ike isi eme ya?
15 Ihe Aịzaya 65:13 ji bido bụ: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị.” Ihe amaokwu nke 25 ji mechie bụ “ọ bụ Jehova kwuru ihe a.” Okwu Jehova na-emezu mgbe niile. (Aịza. 55:10, 11) Paradaịs ihe atụ dị adị taa. Jehova emeela ka e nwee ndị na-efe ya dị ezigbo iche. Ebe ọ bụ na anyị so n’ezinụlọ Jehova, anyị na ụmụnna anyị na-anọ n’udo, obi eruokwa anyị ala n’ụwa a tigbuo zọgbuo juru. (Ọma 72:7) N’ihi ihe ndị a, anyị chọrọ inyere ọtụtụ ndị aka ka ha soro anyị na-efe Jehova. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iji ọrụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs kpọrọ ihe.—Mat. 28:19, 20.
OTÚ ANYỊ GA-ESI ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA ỊBATA NA PARADAỊS IHE ATỤ
16. Gịnị nwere ike ime ka ndị mmadụ chọọ ịbata na paradaịs ihe atụ?
16 Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ọrụ dị mkpa ọ ga-arụ ime ka ndị ọzọ hụ otú paradaịs ihe atụ anyị si maa ezigbo mma. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-eme ka Jehova. Ọ naghị amanye ndị mmadụ ịbata n’ọgbakọ ya, kama, ọ na-eji nwayọọ ‘adọta’ ha. (Jọn 6:44; Jere. 31:3) Ọ bụrụ na ndị nwere ezigbo obi amụta banyere ịhụnanya Jehova na ụdị onye ọ bụ, ha na-abịakwute ya. Olee otú anyị ga-esi jiri àgwà ọma anyị mee ka ndị mmadụ bata na paradaịs ihe atụ?
17. Olee ihe anyị ga-eme ka ndị mmadụ chọọ ịbata na paradaịs ihe atụ?
17 Otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ka ndị mmadụ bata na paradaịs ihe atụ bụ ịhụ ụmụnna anyị n’anya ma na-emere ha obiọma. Ọ bụrụ na ndị ọhụrụ abịa ọmụmụ ihe anyị, anyị chọrọ ka obi dị ha otú ọ dị ndị na-amaghị Chineke bịara ọmụmụ ihe Ndị Kraịst n’ọgbakọ Kọrịnt oge ochie. Ha kwuru, sị: “N’eziokwu, Chineke nọnyeere unu.” (1 Kọr. 14:24, 25; Zek. 8:23) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-ege ntị na ndụmọdụ ahụ bụ́ ka ‘anyị na ibe anyị na-adị n’udo.’—1 Tesa. 5:13.
18. Gịnị nwere ike ime ka ndị mmadụ chọọ ịbata n’ọgbakọ Jehova?
18 Anyị kwesịrị ịna-agbalị mgbe niile ile ụmụnna anyị anya otú Jehova si ele ha. Otú anyị ga-esi na-eme ya bụ ịna-elekwasị anya n’àgwà ọma ndị ha nwere, ọ bụghị n’ihe ndị ha na-anaghị emeta. Ihe ndị ha na-anaghị emeta so n’ihe ndị ga-emecha gafere. Anyị kwesịrị iji ịhụnanya na-edozi nghọtahie ọ bụla anyị na ụmụnna anyị nwere. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ‘ịna-enwere ibe anyị obiọma, na-enwe obi ebere, na-agbagharakwa ibe anyị kpamkpam.’ (Efe. 4:32) Anyị mee otú ahụ, paradaịs ihe atụ anyị nọ na ya ga-amasị ndị chọrọ ka e si otú ahụ na-emeso ha. b
NỌSIE IKE NA PARADAỊS IHE ATỤ
19. (a) Dị ka e kwuru n’igbe isiokwu ya bụ “ Ha Pụrụ, Mechaa Lọghachi,” gịnị ka ụfọdụ ndị kwuru mgbe ha lọghachitere na paradaịs ihe atụ? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
19 Obi atọgbuola anyị na anyị nọ na paradaịs ihe atụ. Ọ na-amakwu mma karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ndị na-efe Jehova na-abatakwu na ya n’ike n’ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ka anyị na-ekele Jehova ruo mgbe ebighị ebi maka paradaịs a ọ kpọbatara anyị. Onye ọ bụla nke chọrọ ịna-ama pokopoko, ahụ́ ana-eru ya ala, ihe o nwere eju ya afọ, obi eruokwa ya ala ga-abatarịrị na paradaịs a. Ọ gaghịkwa ahapụ ya. Ma, ka anyị kpachara anya n’ihi na Ekwensu na-agbalị ike ya niile ime ka anyị si na paradaịs ihe atụ a pụọ. (1 Pita 5:8; Mkpu. 12:9) Ka anyị ghara ikwe ka o nweta anyị. Ka anyị gbalịsie ike na-eme ka paradaịs ihe atụ a na-amakwu mma, na-adịkwu ọcha, ndị nọ na ya adịrịkwuo n’udo.
GỊNỊ KA Ị GA-AZA?
-
Gịnị bụ paradaịs ihe atụ?
-
Olee ngọzi ndị anyị na-enweta na paradaịs ihe atụ?
-
Olee otú anyị ga-esi eme ka ndị ọzọ chọwa ịbata na paradaịs ihe atụ?
ABỤ NKE 144 Lekwasị Anya n’Ụgwọ Ọrụ
a NKỌWAKWU: “Paradaịs ihe atụ” pụtara otú obi si ruo ndị na-efe Jehova ala. Na paradaịs ihe atụ, anyị na Jehova na ụmụnna anyị na-adị n’udo.
b Gaa na jw.org lee vidio isiokwu ya bụ Gịnị Ka Ha Na-eme Ugbu A? Alena Žitníková: Otú Ihe M Na-atụ Anya Ya Si Mezuo, ka ị hụ ngọzi otu nwanna nwaanyị nwetara n’ihi na ọ nọ na paradaịs ihe atụ.
c NKỌWA FOTO: Ebe ọtụtụ ụmụnna na ibe ha nọ na-akparịta n’ọmụmụ ihe, otu nwanna aga nọọrọ onwe ya.